Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/15 p. 8-9
  • Pita Emee Nkwusa na Pentikọst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Pita Emee Nkwusa na Pentikọst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Ọ Bụla Na-anụ Asụsụ nke Aka Ya
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • ‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Gịnị Bụ “Mkpịsị Ugodi nke Alaeze”?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Jizọs Kụziiri Ya Ihe Bụ́ Ịgbaghara Mmadụ Mmehie
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Kwụsiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/15 p. 8-9

Ha Mere Uche Jehova

Pita Emee Nkwusa na Pentikọst

ỌBỤ ụtụtụ dị jụụ n’oge opupu ihe ubi n’afọ 33 O.A. Ebe nile jupụtara n’obi ụtọ! Ìgwè mmadụ na-ekwo ekwo nke ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu jupụtara n’okporo ámá Jerusalem. Ha si ebe ndị dị ka Ilam, Mesọpọtamia, Kapadọsia, Ijipt, na Rom wee bịa. Lee ka o si bụrụ ihe na-adọrọ mmasị ịhụ ka ha yi uwe ọdịnala ha na ịnụ asụsụ ha dịgasị iche iche! Ụfọdụ ejewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku kilomita abụọ iji nọrọ maka ememe a pụrụ iche. Gịnị ka ọ bụ? Pentikọst—ememe ndị Juu na-enye ọṅụ nke na-eweta owuwe ihe ubi ọkà barley ná ngwụsị.—Levitikọs 23:15-21.

Anwụrụ ọkụ si n’onyinye ndị dị n’elu ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ na-akwụpụ, ndị Livaị na-abụkwa abụ Halel ahụ (Abụ Ọma 113 ruo 118). Kpọmkwem tupu elekere 9:00 n’ụtụtụ, otu ihe na-atụ n’anya mere. Site n’eluigwe, “ụzụ, dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike” dara. O jupụtara ụlọ ahụ dum bụ ebe ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 nke Jisọs Kraịst gbakọrọ. Ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu, sị: “E wee mee ka ha hụ ire, dị ka nke ọkụ, na-ekesa onwe ha; o wee nọkwasị ha nile n’otu n’otu. Ha nile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.”—Ọrụ 2:1-4.

Onye Ọ Bụla Na-anụ Asụsụ nke Aka Ya

N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ si n’ụlọ ahụ na-apụta. N’ụzọ na-eju anya, ha pụrụ ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke ìgwè mmadụ ahụ! Cheedị otú o si bụrụ ihe ijuanya mgbe onye ọbịa si Peasia na onye Ijipt nụrụ ka ndị Galili na-asụ asụsụ ha. N’ụzọ kwere nghọta, ìgwè mmadụ ahụ nwere oké ihe ijuanya. “Isi ihe a bụ gịnị?” ka ha jụrụ. Ụfọdụ malitere ime ndị ahụ na-eso ụzọ akaje, na-asị: “Ha ṅụjuworo mmanya vine ọhụrụ afọ.”—Ọrụ 2:12, 13.

Pita onyeozi biliziri ọtọ wee gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu. Ọ kọwara na onyinye ọrụ ebube a nke asụsụ dị iche iche bụ ná mmezu nke nkwa Chineke kwere site n’ọnụ Joel onye amụma: “M ga-awụsa ụfọdụ n’ime Mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ.” (Ọrụ 2:14-21; Joel 2:28-32) Ee, Chineke ka wụsasịrị mmụọ nsọ ya n’ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs. Nke a bụ ihe àmà doro anya na e mewo ka Jisọs si n’ọnwụ bilie ma nọrọ ugbu a n’eluigwe n’aka nri Chineke. “Ya mere,” ka Pita kwuru, “ka ụlọ Israel nile mazuo, na Chineke mere Ya ka Ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst anyị, bụ́ Jisọs ahụ Onye unu onwe unu [kpọgburu, NW].”—Ọrụ 2:22-36.

Olee otú ndị na-ege ya ntị si meghachi omume? “E wee dụọ ha n’ime obi ha,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “ha wee sị Pita na ndị ozi fọdụrụ, Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme?” Pita zara, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu.” Ihe dị ka mmadụ 3,000 mere nnọọ nke ahụ! Ka e mesịrị, “ha wee na-anọgidesi ike n’ozizi ndị ozi.”—Ọrụ 2:37-42.

Site n’ibute ụzọ n’oge a dị ịrịba ama, Pita jiri nke mbụ n’ime “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe” ahụ Jisọs kwere nkwa inye ya mee ihe. (Matiu 16:19) Mkpịsị ugodi ndị a megheere ìgwè mmadụ dị iche iche ohere ndị pụrụ iche. Mkpịsị ugodi nke mbụ a mere ka o kwe ndị Juu omume ịghọ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ka e mesịrị, mkpịsị ugodi nke abụọ na nke atọ mere ka otu ohere a dịịrị ndị Sameria na ndị Jentaịl n’otu n’otu.—Ọrụ 8:14-17; 10:44-48.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Ọ bụ ezie na ìgwè ndị Juu a na ndị na-eso ụzọ ndị Juu nwere ibu ọrụ e nwekọrọ ọnụ maka ọnwụ nke Ọkpara Chineke, Pita ji nkwanye ùgwù gwa ha okwu, na-akpọ ha “ụmụnna.” (Ọrụ 2:29) Nzube ya bụ ịkpali ha inwe nchegharị, ọ bụghị ịma ha ikpe. Ya mere, ụzọ o si gwa ha okwu dị mma. O kwuru ihe ndị mere eme ma jiri nhota ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ kwadoo isi ihe ọ na-ekwu.

Ndị na-ekwusa ozi ọma taa ga-eme nke ọma ịgbaso ihe nlereanya Pita. Ha kwesịrị ịgbalị iguzobe otu ihe nke ha na ndị na-ege ha ntị kwekọrịtara na ya wee jirizie akọ soro ha tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe a kọwara eziokwu Bible n’ụzọ dị mma, ndị obi ha ziri ezi ga-azaghachi.—Ọrụ 13:48.

Ịnụ ọkụ n’obi na nkwuwa okwu Pita n’ụbọchị Pentikọst adịtụghị ka ngọnarị ọ gọnarịrị Jisọs ihe dị ka izu asaa tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ ụjọ mmadụ jikpara Pita. (Matiu 26:69-75) Ma Jisọs arịọworị arịrịọ n’ihi Pita. (Luk 22:31, 32) N’enweghị obi abụọ, ngosi Jisọs gosiri Pita onwe ya ka mbilite n’ọnwụ ya gasịrị wusiri onyeozi ahụ ike. (1 Ndị Kọrint 15:5) N’ihi ya, okwukwe Pita adaghị. N’oge na-adịghị anya, o ji nkwuwa okwu na-eme nkwusa. Ya mere, o mere nkwusa ọ bụghị nanị na Pentikọst kama ná ndụ ya nile fọrọ afọ.

Gịnị ma ọ bụrụ na anyị emehiewo n’ụzọ ụfọdụ, ọbụna dị ka Pita mehiere? Ka anyị gosipụta nchegharị, kpee ekpere maka mgbaghara, ma mee ihe iji nweta enyemaka ime mmụọ. (Jemes 5:14-16) Mgbe ahụ anyị pụrụ ịga n’ihu na-enwe obi ike na ozi anyị dị nsọ bụ nke Nna anyị nke eluigwe na-eme ebere, bụ́ Jehova, na-anakwere.—Ọpụpụ 34.6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya