Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka A Na-ebu Ọnụ?
IWU Chineke nke e nyere site n’aka Mosis chọrọ ka e buo ọnụ nanị n’otu oge—n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie mgbaafọ. Iwu ahụ nyere iwu na n’ụbọchị ahụ ụmụ Israel ‘ga-eweda mkpụrụ obi ha n’ala,’ bụ́ nke a ghọtara ịpụta na ha buru ọnụ. (Levitikọs 16:29-31; 23:27; Abụ Ọma 35:13) Otú ọ dị, ibu ọnụ a abụghị nanị iji mezuo iwu. Idebe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kpaliri ndị Israel ịmatakwu mmehie ha na mkpa maka mgbapụta. Ha buru ọnụ n’ụbọchị ahụ ijikwa gosipụta mwute ha maka mmehie ha na nchegharị n’ebe Chineke nọ.
Ọ bụ ezie na nke a bụ ibu ọnụ a na-aghaghị ime n’okpuru Iwu Mosis, ụmụ Israel buru ọnụ n’oge ndị ọzọ. (Ọpụpụ 34:28; 1 Samuel 7:6; 2 Ihe Emere 20:3; Ezra 8:21; Esta 4:3, 16) Ndị a gụnyere ibu ọnụ mmadụ ga-eji obi ya mee dị ka ụzọ isi gosipụta nchegharị. Jehova gbara dị Juda na-eme mmehie ume, sị: “Werenụ obi unu nile, werekwa obubu ọnụ, werekwa ịkwa ákwá, werekwa iti aka n’obi, chigharịkwute m.” Nke a agaghị abụ ihe ngosi elu ahụ, n’ihi na Chineke gara n’ihu na-ekwu, sị: “Dọwakwaanụ obi unu, adọwakwala uwe unu.”—Joel 2:12-15.
Mgbe e mesịrị, ọtụtụ buru ọnụ dị ka ihe ngosi e ji emezu iwu. Jehova kpọrọ obubu ọnụ dị otú ahụ na-esiteghị n’ezi obi asị̀, n’ihi ya kwa, jụọ ụmụ Israel nwere ihu abụọ, sị: “Ọ̀ bụ dị ka nke a ka obubu ọnụ nke M na-ahọpụta bụ? bụ́ ụbọchị mmadụ ga-eweda mkpụrụ obi ya n’ala? Ọ̀ bụ iruda isi ya n’ala dị ka amị̀, na ịgbasa ákwà mkpe na ntụ n’okpuru ya? ọ̀ bụ nke a ka ị ga-akpọ obubu ọnụ na ụbọchị na-atọ Jehova ụtọ?” (Aịsaịa 58:5) Kama ime ngosi nke ibu ọnụ ha, a gwara ndị a na-eme isi ike ka ha rụpụta ọrụ nke kwesịrị nchegharị.
Ụfọdụ obubu ọnụ nke ndị Juu guzobere nwetara nkatọ Chineke site ná mmalite. Dị ka ihe atụ, n’otu oge ndị Juda nwere obubu ọnụ anọ a na-eme kwa afọ iji cheta ihe omume ndị kpatara ọdachi nke e jikọrọ ya na ngechibido na mbibi Jerusalem na narị afọ nke asaa T.O.A. (2 Ndị Eze 25:1-4, 8, 9, 22-26; Zekaraịa 8:19) Mgbe a tọhapụsịrị ndị Juu ná ndọrọ n’agha na Babilọn, Jehova kwuru site n’ọnụ Zekaraịa onye amụma, sị: “Mgbe unu buru ọnụ . . . , ọbụna [afọ iri asaa] ndị a, ọ̀ bụ obubu ọnụ unu buru ma ọlị nye Mụ onwe m?” Chineke akwadoghị obubu ọnụ ndị a n’ihi na ndị Juu na-ebu ọnụ ma na-eru újú banyere ikpe ndị siteworo n’aka Jehova n’onwe ya. Ha na-ebu ọnụ n’ihi ọdachi nke dakwasịrị ha, ọ bụghị n’ihi ajọ omume ha nke dujere na ya. Mgbe e weghachisịrị ha n’ala ha, ọ bụ oge ha ga-aṅụrị ọṅụ kama iru oké újú banyere ihe gara aga.—Zekaraịa 7:5.
Ibu Ọnụ Ọ̀ Dịịrị Ndị Kraịst?
Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha buo ọnụ, ya na ụmụazụ ya buru ọnụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie n’ihi na ha nọ n’okpuru Iwu Mosis. Tụkwasị na nke a, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ji obi ha buo ọnụ n’oge ndị ọzọ, ebe ọ bụ na Jisọs agwaghị ha ka ha zere omume ahụ kpam kpam. (Ọrụ 13:2, 3; 14:23) Ma, ọ dịghị mgbe ha ‘ga-emebi ihu ha, ka ha were onwe ha gosi mmadụ na ha na-ebu ọnụ.’ (Matiu 6:16) Ngosi elu ahụ dị otú ahụ nke ime nsọ nsọ pụrụ ime ka ndị mmadụ jiri mmasị na-ekiri ha ma na-ekwe n’isi ná nkwado. Ka o sina dị, Chineke enweghị obi ụtọ n’ụdị ngosi ahụ.—Matiu 6:17, 18.
Jisọs kwukwara okwu banyere ụmụazụ ya ibu ọnụ n’oge ọnwụ ya. O sighị otú ahụ na-eguzobe obubu ọnụ ememe okpukpe. Kama nke ahụ, ọ nọ na-egosi mmeghachi omume nye iru újú dị ukwuu nke ha ga-enwe. Ozugbo a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ ga-anọnyekwara ha ọzọ, a gakwaghị enwe ihe dị otú ahụ mere ha ga-eji buo ọnụ.—Luk 5:34, 35.
Iwu Mosis gwụsịrị mgbe “e chere [Kraịst] n’ihu Chineke nanị otu mgbe iburu mmehie nile nke ọtụtụ mmadụ.” (Ndị Hibru 9:24-28) Mgbe Iwu ahụ gwụkwara, iwu ahụ e nyere ibu ọnụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie gwụsịrị. N’ụzọ dị otú a, e wepụrụ nanị obubu ọnụ a na-aghaghị ime nke e zoro aka na Bible.
Gịnị Banyere Lent?
Gịnịzi bụ ihe ndabere maka omume Krisendọm nke ibu ọnụ n’oge Lent? Ma chọọchị Katọlik ma nke Protestant matara Lent, ọ bụ ezie na ụzọ idebe ya dị iche site na chọọchị gaa na chọọchị. Ụfọdụ na-eri nanị otu nri n’ụbọchị n’oge na-ewe ụbọchị 40 zuru ezu na-ebute Ista ụzọ. Ndị ọzọ na-ebu ọnụ kpam kpam nanị na Ash Wednesday na Good Friday. Nye ụfọdụ, Lent chọrọ ịjụ ihe ndị e ji anụ, azụ̀, àkwá, na mmiri ara ehi mee.
E weere ya na Lent dabeere n’ụbọchị 40 Jisọs buru ọnụ mgbe e mesịrị ya baptism. Ọ̀ nọ mgbe ahụ na-eguzobe ememe okpukpe a ga-agbaso kwa afọ? Ọ dịghị ma ọlị. Nke a pụtara ìhè site n’eziokwu bụ na Bible edekọghị ụdị omume ahụ n’etiti ndị Kraịst oge mbụ. E debere Lent na nke mbụ ya na narị afọ nke anọ mgbe Kraịst nwụsịrị. Dị ka ọtụtụ ozizi ndị ọzọ nke Krisendọm, a gbazitere ya ndị na-ekpere arụsị.
Ọ bụrụ na Lent bụ iji ṅomie obubu ọnụ Jisọs buru n’ọzara mgbe e mesịrị ya baptism, n’ihi gịnị ka a na-eji eme ya n’izu ndị na-eduga n’Ista—nke e weere dị ka oge o bilitere n’ọnwụ? Jisọs ebughị ọnụ n’ụbọchị ndị bu ọnwụ ya ụzọ. Ihe ndekọ Oziọma ahụ na-egosi na ya na ndị na-eso ụzọ ya jere leta ebe obibi dị iche iche ma rie ihe oriri na Betani nanị ụbọchị ole na ole tupu ya anwụọ. O rikwara nri Ememe Ngabiga ahụ n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya.—Matiu 26:6, 7; Luk 22:15; Jọn 12:2.
Ọ dị ihe a ga-amụta site n’obubu ọnụ Jisọs mgbe e mesịrị ya baptism. Ọ na-amalite ozi dị oké mkpa. O metụtara iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ọdịnihu nke agbụrụ mmadụ nile. Nke a bụ oge ntụgharị uche dị omimi na maka iji ekpere chigharịkwuru Jehova maka enyemaka na nduzi. N’oge a Jisọs buru ọnụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nke a na-egosi na ibu ọnụ pụrụ ịba uru mgbe e ji ezi ebumnobi mee ya nakwa n’oge kwesịrị ekwesị.—Tụlee Ndị Kọlọsi 2:20-23.
Mgbe Ibu Ọnụ Pụrụ Ịba Uru
Ka anyị tụlee ụfọdụ oge taa mgbe onye na-efe Chineke pụrụ ibu ọnụ. Onye meworo mmehie nwere ike ọ gaghị enwe mmasị iri ihe ruo oge ụfọdụ. Nke a agaghị abụ iji dọta mmasị ndị ọzọ ma ọ bụ bụrụ n’iwe n’ihi ahụhụ ọ natara. N’eziekwa, ibu ọnụ n’onwe ya agaghị edozi okwu n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, onye nwere ezi nchegharị ga-enwe mwute dị omimi n’ihi imejọ Jehova na ikekwe ndị enyi na ezinụlọ. Ihe mgbu na ikpesi ekpere ike maka mgbaghara pụrụ ịbịanyụ ọchịchọ iri nri.
Eze Devid nke Israel nwere ahụmahụ yiri ya. Mgbe o chere ihu atụmanya nke ịbụ onye nwa ya nwoke Batsheba mụụrụ ya nwụnahụrụ, o tinyere ike ya nile n’ikpegara Jehova ekpere iji nweta ebere banyere nwa ahụ. Ka mmetụta uche na ume ya gara n’ekpere ya, o buru ọnụ. N’otu aka ahụ, iri nri pụrụ iyi nke na-ekwesịghị ekwesị n’ọnọdụ ụfọdụ siri ike taa.—2 Samuel 12:15-17.
A pụkwara inwe oge mgbe onye na-asọpụrụ Chineke chọrọ ịtụkwasị uche ya n’ụfọdụ ihe ime mmụọ miri emi. Ime nnyocha n’ime Bible na mbipụta ndị Kraịst pụrụ ịdị mkpa. Oge ụfọdụ pụrụ ịdị mkpa maka ntụgharị uche. N’oge ọmụmụ ihe dị otú ahụ a na-etinye uche nile na ya, mmadụ pụrụ ịhọrọ ịbụ onye iri nri na-agaghị adọpụ uche ya.—Tụlee Jeremaịa 36:8-10.
E nwere ihe atụ Akwụkwọ Nsọ nke ndị ohu Chineke ibu ọnụ mgbe a na-aghaghị ime mkpebi ndị siri ike. N’ụbọchị Nehemaịa a gaje ịṅụ iyi nye Jehova, a ga-abụkwa ndị Juu ọnụ ma ọ bụrụ na ha emebie ya. Ha ga-ekwe nkwa ịkpọpụ ndị nwunye ha si n’ala ọzọ ma doo onwe ha iche pụọ ná mba ndị gbara ha gburugburu. Tupu ọṅụṅụ iyi a na n’oge ha na-ekwupụta njehie ha, ọgbakọ ahụ nile buru ọnụ. (Nehemaịa 9:1, 38; 10:29, 30) Ya mere, mgbe o chere mkpebi siri ike ihu, onye Kraịst pụrụ ịghara iri nri ruo mkpirikpi oge.
Ime mkpebi nke òtù ndị okenye dị iche iche n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ na-eso ibu ọnụ agakọ mgbe ụfọdụ. Taa, ndị okenye ọgbakọ ndị mkpebi siri ike na-eche ihu, ikekwe n’ihe banyere okwu ikpe, pụrụ ịghara iri nri mgbe ha na-atụle okwu ahụ.
Ịhọrọ ibu ọnụ n’ọnọdụ ụfọdụ bụ mkpebi onwe onye. Otu onye ekwesịghị ikpe onye ọzọ ikpe n’okwu a. Anyị ekwesịghị ịchọ ‘igosi onwe anyị nye mmadụ n’ìhè dị ka ndị ezi omume’; anyị ekwesịghịkwa ime ka nri bụrụ ihe dị oké mkpa nke na ọ na-egbochi anyị ilekọta ibu ọrụ ndị siri ike. (Matiu 23:28; Luk 12:22, 23) Bible na-egosikwa na Chineke adịghị achọ ka anyị buo ọnụ, ọ dịghịkwa egbochi anyị ibu ọnụ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ị̀ maara ihe mere Jisọs ji buo ọnụ ruo ụbọchi 40 mgbe e mesịrị ya baptism?