Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Enyemaka Maka Ndị ‘Akpịrị Na-akpọ Nkụ’ na Russia
“NGỌZI na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ na ya: n’ihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju,” ka Jisọs kwuru. (Matiu 5:6) Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi otú Ndịàmà Jehova si na-enye aka imeju akpịrị ịkpọ nkụ ime mmụọ nke ọtụtụ ndị nọ na Russia, bụ́ ebe e belatara nnwere onwe okpukpe ruo ihe karịrị afọ 70.
▪ Otu nwanyị aha ya bụ Valentina nwere ajụjụ Bible ndị siri ike a na-azabeghị ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, o chere, sị: ‘Ònye ka Jisọs kpegaara ekpere?’ Ọ tụgharịrị uche na ọ ghaghị ịbụ na Jisọs kpegaara onye ka ya onwe ya elu ekpere, o chekwara banyere aha Onye a.
O jere leta Chọọchị Orthodox nke Russia. Otú ọ dị, n’okpukpe ahụ ọ chọtaghị azịza nye ajụjụ ya nile. N’ịbụ onye na-enweghị afọ ojuju, ọ gara otu chọọchị Protestant ma ọzọkwa ọ chọtaghị azịza ndị doro anya. N’amaghị ebe ọzọ ọ ga-aga, Valentina malitere ịgụ Bible, na-agbalị ịchọta azịza n’onwe ya—ma o nweghị isi. O kpere ekpere maka enyemaka.
Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ụzọ ya. Ha gosiri ya site na Bible na aha Chineke bụ Jehova. N’ikpeazụ, ọ mụtara onye Jisọs kpegaara ekpere! Ọ malitere isoro Ndịàmà na-amụ Bible mgbe nile. Ọtụtụ mgbe ọ na-amụ anya abalị nile na-agụ akwụkwọ ndị Watch Tower Society bipụtara ma na-achọta akụkụ Bible dị iche iche. N’oge na-adịghị anya Valentina kwubiri na ya achọtawo eziokwu ahụ. N’ime ọnwa atọ ọ malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa, ọnwa abụọ kwa mgbe nke ahụ gasịrị, e mere ya baptism. A kwụghachiri ọchịchọ o ji ekpere chọọ eziokwu ụgwọ.
▪ Otu Onyeàmà ji bọs mee njem iji mee nkwusa n’ógbè dịpụrụ adịpụ. N’oge njem ahụ ọ gwara otu nwa agbọghọ okwu banyere nkwa nile nke Bible, ma nwa agbọghọ ahụ enweghị mmasị. Ọnwa abụọ n’ihu Onyeàmà ahụ mere njem nke abụọ gaa n’otu ebe ahụ iji kwuo okwu ihu ọha. Mgbe o kwusịrị okwu ahụ, o jekwuuru otu onye ọbịa ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ dịwo onye gwawororị gị okwu banyere ozi ọma sitere na Bible?” Nwoke ahụ zara, sị, “Ee, ị gwawo m.” Onyeàmà ahụ chere na o ji ya n’egwuregwu. Ma nwa okorobịa ahụ kọwara na ọnwa abụọ gara aga ọ nụpeere mkparịta ụka n’etiti Onyeàmà ahụ na nwa agbọghọ ahụ, n’oge njem bọs ahụ. “Achọrọ m ịmatakwu ihe, ma ị pụrụ na bọs, m chere na m gaghị ahụ Ndịàmà Jehova ọzọ. Mgbe ahụ, n’ebe m na-arụ ọrụ ezutere m otu nwoke so Ndịàmà na-amụ Bible. Leenụ m!”
Nwoke ahụ na nwunye ya malitere ịmụ Bible. Mgbe mkpirikpi oge gasịrị, ọ pụrụ ịhụ na ọrụ ya megidere ụkpụrụ Bible. N’ịchọ ịnọgide na-enwe ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ, ọ gbanwere ọrụ ya. Ugbu a ọ na-agwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke n’ohere ọ bụla. Nwunye ya na-agakwa n’ihu n’ọmụmụ ọ na-amụ Bible.
Ndịàmà Jehova nọ n’ókèala ahụ buru ibu nke Russia nwere obi ụtọ ikere òkè n’ịgwa ndị nile obi ha ziri ezi, sị: “Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.