Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ—Ò Kwesịrị Ịchọ Ọrụ Ebube?
ALBERT nọ ná mmalite afọ ndị 20 ya mgbe ọ malitere ịchọ Chineke. Ọ nwalere ọtụtụ okpukpe ma nọgide n’enweghị afọ ojuju. N’ịgụ ụfọdụ akụkụ Bible, ọ mụtara otú Chineke si mesoo ndị dị ka Noa, Abraham, Sera, na Mosis. Albert hụrụ onwe ya ịbụ onye a dọtara n’ebe Chineke nke Bible nọ. Otú ọ dị, ọ̀ pụrụ ijide n’aka na Chineke dị adị n’ezie?
Otu uhuruchi Albert kwọọrọ ụgbọala gaa n’ebe dịpụrụ iche ebe o kpere ekpere, sị: “Biko Chineke, nye m ihe ịrịba ama—ihe ọ bụla ga-egosi na ị dị adị.” Albert cheere ruo ogologo oge. O chetara na mgbe ọ na-enweghị ihe merenụ, atụmanya ya “ghọrọ ndakpọ olileanya, ịtọgbọ chakoo, iwe.”
Dị ka Albert, ọtụtụ na-eche na ha achọwo Chineke na nkịtị. Ha pụrụ ịbụ ndị okwuchukwu nke ndị ụkọchukwu gbagwojuru anya ma ọ bụ ndị ire ahịa nke ndị okwuchukwu telivishọn kụdara mmụọ. N’ịbụ ndị ihu abụọ pụtara ìhè n’etiti ọtụtụ ndị agbata obi ha metụrụ n’ahụ, ụfọdụ ejighị n’aka ihe ha ga-ekwere na ya. Ma, Eze Devid nke Israel oge ochie mesiri nwa ya nwoke bụ́ Solomọn obi ike, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ [Chineke], Ọ ga-eme ka ị chọta Ya.”—1 Ihe Emere 28:9.
Mgbe ahụ, oleezi otú Chineke si ekpughe onwe ya? Ì kwesịrị ịtụ anya ihe ịrịba ama—ahụmahụ ụfọdụ karịrị ike mmadụ nke ga-egosi gị na Chineke dị adị? Dị ka njụta echiche e mere na nso nso a nke a kọrọ na magazin Time si kwuo, ihe karịrị ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị America kwere n’ọrụ ebube. Isiokwu ahụ kwukwara na “chọọchị ndị kasị eto ngwa ngwa n’America bụ ndị chọọchị Mmụọ Nsọ na Pentikọstal bụ́ ndị ofufe ha hiwere isi ‘n’ihe ịrịba ama na ọrụ ebube.’”
Ò kwesịrị n’ezie iwe “ihe ịrịba ama na ọrụ ebube” iji kwere na Chineke? O jiriwo ọrụ ebube mee ihe n’oge gara aga. Iji maa atụ: Sọl nke Tasọs, bụ́ onye na-akpagbu ụmụazụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nwere ahụmahụ pụrụ nnọọ iche n’ụzọ sitere Jerusalem gaa Damaskọs. Nzute ọrụ ebube a o zutere Jisọs ahụ a kpọliteworo n’ọnwụ dujere ná ntọghata Sọl. (Ọrụ 9:1-22) N’ihi ya onye bụbu onye mkpagbu ghọrọ Pọl onyeozi—otu n’ime ndị kasị akwado Iso Ụzọ Kraịst!
Ma ọrụ ebube hà na-akpali ụdị ezi mmeghachi omume ahụ mgbe nile? Ezigbo okwukwe n’ebe Chineke nọ ọ̀ dabeere na mmadụ inwe otu ahụmahụ ọrụ ebube?
[Foto dị na peeji nke 3]
Ọkpara Chineke gwara Sọl nke Tasọs okwu n’ụzọ ọrụ ebube. Ì kwesịrị ịtụ anya ọrụ ebube?