Klas Nke 101 Nke Gilead—Ndị Obi Ha Na-anụrụ Ọrụ Ọma ọkụ
ONYE Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ n’obi, otú ahụ ka ọ dịkwa Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Dị ka onye nlereanya anyị, Jisọs gosiri ịnụ ọkụ n’obi site n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya, nke gụnyere inyefe “Onwe ya n’ihi anyị, ka O wee . . . sachakwaara Onwe ya otu ndị nke ga-abụ ndị nke aka Ya, ndị obi ha na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ.” (Taịtọs 2:14) Mmadụ 48 so na klas nke 101 nke Watchtower Bible School of Gilead egosipụtawo n’ezie ịnụ ọkụ n’obi ha maka ọrụ ọma. E mere usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ maka ndị ozi ala ọzọ a na September 7, 1996, n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower dị na Patterson, New York.
Ndụmọdụ Bara Uru Iji Nọgide Na-anụ Ọkụ n’Obi
Onye isi oche nke usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ bụ Carey Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi, nke nọworo ihe karịrị afọ 70 n’ozi oge nile. N’okwu mmeghe ya, Nwanna Barber kpọtụrụ uche n’ọrụ nkwusa na izi ihe Jisọs, onye bụ “Ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12) Ọ kọwapụtara na Jisọs ejichighịrị onwe ya ọrụ ahụ dị nsọpụrụ kama ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ime ka ìhè ha na-enwukwa. (Matiu 5:14-16) Ihe ùgwù a nke ije ozi na-eme ka ndụ onye Kraịst nwekwuo nzube ma na-atụkwasị ibu ọrụ dị arọ n’ubu ndị nile ‘na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè.’—Ndị Efesọs 5:8.
Ka okwu mmeghe ndị ahụ gasịrị, a kpọpụtara Don Adams nke Ọfịs Nlekọta Ọrụ dị n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ịga Ihu, Ọ Bụghị Azụ.” Nwanna Adams dọọrọ uche gaa n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead n’onwe ya na nzube ya—ịgbatịkwu nkwusa ozi ọma ahụ gaa n’ala ndị ọzọ. O kwuru okwu banyere ọganihu nke nzukọ Chineke, bụ́ nke bipụtaworo akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụwa nile n’ihe gafere asụsụ 300. E wepụtawo akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke e bipụtara na 1995, n’asụsụ 111 ma mee atụmatụ ka e bie ya n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. O nyeworị aka n’inyere ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jisọs aka iru n’ókè nke nraranye na baptism nanị n’ime ọnwa ole na ole. Ya mere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ga-enwe ihe ndị kasị ọhụrụ e ji amụ Bible e nwere maka ọrụ ha.
Mgbe ọ gasịrị, Lyman Swingle, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nọgide Na-ejere Jehova Ozi Gị Dị Nsọ,” nke dabeere ná Mkpughe 7:15. Ebe Jehova n’onwe ya bụ Chineke obi ụtọ, ịnọgide na-ejere ya ozi bụ ihe na-enye mmadụ obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) N’ihi ozi a na-enye ọṅụ, oké ìgwè ndị mmadụ si n’akụkụ nile nke ụwa abịawo ife ya ofufe. N’ime afọ ndị gafeworonụ, ndị a zụworo n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead ekerewo òkè n’inyere ọtụtụ n’ime ndị a aka ịbịa nwee ezi ihe ọmụma nke eziokwu. Ya mere, anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji kwere na Jehova ga-anọgide na-agọzi ndị a na-ezipụ ugbu a ije chịkọtakwuo ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-amụba amụba.
“Ịtụgharị Uche n’Ọṅụ nke Jehova” bụ isiokwu Daniel Sydlik, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, mere ka ọ pụta ìhè. O gosiri na ndị ohu Chineke nile, gụnyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ, nwere ihe ùgwù nke izi ndị mmadụ ụzọ nke ndụ ebighị ebi na ụzọ isi nweta ihe kasị mma ná ndụ ugbu a. “Izi ihe,” ka Nwanna Sydlik kwuru, “bụ ọrụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’onwe ya. A na-egosipụta ya n’ihu nke ndị ahụ na-ezi ihe na n’ihu ndị na-amụ amụ.” (Abụ Ọma 16:8-11) O hotara otu onye ozi ala ọzọ nọ n’Estonia bụ́ onye kwuru sị, “Anyị nwere ozi kachasịnụ n’elu ala, ọ bụkwa ihu anyị na-egosipụta ya.” Ọdịdị ihu anyị pụrụ imeghe ọtụtụ ọnụ ụzọ ma kpasuo mmasị. Ndị mmadụ chọrọ ịma ihe na-enye ndị ohu Jehova obi ụtọ. “Ya mere lebara ọdịdị ihu gị anya,” ka Nwanna Sydlik dụrụ n’ọdụ. “Ndị mmadụ na-enwe mmasị ịhụ ndị obi dị ụtọ.”
Ulysses Glass, onye kerewooro òkè n’inye ụmụ akwụkwọ Gilead ntụziaka kemgbe klas nke 12 na 1949, gwara ndị na-ege ntị okwu n’isiokwu bụ́ “Jirinụ Ndidi Chebe Mkpụrụ Obi Unu.” Gịnị bụ ndidi? Ọ na-enye echiche nke iji nwayọọ na-echere ihe, igosi ntachi obi n’okpuru mkpasu iwe ma ọ bụ nrụgide. Onye ndidi na-achịkwa mmụọ ya mgbe nile; onye na-enweghị ndidi na-eme ọkụ ọkụ ma bụrụ onye a na-akpasu iwe ngwa ngwa. “Ọtụtụ ndị na-eche na ndidi na-egosi adịghị ike ma ọ bụ ịnọ n’obi abụọ,” ka Nwanna Glass kwuru, ma “nye Jehova ọ bụ ihe àmà nke ume na nzube.” (Ilu 16:32) Gịnị bụ ụgwọ ọrụ ndidi na-akwụ? “Ndidi n’oge iwe ga-egbochiri gị otu narị ụbọchị nke ihe mgbu,” ka otu ilu ndị China na-ekwu. “Ndidi na-emeziwanye ọdịdị mmadụ,” ka Nwanna Glass kwuru. “Ya bụ, ọ na-eji ágbá nke ịdịgide adịgide etechi àgwà ọma ndị ọzọ. Ọ na-eme ka okwukwe bụrụ ihe a na-achọsi ike, ka udo na-adịte anya, ka ịhụnanya bụrụkwa nke kwụsiri ike.”
“Ọ bụ ihe ùgwù inweta ọrụ site n’aka Jehova Chineke site ná nzukọ ya,” ka Mark Noumair kwuru, bụ́ onye jere ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Kenya ruo afọ 11, bụrụkwa onye nkụzi na Gilead ugbu a. Ka ọ na-ewulite isiokwu bụ́ “Ọ Gwụla Ma I Nwere Okwukwe, Ị Gaghị Anọte Aka,” Nwanna Noumair kpọtụrụ uche n’ihe atụ Eze Ehaz nke Juda. Aịsaịa mesiri eze ahụ obi ike banyere nkwado Jehova n’ọrụ ya, ma n’agbanyeghị nke ahụ Ehaz atụkwasịghị Ya obi. (Aịsaịa 7:2-9) Nwanna Noumair kọwapụtaziri na ọ dị ndị ozi ala ọzọ—n’ezie, anyị nile—mkpa inwe okwukwe na Jehova iji nọtee aka n’ọrụ ọchịchị Chineke ha. Ihe ịma aka ndị pụrụ iche nke ọrụ ozi ala ọzọ chọrọ okwukwe siri ike. “Buru n’uche mgbe nile na e nweghị ọnọdụ zuru okè n’usoro ihe a,” ka Nwanna Noumair kwuru.
Ahụmahụ Ndị Na-akpali Ọrụ Ịnụ Ọkụ n’Obi
N’oge ọzụzụ ha na Gilead, ụmụ akwụkwọ ahụ tinyere oge n’ozi ihu ọha ná ngwụsị izu ọ bụla, bụ́ nke ga-abụkwa isi ihe n’ọrụ ozi ala ọzọ ha. Wallace Liverance, onye so n’òtù ndị nkụzi Gilead, gbara ụmụ akwụkwọ 15 ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị kọrọ ahụmahụ ha. Leon Weaver nke Kọmitii Ngalaba Ije Ozi na Lon Schilling nke Kọmitii Ịrụ Ọrụ Betel gbaziri ndị òtù kọmitii alaka si Africa na Latin America ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị kọrọ ahụmahụ sitere n’ubi ozi ala ọzọ, ndị nwekwara okwu ndụmọdụ dị mma maka ndị ozi ala ọzọ ahụ na-agụsị akwụkwọ. A kọwapụtara na n’ime Sierra Leone, ihe dị ka 90 pasent nke ndị e mere baptism n’afọ ije ozi 1995 bụrịị ndị ndị ozi ala ọzọ nyeere aka. Lee ihe ndekọ ọma nke ọrụ ịnụ ọkụ n’obi ọ bụ!
N’ikpeazụ, Milton Henschel, bụ́ onye isi oche Society, gwara ndị na-ege ntị dị 2,734 okwu n’isiokwu bụ́ “Nzukọ Jehova A Na-ahụ Anya Pụrụ Iche.” Gịnị na-eme nzukọ Chineke ihe na-enweghị oyiri? Ọ bụghị otú ọ ha ma ọ bụkwanụ ike ya kama eziokwu ahụ bụ na ọ bụ iwu nduzi ezi omume na ihe e kpere n’ikpe nke Chineke na-eduzi ya. N’oge ochie ọ bụ ndị Jehova, bụ́ mba Israel, ka e nyere okwu ya dị nsọ, bụ́ nke mere ka mba ahụ pụọ iche. (Ndị Rom 3:1, 2) Taa, nzukọ Jehova dị n’otu ka ọ na-arụ ọrụ n’okpuru nduzi nke Jisọs Kraịst. (Matiu 28:19, 20) Ọ na-aga n’ihu, na-eto. È nwere nzukọ ọzọ n’elu ala nke Òtù Na-achị Isi ya na-aga n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, tupu ha emee mkpebi ndị dị mkpa? N’ụzọ ndị a na ndị ọzọ, nzukọ Jehova a na-ahụ anya pụrụ iche n’ezie.
Usoro ihe omume tọrọ ụtọ jiri nnyefe nke diplọma na ọgụgụ nke otu akwụkwọ ozi sitere n’aka klas ahụ nke na-ekwupụta ekele maka ọzụzụ pụrụ iche mechie.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Klas
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 12
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Nkezi afọ ndụ: 31.7
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 13.8
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 9.8
[Foto dị na peeji nke 23]
Klas nke 101 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Swint, H.; Zezenski, A.; Highfield, L.; Mercado, S.; Diehl, A.; Chavez, V.; Smith, J.; Selenius, S. (2) Kurtz, D.; Clark, C.; Leisborn, J.; Mortensen, W.; Bromiley, A.; Toikka, L.; Marten, A.; Smith, D. (3) Zezenski, D.; Bjerregaard, L.; Garafalo, B.; Kaldal, L.; Chavez, E.; Fröding, S.; Khan, R.; Selenius, R. (4) Swint, B.; Bjerregaard, M.; Garafalo, P.; Holmblad, L.; Keyzer, M.; Fröding, T.; Palfreyman, J.; Palfreyman, D. (5) Minguez, L.; Leisborn, M.; Mercado, M.; Kurtz, M.; Diehl, H.; Toikka, J.; Clark, S.; Khan, A. (6) Minguez, F.; Marten, B.; Highfield, L.; Holmblad, B.; Bromiley, K.; Kaldal, H.; Mortensen, P.; Keyzer, R.