Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/15 p. 2-7
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị E Ji Mkpụrụ Ha Mara
  • Mkpa Maka Ịkpachara Anya
  • Nyochaa Mkpụrụ Ya
  • Oge Ime Ihe Pụtara Ìhè
  • Ofufe Chineke Na-anakwere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
    A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!
  • Ị̀ Chọtawo Ezi Okpukpe Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/15 p. 2-7

Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?

Ì chere na okpukpe nile na-amasị Chineke? Ikekwe ụdị ofufe ọ bụla ị maara na-agba ume inwe ezi àgwà, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ. Ma nke ahụ ò zuru ezu iji masị Chineke?

ỤFỌDỤ na-ekwu, sị, ‘Nanị nwee obi ziri ezi n’ofufe gị, ọ ga-amasịkwa Chineke. E nwere akụkụ dị mma n’okpukpe nile.’ Dị ka ihe atụ, Okpukpe Bahai ewerewo echiche a ruo n’ókè nke iwebata okpukpe itoolu bụ isi n’ụwa ná nkwenkwe ya. Òtù okpukpe a kwenyere na okpukpe a nile sitechara n’aka Chineke ma bụrụ akụkụ dịgasị iche iche nke otu eziokwu. Olee otú nke a pụrụ isi dị otú a?

Ọzọkwa, i nweere onwe gị iche otú okpukpe pụrụ isi masị Chineke ebe ọ na-enye ndị òtù ya iwu ịgbanye gas na-akpaghasị ịrụ ọrụ nke akwara n’ebe ọha na eze na-anọ, nke nwere ike igbu ọtụtụ ndị. E bowo otu òtù okpukpe nọ na Japan ebubo ime nke ahụ. Ka Chineke ọ̀ ga-enwe mmasị n’okpukpe nke na-eme ka ndị òtù ya gbuo onwe ha? Afọ ole na ole gara aga, nke ahụ mere ndị na-eso ụzọ onye ndú okpukpe bụ́ Jim Jones.

N’ileghachi anya azụ n’oge gboo, anyị pụrụ nnọọ ịjụ, sị, Okpukpe hà pụrụ ịmasị Chineke ebe ha na-akpasu ibu agha, dị ka ọ dị n’Agha Iri Afọ Atọ ahụ, nke a lụrụ malite na 1618 ruo 1648? Dị ka akwụkwọ The Universal History of the World si kwuo, agha okpukpe ahụ ndị Katọlik na ndị Protestant lụrụ bụ “otu n’ime agha kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke Europe.”

Agha Ntụte dị iche iche nke okpukpe malite na narị afọ nke 11 ruo nke 13 rụpụtakwara oké mwụfu ọbara. N’Agha Ntụte mbụ, dị ka ihe atụ, ndị kpọrọ onwe ha ndị agha ntụte ndị Kraịst ji obi ọjọọ gbuo ndị Alakụba na ndị Juu bi na Jerusalem.

Tụleekwa ihe mere n’oge Njụta Okwukwe, nke malitere na narị afọ nke 13 ma dịruo ihe dị ka afọ 600. E mekpọrọ ọtụtụ puku ọnụ ma gbaa ha ọkụ n’iwu nke ndị ndú okpukpe. N’akwụkwọ ya bụ́ Vicars of Christ—The Dark Side of the Papacy, Peter De Rosa na-ekwu, sị: “N’aha popu, [ndị njụta okwukwe ahụ] bụ ndị hụrụ maka ogbugbu kasị njọ na nke were ogologo oge e gburu àgwà ọma nke ụmụ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme banyere [ụmụ] mmadụ.” Banyere onye njụta okwukwe so n’òtù Dominic bụ́ Torquemada nke Spain, De Rosa na-ekwu, sị: “N’ịbụ onye a họpụtara na 1483, ọ chịrị ọchịchị aka ike ruo afọ iri na ise. Ọnụ ọgụgụ ndị o gburu karịrị 114,000 nke 10,220 n’ime ha bụ ndị a gbara ọkụ.”

N’ezie, okpukpe nile nke Krisendọm abụghị ha bụ nanị ndị ikpe ọbara mara. N’akwụkwọ ya bụ́ Pensées, onye France bụ ọkà ihe ọmụma bụ́ Blaise Pascal kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ n’ụzọ zuru ezu na n’obi ụtọ dị ka mgbe ha na-eme ya ná nkwenkwe nke okpukpe.”

Ndị E Ji Mkpụrụ Ha Mara

N’ụzọ Chineke si ele ihe anya, ịnakwere okpukpe adabereghị nanị n’otu ihe. Ka okpukpe wee bụrụ nke ọ na-anakwere, nkụzi ya na ihe omume ya aghaghị ikwekọ n’Okwu ya e dere ede nke eziokwu, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 119:160; Jọn 17:17) Mkpụrụ nke ofufe Chineke na-anabata na-amịpụta aghaghị ikwekọ n’ụkpụrụ Jehova Chineke.

N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst gosiri na a ga-enwe ndị amụma ndị na-azọrọ n’ụzọ ụgha na ha na-anọchite anya Chineke. Jisọs kwuru, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. Mmadụ [ọ̀] na-ekpokọpụta mkpụrụ vine n’ogwu, ma ọ bụ fig n’uké? Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma. A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ. Ya mere unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:15-20) Okwu ndị a na-egosi mkpa ọ dị anyị ịnọ na nche n’ụzọ ime mmụọ. Anyị pụrụ iche na Chineke na Kraịst na-anakwere otu onye ndú ma ọ bụ òtù okpukpe, ma anyị pụrụ ihie ụzọ.

Mkpa Maka Ịkpachara Anya

N’agbanyeghị na okpukpe na-azọrọ inwe nnwapụta Chineke, ndị ụkọchukwu ya ana-agụkwa amaokwu ụfọdụ site na Bible, nke ahụ apụtaghị na ọ bụ ụdị ofufe na-amasị Chineke. Ndị ndú ya pụrụ ọbụna ime ihe ndị dị ebube ndị na-eme ka o yie ka Chineke o ji ha arụ ọrụ. Ka o sina dị, okpukpe ahụ ka pụrụ ịbụ nke ụgha, ghara ịdị na-amịpụta mkpụrụ Chineke na-anakwere. Ndị odeakwụkwọ dị nsọ nke Ijipt n’oge Mosis nwere ike ime ihe ndị dị ebube, ma n’ezie ha enweghị nnwapụta Chineke.—Ọpụpụ 7:8-22.

Taa dị ka ọ dị n’oge gara aga, ọtụtụ okpukpe na-akwalite echiche na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ kama ịrapara n’ihe Chineke kwuru ịbụ eziokwu. Mgbe ahụ, ịdọ aka ná ntị ahụ nke Bible kwesịrị ekwesị karịsịa: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

Mgbe o kwusịrị okwu banyere mkpụrụ ọma na nke ọjọọ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha Gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ànyị ejighịkwa aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.

Nyochaa Mkpụrụ Ya

Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọ dị mkpa ile anya ná mkpụrụ nke okpukpe na-amịpụta tupu e kwubie na Chineke na-anakwere ya. Dị ka ihe atụ, okpukpe ahụ ọ̀ na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Mgbe ahụ rịba okwu ndị a ama, ndị e dekọrọ na Jemes 4:4: “Onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.” Ọzọkwa, Jisọs kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Okpukpe nke dị mma n’anya Chineke adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a, bụ́ nke “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” mmụọ ahụ e kere eke nke a na-adịghị ahụ anya bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Kama nke ahụ, okpukpe Chineke na-anwapụta na-eji iguzosi ike n’ihe akwado Alaeze ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst ma na-ekwusa ozi ọma banyere ọchịchị eluigwe ahụ.—Mak 13:10.

Chineke ọ̀ na-anakwere okpukpe ma ọ bụrụ na ọ na-akwado inupụrụ ọchịchị isi? Azịza ya doro anya ma ọ bụrụ na anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, ka ha na-ekwenye ekwenye, ka ha bụrụ ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (Taịtọs 3:1) N’ezie, Jisọs gosiri na ndị na-eso ụzọ ya gaje ‘inyeghachi Siza ihe nke Siza, nyeghachikwa Chineke ihe nke Chineke.’—Mak 12:17.

Ọ bụrụkwanụ na okpukpe na-agba ume ikere òkè n’agha nke mba dị iche iche. Pita nke Mbụ 3:11 na-agba anyị ume ka anyị “mee ezi ihe” ma “chọọ udo, gbasookwa ya.” Olee otú okpukpe pụrụ isi masị Chineke ma ọ bụrụ na ndị òtù ya dị njikere igbu ndị ibe ha na-efe ofufe nọ ná mba ọzọ n’agha? Ndị so n’okpukpe nke nwere nnwapụta Chineke na-egosipụta àgwà ya bụ́ isi—ịhụnanya. Jisọs kwukwara, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ịhụnanya ahụ enweghị ihe ọ bụla jikọrọ ya na ajọ ịkpọasị ndị a na-akpasu n’agha nke mba dị iche iche.

Ezi okpukpe na-agbanwe ndị nwere àgwà ịlụ agha gaa n’ịbụ ndị hụrụ udo n’anya. E buru nke a n’amụma n’okwu ndị a: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma oge, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Kama ịgbọpụta okwu ịkpọasị, ndị na-efe ezi ofufe na-erube isi n’iwu ahụ bụ́: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:39.

Ndị na-ekpe ezi okpukpe na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova Chineke, na-ajụ ịnakwere ndụ omume rụrụ arụ. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ma ọ̀ bụ unu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndi na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

Oge Ime Ihe Pụtara Ìhè

Ọ dị mkpa ịghọta ọdịiche dị n’ofufe ụgha na ezi okpukpe. N’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, a kọwara alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dị ka “Babilọn Ukwu ahụ,” nwanyị ihe atụ na-akwa iko “onye ya na ndị eze ụwa kwara iko.” Ikpe ọbara mara ya, o jikwa iko ọlaedo nke “jupụtara n’ihe arụ, bụ́ ihe nile na-adịghị ọcha nke ịkwa iko ya.” (Mkpughe 17:1-6) Ọ dịghị ihe ọ bụla banyere ya nke Chineke na-anakwere.

Ugbu a bụ oge ime ihe pụtara ìhè. Nye ndị obi ha ziri ezi ka nọ n’ime Babilọn Ukwu ahụ, Onye Okike anyị na-ahụ n’anya na-ezipụ ịkpọ òkù a: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”—Mkpughe 18:4.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ikpe okpukpe nke na-amasị Chineke, gịnị ma ị matakwuo Ndịàmà Jehova nke ọma karị? Chaatị na-esonụ depụtara ụfọdụ n’ime nkweta ha, tinyere ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ kpatara ndị a. Nyochaa Bible gị iji hụ ma nkweta nke Ndịàmà ò kwekọrọ n’Okwu Chineke. Mee nchọpụta iji hụ ma okpukpe ha ọ̀ na-amịpụta ụdị mkpụrụ ị ga-atụ anya ya site n’aka ezi ofufe. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ na-eme otú a, ọ ghaghị ịbụ na ị chọtawo okpukpe nke na-amasị Chineke.

[Igbe dị na peeji nke 5]

IHE NDỊÀMÀ JEHOVA KWERE NA YA

NKWETA NDABERE BIBLE

Aha Chineke bụ Jehova Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 83:18

Bible bụ Okwu Chineke Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17

Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke Matiu 3:16, 17; Jọn 14:28

Ihe a kpọrọ mmadụ arịpụtaghị Jenesis 1:27; 2:7

arịpụta kama e kere ha eke

Ọnwụ mmadụ bụ n’ihi mmehie nke Ndị Rom 5:12

mmadụ mbụ

Mkpụrụ obi na-akwụsị ịdị mgbe Eklisiastis 9:5, 10;

mmadụ nwụrụ Ezikiel 18:4

Hel bụ ili nke ihe a kpọrọ mmadụ Job 14:13; Mkpughe 20:13,

King James Version

Mbilite n’ọnwụ bụ olileanya Jọn 5:28, 29; 11:25;

dịịrị ndị nwụrụ anwụ Ọrụ 24:15

Kraịst nyere ndụ elu ala ya Matiu 20:28; 1 Pita 2:24;

dị ka ihe mgbapụta 1 Jọn 2:1, 2

maka ụmụ mmadụ na-erube isi

Nanị Jehova ka a ga-ekpegara Matiu 6:9; Jọn 14:6, 13, 14

ekpere site na Kraịst

A ghaghị irube isi n’iwu Bible 1 Ndị Kọrint 6:9, 10

banyere omume

A gaghị eji ihe oyiyi fee ofufe Ọpụpụ 20:4-6;

1 Ndị Kọrint 10:14

A ghaghị izere mgbaasị Deuterọnọmi 18:10-12;

Ndị Galetia 5:19-21

A gaghị eweba ọbara n’ime Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:28, 29

ahụ mmadụ

Ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Jọn 15:19; 17:16;

na-anọpụ iche n’ụwa Jemes 1:27; 4:4

Ndị Kraịst na-agba àmà, Aịsaịa 43:10-12;

na-ekwusa ozi ọma Matiu 24:14; 28:19, 20

Baptism site ná mmikpu Mak 1:9, 10; Jọn 3:22;

kpam kpam n’ime mmiri Ọrụ 19:4, 5

na-egosi nrara nye Chineke

Akwụkwọ Nsọ akwadoghị Job 32:21, 22; Matiu 23:8-12

utu aha okpukpe

Anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ” Daniel 12:4; Matiu 24:3-14;

2 Timoti 3:1-5

Ọnụnọ Kraịst bụ nke Matiu 24:3; Jọn 14:19;

a na-adịghị ahụ anya 1 Pita 3:18

Setan bụ onye ọchịchị Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19

a na-adịghị ahụ anya nke ụwa a

Chineke ga-ebibi ajọ usoro ihe Daniel 2:44;

dị ugbu a Mkpughe 16:14, 16; 18:1-8

Alaeze Chineke n’okpuru Aịsaịa 9:6, 7;

Kraịst ga-achị ụwa n’ezi omume Daniel 7:13, 14; Matiu 6:10

“Igwe atụrụ nta” ga-eso Luk 12:32;

Kraịst chịa n’eluigwe Mkpughe 14:1-4; 20:4

Ndị ọzọ Chineke nwapụtara Luk 23:43; Jọn 3:16;

ga-anata ndụ agwụghị Mkpughe 21:1-4

agwụ n’elu ala paradaịs

[Foto dị na peeji nke 4]

E gburu ọtụtụ puku n’oge Njụta Okwukwe

[Foto dị na peeji nke 6]

Agha Ntụte ndị ahụ rụpụtara ajọ mwụfu ọbara

[Foto dị na peeji nke 7]

A na-eji ezi mkpụrụ ya amata ezi okpukpe

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 2]

Ihu akwụkwọ: Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya