Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/1 p. 29-30
  • Ọgụ Casiodoro De Reina Lụrụ Maka Bible Spanish

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgụ Casiodoro De Reina Lụrụ Maka Bible Spanish
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha Chineke n’Ime Nsụgharị Dị Iche Iche nke Spanish
  • Ọgụ A Lụrụ Maka Nlanarị nke Bible n’Asụsụ Spanish
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú Okwu Chineke Si Ruo Ndị Mmadụ Aka na Spen n’Oge Ochie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
    Teta!: Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
  • Baịbụl—Akwụkwọ Eziokwu na Akwụkwọ Amụma
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/1 p. 29-30

Ọgụ Casiodoro De Reina Lụrụ Maka Bible Spanish

SPAIN nke narị afọ nke 16 bụ ebe dị ize ndụ ịnọ gụọ Bible. Chọọchị Katọlik enyewo Njụta Okwukwe ntụziaka ka ọ kwụsị ozizi ọ bụla dị iche n’ihe e kwere na ya. Ma e nwere otu nwa okorobịa n’ebe ndịda Spain onye, ọ bụghị nanị na ọ gụrụ Akwụkwọ Nsọ kamakwa ọ ṅụrụ iyi ịsụgharị ha gaa n’asụsụ ógbè ahụ ka onye Spain ọ bụla nwee ike ịgụ ha. Aha ya bụ Casiodoro de Reina.

A kpaliri mmasị Reina na Bible n’afọ ndị ọ nọrọ n’ebe obibi ndị mọnk nke San Isidro del Campo, ná mpụga nke Seville, Spain. N’afọ ndị 1550, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mọnk nọ n’ebe obibi a pụrụ iche nke ndị mọnk tinyere ọnụ ọgụgụ hour ka ukwuu na-agụ Akwụkwọ Nsọ karịa ka ha tinyere n’ịrụ ọrụ ụkọchukwu ha. Ozi Bible gbanwekwara echiche ha. Ha jụrụ ozizi ndị Katọlik banyere iji ihe oyiyi eme ihe na nkwenye na pọgatrị. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, echiche ha ghọrọ ndị a maara n’ógbè ahụ, n’ịtụkwa ụjọ ịbụ ndị Njụta Okwukwe nke Spain jidere, ha kpebiri ịgbaga obodo ọzọ. Reina bụ otu n’ime mmadụ 12 ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịgbaga Geneva, Switzerland.

Mgbe o jisisịrị ike lanarị, o si n’otu obodo ukwu Europe gaa n’ọzọ, jisi ike nọgide na-agbanarị ndị na-akpagbu ya. Na 1562 ndị njụta okwukwe ahụ na-enweghị ike ijide ya suru ihe oyiyi ya ọkụ na Seville, ma ọbụna ajọ iyi egwu ahụ emeghị ka Reina kwụsị ọrụ ya nke ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ. N’agbanyeghị nkwa e kwere ịkwụ onye ọ bụla jidere ya ụgwọ na ịnọ na-ebi mgbe nile n’egwu nke ịbụ onye e jidere, ọ rụrụ ọrụ n’esepụghị aka ná nsụgharị Spanish ya. “E wezụga mgbe m rịara ọrịa ma ọ bụ mgbe m nọ na njem, . . . ọ dịghị mgbe mkpịsị akwụkwọ si m n’aka pụọ,” ka ọ kọwara.

N’ime afọ iri Reina rụsịrị ọrụ ahụ. Na 1569 e bipụtara nsụgharị ya nke Bible dum na Basel, Switzerland. Ọrụ a pụrụ iche bụ nsụgharị Spanish mbụ nke e mere site n’asụsụ ndị mbụ. Ruo ọtụtụ narị afọ a nọwo na-enwe Bible Latin, ma Latin bụ asụsụ nke ndị nọ n’ọkwá dị elu. Reina kwenyere na Bible bụ nke onye ọ bụla kwesịrị ịghọta, o tinyekwara ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ijiri ihe mgbaru ọsọ ahụ gaa n’ihu.

N’okwu mmalite nke nsụgharị ya, ọ kọwara ihe ndị kpatara ya. “Igbochi Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị nkịtị bụ n’ụzọ a na-apụghị izere ezere mkparị kasị ukwuu nye Chineke, bụrụkwa mmerụ ahụ nke ọdịmma ndị mmadụ. Nke a bụ n’ụzọ doro anya aka ọrụ Setan na ndị ọ na-achịkwa. . . . Ebe ọ bụ na Chineke nyere ụmụ mmadụ Okwu ya, na-achọ ka mmadụ nile ghọta ya ma tinye ya n’ọrụ, onye ọ bụla nke ga-egbochi inwe ya n’asụsụ ọ bụla apụghị inwe ezi ebumnobi.”

Okwu a bụ nke anya ike, ebe ọ bụ na e kwuru ya nanị afọ 18 ka Ndepụta Akwụkwọ A Machibidoro Iwu nke ndị Njụta Okwukwe nke Spain machibidosịrị Bible ahụ iwu kpọmkwem “n’akwụkwọ ọgụgụ nkịtị n’asụsụ Castilian [Spanish] ma ọ bụ n’ụdị asụsụ ọ bụla ọzọ nke ógbè.” N’ụzọ doro anya, Reina ekweghị ka egwu mmadụ gbochie ịhụnanya o nwere maka eziokwu.

E wezụga inwe ọchịchọ siri ike ime ka Bible ruo ndị nile na-asụ asụsụ Spanish aka, Reina chọkwara imepụta nsụgharị kasị zie ezie a pụrụ inwe. N’okwu mmalite ya ọ kọwara uru dị iche iche nke ime nsụgharị site n’asụsụ ndị mbụ kpọmkwem. Ndehie ihe ụfọdụ egbebatawo n’ihe odide Latin nke Vulgate ahụ, ka Reina kọwara. Otu n’ime ndị kasị pụta ìhè n’ime ndehie ihe ndị a bụ mwepụ e wepụrụ aha Chineke.

Aha Chineke n’Ime Nsụgharị Dị Iche Iche nke Spanish

Reina ghọtara na aha Chineke, bụ́ Jehova, kwesịrị ịpụta ná nsụgharị Bible ọ bụla e ji ezi akọ na uche mee, dị ka ọ dị n’ihe odide mbụ ahụ. Ọ jụrụ ịgbaso omenala nke iji utu aha ndị dị ka “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke. N’okwu mmeghe nke nsụgharị ya, o ji ụdị ịkpọ okwu aha e ji mara ọrụ ya wee kọwaa ihe ndị mere o ji mee ya.

“Anyị echekwawo aha ahụ bụ́ (Iehoua), ọ bụghị n’enweghị ihe ndị kasị gbaa ọkpụrụkpụ mere anyị ji mee ya. Nke mbụ, n’ihi na n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ya ná nsụgharị anyị, a pụkwara ịchọta ya n’ihe odide Hibru, ọ dịkwa anyị ka anyị apụghị ịhapụ idenye ya ma ọ bụ gbanwee ya n’emeghị omume ekwesịghị ntụkwasị obi na imerụ ihe dị nsọ n’ebe iwu Chineke dị, bụ́ nke nyere iwu ka a ghara iwepụ ma ọ bụ tụkwasị ihe ọ bụla. . . . Omenala [nke ịhapụ aha ahụ], bụ́ nke Ekwensu kpatara, bilitere site na nkwenkwe ụgha nke ndị rabaị nke oge a bụ́ ndị, ọ bụ ezie na ha na-azọrọ na ha na-asọpụrụ ya, n’ezie liri aha nsọ Ya, na-eme ka ndị Chineke chezọọ ihe ahụ ọ chọrọ ka e jiri doo ya iche pụọ na chi . . . ndị ọzọ nile.”

Ọchịchọ kwesịrị ịja mma Reina nwere ibuli aha Chineke elu nwere mmetụta ndị na-adịte anya. Ruo n’ụbọchị anyị, ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná nsụgharị Spanish—ma nke ndị Katọlik ma nke ndị Protestant—agbasowo ihe nlereanya a, na-eji aha Chineke eme ihe n’ime ya nile. N’ụzọ dị ukwuu n’ihi Reina, ndị na-agụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nsụgharị Spanish ọ bụla nke Bible pụrụ ịghọta ngwa ngwa na Chineke nwere aha onwe onye nke na-edo ya iche pụọ na chi ndị ọzọ nile.

Eziokwu ahụ bụ na a na-ahụ n’ụzọ pụtara ìhè aha Jehova n’asụsụ Hibru na peji bu aha Bible Reina kwesịrị ịrịba ama. Reina tinyere ndụ ya ná nzube ahụ ziri ezi nke ichekwa Okwu Chineke, na-eme ka e nwee ya n’asụsụ nke ọtụtụ nde mmadụ pụrụ ịgụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya