Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
À pụrụ ikwu na nghọta ọhụrụ e nwere na nso nso a banyere okwu bụ́ “ọgbọ” na Matiu 24:34 na-enye ohere maka echiche nke na a pụrụ ime ka ọgwụgwụ usoro ihe nke a gbuo oge ruo n’ọdịnihu dị anya?
Ọ bụghị otú ahụ ma ọlị. N’ụzọ megidere nke ahụ, nghọta e meziwanyere na nso nso banyere okwu a kwesịrị inyere anyị aka ịnọgide na-atụ anya ọgwụgwụ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?
Dị ka Ụlọ Nche November 1, 1995, kọwara, Jisọs jiri nkebi ahịrị okwu bụ́ “ọgbọ a” mee ihe n’ebe ndị ajọ mmadụ nke oge ya nọ. (Matiu 11:7, 16-19; 12:39, 45; 17:14-17; Ọrụ 2:5, 6, 14, 40) Otú ahụ, ọ bụghị nkọwa nke ogologo oge a kara aka nke na-amalite n’otu oge kpọmkwem.
N’eziokwu, “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” dị n’otu mbipụta nke Ụlọ Nche ahụ lekwasịrị anya n’ọkpụrụkpụ isi ihe abụọ: “A pụghị iwere otu ọgbọ nke ndị mmadụ dị ka oge nke nwere ọnụ ọgụgụ afọ a kara aka” nakwa, “Ndị mmadụ nọ n’otu ọgbọ na-adị ndụ nanị ruo mkpirikpi oge.”
Anyị na-ejikarị “ọgbọ” eme ihe n’ụzọ dị otú a. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịsị, ‘Ndị agha nke ọgbọ Napoléon amaghị ihe ọ bụla banyere ụgbọelu na bọmbụ atọm.’ Ànyị ga na-ezo aka nanị ná ndị agha a mụrụ n’otu afọ a mụrụ Napoléon? Ànyị ga na-ezo aka nanị ná ndị agha France ahụ nwụrụ tupu Napoléon anwụọ? Ee e; anyị agaghịkwa adị na-agbalị iguzobe ọnụ ọgụgụ a kara aka nke afọ site n’iji “ọgbọ” mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, anyị ga na-ezo aka na nanị nwa oge, ọ bụghị ọtụtụ narị afọ site n’oge Napoléon gaa n’ọdịnihu.
O yiri nghọta anyị nke ihe Jisọs kwuru n’amụma ya o buru n’Ugwu Olive. Mmezu nke akụkụ dị iche iche nke amụma ahụ na-egosi na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a dị nsọ. (Matiu 24:32, 33) Cheta na dị ka Mkpughe 12:9, 10 kwuru, site ná nguzobe nke Alaeze eluigwe nke Chineke na 1914, a chụdara Setan n’ógbè nke ụwa. Mkpughe na-atụkwasị na Setan nwere oké ọnụma ugbu a. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ matara na “o nwere nanị nwa oge.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Mkpughe 12:12.
O si otú a kwesị ekwesị na Ụlọ Nche November 1 bu isiokwu nta bụ́ “Na-echenụ Nche!” Paragraf na-esonụ kwuru nnọọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ọ dịghị anyị mkpa ịmata kpọmkwem mgbe ihe dị iche iche ga-eme. Kama nke ahụ, ebe anyị ga-elekwasị anya ga-abụrịrị n’ịnọ na nche, ịzụlite okwukwe siri ike, na iji ọrụ n’aka n’ozi Jehova—ọ bụghị n’ịgbakọ oge.” Mgbe ahụ o hotara okwu Jisọs: “Lezienụ anya, mụrụnụ anya, . . . n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ. Ma okwu M na-agwa unu ka M na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.”—Mak 13:33, 37.