Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/1 p. 14-19
  • Ile Ọbịa Ndị Kraịst n’Ụwa Kewasịrị Ekewasị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ile Ọbịa Ndị Kraịst n’Ụwa Kewasịrị Ekewasị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ileta Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ”
  • È Nwere Ndị Si Mba Ọzọ Nọ n’Etiti Anyị?
  • Soro Ndị Nsọ Kerịta Ihe
  • N’oge Ndị Pụrụ Iche
  • ‘Na-ele Ọbịa n’Atamughị Ntamu’
  • Ile Ọbịa Bụ Ihe Na-eme Obi Ụtọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • “Na-agbasonụ Ọrụ Ile Ndị Ọbịa Anya nke Ọma”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Na-elenụ Ibe Unu Ọbịa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Na-elekọtanụ Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/1 p. 14-19

Ile Ọbịa Ndị Kraịst n’Ụwa Kewasịrị Ekewasị

“Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.”—3 JỌN 8.

1. Onyinye ndị dị aṅaa a na-achọsi ike karịsịa ka Onye Okike nyeworo mmadụ?

“ỌDỊGHỊ ezi ihe mmadụ nwere n’okpuru anyanwụ ma ọ bụghị iri ihe, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nke ahụ ga-arapara n’ahụ ya n’ime ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ụbọchị nile nke ndụ ya nke Chineke nyeworo ya n’okpuru anyanwụ.” (Eklisiastis 8:15) Site n’okwu ndị ahụ onye mkpọkọta oge ochie bụ́ onye Hibru na-agwa anyị na Jehova Chineke abụghị nanị na ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ o kere nwee ọṅụ na obi ụtọ kamakwa ọ na-enye ha ihe ha ga-eji nwee ya. N’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ otu ọchịchọ e nwere n’etiti ndị mmadụ n’ebe nile yiri ka ọ bụ ịṅụrị ọṅụ na ikpori ndụ.

2. (a) Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ siworo mebie ihe Jehova zubere maka ha? (b) Gịnị ka ọ rụpụtara?

2 Taa anyị na-ebi n’ọha mmadụ nke na-achọ ihe ụtọ ebe ihe riri ndị mmadụ isi bụ nchụso ihe ụtọ na mkpori ndụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ aghọọla “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya,” dị ka Bible buru n’amụma. (2 Timoti 3:1-4) N’ezie, nke a bụ ajọ nhịgharị nke ihe Jehova Chineke zubere. Mgbe nchụso nke mkpori ndụ ghọrọ ihe mgbaru ọsọ bụ isi, ma ọ bụ mgbe imejụ ọchịchọ onwe onye ghọrọ nzube bụ isi, a dịghị enwe ezi afọ ojuju, ‘ihe nile na-aghọkwa ihe efu na ịchọ ijide ifufe.’ (Eklisiastis 1:14; 2:11) N’ihi nke a ụwa jupụtara ná ndị owu na-ama na ndị ike ụwa gwụrụ, bụ́ nke na-eduje, n’aka nke ọzọ, n’ọtụtụ n’ime nsogbu dị n’ọha mmadụ. (Ilu 18:1) Ndị mmadụ na-amalite inyo ibe ha enyo, ma ghọọ ndị e kewasịrị n’ihi agbụrụ, ebo, ọkwá, na ọnọdụ akụ̀ na ụba.

3. Ànyị pụrụ isi aṅaa chọta ezi ọṅụ na afọ ojuju?

3 Lee otú ihe ga-esi dị iche ma ndị mmadụ ṅomie ụzọ Jehova si emeso ndị ọzọ—inwe obiọma, mmesapụ aka, ile ọbịa! O mere ka o doo anya na isi ihe dị n’inweta ezi obi ụtọ abụghị anyị ịgbalị imejụ ọchịchọ anyị. Kama nke ahụ, lee isi ihe dị na ya: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Iji nweta ezi ọṅụ na afọ ojuju, anyị aghaghị imeri ihe mgbochi na nkewa ndị pụrụ ijikpa anyị. Anyị aghaghịkwa irute ndị anyị na ha na-ejere Jehova ozi. Ọ dị mkpa ka anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ bụ́: “Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” (3 Jọn 8) Ile ndị ruru eru ọbịa, ruo n’ókè ọnọdụ anyị kwere bara uru n’ụzọ abụọ—ọ na-abara ma ndị na-ele ma ndị a na-ele ya uru. Mgbe ahụ, olee ndị so ná ndị ruru eru ndị anyị kwesịrị “ịkpọbata”?

“Ileta Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ”

4. Mgbanwe dị aṅaa ná mmekọrịta ezinụlọ ka a na-ahụ ọbụna n’etiti ụfọdụ ndị Jehova?

4 Ezinụlọ ndị siri ike na alụmdi na nwunye obi ụtọ dị na ha dị ụkọ taa. Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm na-arị elu na ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị nne na-alụghị di gburugburu ụwa agbanwewo ezinụlọ ọdịnala kpam kpam. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ghọworo Ndịàmà Jehova n’afọ ndị na-adịbeghị anya si n’ezinụlọ ndị kewara ekewa. Ha bụ ndị ha na ndị òtù ọlụlụ ha gbara alụkwaghịm ma ọ bụ kewaa, ma ọ bụ ha bi n’ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Tụkwasị, dị ka Jisọs buru n’amụma, eziokwu ahụ ọ kụziri arụpụtawo nkewa n’ọtụtụ ezinụlọ.—Matiu 10:34-37; Luk 12:51-53.

5. Gịnị ka Jisọs kwuru nke pụrụ ịbụ isi iyi nke agbamume nye ndị nọ n’ezinụlọ kewara ekewa?

5 Ọ na-eme anyị obi ụtọ ịhụ ka ndị ọhụrụ na-ewere nguzo siri ike maka eziokwu ahụ, anyị na-ejikarịkwa nkwa Jisọs na-agba ume akasi ha obi: “N’ezie asị m unu, Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.

6. Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ‘ụmụnne ndị ikom, ụmụnne ndị inyom, nne, na ụmụ’ nye “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ” nọ n’etiti anyị?

6 Otú ọ dị, olee ndị bụ ‘ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ’ a? Nanị ịhụ ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọtụtụ mgbe otu narị ma ọ bụ karị, bụ́ ndị na-akpọ onwe ha ụmụnna nwoke na nwanyị adịghị eme ozugbo ka mmadụ nwee mmetụta na ndị a bụ ụmụnne ya ndị ikom, ndị inyom, nne, na ụmụ. Tụlee isi ihe a: Jemes onye na-eso ụzọ na-echetara anyị na ka ofufe anyị wee bụrụ nke Jehova na-anakwere, anyị aghaghị ‘ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe anyị n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.’ (Jemes 1:27) Nke ahụ pụtara na anyị agaghị ekwe ka omume ụwa nke nganga akụ̀ na ụba na nkarị nke ọkwá mechie ọnụ ụzọ nke ọmịiko anyị n’ebe “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ” dị otú ahụ nọ. Kama nke ahụ anyị aghaghị ibute ụzọ n’ịgbatịpụrụ ha mkpakọrịta na ile ọbịa anyị.

7. (a) Gịnị bụ n’ezie nzube nke ile “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ” ọbịa? (b) Olee ndị pụkwara ikere òkè n’igosi ile ọbịa ndị Kraịst?

7 Ile “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ” ọbịa adịghị agụnye mgbe nile imeju ihe ndị pụrụ ịkọ ha n’ụzọ ihe onwunwe. Ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ndị kewara ekewa n’ụzọ okpukpe anọchaghị ná mkpa ego. Otú ọ dị, mkpakọrịta ọma ahụ, ọnọdụ dị n’ezinụlọ, iso ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche nọkọọ, na ikerịta ihe ime mmụọ ndị dị mma—ndị a bụcha akụkụ dị oké ọnụ ahịa nke ndụ. Ya mere, icheta na ọ bụghị ịdị ukwuu nke oge ahụ, kama mmụọ ịhụnanya na ịdị n’otu bụ ihe dị mkpa, lee ka o si dị mma na, mgbe ụfọdụ, ọbụna “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ” pụrụ ikere òkè n’ile ndị Kraịst ibe ha ọbịa!—Tụlee 1 Ndị Eze 17:8-16.

È Nwere Ndị Si Mba Ọzọ Nọ n’Etiti Anyị?

8. Mgbanwe dị aṅaa ka a na-ahụ n’ọtụtụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova?

8 Anyị bi n’oge oké nkwagharị nke ndị mmadụ. “Ihe karịrị nde 100 mmadụ gburugburu ụwa na-ebi ná mba ndị ha na-abụghị ụmụ amaala ha, a na-achụpụkwa nde 23 ná mba nke aka ha,” ka magazin bụ́ World Press Review na-ekwu. Ihe nke a rụpụtaworo kpọmkwem bụ na n’ọtụtụ ógbè, karịsịa n’obodo ukwu ndị ka buo ibu, ọgbakọ ndị Jehova ndị ihe ka ukwuu ná ndị mejupụtaburu ha bụ ndị si n’otu agbụrụ ma ọ bụ mba nweziri ndị si n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ikekwe nke a bụ eziokwu n’ebe ị nọ. Otú ọ dị, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị a bụ́ “ndị ala ọzọ” na “ndị si mba ọzọ,” dị ka ụwa pụrụ isi kpọọ ha anya, ndị asụsụ, omenala, na ụzọ ndụ ha pụrụ ịdị iche na nke anyị?

9. Ọnyà dị aṅaa siri ike pụrụ ịmata anyị n’ihe banyere otú anyị si ele “ndị ala ọzọ” na “ndị si mba ọzọ” na-abata n’ọgbakọ ndị Kraịst anya?

9 N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, anyị agaghị ekwe ka echiche ọ bụla nke ụjọ ndị a na-amabughị mee ka anyị chee na anyị katụ ruo eru inweta ihe ùgwù nke ịmara eziokwu ahụ karịa ndị si n’ala a na-amabughị ma ọ bụ nke a kpọrọ nke ndị ọgọ mmụọ; anyị ekwesịghịkwa ịdị na-eme ka ndị a bịara ọhụrụ hà na-awabata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ihe owuwu ndị ọzọ. Pọl onyeozi aghaghị ichetara ụfọdụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ, bụ́ ndị nwere echiche dị otú ahụ, na ọ dịghị onye ruru eru n’ezie; ọ bụ amara Chineke mere ka o kwe onye ọ bụla omume inweta nzọpụta. (Ndị Rom 3:9-12, 23, 24) Anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ na amara Chineke na-erute ọtụtụ mmadụ ugbu a bụ́ ndị, n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, abụrụwo ndị a napụrụ ohere nke ịnụ ozi ọma. (1 Timoti 2:4) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na mmasị anyị nwere maka ha bụ ezie?

10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele “ndị si mba ọzọ” nọ n’etiti anyị ọbịa n’ezie?

10 Anyị pụrụ ịgbaso ndụmọdụ Pọl: “Na-akpọbatanụ ibe unu, dị ka Kraịst anyị kpọtakwara unu, ka e wee nye Chineke otuto.” (Ndị Rom 15:7) N’ịmata na ndị si n’ala ma ọ bụ ná nzụlite ndị ọzọ na-abụkarị ndị ihe na-adabaraghị, anyị kwesịrị igosi ha obiọma na nchebara echiche mgbe ọ dị n’ike anyị ime otú ahụ. Anyị kwesịrị ịkpọbata ha n’etiti anyị, mesoo onye ọ bụla n’ime ha “dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ unu,” ‘hụkwa ya n’anya dị ka onwe gị.’ (Levitikọs 19:34) Nke a pụrụ isi ike ime, ma anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma anyị cheta ndụmọdụ bụ́: “Unu ekwela ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.

Soro Ndị Nsọ Kerịta Ihe

11, 12. Olee nchebara echiche pụrụ iche e nyere ndị ohu Jehova ụfọdụ (a) n’Israel oge ochie (b) na narị afọ mbụ?

11 Ndị so ná ndị ruru eru n’ezie inweta nchebara echiche na ile ọbịa anyị bụ ndị Kraịst tozuru okè ndị na-arụsi ọrụ ike maka ọdịmma ime mmụọ anyị. Jehova mere ndokwa ndị pụrụ iche maka ndị nchụàjà na ndị Livaị n’Israel oge ochie. (Ọnụ Ọgụgụ 18:25-29) Na narị afọ mbụ, a gbakwara ndị Kraịst ume ilekọta ndị jeere ha ozi n’ọkwá ndị pụrụ iche. Ihe ndekọ dị na 3 Jọn 5-8 na-enyetụ anyị nghọta nke nkekọ ịhụnanya siri ike dị n’etiti ndị Kraịst oge mbụ.

12 Jọn onyeozi ahụ meworo agadi jiri obiọma na ile ọbịa nke Gaịọs leworo ụmụnna ụfọdụ na-ejegharị ejegharị ndị e zijere ileta ọgbakọ ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu. Ụmụnna a—gụnyere Dimitrịọs, onye o yiri ka ọ bụ ya wegara akwụkwọ ozi ahụ—bụcha ndị a na-amabughị ma ọ bụ ndị Gaịọs na-amabughị. Ma a nabatara ha nke ọma n’ihi na ọ bụ “n’ihi Aha [Chineke] ka ha pụrụ.” Jọn si otú a tinye ya: “Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.”—3 Jọn 1, 7, 8.

13. Olee ndị n’etiti anyị taa ruru eru karịsịa ka a ‘kpọbata’ ha nke ọma?

13 Taa, n’ime nzukọ Jehova, e nwere ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ụzọ siri ike n’ihi òtù ụmụnna nile. Ndị a na-agụnye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị na-etinye oge na ume ha kwa izu n’iwuli ọgbakọ dị iche iche elu; ndị ozi ala ọzọ, ndị na-ahapụ ezinụlọ na ndị enyi iji mee nkwusa n’ala ndị ọzọ; ndị na-eje ozi n’ebe obibi Betel ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, ndị na-eje ozi ha n’afọ ofufo iji kwadoo ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ; na ndị nọ n’ozi ọsụ ụzọ, ndị na-etinye akụkụ ka ukwuu nke oge na ume ha n’ozi ubi. N’ụzọ bụ isi, ndị a nile na-arụsi ọrụ ike, ọ bụghị maka otuto ma ọ bụ uru onwe onye ọ bụla, kama n’ihi ịhụnanya maka òtù ụmụnna ndị Kraịst na maka Jehova. Ha ruru eru ka anyị ṅomie ha n’ihi nraranye ha sitere ná mkpụrụ obi dum, ha rukwara eru n’ezie ka a ‘kpọbata’ ha.

14. (a) Olee otú o si bụrụ na anyị na-aghọ ndị Kraịst ka mma mgbe anyị lere ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbịa? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na Meri họọrọ “ezi òkè ahụ”?

14 Mgbe anyị ‘kpọbatara mmadụ dị otú a,’ ka Jọn onyeozi mere ka ọ pụta ìhè, ‘anyị na-abụ ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.’ N’otu echiche anyị na-aghọ ndị Kraịst ka mma n’ihi ya. Nke a bụ n’ihi na ọrụ ndị Kraịst gụnyere imere ndị kwere ekwe ibe anyị ihe ọma. (Ilu 3:27, 28; 1 Jọn 3:18) E nwere nkwụghachi ụgwọ n’ụzọ ọzọkwa. Mgbe Meri na Mata kpọbatara Jisọs n’ụlọ ha, Mata chọrọ ịbụ ezi onye nlekọta site n’ịkwadebere Jisọs “ọtụtụ ihe.” Meri lere ya ọbịa n’ụzọ dị iche. Ọ “na-anọdụkwa ala n’ụkwụ ala Onyenwe anyị, wee nụrụ okwu Ya,” Jisọs jakwara ya mma maka ịhọrọ “ezi òkè ahụ.” (Luk 10:38-42) Iso ndị nwere ogologo afọ nke ahụmahụ nwee mkparịta ụka na nkwurịta okwu na-abụkarị ihe ndị na-apụta ìhè n’uhuruchi ndị e sooro ha nọkọọ.—Ndị Rom 1:11, 12.

N’oge Ndị Pụrụ Iche

15. Oge ndị dị aṅaa pụrụ iche pụrụ ịbụ oge obi ụtọ nye ndị Jehova?

15 Ọ bụ ezie na ezi ndị Kraịst adịghị agbaso omenala ndị a ma ama ma ọ bụ na-edebe ezumike na ememe ndị ụwa, e nwere oge mgbe ha na-abịakọta ọnụ ịnụ ụtọ nke mkpakọrịta ibe ha. Dị ka ihe atụ, Jisọs jere otu oriri ọlụlụ nwunye na Kena ma tụnye ụtụ n’ọṅụ nke oge ahụ site n’ịrụ ọrụ ebube ya mbụ n’ebe ahụ. (Jọn 2:1-11) N’otu aka ahụ taa, ndị Jehova na-enwekọ oge obi ụtọ ọnụ n’oge ndị pụrụ iche dị otú ahụ, ememe na ihe omume kwesịrị ekwesị na-etinyekwa ihe dị ukwuu n’ihe omume ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, gịnị kwesịrị ekwesị?

16. Olee ụkpụrụ nduzi ndị anyị nwere banyere àgwà kwesịrị ekwesị ọbụna maka oge ndị pụrụ iche?

16 Site n’ọmụmụ anyị na-amụ Bible, anyị na-amụta ihe bụ àgwà kwesịrị ekwesị maka ndị Kraịst, anyị na-agbasokwa nke a oge nile. (Ndị Rom 13:12-14; Ndị Galetia 5:19-21; Ndị Efesọs 5:3-5) Nnọkọ ntụrụndụ, ma ha bụ n’ihe metụtara agbamakwụkwọ ma ọ bụ n’ihi ihe ọ bụla ọzọ, adịghị enye anyị ohere ịhapụ ụkpụrụ ndị Kraịst anyị ma ọ bụ mee ihe anyị na-agaghị eme n’oge ndị ọzọ; iwu ejighịkwa anyị ịgbaso omenala nile dị n’ala anyị bi. Ọtụtụ n’ime ha dabeere n’omume na nkwenkwe okpukpe ụgha, ndị ọzọkwa na-agụnye àgwà ndị o doro anya na ndị Kraịst adịghị anabata.—1 Pita 4:3, 4.

17. (a) Olee ihe ndị na-egosi na a haziri ma lekọta oriri agbamakwụkwọ e mere na Kena nke ọma? (b) Gịnị na-egosi na Jisọs kwadoro ememe ahụ?

17 N’ịgụ Jọn 2:1-11, o sighịrị anyị ike ịhụ na ọ bụ ememe buru ibu, ọtụtụ ndị ọbịa nọkwa n’ebe ahụ. Otú ọ dị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bụ ndị ọbịa ‘a kpọrọ akpọ’; ha anọkataghị nnọọ tikabata, ọ bụ ezie na ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ikwu nke onye ahụ kpọrọ oriri ma eleghị anya. Anyị na-arịbakwa ama na e nwere “ndị na-eje ozi” tinyere “onye isi oriri,” bụ́ onye ga-enye ntụzi banyere ihe e bupụtara ma ọ bụ mee. Ihe a nile na-egosi na a haziri ma lekọta ihe omume ahụ nke ọma. Ihe ndekọ ahụ mechiri site n’ikwu na site n’ihe o mere n’oriri ahụ, Jisọs “wee mee ka ebube Ya pụta ìhè.” Ọ̀ gaara ahọrọwo oge ahụ iji mee ya a sị na ọ bụ oriri oké mkpọtụ, nke a na-achịkwaghị achịkwa? Obi abụọ adịghị ya na ọ gaghị eme ya.

18. Olee echiche siri ike a na-aghaghị ichebara nnọkọ ntụrụndụ ọ bụla?

18 Mgbe ahụ, gịnị banyere oriri ọ bụla pụrụ iche anyị pụrụ ịkpọ? Anyị chọrọ icheta na nzube nke iji ile ọbịa kpọbata ndị ọzọ bụ ka anyị wee nwee ike “bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” N’ihi ya, o zughị ezu ịkpọ otu ememe nnọkọ “Ndịàmà.” A pụrụ ịjụ ajụjụ bụ, Ọ̀ bụ àmà n’ezie banyere ndị anyị bụ na ihe anyị kwere? Anyị ekwesịghị ma ọlị ile oge ndị dị otú ahụ anya dị ka ohere nke ịhụ ókè anyị pụrụ iru n’ịma ụwa aka n’ajọ omume ya nile, n’itinye aka ‘n’agụụ ihe ọjọọ nke ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi.’ (1 Jọn 2:15, 16) Kama nke ahụ, oge ndị a aghaghị igosi n’ụzọ kwesịrị ekwesị ọrụ anyị dị ka Ndịàmà Jehova, anyị kwesịkwara ijide n’aka na ihe anyị na-eme na-ewetara Jehova otuto na nsọpụrụ.—Matiu 5:16; 1 Ndị Kọrint 10:31-33.

‘Na-ele Ọbịa n’Atamughị Ntamu’

19. Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ịdị ‘na-elerịta ibe anyị ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu’?

19 Ka ọnọdụ ụwa nọgidere na-adakpọ, a na-ekewakwukwa ndị mmadụ, ọ dị anyị mkpa ime ihe nile anyị pụrụ ime iji wusie nkekọ chiri anya nke dị n’etiti ezi ndị Kraịst ike. (Ndị Kọlọsi 3:14) Iji mee nke a, anyị aghaghị ‘ime ka ịhụnanya anyị na-ahụrịta onwe anyị dị ike,’ dị ka Pita gbara anyị ume. Mgbe ahụ, n’okwu ndị dị irè, o kwukwasịrị: “Na-elerịta onwe unu ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu.” (1 Pita 4:7-9) Ànyị dị njikere ibute ụzọ n’ile ụmụnna anyị ọbịa, ịdọgbu onwe anyị iji nwee obiọma ma nye aka? Ka ànyị na-atamu ntamu mgbe ụdị ohere ahụ bilitere? Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-emebi ọṅụ anyị pụrụ inweta ma na-atụfu ụgwọ ọrụ nke obi ụtọ maka ime ihe ọma.—Ilu 3:27; Ọrụ 20:35.

20. Olee ngọzi ndị na-echere anyị ma anyị na-ele ọbịa n’ime ụwa nke taa kewasịrị ekewasị?

20 Iso ndị Kraịst ibe anyị na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya, inwe obiọma na ilerịta ibe anyị ọbịa, ga-eweta ọtụtụ ngọzi. (Matiu 10:40-42) Nye ndị dị otú ahụ Jehova kwere nkwa na ya “ga-agbasakwa ụlọikwuu Ya n’isi ha. Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ.” Ịnọ n’ụlọikwuu Jehova bụ inweta nchebe na ile ọbịa ya. (Mkpughe 7:15, 16; Aịsaịa 25:6) Ee, olileanya nke inweta ile ọbịa Jehova ruo mgbe ebighị ebi dị nnọọ n’ihu.—Abụ Ọma 27:4; 61:3, 4.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị ka anyị na-agaghị eleghara anya ma anyị chọọ inweta ezi ọṅụ na afọ ojuju?

◻ Olee ndị bụ “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ,” anyị kwesịkwara isi aṅaa ‘lekọta’ ha?

◻ Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele “ndị ala ọzọ” na “ndị si mba ọzọ” nọ n’etiti anyị anya?

◻ Olee ndị ruru eru inweta nchebara echiche pụrụ iche taa?

◻ Olee otú oge ndị pụrụ iche kwesịrị isi gosipụta ezi mmụọ nke ile ọbịa?

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

N’oge ememe anyị pụrụ ile ndị si mba ọzọ, ụmụ mgbei, ndị nọ n’ozi oge nile, na ndị ọbịa ndị ọzọ ọbịa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya