Inye Enyemaka n’Etiti Mbibi
MGBALỊ ụmụ mmadụ na-eme inye enyemaka mgbe e nwere ọdachi kwesịrị ịja mma n’ezie. Ọtụtụ atụmatụ enyemaka enyewo aka iwughachi ụlọ, jikọtaghachi ezinụlọ, na, nke kasịnụ, zọpụta ndụ.
Mgbe e nwere ọdachi, Ndịàmà Jehova na-eji ndokwa ọ bụla e mere site n’atụmatụ enyemaka ndị obodo eme ihe—na-enwekwa ekele maka ha. N’otu oge ahụkwa, ha nwere ibu ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ‘ịrụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe [ha] nọ.’ (Ndị Galetia 6:10) Ee, ọ na-adị Ndịàmà ka ha bụ ụmụnne; ha na-ele ibe ha anya dị ka “ezinụlọ.” Ọ bụ ya mere ha ji akpọ ibe ha ‘nwanna nwoke’ na ‘nwanna nwanyị.’—Tụlee Mak 3:31-35; Faịlimọn 1, 2.
Ya mere mgbe ọdachi metụtara otu ógbè, ndị okenye nọ n’etiti Ndịàmà Jehova na-eme mgbalị siri ike iji chọpụta ebe onye òtù ọ bụla nke ọgbakọ nọ na mkpa ya ma mee ndokwa maka enyemaka dị mkpa. Tụlee otú nke a si bụrụ eziokwu n’Accra, Ghana; San Angelo, U.S.A.; na Kobe, Japan.
Accra—“Ntakịrị Ụbọchị Noa”
Mmiri malitere izo n’ihe dị ka n’elekere 11 ná mgbede, o zokwara n’akwụsịghị akwụsị ruo ọtụtụ hour. “Ọ nọ na-ezosi ike nke na ezinụlọ m nile ehighị ụra,” ka John Twumasi na-ekwu, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’Accra. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Graphic kpọrọ ya “ntakịrị Ụbọchị Noa.” “Anyị gbalịrị ibugo ụfọdụ ihe ndị bara uru n’ụlọ elu,” ka John gara n’ihu ikwu, “ma mgbe anyị meghere ọnụ ụzọ nke ebe e si arịgo, idei mmiri sọbatara.”
Ndị ọchịchị nyere ịdọ aka ná ntị ka ndị mmadụ kwapụ, ma ọtụtụ gburu oge, na-atụ ụjọ na ụlọ tọgbọ chakoo—a sịgodị na mmiri jupụtara n’ime ya—pụrụ ịrata ndị ohi. Ụfọdụ apụghị ịpụ a sịgodị na ha chọrọ. “Mụ na nne m enweghị ike imepe ụzọ,” ka otu nwatakịrị nwanyị aha ya bụ Paulina na-ekwu. “Mmiri ahụ nọgidere na-eto, ya mere anyị rịkwasịrị n’elu drọm osisi ma jide aka n’ohiere elu ụlọ. N’ikpeazụ, n’ihe dị ka n’elekere anya ise n’ụtụtụ, ndị agbata obi anyị napụtara anyị.”
Ozugbo o kwere mee, Ndịàmà Jehova malitere ọrụ. Otu nwanna nwanyị onye Kraịst aha ya bụ Beatrice na-akọ, sị: “Ndị okenye nọ n’ọgbakọ nọ na-achọgharị anyị, ha hụkwara anyị n’ụlọ nke otu Onyeàmà ibe anyị, bụ́ ebe anyị gbabaworo. Nanị ụbọchị atọ ka idei mmiri ahụ gasịrị, ndị okenye na ndị òtù ọgbakọ bụ ụmụ okoro na agbọghọ bịara nyere anyị aka ma kọchapụ apịtị dị n’ime na n’èzí ụlọ anyị. Watch Tower Society wetara ncha, ọgwụ mgbochi nje, ágbá, matarasị, blanket, ákwà, na uwe maka ụmụaka. Ụmụnna ahụ ziteere anyị ihe oriri ruo ọtụtụ ụbọchị. O metụrụ m n’ahụ nke ukwuu!”
John Twumasi, onye e hotara na mbụ, na-akọ, sị: “Agwara m ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ na Society eziteworo anyị ncha na ọgwụ mgbochi nje—nke zuru iji hichaa ụlọ ahụ dum. Ihe dị ka mmadụ 40 bi n’ụlọ ahụ nyere aka hichaa ya. Enyere m ndị agbata obi m, tinyere otu nwoke bụ onye ụkọchukwu nke chọọchị dị n’ógbè ahụ, ụfọdụ n’ime ncha ahụ. Ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ chere n’ụzọ na-ezighị ezi na Ndịàmà Jehova na-egosi nanị ndị nke ha ịhụnanya.”
Ụmụnna nwoke na nwanyị ahụ bụ́ ndị Kraịst nwere ekele dị ukwuu n’enyemaka ịhụnanya e nyeere ha. Nwanna Twumasi na-ekwubi, sị: “Ọ bụ ezie na ihe ndị funahụrụ m n’idei mmiri ahụ gburu ego karịa ihe enyemaka ndị ahụ, mụ na ezinụlọ m na-eche na n’ihi ndokwa a na-emetụ n’ahụ si n’aka Society, anyị enwetawo ihe karịrị nnọọ ihe funahụrụ anyị.”
San Angelo—“O Yiri Ka Ụwa Ọ̀ Na-abịa ná Njedebe”
Ajọ ifufe ahụ bibiri San Angelo na May 28, 1995, fopụsịrị osisi, gbajisie polu eletrik, tụchisiekwa waya eletrik ike eletrik dị na ha n’ụzọ. Ifufe feruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke kilomita 160 n’otu hour, na-ebibi ihe owuwu ọha na eze. Ihe karịrị ụlọ 20,000 enweghị ọkụ. Mgbe ahụ akụ́ mmiri igwe malitere. Ụlọ Ọrụ Mba Maka Ihu Igwe kọrọ banyere “akụ́ mmiri igwe ha ka bọl golf,” e mesịa “akụ́ mmiri igwe ha ka ntakịrị bọl,” n’ikpeazụzi, “akụ́ mmiri igwe ha ka mkpụrụ osisi grape.” Ọdịda ya na-adachi ntị. Otu onye bi ebe ahụ kwuru, sị: “O yiri ka ụwa ọ̀ na-abịa ná njedebe.”
Ịdị jụụ nke na-atụ aro ihe ọjọọ ga-emenụ sochiri ifufe ahụ. Ndị mmadụ ji nwayọọ nwayọọ si n’ụlọ ha ndị kụjasịrị akụjasị pụta iji kirie mbibi ahụ. A gbụchapụsịwo akwụkwọ n’osisi ndị ka guzo ọtọ. Ebe obibi ndị ka guzo ọtọ yiri ka a gbara ha akpụkpọ. N’ebe ụfọdụ akụ́ mmiri igwe kpuchiri ala ná mkputamkpu ndị ruru otu mita n’ịdị omimi. E bibiwo ọtụtụ puku window ụlọ na ụgbọala n’ifufe ahụ nke na ugbu a mpekere enyo ndị nọ na-egbukepụ n’ime akụ́ mmiri igwe ahụ kpuchiri ala. “Mgbe m lọtara n’ụlọ,” ka otu nwanyị na-ekwu, “anọdụrụ m nnọọ ala n’ime ụgbọala m n’ebe e si abata wee bee ákwá. Mbibi ahụ dị oké njọ, o riri m nnọọ ọnụ.”
Atụmatụ enyemaka na ụlọ ọgwụ dị iche iche nyere enyemaka ego, ihe e ji ewu ụlọ, nlekọta ahụ ike, na ndụmọdụ n’egbughị oge. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ọtụtụ ndị bụ́ ndị oké ifufe ahụ metụtakwara mere ihe nile ha nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka.
Ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova mekwara ihe. Aubrey Conner, bụ́ onye okenye na San Angelo na-akọ, sị: “Ozugbo ifufe ahụ kwụsịrị, anyị malitere ịkpọ na fon na-achọpụta ihe banyere ibe anyị. Anyị nyeere onwe anyị na ndị agbata obi anyị na-abụghị Ndịàmà aka iji bọọdụ kụchie window, itinye plastik n’elu ụlọ, na ikpuchi ụlọ dị iche iche pụọ n’ihu igwe ruo n’ókè kwere omume. Mgbe ahụ anyị depụtara aha onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ onye o metụtara ụlọ ya. Ihe dị ka otu narị ụlọ chọrọ ndozi, ihe ọrụ nke ụlọ ọrụ enyemaka èzí wetara ezughịkwa. Ya mere anyị zụtakwuru ihe ọrụ ma hazie onwe anyị maka ọrụ. Ná ngụkọta, ihe dị ka Ndịàmà 1,000 wepụtara onwe ha inye aka, ihe dị ka 250 ná ngwụsị izu ọ bụla. Ha si ihe ruru kilomita 740 wee bịa. Mmadụ nile rụrụ ọrụ n’enweghị ike ọgwụgwụ, ọtụtụ mgbe n’ihu igwe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40 degree Celsius. Ọbụna otu nwanna nwanyị dị afọ 70 soro anyị rụọ ọrụ ná ngwụsị izu ọ bụla ma e wezụga otu, nke ahụ bụkwa mgbe a na-edozi ụlọ nke ya. Ná ngwụsị izu ahụkwa, ọ rịgooro n’elu ụlọ nke ya na-enye aka n’idozi ya!
“Ọtụtụ mgbe anyị nụrụ site n’ọnụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ okwu ndị dị ka, ‘Ọ́ gaghị adị mma ma ọ bụrụ na okpukpe ndị ọzọ ga-emere ndị òtù ha ihe a?’ Ndị agbata obi anyị nwere mmasị ịhụ ka ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo dị 10 ruo 12 (tinyere ụmụnna nwanyị) bịara n’isi ụtụtụ Friday n’ụlọ nke otu Onyeàmà ibe ha, dị njikere idozi ma ọ bụ ọbụna iwugharị elu ụlọ ahụ dum n’efu. N’ọnọdụ ka ukwuu a rụzuru ọrụ ahụ n’otu ngwụsị izu. Mgbe ụfọdụ, onye ọrụ iwu ihe na-abụghị Onyeàmà ga-agamiela n’otu ọrụ iwu elu ụlọ mgbe ìgwè ndị ọrụ anyị bịarutere n’ụlọ na-esonụ. Anyị ga-ekpekepụ ma wugharịa elu ụlọ anyị ma hichaa ogige ụlọ ahụ tupu ha emesịa nke ha. Mgbe ụfọdụ ha kwụsịrị ọrụ ha nanị iji kirie anyị!”
Nwanna Conner na-ekwubi, sị: “Agụụ ahụmahụ ndị anyị nwekọworo ọnụ gaje ịgụ anyị nile. Anyị abịawo mata ibe anyị site n’akụkụ ọzọ site n’igosi na ịbụ ndị e gosiri ịhụnanya ụmụnna dị ka ọ na-adịtụbeghị. Anyị na-eche na nke a bụ nanị ihe atụ nke ihe ọ ga-adị ka ya n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, na-enwe ụmụnna nwoke na nwanyị na-enyere ibe ha aka n’ihi na ha chọrọ n’ezie.”—2 Pita 3:13.
Kobe—“Osisi, Ahụ Ụlọ na Ozu Ndị Mmadụ Lara n’Iyi”
Ndị bi na Kobe kwesịrị ịdị njikere. N’ezie, na September 1 ọ bụla ha na-eme ememe Ụbọchị Mgbochi Ọdachi. Ụmụ akwụkwọ na-anata ọzụzụ banyere ala ọma jijiji, ndị agha na-amụgharị ozi iji helikọpta napụta ndị mmadụ, ngalaba mgbanyụ ọkụ na-ewepụtakwa ígwè ọrụ ha ndị na-emepụta ihe yiri ala ọma jijiji, bụ́ nke ndị wepụtara onwe ha na-anọ ya amụgharị ọzụzụ nkà nlanarị ha n’ime igbe ha ka otu ọnụ ụlọ nke na-ama jijiji ma na-amagharị dị nnọọ ka ọ bụ ala ọma jijiji n’ezie. Ma mgbe ala ọma jijiji mere n’ezie na January 17, 1995, nkwadebe ahụ nile yiri ka o nweghị isi. Ọtụtụ iri puku elu ụlọ dakpọrọ—ihe na-emetụbeghị n’ihe ndị ahụ na-emepụta ihe yiri ala ọma jijiji. Ụgbọ okporo ígwè dara; akụkụ ụfọdụ nke ụzọ awara awara kebisịrị; okporo gas na nke mmiri gbawara; ụlọ dị iche iche dakpọrọ dị ka kadbọd. Magazin bụ́ Time kọwara ebe ahụ dị ka “osisi, ahụ ụlọ na ozu ndị mmadụ lara n’iyi.”
Ọkụ sochiziri. Ụlọ dị iche iche nọ na-agba ọkụ ka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ́ ndị nwere nkụda mmụọ tọrọ atọ n’ọtụtụ maịlụ nke ahịrị ụgbọala guzo otu ebe. Ndị rutere n’ebe ndị ahụ ọkụ na-agba chọpụtara ọtụtụ mgbe na a pụghị inweta mmiri ọ bụla n’usoro nkesa mmiri e bibiworo nke obodo ukwu ahụ. “Ụbọchị mbụ bụ nnọọ ọgba aghara,” ka otu onye isi obodo ahụ kwuru. “Enwetụbeghị m ụdị mmetụta dị otú ahụ nke enweghị ike ime ihe ọ bụla ná ndụ m, na-amara na e nwere ọtụtụ mmadụ e jichiri n’ime ụlọ ndị ahụ na-agba ọkụ. N’ịmatakwa na ọ dịghị ihe ọ bụla m pụrụ ime banyere ya.”
Ná ngụkọta, e gburu ihe dị ka mmadụ 5,000, e bibikwara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụlọ 50,000. Kobe nwere nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe oriri ọ chọrọ. Iji nweta mmiri, ụfọdụ malitere ịkọchara mmiri ruru unyi n’okpuru okporo mmiri ndị ahụ gbawara agbawa. Ọtụtụ n’ime ndị na-enweghị ebe obibi gbalagara n’ebe nchebe, nke ụfọdụ n’ime ha kesara ihe oriri, na-ekenye onye ọ bụla otu ntakịrị ọkpụrụkpụ osikapa kwa ụbọchị. Enweghị afọ ojuju gbasara n’oge na-adịghị anya. “Ndị ọchịchị emebeghị ihe ọ bụla,” ka otu nwoke kpesara. “Ọ bụrụ na anyị anọgide na-adabere n’ebe ha nọ agụụ ga-agụgbu anyị.”
Ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị na Kobe na n’ógbè ndị dị nso haziri onwe ha ozugbo. Otu onye na-anya helikọpta nke ji anya ya hụ ọrụ ha kwuru, sị: “Ejere m n’ógbè ahụ e nwere ọdachi n’ụbọchị ahụ ala ọma jijiji ahụ mere ma nọọ otu izu n’ebe ahụ. Mgbe m rutere n’otu ebe nchebe, ihe nile na-agba aghara. Ọ dịghị ọrụ enyemaka a na-arụ ma ọlị. Ndịàmà Jehova agwụla ndị gbagara n’ebe ahụ, na-elekọta ihe dị iche iche.”
N’ezie, e nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ. E mere ka Ụlọ Nzukọ Alaeze iri ghara ịdịkwa mma iji eme ihe, ihe karịkwara Ndịàmà 430 enweghị ụlọ. Ụlọ 1,206 ndị ọzọkwa ha bi chọrọ ndozi. Ọ bụghị nanị nke ahụ kama ezinụlọ nke Ndịàmà 15 ndị nwụrụ n’ọdachi ahụ nwere mkpa dị ukwuu maka nkasi obi.
Ihe dị ka Ndịàmà 1,000 sitere n’akụkụ nile nke mba ahụ wepụtara oge ha inye aka n’ọrụ ndozi ahụ. “Mgbe anyị rụrụ ọrụ n’ụlọ nke ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị a na-emebeghị baptism,” ka otu nwanna na-ekwu, “a na-ajụ anyị mgbe nile, sị, ‘Ego ole ka anyị kwesịrị ịkwụ maka ihe a nile?’ Mgbe anyị gwara ha na ọ bụ ọgbakọ dị iche iche na-akwado ọrụ ahụ, ha kelere anyị, na-asị, ‘Ihe anyị mụworo emeela ugbu a!’”
Ọtụtụ ndị nwere mmasị ná nzaghachi dị ngwa na nke ịtọ anya n’ala nke Ndịàmà ahụ n’ebe ọdachi ahụ dị. “Ọ masịrị m nke ukwuu,” ka onye ahụ na-anya ụgbọelu e hotara na mbụ kwuru. “Unu na-akpọ ibe unu ‘nwanna nwoke’ na ‘nwanna nwanyị.’ Ahụwo m otú unu si enyere ibe unu aka; unu bụ otu ezinụlọ n’ezie.”
Ndịàmà ahụ n’onwe ha mụtara ihe ndị bara uru site n’ala ọma jijiji ahụ. Otu nwanna nwanyị kwetara, sị: “Anọwo m mgbe nile na-eche na ka nzukọ na-ebuwanye ibu, otú ahụ ka ọ na-esiwanye ike igosi nchegbu onwe onye.” Ma nlekọta ịhụnanya o nwetara gbanwere echiche ya. “Amatawo m ugbu a na Jehova na-elekọta anyị ọ bụghị nanị dị ka otu nzukọ kama dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu.” Otú ọ dị, ngwọta na-adịgide adịgide pụọ n’ọdachi ka dị n’ihu.
Ngwọta Na-adịgide Adịgide n’Isi Nso!
Ndịàmà Jehova na-elepụ anya n’oge mgbe ọdachi na-agaghị egbubikwa ndụ mmadụ na ụzọ ha si enweta ihe e ji ebi ndụ. N’ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-akụziri mmadụ ime ihe n’ụzọ kwekọrọ na gburugburu ebe obibi ụwa. Ka ụmụ mmadụ na-ewepụ omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ha ga-abụ ndị e kpughere n’ụzọ dị ala karị nye ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọzọkwa, Jehova Chineke—Onye Okike nke ike okike—ga-ahụ na ezinụlọ ya nke ụmụ mmadụ na ihe e kere eke dị n’ụwa agaghị abụkwa nke ike okike ga-eyi egwu ọzọ. Mgbe ahụ ụwa ga-abụ paradaịs n’ezie. (Aịsaịa 65:17, 21, 23; Luk 23:43) A ga-emezu amụma nke Mkpughe 21:4 n’ụzọ dị ebube: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”
[Foto dị na peeji nke 5]
Beatrice Jones (n’aka ekpe) na-egosi otú ya na ndị ọzọ si jikọta aka iji gafere idei mmiri
[Foto dị na peeji nke 6]
Ọrụ enyemaka mgbe ajọ ifufe ahụ gasịrị