Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/15 p. 8-13
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbalị Dara Ada nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
  • Ịga n’Isi Ihe Na-akpata Ya
  • Ụzọ Udo
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olee Mgbe Udo Na-adịgide Adịgide Ga-abịa n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/15 p. 8-13

Ezi Udo—Site n’Ebee?

“[Jehova] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”—ABỤ ỌMA 46:9.

1. Nkwa dị aṅaa magburu onwe ya banyere udo ka anyị na-achọta n’amụma Aịsaịa?

“IHE ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” (Aịsaịa 32:17, 18) Lee nkwa ọma ọ bụ! Ọ bụ nkwa nke ezi udo nke Chineke na-eweta.

2, 3. Kọwaa ezi udo.

2 Otú ọ dị, gịnị bụ ezi udo? Ọ̀ bụ nanị enweghị agha? Ka ọ̀ bụ nanị oge mgbe mba dị iche iche na-akwadebe maka agha ọzọ? Ezi udo, ọ̀ bụ nanị nrọ? Ndị ahụ bụ ajụjụ ọ dị mkpa ka anyị nwee azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha. Nke mbụ, ezi udo karịrị nnọọ nrọ. Udo Chineke kwere nkwa ya karịrị ihe ọ bụla nke ụwa a pụrụ iche n’echiche. (Aịsaịa 64:4) Ọ bụghị udo ga-adịru afọ ole na ole ma ọ bụ iri afọ ole na ole. Ọ na-adịru ebighị ebi! Ọ bụghịkwa udo maka nanị mmadụ ole na ole ihe dabaara—ọ na-agụnye eluigwe na ala, ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ. Ọ na-agbasapụ ruo ndị mba, ìgwè agbụrụ, asụsụ, na ụcha akpụkpọ ahụ nile. O nweghị ókè, ihe mgbochi, ọdịda.—Abụ Ọma 72:7, 8; Aịsaịa 48:18.

3 Ezi udo pụtara udo kwa ụbọchị. Ọ pụtara na ị ga-eteta kwa ụtụtụ n’enweghị echiche nke agha, n’enweghị nchegbu banyere ọdịnihu gị, ọdịnihu ụmụ gị, ọbụna ọdịnihu ụmụ ụmụ gị. Ọ pụtara udo nke uche zuru ezu. (Ndị Kọlọsi 3:15) Ọ pụtara enwekwaghị agha, enwekwaghị mpụ, enwekwaghị ime ihe ike, enwekwaghị ezinụlọ e kewara ekewa, enwekwaghị ndị na-enweghị ebe obibi, enwekwaghị ndị agụụ ma ọ bụ oké oyi na-egbu, na enwekwaghị obi nkoropụ na nkụda mmụọ. Nke kakwa mma, udo Chineke pụtara ụwa nke ọrịa, ihe mgbu, iru újú, ma ọ bụ ọnwụ na-adịghị. (Mkpughe 21:4) Lee olileanya dị ebube anyị nwere nke inwe ezi udo ruo mgbe ebighị ebi! Nke a ọ́ bụghị ụdị udo na obi ụtọ na-agụsi anyị nile agụụ ike? Nke a ọ́ bụghị ụdị udo anyị kwesịrị ikpe ekpere ma rụọ ọrụ maka ya?

Mgbalị Dara Ada nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ

4. Mgbalị ndị dị aṅaa maka udo ka mba dị iche iche meworo, gịnịkwa siworo na ha pụta?

4 Eri ọtụtụ narị afọ, ụmụ mmadụ na mba nile ekwuwo banyere udo, rụrịta ụka banyere udo, bịanye aka n’ọtụtụ narị akwụkwọ nkwekọrịta udo. Gịnị siworo na ya pụta? N’afọ 80 gara aga, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịbeghị mgbe mba ma ọ bụ ìgwè ọ bụla na-anọghị n’agha. N’ụzọ doro anya, udo akwawo ihe a kpọrọ mmadụ. Ya mere ajụjụ bụ, N’ihi gịnị ka mgbalị nile nke mmadụ iweta udo mba nile jiworo daa, n’ihi gịnịkwa ka mmadụ na-enweghị ike iweta ezi udo nke ga-adịgide adịgide?

5. N’ihi gịnị ka mgbalị ụmụ mmadụ na-eme maka udo jiworo daa mgbe nile?

5 Azịza dị mfe bụ na ihe a kpọrọ mmadụ echigharịkwurubeghị isi iyi ziri ezi maka ezi udo. N’okpuru mmetụta nke Setan Ekwensu, ụmụ mmadụ eguzobewo nzukọ ndị nweworo mmetụta ọjọọ n’ihi adịghị ike na omume ọjọọ nke aka ha—anyaukwu na oké ọchịchọ ha, agụụ na-agụ ha maka ike na ịbụ ndị a ma ama. Ha agawo ụlọ akwụkwọ nke agụmakwụkwọ dị elu ma guzobekwa òtù na ìgwè nnyocha dị iche iche, bụ́ ndị chepụtaworo nanị ụzọ ndị ọzọ nke mmegbu na mbibi. Gaa n’isi iyi dị aṅaa ka e dugaworo ụmụ mmadụ? Ebee ka ha legaworo anya?

6, 7. (a) Ihe ndekọ dị aṅaa ka Njikọ Mba Nile meere onwe ya? (b) Gịnị bụ ihe ndekọ nke Mba Ndị Dị n’Otu?

6 Laa azụ na 1919 mba dị iche iche tụkwasịrị obi ná Njikọ Mba Nile iji weta udo na-adịgide adịgide. Mwakpo Mussolini wakporo Etiopia na 1935 na agha obodo a lụrụ na Spain malite na 1936 tisara olileanya ahụ. Njikọ ahụ pụrụ n’anya mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na 1939. Ihe ahụ a kpọrọ udo adịrubeghị ọbụna afọ 20.

7 Gịnị banyere Mba Ndị Dị n’Otu? Ò nyewo ezi olileanya ọ bụla maka udo na-adịgide adịgide n’ụwa nile? Ọ dịghị ma ọlị. A lụwo ihe karịrị agha na esemokwu ibu agha 150 eri mmalite ya na 1945! O jughị anya na Gwynne Dyer, onye Canada bụ ọkà mmụta n’ihe banyere agha na mmalite ya, kọwara òtù UN dị ka “òtù nke ndị na-agbagbu anụ ghọrọ ndị na-azụ anụ, ọ bụghị nzukọ nke ndị senti,” na “n’akụkụ ka ukwuu ụlọ ọrụ ekwu ekwu emeghị eme.”—Tụlee Jeremaịa 6:14; 8:15.

8. N’agbanyeghị okwu udo ha, gịnị ka mba dị iche iche nọworo na-eme? (Aịsaịa 59:8)

8 N’agbanyeghị okwu udo ha, mba dị iche iche anọgidewo na-echepụta ma na-akpụpụta ngwá agha. Mba ndị na-akwado nnọkọ udo dị iche iche na-abụkarị kpọmkwem ndị na-ebute ụzọ n’ịkpụpụta ngwá ahịa. Oké uru azụmahịa ná mba ndị a na-akwalite mmepụta nke ngwá agha ndị na-akpata ọnwụ, gụnyere ogbunigwe ọjọọ ndị na-egbu ma ọ bụ na-akwarụ ihe dị ka ndị nkịtị 26,000 toworo ogo mmadụ na ụmụaka kwa afọ. Anyaukwu na àgwà arụrụala bụ ike nkwali. Iri ngo na aka azụ bụ akụkụ dị mkpa n’azụmahịa ngwá agha mba nile. Ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eme onwe ha ọgaranya site n’ụzọ a.

9, 10. Gịnị ka ndị ọkachamara nke ụwa kwuworo banyere agha na mgbalị ụmụ mmadụ?

9 Na December 1995, onye Poland bụ́ ọkà mmụta physics na onye ritere Onyinye Nobel Maka Udo bụ́ Joseph Rotblat kpọkuru mba dị iche iche ịkwụsị asọmpi mkpụpụta ngwá agha. O kwuru, sị: “Nanị ụzọ e nwere isi gbochie [asọmpi mkpụpụta ngwá agha ọhụrụ] bụ ịkwụsị agha kpam kpam.” Ì chere na nke a yiri ka ọ ga-eme? Malite na 1928 gaa n’ihu, mba 62 kwadoro Nkwekọrịta Kellogg-Briand, na-ajụ agha dị ka ụzọ e si edozi esemokwu. Agha Ụwa nke Abụọ gosipụtara n’ụzọ doro anya na nkwekọrịta ahụ abaghị uru karịa akwụkwọ e dere ya n’elu ya.

10 N’ụzọ na-enweghị ngọnarị, agha anọgidewo na-abụ nkume mkpọbi ụkwụ dị n’ụzọ akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka Gwynne Dyer si dee, “agha bụ ihe omume bụ isi ná mmepeanya ụmụ mmadụ, o nwekwara akụkọ ihe mere eme nke dị ogologo kpọmkwem dị ka mmepeanya.” Ee, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmepeanya na alaeze ukwu ọ bụla nwere ndị ọchịagha ya a na-asọpụrụ, ndị agha ya a na-akwụ ụgwọ, ọgụ ya ndị a ma ama, ụlọ akwụkwọ ndị agha ya e doro nsọ, na nkwakọba ngwá agha ya. Otú ọ dị, agha akawo narị afọ anyị akara karịa nke ọ bụla ọzọ, ma n’ibibi ihe ma ná mfu nke ndụ.

11. Ihe dị aṅaa bụ isi ka ndị ndú ụwa leghawooro anya n’ọchịchọ ha na-achọ udo?

11 O doro anya na ndị ndú ụwa elegharawo amamihe bụ isi nke Jeremaịa 10:23 anya: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ọ bụrụ na a gụpụ Chineke n’okwu ahụ, a pụghị inwe ezi udo. Mgbe ahụ, ihe a nile hà na-apụta na a pụghị izere agha n’ọha mmadụ mepere anya? Ọ̀ pụtara na udo—ezi udo—bụ nrọ na-agaghị ekwe omume?

Ịga n’Isi Ihe Na-akpata Ya

12, 13. (a) Gịnị ka Bible na-ekpughe n’ihe banyere isi ihe a na-adịghị ahụ anya na-akpata agha? (b) Olee otú Setan siworo chigharịa uche ndị mmadụ pụọ n’ezi ihe ngwọta nke nsogbu ụwa?

12 Iji zaa ajụjụ ndị ahụ, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe ndị na-akpata agha. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi bụ́ Setan bụ “ogbu mmadụ” na “onye ụgha” mbụ, na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19) Gịnị ka o meworo iji kwalite atụmatụ ya? Anyị na-agụ ná 2 Ndị Kọrint 4:3, 4, sị: “Ma a sịkwa na e kpudoworo ozi ọma anyị ihe, ọ bụ n’etiti ndị na-ala n’iyi ka e kpudoworo ya: ndị chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, Onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.” Setan na-eme ihe nile kwere omume iji chigharịa uche ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’Alaeze Chineke dị ka ihe ngwọta nke nsogbu ụwa. Ọ na-eji ihe iseokwu na-akpata nkewa ọha na eze, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na okpukpe ekpuchi anya ma na-adọpụ uche ndị mmadụ, ka ndị a wee yie ka hà dị mkpa karịa ịchịisi Chineke. Otu ihe atụ bụ mmụba zuru ụwa ọnụ nke ịhụ mba n’anya e nwere n’oge na-adịbeghị anya.

13 Setan bụ́ Ekwensu na-akwalite ịhụ mba n’anya na ịkpa ókè agbụrụ, nkwenkwe nke otu mba, agbụrụ, ma ọ bụ ebo ịka ndị ọzọ. A na-atụte ịkpọasị siri ike bụ́ ndị a bịadaworo ruo ọtụtụ narị afọ iji kpasuo agha na ọgụ ndị ọzọ. Federico Mayor, bụ́ ọga kpata kpata nke òtù UNESCO, dọrọ aka ná ntị banyere omume a, sị: “Ọbụna ebe ikwe ibe nọrọ bụbu ihe a na-ahụkarị, mgbanwe àgwà gaa n’ụjọ onye ọbịa na-apụtakwu ìhè, okwu ndị na-emelara ìgwè mmadụ so na ya ihe ma ọ bụ nke ndị na-akpa ókè agbụrụ bụ́ ndị yiworo ihe mgbe ochie bụkwa ihe a na-anụ mgbe mgbe karị.” Gịnị siworo na ya pụta? Mgbukpọ na-awụ akpata oyi n’ahụ n’ebe bụbu Yugoslavia na oké mgbukpọ agbụrụ mere na Rwanda bụ nanị abụọ n’ime ihe omume ndị dị otú ahụ ghọworo isi akụkọ.

14. Olee otú Mkpughe 6:4 si see onyinyo agha na mmetụta ya n’oge anyị?

14 Bible buru amụma na n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ, nke na-anọchite anya agha, ga-awụ ọsọ n’ụwa nile. Anyị na-agụ ná Mkpughe 6:4, sị: “Ịnyịnya ọzọ wee pụta, bụ́ ịnyịnya nke na-acha ọkụ ọkụ: e wee nye onye na-anọkwasị ya ike ịnapụ udo n’ụwa, ya na ka ha wee gburịta onwe ha: e wee nye ya oké mma agha.” Eri 1914 anyị ahụwo ka onye na-agba ịnyịnya ihe atụ a ‘wepụrụ udo,’ mba dị iche iche agawokwa nnọọ n’ihu n’ịlụ ọgụ na iburịta agha.

15, 16. (a) Òkè dị aṅaa ka okpukpe kerewooro n’agha na ogbugbu dị iche iche? (b) Olee otú Jehova si ele ihe okpukpe meworo anya?

15 Ihe a na-agaghị eleghara anya ma ọlị bụ òkè okpukpe na-ekere n’agha na ogbugbu ndị a. A pụrụ ikwu na ihe kpatara akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ nke jupụtara n’ọbara bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ihi mmetụta na-eduhie eduhie nke okpukpe ụgha. Ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Hans Küng dere, sị: “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’ụzọ na-adịghị mma, na-ebibi ebibi, [okpukpe] atụnyewo ma ka na-atụnye ụtụ buru ibu. Ọgụ dị ukwuu, mburịta agha jupụtara n’ọbara, n’ezie ‘agha okpukpe’ bụ ha kpatara ha; . . . nke a bụkwa otu ihe ahụ banyere agha ụwa abụọ ahụ.”

16 Olee otú Jehova Chineke si ele òkè okpukpe ụgha na-ekere n’ogbugbu na agha dị iche iche anya? Ikpe Chineke mara okpukpe ụgha, nke e dekọrọ ná Mkpughe 18:5, na-asị: “Mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.” Mmekọrịta okpukpe ụgha na ndị ọchịchị ụwa akpatawo ikpe ọmụma ọbara dị otú ahụ, oké ntụkọba buru ibu otú a nke mmehie, nke na ọ pụghị ikwe omume Chineke ileghara ya anya. N’isi nso, ọ ga-ewepụ kpam kpam ihe mkpọbi ụkwụ a dị n’ụzọ ezi udo.—Mkpughe 18:21.

Ụzọ Udo

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị nanị nrọ na-agaghị eme eme ikwere na udo ebighị ebi ga-ekwe omume? (b) Gịnị ka Jehova mewororị iji mee ka e jide n’aka na ezi udo ga-abịa?

17 Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ, site ná ngwá ọrụ ndị dị ka Mba Ndị Dị n’Otu, apụghị iweta ezi udo nke na-adịgide adịgide, n’ebee ka ezi udo ga-esi bịa, n’ụzọ dịkwa aṅaa? Ọ̀ bụ nnọọ nrọ na-agaghị eme eme ikwere na udo ebighị ebi ga-ekwe nnweta? Ọ bụghị ma ọ bụrụ na anyị echigharịkwuru ezi isi iyi nke udo. Ònyekwa ka ọ bụ? Abụ Ọma 46:9 na-aza site n’ịgwa anyị na Jehova “na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esurekwa ụgbọala nile n’ọkụ.” Jehova amalitewokwarị usoro o ji akwụsị agha na ime ka ezi udo dịrị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ichi Kraịst Jisọs eze nke Alaeze ruuru ya na 1914, nakwa site n’ịkwalite mkpọsa agụmakwụkwọ kasịnụ maka udo n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Okwu amụma nke Aịsaịa 54:13 na-emesighachi anyị obi ike, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.”

18 Amụma a na-eme ka ụkpụrụ nke ihe mere ihe na ihe o mere pụta ìhè—ya bụ, ihe ọ bụla merenụ nwere ihe mere ya. N’ọnọdụ a, nkụzi Jehova—ihe mere ihe—na-agbanwe ndị nwere mmasị n’ịlụ agha ịghọ ndị hụrụ udo n’anya bụ́ ndị ha na Chineke dị n’udo. Ihe o mere bụ mgbanwe obi nke na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị hụrụ udo n’anya. Nkụzi a nke na-agbanwe obi na uche ndị mmadụ nọ ọbụna ugbu a na-agbasa n’ụwa dum ka ọtụtụ nde na-agbaso ihe nlereanya nke “Onyeisi Udo” ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst.—Aịsaịa 9:6.

19. Gịnị ka Jisọs kụziri banyere ezi udo?

19 Gịnịkwa ka Jisọs kụziri banyere ezi udo? O kwuru ọ bụghị nanị banyere udo n’etiti mba dị iche iche, kama banyere udo n’etiti ndị mmadụ ná mmekọrịta ha na banyere udo nke dị n’ime nke na-abịa site n’ezi akọ na uche. Na Jọn 14:27, anyị na-agụ okwu Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Udo ka M hapụụrụ unu; udo nke m ka M na-enye unu: ọ bụghị dị ka ụwa na-enye ka Mụ onwe m na-enye unu. Ka obi unu ghara ịlọ mmiri, ka ọ gharakwa ịtụ ụjọ.” Olee otú udo Jisọs si dị iche n’ebe nke ụwa dị?

20. Site n’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs ga-eweta ezi udo?

20 Nke mbụ, e jikọtara udo Jisọs n’ụzọ chiri anya n’ozi Alaeze ya. Ọ maara na ọchịchị ezi omume eluigwe ahụ, nke Jisọs na 144,000 ga-eso ya chịa mejupụtara, ga-eweta agha na ndị na-akpalite agha ná njedebe. (Mkpughe 14:1, 3) Ọ maara na ọ ga-eweta ọnọdụ paradaịs dị n’udo nke o kwere onye ajọ omume nwụrụ n’akụkụ ya ná nkwa. Jisọs ekweghị ya nkwa inwe ọnọdụ n’Alaeze eluigwe, kama o kwuru, sị: “N’ezie asị m gị, Taa ka Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.

21, 22. (a) Olileanya dị aṅaa na-akwagide akwagide n’ụzọ dị ebube ka ezi udo na-agụnye? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji hụ ngọzi ahụ?

21 Jisọs makwaara na Alaeze ya ga-ewetara ndị nile na-eru újú bụ́ ndị gosipụtara okwukwe na ya nkasi obi. Udo ya na-agụnye olileanya mbilite n’ọnwụ nke na-akwagide akwagide n’ụzọ dị ebube. Cheta okwu ya na-agba ume nke a na-achọta na Jọn 5:28, 29: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”

22 Ị̀ na-atụ anya oge ahụ? Ndị ị hụrụ n’anya hà anwụnahụwo gị? Ọ na-agụ gị agụụ ịhụ ha ọzọ? Mgbe ahụ nakwere udo nke Jisọs na-enye. Nwee okwukwe yiri nke Mata, bụ́ nwanne nwanyị Lazarọs, onye gwara Jisọs, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Ma rịba ama nzaghachi na-akpali akpali nke Jisọs nyere Mata: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. Ì kwere nke a?”—Jọn 11:24-26.

23. N’ihi gịnị ka ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke ji dị mkpa n’inweta ezi udo?

23 Gị onwe gị kwa pụrụ ikwere ma rite uru site ná nkwa ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Rịba ama otú Pọl onyeozi si mesie ike ịdị mkpa nke ezi ihe ọmụma: “Anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazu nke Chineke.” (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ezi ihe ọmụma a ga-eme ka i kwere na Jehova Chineke bụ isi iyi nke ezi udo. Ọ ga-agwakwa gị ihe ị na-aghaghị ime ugbu a ka i wee nwee ike isonyere ọbụ abụ ahụ n’ikwu, sị: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dina ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 4:8.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka mgbalị ụmụ mmadụ jiworo daa mgbe nile?

◻ Gịnị bụ isi ihe na-akpata agha?

◻ N’ihi gịnị ka udo na-adịgide adịgide ji ghara ịbụ nrọ na-agaghị eme eme?

◻ Gịnị bụ isi iyi nke ezi udo?

[Foto dị na peeji nke 8]

Ezi udo abụghị nrọ. Ọ bụ nkwa Chineke

[Foto dị na peeji nke 10]

Kemgbe 1914 onye na-agba ịnyịnya ihe atụ ahụ na-acha ọkụ ọkụ ewepụwo udo n’ụwa

[Foto dị na peeji nke 11]

Okpukpe na UN hà pụrụ iweta udo?

[Ebe E Si Nweta Foto]

UN photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya