Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Ga-eso Unu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Gịnị Ka Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ”Mmụọ Nsọ n’Onwe Ya So Mmụọ Anyị Na-agba Àmà”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Akụkọ ndị e nwetara n’afọ ụfọdụ gara aga na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị na-ekere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ arịwo elu nke nta. Nke a ọ̀ na-atụ aro na e ji mmụọ nsọ na-ete ọtụtụ ndị ọhụrụ mmanụ?

E nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na ọnụ ọgụgụ nke 144,000 ndị Kraịst e tere mmanụ kụụrụ ọnụ ọtụtụ afọ iri gara aga.

N’Ọrụ 2:1-4, anyị na-agụ banyere ndị mbụ so n’ìgwè ahụ dị nta, sị: “Mgbe ụbọchị Pentikọst na-ezu okè, ha nile wee nọkọọ n’otu ebe. Na mberede ụzụ, dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike, wee site n’eluigwe, o wee jupụta ụlọ ahụ dum ebe ha na-anọdụ ala. E wee mee ka ha hụ ire, dị ka nke ọkụ, na-ekesa onwe ha; o wee nọkwasị ha nile n’otu n’otu. Ha nile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.”

Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova họọrọ ndị ọzọ, o jikwa mmụọ nsọ ya tee ha mmanụ. A tụkwasịrị ọtụtụ puku n’afọ ndị mbụ nke Iso Ụzọ Kraịst. N’Ememe Ncheta n’oge anyị, onye ọkà okwu na-adọrọkarị uche gaa n’okwu Pọl ndị dị ná Ndị Rom 8:15-17, bụ́ nke kwuru na ndị ahụ e tere mmanụ ‘na-anata Mmụọ nke ido ka ụmụ.’ Pọl kwukwasịrị na mmụọ nsọ ahụ ha na-anata ‘na-eso mmụọ ha na-agba àmà, na ha bụ ụmụ Chineke, ndị ha na Kraịst na-ekekọ.’ Ndị e ji mmụọ nsọ a tee mmanụ n’ezie ma ya n’ụzọ doro anya. Ọ bụghị ọchịchọ efu ma ọ bụ ngosipụta nke echiche mmetụta uche na nke na-ezighị ezi ha nwere banyere onwe ha.

Anyị na-aghọta na ọkpụkpọ eluigwe a gara n’ihu ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ ezie na n’oge ahụ a kpọrọ Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, a pụrụ inweworị oge ụfọdụ mgbe ọnụ ọgụgụ nke ndị e tere mmanụ dị nnọọ ole na ole.a Site ná nguzobeghachi nke ezi Iso Ụzọ Kraịst na nso nso ngwụsị nke narị afọ gara aga, a kpọkwuru ma họrọkwuo ndị ọzọ. Ma o yiri ka na n’etiti afọ ndị 1930, ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke 144,000 kụụrụ ọnụ n’ụzọ bụ isi. Ya mere ìgwè ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị nwere olileanya elu ala malitere ịpụta. Jisọs kpọrọ ndị dị otú ahụ “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị na-esoro ndị e tere mmanụ dị n’otu n’ofufe dị ka otu ìgwè atụrụ a nwapụtara.—Jọn 10:14-16.

Ihe ndị bụ eziokwu n’ime afọ iri ndị gara aga na-egosi ma nkụrụ ọnụ nke ọkpụkpọ ndị e tere mmanụ ma ngọzi Jehova ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ na-amụba amụba bụ́ ndị nwere olileanya ịlanarị ‘oké mkpagbu’ ahụ. (Mkpughe 7:9, 14) Dị ka ihe atụ, n’Ememe Ncheta e mere na 1935, nke 63,146 bịara, ọnụ ọgụgụ ndị keere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ dị ka ihe àmà nke okwukwu ha na-ekwu na e tere ha mmanụ dị 52,465. Afọ 30 n’ihu, ma ọ bụ na 1965, ndị bịaranụ dị 1,933,089, ebe ndị keere òkè dalatara ruo 11,550. Ịgatụkwu afọ 30 n’ihu, na 1995 ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ gbagoro gaa 13,147,201, ma ọ bụ nanị 8,645 keere òkè n’achịcha na mmanya ahụ. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) N’ụzọ doro anya, ka ọtụtụ iri afọ na-agafe, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ekwu na ha so n’ihe ahụ fọdụrụnụ dalatara nke ukwuu—ihe dị ka 52,400 na 1935; 11,500 na 1965; 8,600 na 1995. Otú ọ dị, a gọziwo ndị nwere olileanya elu ala, ọnụ ọgụgụ ha amụbawokwa n’ụba.

Akụkọ kasị ọhụrụ e bipụtara bụ maka afọ 1995, ọ na-egosikwa 28 ndị keere òkè karịa afọ bu ya ụzọ, ọ bụ ezie na nkezi nke ndị na-ekere òkè ma e jiri ya tụnyere ndị bịara dalatara n’ezie. Ka o sina dị, na mmadụ ole na ole karị họọrọ ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ abụghị ihe ga-eweta nchegbu. N’afọ ndị gara aga, ụfọdụ, ọbụna ndị e mere baptism ọhụrụ, amalitewo ikere òkè na mberede. N’ọtụtụ ọnọdụ, mgbe oge ụfọdụ gasịrị ha kwetara na nke a bụ ihie ụzọ. Ụfọdụ achọpụtawo na ha keere òkè n’ihi mmeghachi omume mmetụta uche n’ebe ikekwe nrụgide anụ ahụ ma ọ bụ nke uche dị. Ma ha bịara hụ na a kpọghị ha n’ezie gaa ná ndụ eluigwe. Ha rịọrọ maka nghọta obi ebere nke Chineke. Ha nọgidekwara na-ejere ya ozi dị ka ezi ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe, na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala.

Ọ dịghị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị chegbuo onwe ya ma ọ bụrụ na mmadụ amalite ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ ma ọ bụ kwụsị ime otú ahụ. Ọ bụghị ihe dịịrị anyị n’ezie ma e jiriwo mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ n’ezie ma kpọọ ya gaa ná ndụ n’eluigwe ma ọ bụ na e jighị. Cheta mmesi obi ike nke Jisọs: “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma; amakwaara m atụrụ nke m.” Dị nnọọ ka e jikwa n’aka, Jehova maara ndị ọ họrọwooro dị ka ụmụ ime mmụọ. E nwere ihe ọ bụla mere a ga-eji kwere na ọnụ ọgụgụ nke ndị e tere mmanụ ga-anọgide na-adalata ka ime agadi na ihe ndabara na-eweta ndụ elu ala ha ná njedebe. Ma, ọbụna ka ndị a e tere mmanụ n’ezie na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, na-elepụ anya n’ihu maka okpueze nke ndụ, atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị sachaworo uwe mwụda ha n’ọbara nke Nwa Atụrụ ahụ, pụrụ ilepụ anya n’ihu ịlanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ.—2 Timoti 4:6-8; Mkpughe 2:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15, 1965, peji nke 191-192.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya