“Jehova Agaghị Aha Ndị Ya Aka”
“Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.”—ABỤ ỌMA 34:19.
1, 2. (a) Olee otú Jehova si agọzi ndị ya taa? (b) Gịnị ka ọtụtụ ndị Kraịst na-ezute, oleekwa ajụjụ ndị na-ebilite?
NÁ MMEZU nke amụma Bible, ndị na-efe Jehova bi na paradaịs ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 12:1-4) Ndịàmà Jehova nọ n’òtù mba nile nke e ji ịhụnanya na ịdị n’otu mara. (Jọn 13:35) Ha na-enweta ihe ọmụma eziokwu Bible nke miri emi ma zuo ezu. (Aịsaịa 54:13) Lee aha ekele ha nwere n’ebe Jehova nọ na ọ na-enye ha ihe ùgwù nke ịbụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ime mmụọ ya!—Abụ Ọma 15:1.
2 Ọ bụ ezie na ndị nile nọ ná nzukọ Jehova na-anụ ụtọ ọganihu ime mmụọ, o yiri ka ụfọdụ na-ebitụ ndụ udo na ịnọ jụụ ebe ndị ọzọ na-enwe otu ụdị ihe otiti ma ọ bụ ọzọ. Ọtụtụ ndị Kraịst na-achọta onwe ha n’ọnọdụ kwesịrị imere ebere ruo ogologo oge, n’atụghịkwa anya ahụ efe ọ bụla. A na-enwekarị nkụda aka n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ. (Ilu 13:12) Ọdachi hà bụ ihe àmà nke iwe Chineke? Jehova ọ̀ na-enye ụfọdụ ndị Kraịst nchebe pụrụ iche ma na-aha ndị ọzọ aka?
3. (a) Ọ̀ bụ Jehova na-akpata ahụhụ ndị ya na-ata? (b) N’ihi gịnị ka ọbụna ndị na-efe Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ji ata ahụhụ dị ka mmadụ?
3 Bible na-aza, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ịsị, mgbe a na-anwa ya, A na-esite n’aka Chineke anwa m: n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Jehova bụ Onye Nchebe na Onye Nkwado nke ndị ya. (Abụ Ọma 91:2-6) “Jehova agaghị aha ndị Ya aka.” (Abụ Ọma 94:14) Nke a apụtaghị na ndị na-efe ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi agaghị ata ahụhụ. Ọ bụ mmadụ ndị ketara ezughị okè eketa na-achị usoro ihe nke dị ugbu a. Ọtụtụ rụrụ arụ, ole na ole kwa bụ nnọọ ndị arụrụala. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha na-elegara Jehova anya maka amamihe. Nke a na-akpata ọtụtụ ahụhụ ụmụ mmadụ. Bible na-eme ka o doo anya na ndị Jehova apụghị izere mgbe nile ihe ọjọọ ndị ezughị okè na ajọ omume mmadụ na-akpata.—Ọrụ 14:22.
Ndị Kraịst Na-eguzosi Ike n’Ihe Na-atụ Anya Ịta Ahụhụ
4. Gịnị ka ndị Kraịst nile pụrụ ịtụ anya ya ma ọ bụrụhaala na ha bi n’usoro ihe ọjọọ nke a, n’ihi gịnịkwa?
4 Ọ bụ ezie na ha abụghị akụkụ nke ụwa, ụmụazụ Jisọs na-ebi n’ime usoro ihe nke a. (Jọn 17:15, 16) E kpughere Setan n’ime Bible dị ka ike na-achị isi na-akwado ụwa a. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ndị Kraịst nile pụrụ ịtụ anya na ha aghaghị izute nsogbu siri ike n’otu oge. N’iburu nke ahụ n’uche, Pita onyeozi na-asị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu maara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:8, 9) Ee, òtù ụmụnna bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya ahụhụ.
5. Olee otú Jisọs siri mee ka o doo anya na ihe mwute ga na-eme ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ná ndụ?
5 Ọ bụrụgodị na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ụzọ miri emi, bụrụkwa ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ụkpụrụ ya, ihe mwute ga-eme anyị ná ndụ. Jisọs mere ka nke a doo anya n’ihe atụ ya nke e dekọrọ na Matiu 7:24-27, ebe ọ kọwara ihe dị iche n’etiti ndị na-erubere okwu ya isi na ndị na-adịghị erube isi. O ji ndị na-eso ụzọ ya na-erube isi tụnyere nwoke nwere uche onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume siri ike. O ji ndị na-adịghị erubere okwu ya isi tụnyere nwoke bụ́ onye nzuzu nke wuru ụlọ ya n’elu ájá. Mgbe oké ifufe fesịrị, nanị ụlọ e wuru n’elu oké nkume lanarịrị. Rịba ama na n’ọnọdụ nke ụlọ nwoke ahụ nwere uche, “mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee makwasị ụlọ ahụ; ma ọ daghị.” Jisọs ekweghị nkwa na nwoke ahụ nwere uche ga na-enwe udo na ịdị jụụ mgbe nile. Kama nke ahụ, inwe uche nke nwoke ahụ ga-akwadebe ya ịnagide oké ifufe ahụ. E nyekwara otu echiche ahụ n’ilu nke ọgha mkpụrụ ahụ. N’ime ya Jisọs na-akọwa na ọbụna ndị na-efe ofufe na-erube isi nwere “ezi obi dị mma” ga-eji “ntachi obi mịa mkpụrụ.”—Luk 8:4-15.
6. N’ihe atụ Pọl banyere ihe ọkụ na-apụghị irechapụ, òle ndị ka e ji ọkụ ele ule?
6 N’idegara ndị Kọrint akwụkwọ, Pọl onyeozi ji asụsụ okwu myirịta kọwaa mkpa e nwere maka àgwà ndị na-adịgide adịgide ndị pụrụ inyere anyị aka iche ule ihu. Ụdị ihe ọkụ na-apụghị irechapụ dị ka ọlaedo, ọlaọcha, na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa na àgwà nsọpụrụ Chineke bụ otu ihe ahụ. (Tụlee Ilu 3:13-15; 1 Pita 1:6, 7.) N’aka nke ọzọ, e ji àgwà anụ ahụ atụnyere ihe ndị pụrụ ire ọkụ. Mgbe ahụ Pọl na-asị: “A ga-eme ka ọrụ nke mmadụ nile n’otu n’otu pụta ìhè: n’ihi na ụbọchị ahụ ga-egosi ya, n’ihi na a gaje ikpughe ya n’ọkụ; ọkụ onwe ya ga-anwakwa ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu, aha ọrụ ọ bụ. Ọ bụrụ na ọrụ onye ọ bụla ga-adịgide nke o wukwasịrị ya, ọ ga-anara ụgwọ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 3:10-14) N’ebe a kwa, Bible na-akọwa na anyị nile ga-echerịrị ụdị ụfọdụ nke ule siri ike ihu.
7. Dị ka Ndị Rom 15:4 si ekwu, olee otú Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere anyị aka ịtachi obi n’ule?
7 E nwere ọtụtụ ihe ndekọ dị na Bible banyere ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị na-aghaghị ịtachi obi n’ọtụtụ ọdachi, mgbe ụfọdụ ruo ogologo oge. Ma, Jehova ahaghị ha aka. O yiri ka Pọl onyeozi bu ụdị ihe atụ ndị dị otú ahụ n’uche mgbe ọ sịrị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Tụlee ihe atụ nke ndị ikom atọ ndị nwere ọtụtụ ọdachi, ọ bụ ezie na ha so Chineke nwee mmekọrịta chiri anya.
Ihe Anyị Na-amụta Site n’Ihe Ndekọ Bible
8. Gịnị ka Jehova kwere ka o mee n’ihe banyere Josef, ruokwa oge hà aṅaa?
8 Jehova nwere ihu ọma n’ebe nwa nwoke Jekọb bụ́ Josef nọ site na nwata. Ma, n’abụghị ya ka o si n’aka, ọtụtụ ọdachi dakwasịrị ya. Ụmụnna ya tọọrọ ya ma mesoo ya n’ụzọ obi ọjọọ. E rere ya dị ka ohu n’ala ọzọ ebe e boro ya ebubo ụgha ma tụnye ya “n’olulu.” (Jenesis 40:15) N’ebe ahụ, “ha weere agbụ kesie ụkwụ ya abụọ ike; mkpụrụ obi ya bara n’ígwè.” (Abụ Ọma 105:17, 18) N’oge ọ nọ n’ohu na ná mkpọrọ, obi abụọ adịghị ya na Josef rịọrọ Jehova ugboro ugboro maka ntọhapụ. Ma, ruo ihe dị ka afọ 13, n’agbanyeghị na Jehova mere ka o nwee ume n’ọtụtụ ụzọ, o tetara kwa ụtụtụ ka bụrụ ohu ma ọ bụ onye mkpọrọ.—Jenesis 37:2; 41:46.
9. Gịnị ka Devid na-aghaghị ịtachiri obi ruo ọtụtụ afọ?
9 Ọnọdụ yiri nke ahụ bụ nke Devid. Mgbe Jehova na-ahọrọ nwoke ruru eru ịchị Israel, ọ sịrị: “Achọtawo m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka obi m si achọ, onye ga-eme ihe nile M na-achọ.” (Ọrụ 13:22) N’agbanyeghị ihu ọma o nwere n’anya Jehova, Devid tara ahụhụ dị ukwuu. N’ihe ize ndụ nke ọnwụ, o zoro ruo ọtụtụ afọ n’ọzara, n’ọ́gbà, n’oghere, na n’ala ọzọ. Ịbụ onye a chụgharịrị dị ka anụ ọhịa, o nwere nkụda aka, tụọkwa egwu. Ka o sina dị, ọ tachiri obi n’ike Jehova. Site n’ahụmahụ nke ya Devid nwere ike ikwu n’izi ezi, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.”—Abụ Ọma 34:19.
10. Oké ọdachi dị aṅaa dakwasịrị Nebọt na ezinụlọ ya?
10 N’ụbọchị Elaịja onye amụma, e nwere nanị mmadụ 7,000 nọ n’Israel ndị na-egbubeghị ikpere nye chi ụgha bụ́ Beal. (1 Ndị Eze 19:18; Ndị Rom 11:4) Nebọt, onye o yikarịrị na ọ bụ otu n’ime ha, ghọrọ onye e ji ikpe na-ezighị ezi dị egwu mekpọọ ọnụ. O nwere mmechuihu nke ịbụ onye e boro ebubo nkwulu. N’ịbụ onye a tara ụta, a mara ya ikpe, bụrụkwa onye e ji iwu eze kpebie na a ga-eji nkume tụgbuo, nkịta rachakwara ọbara ya. Ọbụna na e gburu ụmụ ya ndị ikom! Ma, aka ya dị ọcha n’ebubo ahụ. Ndị gbagidere ya akaebe bụ ndị ụgha. Ihe ahụ dum bụ nkata Eze Nwanyị Jezebel kpara ka eze wee nwee ike iweghara ubi vine Nebọt.—1 Ndị Eze 21:1-19; 2 Ndị Eze 9:26.
11. Gịnị ka Pọl onyeozi na-agwa anyị banyere ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’akụkọ ihe mere eme Bible?
11 Josef, Devid, na Nebọt bụ nanị atọ n’ime ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi a kpọtụrụ aha n’ime Bible, ndị ọdachi dakwasịrị. Pọl onyeozi dere ntụleghachi akụkọ ihe mere eme banyere ndị ohu Jehova eri ogologo oge. N’ime ya o kwuru okwu banyere ndị “a nwara ọnwụnwa nke ihe ọchị na ụtarị, ee, tụkwasị ihe ndị a, nke agbụ na ụlọ mkpọrọ: a tụrụ ha nkume, a kwọwara ha, a nwara ha, e weere ihu mma agha gbuo ha: ha jere akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu na-ejegharị; ebe ha nọ ná mkpa, a na-akpagbu ha, a na-emejọ ha (ndị ụwa na-ekwesịghị), na-awagharị n’ọhịa na ugwu na ọgba na ọnụ nke ala.” (Ndị Hibru 11:36-38) Ma Jehova ahaghị ha aka.
Jehova Na-elekọta Ndị Na-ata Ahụhụ
12. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime mkpagbu Ndịàmà Jehova na-enwe taa?
12 Gịnị banyere ndị Jehova taa? Dị ka otu nzukọ, anyị na-atụ anya nchebe Chineke na ịgabiga mgbe ikpeazụ na oké mkpagbu ahụ n’emerụghị ahụ. (Aịsaịa 54:17; Mkpughe 7:9-17) Otú ọ dị, dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, anyị na-aghọta na “mgbe na ihe ndapụta” na-adabara mmadụ nile. (Eklisiastis 9:11) Taa e nwere ọtụtụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ndị ọdachi na-adakwasị. Ụfọdụ na-atachi obi n’ogbenye ọnụ ntụ. Bible na-ekwu banyere ndị Kraịst bụ́ “ụmụ mgbei na ndị di ha nwụrụ” nwere mkpagbu. (Jemes 1:27) Ndị ọzọ na-ahụju anya n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha, agha, mpụ, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọrịa, na ọnwụ.
13. Ahụmahụ siri ike ndị dị aṅaa ka a kọrọ akụkọ ha n’oge na-adịbeghị anya?
13 Dị ka ihe atụ, n’akụkọ ozi 1996 ha nyere Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower kọrọ na ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ná mkpọrọ n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha n’ihi na ha na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ Bible. E kposara ọgbakọ atọ n’otu mba dị na Ndịda America mgbe ìgwè ndị agha okpuru manyere ọtụtụ narị Ndịàmà ịkwapụ n’ógbè ahụ. N’otu mba dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa, e gburu ụfọdụ Ndịàmà e jibidoro n’obere agha obodo. N’otu mba dị n’Etiti Kọntinent America, ajọ mwakwasị nke oké ifufe mere ka ọnọdụ akụ̀ na ụba dịworị njọ nke ụmụnna ụfọdụ ka njọ. N’ebe ndị ọzọ, ebe ịda ogbenye na ụkọ nri nwere ike ghara ịbụ oké nsogbu, mmetụta ọjọọ pụrụ ibelata ọṅụ ụfọdụ ndị. Nrụgide nke ndụ oge a na-anyịgbu ndị ọzọ. N’ihi enweghị mmasị nke ọha na eze, ndị ọzọkwa pụrụ ịdị na-enwe nkụda aka mgbe ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.
14. (a) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ilereanya Job? (b) Kama ịdị na-eche echiche n’ụzọ na-ezighị ezi, gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ata ahụhụ?
14 A gajeghị ịghọta ọnọdụ ndị a dị ka ihe àmà nke iwe Chineke. Cheta ihe banyere Job na ọtụtụ ahụhụ ọ tara. Ọ bụ “nwoke zuru okè, ziekwa ezi.” (Job 1:8) Lee ka Job na-aghaghị isiwo nwee nkụda mmụọ mgbe Elifaz boro ya ebubo ime ihe ọjọọ! (Job, isi nke 4, 5, 22) Anyị ekwesịghị ịdị ngwa n’ikpebi na anyị na-enwe ọdachi n’ihi na anyị emechuwo Jehova ihu n’ụzọ ụfọdụ ma ọ bụ n’ihi na Jehova ewepụwo ngọzi ya. Inwe echiche na-ezighị ezi n’ihu mkpagbu pụrụ ime ka okwukwe anyị daa mbà. (1 Ndị Tesalọnaịka 3:1-3, 5) Mgbe anyị na-ahụ ahụhụ, ọ kasị mma ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova na Jisọs nọ ndị ezi omume nso n’agbanyeghị ihe na-emenụ.
15. Olee otú anyị si mara na Jehova nwere nchegbu miri emi banyere ọdachi ndị na-adakwasị ndị ya?
15 Pọl onyeozi na-emesi anyị obi ike mgbe ọ na-asị: “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst? Ọ̀ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oké mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oké ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha? . . . E mewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:35, 38, 39) Jehova na-eche banyere anyị n’ụzọ miri emi, ọ makwa banyere ahụhụ anyị na-ata. Mgbe ọ ka bụ onye ọsọ ndụ, Devid dere, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa.” (Abụ Ọma 34:15, 18; Matiu 18:6, 14) Nna anyị nke eluigwe na-eche banyere anyị, ọ na-enwekwa obi ebere n’ahụ ndị na-ata ahụhụ. (1 Pita 5:6, 7) Ọ na-enye ihe dị anyị mkpa iji tachie obi, n’agbanyeghị ahụhụ anyị pụrụ ịdị na-ata.
Onyinye Jehova Na-akwagide Anyị
16. Ndokwa ndị dị aṅaa sitere n’aka Jehova na-enyere anyị aka ịtachi obi, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
16 Ọ bụ ezie na anyị agaghị atụ anya ndụ na-enweghị ahụhụ n’usoro ihe ochie nke a, a “dịghị ahapụ nanị” anyị. (2 Ndị Kọrint 4:8, 9) Jisọs kwere nkwa inye ụmụazụ ya onye nkasi obi. Ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, Ọ ga-enyekwa unu Onye nkasi obi ọzọ, ka Ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ Mmụọ nke eziokwu.” (Jọn 14:16, 17) Na Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi gwara ndị na-ege ya ntị na ha nwere ike ịnata “onyinye a, bụ́ Mmụọ Nsọ.” (Ọrụ 2:38) Mmụọ nsọ ọ̀ na-enyere anyị aka taa? Ee! Ike ọrụ Jehova na-enye anyị mkpụrụ magburu onwe ya: “Ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ndị a nile bụ àgwà bara oké uru ndị na-enyere anyị aka ịtachi obi.
17. Olee ụfọdụ eziokwu Bible ndị na-ewusi okwukwe na mkpebi anyị ike iji ndidi chere Jehova?
17 Mmụọ nsọ na-enyekwara anyị aka ịghọta na mkpagbu ndị dị ugbu a “dị mfe, nke dị na nwa oge a,” ma e jiri ha tụnyere ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi. (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Obi siri anyị ike na Chineke agaghị echefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị na-egosi ya. (Ndị Hibru 6:9-12) Ịgụ okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Bible, a na-akasi anyị obi site n’ihe ilereanya nke ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke oge gboo ndị tachiri obi n’ọtụtụ ọdachi ma bụrụ ndị e kwuru na ha bụ ndị ngọzi dịịrị. Jemes na-ede, sị: “Ụmụnna m, natanụ ndị amụma ahụ, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Onyenwe anyị, dị ka ihe ilereanya nke ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi. Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi.” (Jemes 5:10, 11) Bible na-ekwe nkwa “ọkịka nke ike” inyere anyị aka ịtachi obi n’ule. Jehova na-ejikwa olileanya nke mbilite n’ọnwụ na-agọzi anyị. (2 Ndị Kọrint 1:8-10; 4:7) Site n’ịgụ Bible kwa ụbọchị na ịtụgharị uche ná nkwa ndị a, anyị ga-ewusi okwukwe anyị na mkpebi anyị ike iji ndidi chere Chineke.—Abụ Ọma 42:5.
18. (a) Ná 2 Ndị Kọrint 1:3, 4, gịnị ka a na-agba anyị ume ime? (b) Olee otú ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi gosi na ha bụ isi iyi nke nkasi obi na izu ike?
18 Tụkwasị na nke a, Jehova enyewo anyị paradaịs ime mmụọ bụ́ ebe anyị na-anụ ụtọ ezi ịhụnanya nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst. Anyị nile nwere ókè anyị ga-ekere n’ịkasi ibe anyị obi. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Karịsịa ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịbụ isi iyi gbara ọkpụrụkpụ nke nkasi obi na izu ike. (Aịsaịa 32:2) Dị ka “onyinye [n’ụdị, NW] mmadụ,” e nyere ha ọrụ iwuli ndị na-ata ahụhụ elu, ‘ịgụgụ ndị dara mbà n’obi,’ na ‘inyere ndị na-adịghị ike aka.’ (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) A na-agba ndị okenye ume iji magazin bụ́ Ụlọ Nche na Teta!, tinyere mbipụta ndị ọzọ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta, eme ihe nke ọma. (Matiu 24:45-47) Ndị a na-enwe ụba nke ndụmọdụ dabeere na Bible ndị pụrụ inyere anyị aka idozi—na ọbụna igbochi—ụfọdụ n’ime nsogbu ndị na-akpatara anyị nchegbu. Ka anyị ṅomie Jehova site n’ịkasirịta onwe anyị obi na ịgbarịta onwe anyị ume n’oge ndị siri ike!
19. (a) Gịnị na-enyere anyị aka izere ahụhụ ụfọdụ? (b) N’ụzọ bụ isi, ònye ka anyị na-aghaghị ịtụkwasị obi, gịnịkwa ga-enyere anyị aka iche ule ihu?
19 Ka anyị na-abamikwu n’ime mgbe ikpeazụ na ka ọnọdụ na-akawanye njọ n’usoro ihe nke a, ndị Kraịst na-eme ihe ha pụrụ ime iji zere ọdachi. (Ilu 22:3) Ezi echiche, anya udo, na ihe ọmụma nke ụkpụrụ Bible pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi amamihe. (Ilu 3:21, 22) Anyị na-aṅa ntị n’Okwu Jehova ma na-erubere ya isi iji zere mmehie ihe ndị na-agaraghị adị. (Abụ Ọma 38:4) Ka o sina dị, anyị na-aghọta na ọ dịghị ókè mgbalị anyị mere nke pụrụ iwepụ ahụhụ kpam kpam ná ndụ anyị. N’usoro ihe nke a, ọtụtụ ndị ezi omume na-eche ahụhụ ndị siri ike ihu. Otú ọ dị, anyị pụrụ izute ule anyị na-enwe obi ike zuru ezu na “Jehova agaghị aha ndị Ya aka.” (Abụ Ọma 94:14) Anyị makwaara na usoro ihe nke a na ihe otiti ya ga-apụ n’isi nso. Ya mere, ka anyị kpebie na ‘ike agaghị agwụ anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.’—Ndị Galetia 6:9.
Gịnị Ka Anyị Mụtara?
◻ Ule ndị dị aṅaa na-adakwasị òtù ụmụnna ndị Kraịst?
◻ Ihe atụ Bible ndị dị aṅaa na-enyere anyị aka ịghọta na ọdachi abụghị ihe àmà nke iwe Jehova?
◻ Olee mmetụta Jehova na-enwe banyere ahụhụ ndị ya na-ata?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime onyinye sitere n’aka Jehova ndị na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ule?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Devid, Nebọt, na Josef bụ mmadụ atọ ọdachi dị iche iche dakwasịrị