Jehova Na-eme Ihe n’Iguzosi Ike n’Ihe
DỊ KA PETER PALLISER SI KỌỌ
Ọ bụ December 1985. Mkpali rịrị elu ka anyị malitere ifeda n’ọdụ ụgbọelu mba nile dị na Nairobi, Kenya. Mgbe anyị na-abanye obodo ukwu ahụ, ncheta dị iche iche bịaghachiri, nke ebe na ụda ndị a ma ama kpaliri.
ANYỊ bịara Kenya ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi” nke Ndịàmà Jehova. Afọ 12 tupu mgbe ahụ, a manyewo mụ na nwunye m ịpụ na Kenya n’ihi mmachibido a machibidoro ọrụ nkwusa anyị. Anyị ebiwo n’ebe ahụ na Betel, aha e nyere ihe owuwu alaka nile nke Ndịàmà Jehova. Lee ihe ịtụnanya obi ụtọ na-echere anyị mgbe anyị lọghachiri ebe ahụ ileta ya!
Onye nọ na-enye aka ịkwadebe nri ehihie na Betel bụ Onyeàmà na-eto eto anyị mawooro kemgbe ọ dị afọ abụọ. Ọ dịkarịa ala mmadụ isii so n’ezinụlọ Betel bụ ndị anyị maara mgbe ha bụ ụmụaka. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ha ugbu a dị ka ndị ntorobịa, ha na ezinụlọ ha, ha nile ka gbasie ike n’ozi ahụ! Chineke anyị, bụ́ Jehova, elekọtawo ha n’ikwekọ ná nkwa Bible: “N’ebe onye ebere nọ Ị ga-egosi Onwe gị onye ebere.” (2 Samuel 22:26) Lee ọdịiche m hụrụ n’etiti ndụ m dị ka nwata na ndụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nke ndị ntorobịa a na-ebi!
Ndụ Nwata Na-enweghị Nzube
A mụrụ m na Scarborough, England, n’August 14, 1918. Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị nne m na nwanne m nwanyị nkuchi kwagara Canada, ya mere m binyeere nna m, nne ya, na nwanne ya nwanyị, ruo afọ atọ sochirinụ. Mgbe m gbara afọ ise, nne m tọọrọ m ma kpọrọ m gaa Montreal, Canada. Afọ anọ mgbe nke ahụ gasịrị o zilaghachiri m England ibinyere nna m na ịga akwụkwọ.
Nne m na nwanne m nwanyị nkuchi detaara m akwụkwọ n’ihe dị ka ọnwa isii ọ bụla. Ná ngwụsị nke akwụkwọ ozi ha, ha ga-ekwupụta mmasị ha nwere ka m bụrụ ezi nwa amaala, na-eguzosi ike n’ihe nye Eze na mba. Eleghị anya nzaghachi m adabaghị n’ihe ha chere n’ihi na m dere na m kweere na ịhụ mba n’anya na agha ezighị ezi. Ma, n’enweghị nduzi doro anya, n’oge m nọ n’afọ iri na ụma, m nọ nnọọ na-awụgharị.
Mgbe ahụ na July 1939, izu isii tupu Agha Ụwa nke Abụọ amalite, e debara aha m n’usuu ndị agha Britain. M dị nanị afọ 20. N’oge na-adịghị anya e zijere ìgwè ndị agha m so na ya n’ebe ugwu France. Mgbe ụgbọelu ndị Germany wakporo anyị, anyị bụ ndị na-eto eto tụrụ ma gbaa ha égbè anyị. Ọ bụ ndụ na-atụ ụjọ. Anyị laghachiri azụ mgbe anyị zutere ndị agha Germany na-abịanụ, m sokwa n’ime ndị e bupụrụ na Dunkirk n’izu mbụ nke June 1940. M ka ji ụjọ na-echeta ìgwè ozu ndị agha ghasasịrị n’ụsọ mmiri ahụ nile. Alanarịrị m oké ihe ọjọọ ahụ ma jiri ntakịrị ụgbọelu bịarute Harwich n’ebe ọwụwa anyanwụ England.
N’afọ na-esonụ, na March 1941, e zijere m India. N’ebe ahụ m natara ọzụzụ dị ka onye na-arụzi ngwá ọrụ. Mgbe m nọsịrị oge ụfọdụ n’ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa m butere, a kpọfere m n’ìgwè ndị agha nọ na Delhi, isi obodo India. N’ịnọ ebe dị anya site n’obodo m, n’enwetachabeghịkwa onwe m, m malitere iche banyere ọdịnihu. M chere karịsịa banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ.
Igosipụta Iguzosi Ike n’Ihe nke Ọhụrụ
Onye England ibe m, Bert Gale, bụ onye mụ na ya bi n’otu ọnụ ụlọ na Delhi. Otu ụbọchị o kwuru na “okpukpe sitere n’Ekwensu,” okwu nke kpaliri mmasị m. Nwunye ya aghọwo otu n’ime Ndịàmà Jehova, sitekwa n’oge ruo n’oge, ọ na-ezitere ya mbipụta Bible dị iche iche. Otu n’ime ndị a, akwụkwọ nta bụ́ Hope, dọọrọ mmasị m. Ntụle ọ tụlere olileanya nke mbilite n’ọnwụ nyere m ezi echiche nke ịdị jụụ.
N’otu oge ná mmalite 1943, Bert gwara onye nkịtị bụ onye Britain na India, bụ́ Teddy Grubert okwu, bụ́ onye sooro anyị rụọ ọrụ n’ogige ndị agha. Ọ tụrụ anyị n’anya ịnụ na Teddy bụ Onyeàmà. Ọ bụ ezie na na 1941 a machibidowo mbipụta nke Ndịàmà Jehova iwu, ọ kpọọrọ anyị gaa nzukọ ndị Ndịàmà na-enwe na Delhi. N’ọgbakọ nta ahụ, ahụrụ m ezi mkpakọrịta, nke na-ekpo ọkụ na nke mbụ ya ná ndụ m. Basil Tsatos, nwanna nwoke onye Kraịst meworo okenye karị nke sitere Gris, gosiri mmasị onwe onye n’ebe m nọ ma zaa ajụjụ m nile. O nyere azịza Bible doro anya nye ajụjụ banyere ihe mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ, mbilite n’ọnwụ, na ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke Chineke kwere ná nkwa.—Ọrụ 24:15; Ndị Rom 5:12; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.
Akwụkwọ nta Peace—Can It Last?, nke e bipụtara na 1942, dọọrọ mmasị m karịsịa. Ọ kọwara Njikọ Mba Nile dị ka “anụ ọhịa na-acha uhie uhie.” (Mkpughe 17:3) N’ihota isi nke 17, amaokwu nke 11, nke Mkpughe, akwụkwọ nta ahụ sịrị: “A pụrụ ikwu ugbu a na Njikọ ahụ ‘dịịrị, ọ dịghịkwa ugbu a.’” N’ịga n’ihu, ọ sịrị: “Òtù nke mba ụwa ga-ebili ọzọ.” Na 1945, ihe dị ka afọ atọ n’ihu, nke ahụ bụ kpọmkwem ihe merenụ mgbe e hiwere òtù Mba Ndị Dị n’Otu!
N’oge a machibidoro akwụkwọ Ndịàmà iwu, enwere m ike inyere ndị enyi m metara ọhụrụ aka. Ọ bụrụ na otu katọn nke akwụkwọ nta Peace—Can It Last? erute, ọgbakọ ebunye m ya maka nchebe. Ònye ga-eche n’echiche ịchọ akwụkwọ a machibidoro iwu n’ogige ndị agha? Oge ọ bụla m gara nzukọ, m na-ewere akwụkwọ nta ole na ole iji hụ na ụmụnna ndị ahụ nwere ha. Ọbụna na m zoro akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible mgbe ha tụrụ ụjọ na a ga-enyocha ebe obibi ha. N’ikpeazụ, na December 11, 1944, e wepụrụ mmachibido ahụ.
E tinyere iguzosi ike n’ihe m nye nkụzi ndị Kraịst n’ule n’oge ememe Krismas nke 1943 nke a haziri maka ìgwè ndị agha anyị. Ajụrụ m ikere òkè, ebe m mụtaworo na a mụghị Jisọs n’oge oyi nke December nakwa na ndị Kraịst oge mbụ agbaghị Krismas.—Tụlee Luk 2:8-12.
Mgbe e mere mgbakọ “Ndị Nkwusa E Jikọrọ n’Otu” na Jubbulpore (Jabalpur) December 27 ruo 31, 1944, eso m n’ime ihe dị ka 150 bịaranụ. Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ jiri ụgbọ okporo ígwè mee njem site na Delhi, njem nke ihe karịrị kilomita 600. Ọ dịghị mgbe m ga-echezọ ọnọdụ ahụ magburu onwe ya nke dị na mbara èzí, ebe m hụrụ nzukọ Jehova n’ọrụ.
E nyere ndị bịara mgbakọ ụlọ n’ebe obibi ụlọ akwụkwọ, ebe anyị bụrụ abụ Alaeze ma nwee mkpakọrịta ndị Kraịst obi ụtọ. N’oge mgbakọ ahụ m malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha, ọrụ nke nọgideworo na-adị oké ọnụ ahịa nye m.
Ozi Oge Nile n’England
M laghachiri England na 1946, amalitekwara m n’oge na-adịghị anya isonyere Ọgbakọ Wolverton. Ọ bụ ezie na anyị nwere nanị ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze iri, ndị a mere ka ahụ ruo m ala, m nwekwara ụdị afọ ojuju ahụ m nwere n’etiti ụmụnna m n’India. Vera Clifton pụrụ iche n’ọgbakọ ahụ dị ka ezi onye nwere obiọma. Mgbe m matara na o nwere ọchịchọ yiri nke m ịbụ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile, anyị lụrụ, na May 24, 1947. M wuru otu caravan, ma ọ bụ ụlọ mbugharị, n’afọ na-esokwanụ, anyị natara ebe mbụ anyị ga-asụ ụzọ, ime ime obodo bụ́ Huntingdon.
N’ụbọchị ndị ahụ anyị ji ịnyịnya ígwè anyị aga ókèala dị n’ime ime obodo n’isi ụtụtụ. Ụbọchị zuru ezu nke nkwusa anyị bụ nanị nke a na-akwụsịtụ n’ehihie iji rie nri. N’agbanyeghị otú ifufe na-eku anyị n’ihu si ekusi ike ma ọ bụ otú mmiri si na-ezosi ike mgbe anyị na-ala, anyị nwere obi ụtọ na afọ ojuju n’ọrụ Onyenwe anyị.
Ka oge na-aga ọ gụrụ anyị agụụ ịgbasawanye ozi anyị na isoro ndị nke mba ndị ọzọ kerịta “ozi ọma” ahụ. (Matiu 24:14) Ya mere anyị tinyere akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ ozi ala ọzọ Gilead dị na South Lansing, New York, U.S.A. N’ikpeazụ, a nabatara anyị na klas nke 26 nke Gilead gụsịrị akwụkwọ na February 1956.
Ozi A Gbasawanyere n’Africa
Ebe anyị ga-aga ozi ala ọzọ anyị bụ Northern Rhodesia (Zambia ugbu a) n’Africa. N’oge na-adịghị anya mgbe anyị rutesịrị, a kpọrọ anyị òkù ije ozi na Betel mba ahụ. Dị ka akụkụ ọrụ m na Betel, m lekọtara nderịta akwụkwọ anyị na Ọwụwa Anyanwụ Africa. Na 1956, Kenya—otu n’ime mba ndị a nọ n’Ọwụwa Anyanwụ Africa—nwere nanị Ndịàmà anọ, ebe e nwere ihe karịrị nnọọ 24,000 na Northern Rhodesia. Mụ na Vera malitere iche otú ọ ga-esi abụ ihe dị mma ije ozi ebe e nwere mkpa ka ukwuu.
Mgbe ahụ, n’abụghị ihe a tụrụ anya ya, anatara m ịkpọ òkù ọzọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead, n’oge a maka ọzụzụ ga-ewe ọnwa iri maka ndị nlekọta. N’ịhapụ Vera na Northern Rhodesia, agara m New York City, bụ́ ebe Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị n’oge ahụ. Mgbe m natasịrị ọzụzụ ahụ na November 1962, e kenyere m ọrụ na Kenya iji guzobe alaka ụlọ ọrụ n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ Kenya nwere ihe karịrị otu narị Ndịàmà.
Mgbe m lọghachiri Northern Rhodesia ịgakwuru Vera, ekwesịrị m ịkwụsịtụ na Nairobi, Kenya. Ma mgbe m rutere, Bill Nisbet, onye gụsịrị akwụkwọ na Gilead na klas nke 25, gwara m na e nwere ohere inweta ikike ndị ọchịchị ịbanye Kenya ozugbo. Anyị gakwuuru ndị ọrụ na-enyocha ndị si mba ọzọ, n’ime minit ole na ole kwa enwetawo m ikike ịrụ ọrụ ruo afọ ise. Ya mere alaghachighị m Northern Rhodesia ọzọ; kama nke ahụ, Vera sonyeere m na Nairobi.
Mgbe usoro ọmụmụ asụsụ Swahili nke a haziri maka anyị gasịrị, anyị sonyeere ntakịrị ọgbakọ Nairobi n’ozi. N’oge ụfọdụ mgbe anyị gụpụtasịrị okwu anyị na Swahili, onye nwe ụlọ ga-ekwu n’olu dara ụda, sị, “Adịghị m aghọta Bekee!” N’agbanyeghị nke a, anyị nọgidesiri ike ma jiri nwayọọ nwayọọ merie ihe mgbochi asụsụ ahụ.
Ókèala anyị gụnyere ìgwè ụlọ ndị nwere ụdị aha Bible ndị dị ka Jerusalem na Jeriko. A zụlitere mmasị ngwa ngwa, ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze ọhụrụ sitekwara n’ebe ndị a. Lee mmetụta dị ịrịba ama eziokwu Bible nwere n’ahụ ndị a! Echiche nke ebo bụ ọkà ibe pụrụ n’anya ka iguzosi ike n’ihe nye Alaeze ahụ wetara ịdị n’otu n’etiti ndị Jehova. Ọbụna na ebo dị iche iche lụrịtara onwe ha, ihe a na-adịghị ahụkebe n’etiti ndị na-abụghị Ndịàmà.
Ndị nkwusa Alaeze ọhụrụ ji ịnụ ọkụ n’obi nara eziokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ dị Samson ọkụ n’obi ka eziokwu Bible banye n’obodo ya nke na ọ nọgidere na-arịọ ka e zije ndị ọsụ ụzọ n’ebe ahụ. N’ezie, ọ gbakwụnyere ihe n’ụlọ ya dị n’ógbè Ukambani iji nye ha ebe obibi. N’oge na-adịghị anya e hiwere otu ọgbakọ ọhụrụ nke ndị nkwusa Alaeze n’ebe ahụ.
Ọtụtụ mgbe eletara m ụmụnna anyị na mba Ọwụwa Anyanwụ Africa bụ́ Etiopia. Ha na-etinye nkezi nke ihe karịrị hour 20 n’otu ọnwa n’ozi, n’agbanyeghị ịtụ mkpọrọ, iti ihe, na nledo mgbe nile. N’otu mgbe bọs abụọ bu ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị Etiopia mere njem ruo otu izu, na-agbafere ụzọ ugwu dị ize ndụ, iji gaa mgbakọ distrikti na Kenya. Ịdị nkọ ha n’idokwa ka akwụkwọ Alaeze dịrị n’ala ha dị ịrịba ama. Anyị ndị nọ na Kenya nwere obi ụtọ inye aka izijere ha akwụkwọ mgbe nile.
Ndị ọchịchị machibidoro ọrụ anyị iwu na Kenya na 1973, a manyekwara ndị ozi ala ọzọ ịla. N’oge ahụ anyị nwere ihe karịrị Ndịàmà 1,200 na Kenya, ọtụtụ n’ime ndị nọkwa n’ọdụ ụgbọelu iji sị anyị gaa nke ọma a na-apụghị ichefu echefu. Ọnụnọ ha kpaliri otu onye njem ibe m ịjụ ma e nwere ka anyị si bụrụ ndị oké mmadụ. Mụ na Vera laghachiri England, e nyekwara anyị ọrụ ebe ahụ, ma ọ gụrụ anyị agụụ ịlaghachi Africa.
Ịlaghachi Africa
N’ihi ya, ọnwa ole na ole n’ihu, anyị natara ọrụ ọhụrụ anyị ịga na Betel dị n’Accra, isi obodo nke mba ọdịda anyanwụ Africa bụ́ Ghana. N’ebe a otu n’ime ọrụ e kenyere m wetara m ihu n’ihu n’ihe isi ike ndị ụmụnna anyị n’ebe ahụ na-ezute. Ka m na-ahụ maka ịzụta nri na ihe ndị dị mkpa maka ezinụlọ Betel, ọnụ ahịa rịrị elu ọjị nke ihe oriri juru m anya. Ọtụtụ mgbe mmadụ apụghị nnọọ ịzụta ihe ndị dị mkpa. Ụkọ mmanụ ụgbọala na ụkọ akụkụ ahụ ụgbọala wetara nsogbu ndị ọzọ.
M bịara mụta mkpa nke ndidi, ihe ụmụnna anyị ndị Ghana zụliteworo. Ọ bụ ihe na-agba ume nke ukwuu ịhụ àgwà obi ụtọ ha nọgidere na-enwe ka ha na-ajụ ọnwụnwa inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ site n’ịna aka azụ. N’ihi ya, a maara ndị Jehova nọ na Ghana nke ọma maka ịkwụwa aka ọtọ ha, ha nwekwara ezi aha n’ebe ọtụtụ ndị ọchịchị nọ.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị ụkọ ihe onwunwe, e nwere ọganihu ime mmụọ na-aba ụba. N’ala ahụ nile, a na-ahụta mbipụta Bible anyị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe obibi nile. Anyị hụkwara ka ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa alaeze na Ghana toro site na 17,156 na 1973 mgbe anyị rutere gaa n’ihe karịrị 23,000 na 1981. N’afọ ahụ ntiwapụ nke ọrịa cancer akpụkpọ ahụ m, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ kawanyere njọ n’ihi ọtụtụ afọ nke ịnọ n’okpuru anwụ n’India na Africa, manyere anyị ịhapụ Ghana ma laghachi England maka ọgwụgwọ chiri anya.
Ọnọdụ Ndị Ọhụrụ n’England
Nye m nlaghachi anyị pụtara mgbanwe dị ukwuu n’ozi m. Ịgwa ndị na-akwanyere Chineke na Bible ùgwù okwu n’ụzọ dị mfe amarawo m nnọọ ahụ. Ma na London, ọ rara ahụ ịchọta ụdị àgwà ahụ. Nnọgidesi ike nke ụmụnna nọ na Britain na-eju m anya. Nke a emewo ka m hụ mkpa nke ịzụlitekwu mmetụta ọmịiko maka ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa’ n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 9:36.
Mgbe anyị si n’Africa lọghachisịa, mụ na Vera jekọrọ ozi na Betel London ruo oge ọnwụ ya na September 1991 n’afọ ndụ nke 73. Ọ dịbeghị mfe ịbụ onye onye ibe kwesịrị ntụkwasị obi dị otú ahụ nwụnahụrụ, bụ́ onye sooro m dọgbuo onwe ya n’ọrụ n’ozi ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ọnwụ ya na-ewute m nke ukwuu. Ma obi dị m ụtọ maka nkwado ọma m natara site n’aka ezinụlọ Betel anyị nke nwere ihe dị ka ndị òtù 250.
N’ezie m na-agụ ya dị ka ihe ùgwù ịhụ ịga n’ihu nke nzukọ Jehova nakwa ịhụ ọtụtụ ka ha na-eme ozi oge nile ụzọ ndụ ha. Apụrụ m imesi gị obi ike, e nweghị ụzọ ndụ ka nke a mma, n’ihi na ‘Jehova adịghị ahapụ ndị ebere Ya.’—Abụ Ọma 37:28.
[Foto dị na peeji nke 23]
Anyị sụrụ ụzọ n’England malite na 1947 ruo 1955
[Foto dị na peeji nke 23]
Nke mbụ n’ozi n’oge otu mgbakọ n’India
[Foto dị na peeji nke 23]
Mgbe anyị bụ ndị ozi ala ọzọ na Northern Rhodesia
[Foto dị na peeji nke 23]
Na 1985, anyị na ndị enyi anyị anyị na-ahụtụbeghị eri afọ 12