Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
“Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”—ABỤ ỌMA 133:1.
1. Gịnị bụ ọnọdụ nke ọtụtụ ezinụlọ taa?
EZINỤLỌ nọ n’ọgba aghara taa. N’ọtụtụ ezinụlọ, nkekọ alụmdi na nwunye na-achọ ịdakpọ. Ịgba alụkwaghịm na-aghọwanye ihe a na-ahụkarị, ọtụtụ ụmụ nke ndị di na nwunye gbara alụkwaghịm na-enwekwa oké mwute. Ọtụtụ nde ezinụlọ enweghị obi ụtọ, ha adịghịkwa n’otu. Ma, ọ dị otu ezinụlọ nke nwere ezi ọṅụ na ezigbo ịdị n’otu. Ọ bụ ezinụlọ eluigwe na ala nke Jehova Chineke. N’ime ya, ọtụtụ miriad nke ndị mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya na-arụ ọrụ ha n’ikwekọ n’uche Chineke. (Abụ Ọma 103:20, 21) Ma ọ̀ dị otu ezinụlọ n’elu ala nke na-enwe ụdị ịdị n’otu ahụ?
2, 3. (a) Olee ndị bụ ugbu a akụkụ nke ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke, gịnịkwa ka a pụrụ iji Ndịàmà Jehova nile taa tụnyere? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị ga-atụle?
2 Pọl onyeozi dere, sị: ‘M na-egbu ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị, Onye e sitere na Ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.’ (Ndị Efesọs 3:14, 15) Eriri ezinụlọ nile nọ n’elu ụwa nwetara aha ya site n’aka Chineke n’ihi na ọ bụ Onye Okike. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ezinụlọ mmadụ nọ n’eluigwe, n’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ Chineke na-alụ nzukọ ya nke eluigwe, a ga-ejikọkwa Jisọs na nwunye ime mmụọ ya n’eluigwe. (Aịsaịa 54:5; Luk 20:34, 35; 1 Ndị Kọrint 15:50; 2 Ndị Kọrint 11:2) Ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nọ n’elu ụwa bụ ugbu a akụkụ ezinụlọ eluigwe na ala nke Chineke, “atụrụ ọzọ” nke Jisọs kwa, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, bụ ndị ga-abụ ndị òtù ya. (Jọn 10:16; Ndị Rom 8:14-17; Ụlọ Nche, January 15, 1996, peji nke 31) Otú ọ dị, a pụrụ iji Ndịàmà Jehova nile taa tụnyere ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu.
3 Ị̀ bụ akụkụ nke ezinụlọ ahụ dị ebube zuru mba nile nke ndị ohu Chineke? Ọ bụrụ na ị bụ, i nwere otu n’ime ngọzi kasị ukwuu onye ọ bụla pụrụ inwe. Ọtụtụ nde ga-agba akaebe na ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ—nzukọ ya a na-ahụ anya—bụ ala ahịhịa ndụ nke udo na ịdị n’otu n’ime ọzara ụwa nke esemokwu na adịghị n’otu. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ịdị n’otu nke ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ? Ihe ndị dịkwa aṅaa na-akwalite ụdị ịdị n’otu ahụ?
Lee Ka O Si Dị Mma, Dịkwa Ụtọ nke Ukwuu!
4. N’okwu nke aka gị, olee otú ị ga-esi ekwupụta ihe Abụ Ọma 133 na-ekwu banyere ịdị n’otu ụmụnna?
4 Onye ọbụ abụ bụ́ Devid nwere ekele dị ukwuu n’ịdị n’otu ụmụnna. Ọbụna na e nyere ya ike mmụọ nsọ ịbụ abụ banyere ya! Cheedị echiche ka o ji ụbọ akwara ya na-abụ, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu! Ọ dị ka ezi mmanụ ahụ nke dịkwasị n’isi, nke na-eruda n’afụ ọnụ, bụ afụ ọnụ Erọn; nke na-eruda n’ọnụ uwe mwụda ya nile; dị ka igirigi Heamọn, nke na-adakwasị n’ugwu nile nke Zaịọn: n’ihi na n’ebe ahụ ka Jehova nyere ngọzi ahụ iwu, bụ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 133:1-3.
5. Ná ndabere nke Abụ Ọma 133:1, 2, ntụnyere dị aṅaa ka a pụrụ ime n’etiti ndị Israel na ndị ohu Chineke nke oge a?
5 E ji okwu ndị ahụ mee ihe banyere ịdị n’otu ụmụnna nke ndị Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị Israel, nwere. Mgbe ha nọ na Jerusalem maka ememe atọ ha na-eme kwa afọ, ha bikọrọ ọnụ n’ịdị n’otu. Ọ bụ ezie na ha sitere n’ebo dị iche iche, ha bụ otu ezinụlọ. Ịbụ ndị nọkọrọ ọnụ nwere mmetụta dị mma n’ahụ ha, dị ka mmanụ na-enye ume ọhụrụ nke nwere ísì ụtọ. Mgbe a wụkwasịrị ụdị mmanụ ahụ n’isi Erọn, o si n’isi ya rudaa n’afụ ọnụ ya ma gbadaa n’olu uwe mwụda ya. Nye ndị Israel, ịnọkọ ọnụ nwere ezi mmetụta nke mịbanyere n’ìgwè ndị ahụ nile zukọrọnụ. E doziri nghọtahie nile, kwalitekwa ịdị n’otu. Ụdị ịdị n’otu ahụ dị n’ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ taa. Ịkpachi anya nwere mmetụta ime mmụọ dị mma n’ahụ ndị òtù ya. A na-edozi nghọtahie ma ọ bụ esemokwu ọ bụla ka a na-etinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ. (Matiu 5:23, 24; 18:15-17) Ndị Jehova na-enwe ekele dị ukwuu n’ịgbarịta ume nke na-esi n’ịdị n’otu ụmụnna ha apụta.
6, 7. Olee otú ịdị n’otu Israel si yie igirigi nke Ugwu Heamọn, oleekwa ebe a pụrụ ịchọta ngọzi Chineke taa?
6 Olee otú mbikọ n’ịdị n’otu nke Israel si dịkwa ka igirigi nke Ugwu Heamọn? Ebe ọnụ ọnụ ugwu a ji 2,800 mita karịa elu oké osimiri, snow na-eju n’elu ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ nile. Elu Heamọn nke snow kpuchiri na-akpata mgbanwe nke alụlụụ abalị wee na-emepụtazi igirigi dị ukwuu nke na-echekwa ahịhịa ndụ n’oge ọkọchị tere anya. Ikuku oyi sitere n’usoro ugwu Heamọn pụrụ iburu alụlụụ dị otú ahụ gaa ihe ruru ebe ndịda dị ka n’akụkụ Jerusalem, bụ́ ebe ha na-ezo dị ka igirigi. Ya mere, onye ọbụ abụ ahụ kwuru n’ụzọ ziri ezi banyere “igirigi Heamọn, nke na-adakwasị n’ugwu nile nke Zaịọn.” Lee ezi ihe ncheta nke mmetụta na-enye ume ọhụrụ nke na-akwalite ịdị n’otu nke ezinụlọ Jehova nke ndị na-efe ya ofufe nke ahụ bụ!
7 Tupu e guzobe ọgbakọ ndị Kraịst, Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem, bụ ebe bụ isi maka ezi ofufe. N’ihi ya, ọ bụ n’ebe ahụ ka Chineke nyere iwu ka ngọzi ahụ dịrị. Ebe ọ bụ na Isi Iyi nke ngọzi nile biri n’ụzọ ihe atụ n’ebe nsọ dị na Jerusalem, ngọzi ga-esite n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ezi ofufe adabereghịkwa n’otu ebe ọ bụla, a pụrụ ịchọta ngọzi, ịhụnanya, na ịdị n’otu nke ndị ohu Chineke n’elu ụwa nile taa. (Jọn 13:34, 35) Gịnị bụgasị ụfọdụ ihe ndị na-akwalite ịdị n’otu a?
Ihe Ndị Na-akwalite Ịdị n’Otu
8. Gịnị ka anyị na-amụta banyere ịdị n’otu na Jọn 17:20, 21?
8 Ịdị n’otu nke ndị na-efe Jehova ofufe dabeere n’ime ihe kwekọrọ ná nghọta ziri ezi nke Okwu Chineke, tinyere ozizi nke Jisọs Kraịst. Site ná nzite Jehova zitere Ọkpara ya n’ime ụwa ịgba àmà nye eziokwu ahụ na ịnwụ ọnwụ ịchụàjà, e meghere ụzọ maka nhiwe nke ọgbakọ ndị Kraịst dị n’otu. (Jọn 3:16; 18:37) Na a ga-enwe ezi ịdị n’otu n’etiti ndị òtù ya bụ nke e mere ka o doo anya mgbe Jisọs kpere ekpere, sị: “Ọ bụghịkwa nanị ndị a ka M na-ekpe ekpere banyere ha, kama ana m ekpekwa ekpere banyere ndị kwere na Mụ site n’okwu ha; ka ha nile wee bụrụ otu; dị ka Gị onwe gị dị n’ime m, dị ka Mụ onwe m dịkwa n’ime Gị, Nna, ka ha onwe ha wee dịkwa n’ime Anyị: ka ụwa wee kwere na Gị onwe gị zitere m.” (Jọn 17:20, 21) Ụmụazụ Jisọs nwetara ịdị n’otu yiri nke ahụ dị n’etiti Chineke na Ọkpara ya. Nke a mere n’ihi na ha mere ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke na ozizi Jisọs. Otu omume ahụ bụ otu isi ihe na-akpata ịdị n’otu nke ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ taa.
9. Òkè dị aṅaa ka mmụọ nsọ na-ekere n’ịdị n’otu nke ndị Jehova?
9 Ihe ọzọ na-eme ka ndị Jehova dịrị n’otu bụ na anyị nwere mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke. Ọ na-eme ka anyị ghọta eziokwu e kpughere ekpughe nke Okwu Jehova wee si otú a na-ejere ya ozi n’ịdị n’otu. (Jọn 16:12, 13) Mmụọ ahụ na-enyere anyị aka izere ụdị ọrụ anụ ahụ ndị na-eweta adịghị n’otu dị ka esemokwu, ekworo, ọnụma, na ịkpa iche iche. Kama nke ahụ, mmụọ Chineke na-amịpụta n’ime anyị mkpụrụ na-eweta ịdị n’otu nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè.—Ndị Galetia 5:19-23.
10. (a) Myirịta dị aṅaa ka a pụrụ inweta n’etiti ịhụnanya dị n’ezinụlọ mmadụ dị n’otu na ịhụnanya nke pụtara ìhè n’etiti ndị raara onwe ha nye Jehova? (b) Olee otú otu onye so n’Òtù Na-achị Isi si kwupụta mmetụta ya banyere isoro ụmụnna ime mmụọ na-ezukọ?
10 Ndị òtù nke ezinụlọ dị n’otu na-ahụ ibe ha n’anya ma na-enwe obi ụtọ ịnọkọ ọnụ. Ná ntụnyere, ndị so n’ezinụlọ dị n’otu nke ndị na-efe Jehova ofufe na-ahụ ya, Ọkpara ya, na ndị kwere ekwe ibe ha n’anya. (Mak 12:30; Jọn 21:15-17; 1 Jọn 4:21) Dị nnọọ ka ezinụlọ anụ ahụ na-ahụ n’anya na-erikọ nri, ndị raara onwe ha nye Chineke nwere obi ụtọ ịnọ ná nzukọ ndị Kraịst, mgbakọ, na mgbakọ ukwu dị iche iche iji rite uru site ná mkpakọrịta dị mma na nri ime mmụọ magburu onwe ya. (Matiu 24:45-47; Ndị Hibru 10:24, 25) Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova n’otu mgbe tinyere okwu ahụ n’ụzọ dị otú a: “Nye m, isoro ụmụnna zukọọ bụ otu n’ime ihe ụtọ kasịnụ ná ndụ na isi iyi nke agbamume. Ọ na-amasị m iso n’ime ndị mbụ bịarutere Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma soro n’ime ndị ikpeazụ lawaranụ, ma o kwe omume. M na-enwe ọṅụ n’ime onwe m mgbe m sooro ndị Chineke na-akparịta ụka. Mgbe m nọ n’etiti ha ahụ na-eru m ala mụ na ezinụlọ m.” Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?—Abụ Ọma 27:4.
11. N’ọrụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-achọta obi ụtọ karịsịa, gịnịkwa ka ime ije ozi Chineke ihe bụ isi ná ndụ anyị na-arụpụta?
11 Ezinụlọ dị n’otu na-enweta obi ụtọ n’imekọ ihe ọnụ. N’otu aka ahụ, ndị so n’ezinụlọ nke ndị na-efe Jehova ofufe na-enweta ọṅụ n’ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ ha n’ịdị n’otu. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ikerechi òkè anya na ya na-adọta anyị nso karị n’ebe Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọ. Ime ozi Chineke ihe bụ isi ná ndụ anyị na ịkwado ọrụ nile nke ndị ya na-emekwa ka mmụọ ezinụlọ dị n’etiti anyị na-aga n’ihu.
Ịdị n’Usoro nke Ọchịchị Chineke Dị Mkpa
12. Gịnị bụgasị njimara nke ezinụlọ dị n’otu nke nwere obi ụtọ, ndokwa dịkwa aṅaa kwalitere ịdị n’otu n’ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ?
12 Ezinụlọ nke nwere idu ndú siri ike ma na-ahụ n’anya, dịkwa n’usoro yiri ka ọ ga-adị n’otu ma nwee obi ụtọ. (Ndị Efesọs 5:22, 33; 6:1) Jehova bụ Chineke nke ịdị n’usoro na-eweta udo, ndị nile nọkwa n’ezinụlọ ya na-ewere ya dị ka “Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.” (Daniel 7:18, 22, 25, 27; 1 Ndị Kọrint 14:33) Ha na-aghọtakwa na ọ họpụtawo Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, onye nketa nke ihe nile, nyekwa ya ike nile dị n’eluigwe na elu ụwa. (Matiu 28:18; Ndị Hibru 1:1, 2) N’inwe Kraịst dị ka Onye Isi, ọgbakọ ndị Kraịst bụ nzukọ dị n’usoro, dịkwa n’otu. (Ndị Efesọs 5:23) Iji lekọta ọrụ nke ọgbakọ nile nke narị afọ mbụ, e nwere òtù na-achị isi nke ndị ozi na “ndị okenye” ndị ọzọ tozuru okè n’ime mmụọ mejupụtara. Ọgbakọ dị iche iche n’otu n’otu nwere ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, a họpụtara ahọpụta, na ndị ohu na-eje ozi. (Ọrụ 15:6; Ndị Filipaị 1:1) Irubere ndị na-edu ndú isi kwaliri ịdị n’otu.—Ndị Hibru 13:17.
13. Olee otú Jehova na-esi adọta ndị mmadụ, gịnịkwa na-esi na nke a apụta?
13 Ma ịdị n’usoro a nile hà na-atụ aro na ịdị n’otu nke ndị na-efe Jehova bụ n’ihi idu ndú siri ike nke na-enweghị mmetụta? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dịghị ihe na-egosi enweghị ịhụnanya e nwere banyere Chineke na nzukọ ya. Jehova na-adọta ndị mmadụ site n’igosi ịhụnanya, kwa afọ kwa ọtụtụ narị puku na-eji afọ ofufo na ọṅụ ghọọ akụkụ nke nzukọ Jehova site n’ịbụ ndị e mere baptism ná ngosipụta nke nraranye ha sitere n’obi ha dum nye Chineke. Mmụọ ha yiri nke Joshua, bụ́ onye gbara ndị Israel ibe ya ume, sị: “Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe . . . Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.”—Joshua 24:15.
14. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na nzukọ Jehova bụ nke ọchịchị Chineke?
14 Dị ka akụkụ nke ezinụlọ Jehova, ọ bụghị nanị na anyị nwere ọṅụ kamakwa anyị nọ ná ntụkwasị obi. Nke a dị otú a n’ihi na nzukọ ya na-agbaso ọchịchị Chineke. Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke (site n’okwu Grik bụ́ the·osʹ, chi, na kraʹtos, ịchịisi). Ọ bụ ịchịisi Chineke, nke o guzobere ma hiwe. “Mba dị nsọ” e tere mmanụ nke Jehova nọ n’okpuru ịchịisi ya wee si otú ahụ bụrụkwa nke ọchịchị Chineke. (1 Pita 2:9) N’ịbụ ndị nwere Onye Ọchịchị Ukwu, Jehova, dị ka Onye Ikpe, Onye Na-enye Iwu, na Eze anyị, anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji nwee mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi. (Aịsaịa 33:22) Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ụfọdụ ịrụ ụka ga-ebilite ma yie ọṅụ, ịnọ ná ntụkwasị obi, na ịdị n’otu anyị egwu?
Òtù Na-achị Isi Emee Ihe
15, 16. Ịrụ ụka dị aṅaa bilitere na nari afọ mbụ, n’ihi gịnịkwa?
15 Iji chekwaa ịdị n’otu nke ezinụlọ, mgbe ụfọdụ a ghaghị idozi ịrụ ụka. Mgbe ahụ, ka e were ya na a ghaghị idozi nsogbu ime mmụọ iji chekwaa ịdị n’otu nke ezinụlọ Chineke nke ndị na-efe ya ofufe na narị afọ mbụ O.A. Gịnịzi ka e kwesịrị ime? Òtù na-achị isi mere ihe, na-eme mkpebi n’ihe metụtara ihe ime mmụọ. Anyị nwere ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ nke ụdị ime ihe ahụ.
16 N’ihe dị ka na 49 O.A., òtù na-achị isi zukọrọ na Jerusalem iji dozie otu nsogbu siri ike wee si otú ahụ chekwaa ịdị n’otu nke “ezinụlọ Chineke.” (Ndị Efesọs 2:19) Ihe dị ka afọ 13 tupu mgbe ahụ, Pita onyeozi ekwusaworo Kọniliọs ozi ọma, ndị Jentaịl mbụ kwa, ma ọ bụ ndị nke mba nile, ghọrọ ndị kwere ekwe e mere baptism. (Ọrụ, isi nke 10) N’oge njem ozi ala ọzọ mbụ nke Pọl, ọtụtu ndị Jentaịl nakweere Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 13:1–14:28) N’ezie, e guzobewo ọgbakọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl n’Antiọk, Siria. Ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ ndị Juu chere na ndị Jentaịl a tọghatara kwesịrị ibi úgwù ma debe Iwu Mosis, ma ndị ọzọ ekwetaghị. (Ọrụ 15:1-5) Ịrụ ụka a gaara eduje n’adịtụghị n’otu, ọbụna gaa n’iguzobe ọgbakọ ndị Juu na nke ndị Jentaịl iche iche. Ya mere òtù na-achị isi mere ihe ngwa ngwa iji chekwaa ịdị n’otu ndị Kraịst.
17. Olee usoro ime ihe nke ọchịchị Chineke kwekọrọ ekwekọ nke a kọwara n’Ọrụ isi nke 15?
17 Dị ka Ọrụ 15:6-22 si kwuo, “ndị ozi na ndị okenye wee zukọọ ile okwu a.” Ndị ọzọ nọkwa n’ebe ahụ, tinyere ndị si Antiọk. Pita bu ụzọ kọwaa na ‘ndị mba ọzọ sitere n’ọnụ ya nụ okwu nke ozi ọma ahụ, kwerekwa.’ Mgbe ahụ “ọha nile” gere ntị ka Banabas na Pọl na-akọ “ihe ịrịba ama na ọrụ ebube nile, ka ha hà, bụ́ nke Chineke mere n’etiti ndị mba ọzọ,” ma ọ bụ ndị Jentaịl, “site n’aka ha.” Mgbe ahụ Jemes tụrụ aro otú a pụrụ isi dozie okwu ahụ. Mgbe òtù na-achị isi mesịrị mkpebi, a gwara anyị, sị: “Ọ dị ndị ozi na ndị okenye mma, ha na nzukọ Kraịst dum, ịhọpụta ndị ikom ụfọdụ n’ime ha, na iziga ha n’Antiọk, ha na Pọl na Banabas.” ‘Ndị ikom ahụ a họpụtara’—Judas na Saịlas—bugaara ndị kwere ekwe ibe ha akwụkwọ ozi na-agba ume.
18. Òtù na-achị isi mere mkpebi dị aṅaa nke metụtara Iwu Mosis, oleekwa otú nke a si metụta ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl?
18 Akwụkwọ ozi ahụ na-ekwupụta mkpebi òtù na-achị isi ahụ malitere n’okwu ndị a: “Ndị ozi na ụmụnna unu, bụ́ ndị okenye, na-edegara ụmụnna anyị akwụkwọ, bụ́ ndị sitere ná ndị mba ọzọ, ndị bi n’Antiọk na Siria na Silisia, anyị na-ekele unu.” Ndị ọzọ bịara nzukọ a dị oké mkpa, ma n’ụzọ doro anya, “ndị ozi na ndị okenye” mejupụtara òtù na-achị isi ahụ. Mmụọ Chineke duziri ha, n’ihi na akwụkwọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ọ dị Mmụọ Nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:23-29, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) A chọghị ndị Kraịst n’aka ibi úgwù na idebe Iwu Mosis. Mkpebi a nyeere ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl aka ime ihe na ikwu okwu n’ịdị n’otu. Ọgbakọ ndị ahụ ṅụrịrị ọṅụ, ịdị n’otu ahụ dị oké ọnụ ahịa gara n’ihu, ọbụna dị ka ọ dị n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke Chineke taa n’okpuru nduzi ime mmụọ nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.—Ọrụ 15:30-35.
Na-eje Ozi n’Ịdị n’Otu Ọchịchị Chineke
19. N’ihi gịnị ka ịdị n’otu ji baa ụba n’ezinụlọ nke ndị na-efe Jehova ofufe?
19 Ịdị n’otu na-aba ụba mgbe ndị òtù ezinụlọ na-eso ibe ha emekọ ihe ọnụ. Otu ihe ahụ bụ eziokwu n’ezinụlọ nke ndị na-efe Jehova ofufe. Ịbụ ndị na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke, ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ narị afọ mbụ jeere Chineke ozi n’isoro òtù na-achị isi mekọọ ihe n’ụzọ zuru ezu ma nakwere mkpebi ya nile. Site n’enyemaka nke òtù na-achị isi, ndị okenye ahụ ‘kwusara okwu ahụ,’ ndị òtù ọgbakọ dị iche iche n’ozuzu ha ‘kwukwara otu ihe.’ (2 Timoti 4:1, 2; 1 Ndị Kọrint 1:10) Ya mere, e ziri otu eziokwu Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ozi na ná nzukọ ndị Kraịst, ma ọ bụ na Jerusalem, Antiọk, Rom, Kọrint, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ. Ụdị ịdị n’otu ọchịchị Chineke ahụ dị taa.
20. Iji chekwaa ịdị n’otu ndị Kraịst anyị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
20 Iji chekwaa ịdị n’otu anyị, anyị nile bụ́ akụkụ nke ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ kwesịrị ịgbalịsi ike igosi ịhụnanya ọchịchị Chineke. (1 Jọn 4:16) Ọ dị anyị mkpa ido onwe anyị n’okpuru uche Chineke ma gosi nkwanye ùgwù miri emi maka ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’ na Òtù Na-achị Isi. Dị ka nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke, nrubeisi anyị bụ, n’ezie, ihe afọ ofufo na ọṅụ. (1 Jọn 5:3) Lee otú onye ọbụ abụ ahụ si jikọọ ọṅụ na nrubeisi n’ụzọ dabara adaba! Ọ bụrụ abụ, sị: “Toonụ Ja. Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova, nke ihe nile O nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 112:1.
21. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta onwe anyị ịbụ ndị na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke?
21 Jisọs, Onye Isi ọgbakọ, na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke kpam kpam, ọ na-emekwa uche Nna ya mgbe nile. (Jọn 5:30) Ya mere, ka anyị gbasoo Onye Nlereanya anyị site n’ime uche Jehova n’ụzọ ọchịchị Chineke na n’ịdị n’otu n’isoro nzukọ Ya na-emekọ ihe ọnụ n’ụzọ zuru ezu. Mgbe ahụ site n’ọṅụ na ekele sitere n’obi, anyị pụrụ ịbụghachi abụ onye ọbụ abụ ahụ, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú a pụrụ isi jikọọ ịdị n’otu ndị Kraịst anyị na Abụ Ọma 133?
◻ Gịnị bụgasị ihe ndị na-akwalite ịdị n’otu?
◻ N’ihi gịnị ka ịdị n’usoro ọchịchị Chineke ji dị mkpa n’ịdị n’otu nke ndị Chineke?
◻ Olee otú òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ si mee ihe iji chekwaa ịdị n’otu?
◻ Gịnị ka ije ozi n’ịdị n’otu ọchịchị Chineke pụtara nye gị?
[Foto dị na peeji nke 13]
Òtù na-achị isi mere ihe iji chekwaa ịdị n’otu