Zọpụta Ndụ Nwa Gị!
MICHAEL na Alphina bi ná ndagwurugwu dị n’ime ime obodo n’etiti ugwu akwụkwọ ndụ kpuchichara bụ́ KwaZulu-Natal, South Africa. Ha chere ọtụtụ ihe ịma aka ihu n’ịzụlite ụmụ asaa. Site ná nkwado nwunye ya kwadoro ya n’ụzọ zuru ezu, Michael mere ike ya nile irube isi n’iwu Bible nyere ndị bụ nna: “Na-azụpụta [ụmụ unu] n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ma nsogbu na-ebilite mgbe ụfọdụ.
Dị ka ihe atụ, ụmụ okorobịa Africa na-achị ìgwè ehi na-achịkọtakarị ehi nke nne na nna ibe ha ka ha wee nwekwuo oge igwurịkọ egwu. Mgbe ụfọdụ ha na-etinye aka n’ihe ọjọọ ma na-akọrị ihe ha na-ekwesịghị ịkọ. Mgbe ụmụ ndị ikom Michael gawara ịchị ehi ezinụlọ ha, o nyere ha ntụziaka siri ike ka ha ghara iso ụmụaka ụfọdụ na-akpakọrịta. (Jemes 4:4) Ma, mgbe o si ọrụ lọta, ọ na-ahụ ha mgbe ụfọdụ ka ha na-eme otú ahụ. N’ihi ya, ọ na-enye ha ntaramahụhụ.—Ilu 23:13, 14.
Ì chere na Michael dị aka ike gabiga ókè n’ebe ụmụ ya nọ? Ụfọdụ nwere ike iche otú ahụ, ma Jisọs Kraịst sịrị na “a gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.” (Matiu 11:9) Michael na Alphina mere ka e nwee ọnọdụ ịhụnanya n’ụlọ ha, na-ewepụta oge iso ụmụ ha nọkọọ na ịkụziri ha akụkọ na eziokwu Bible.
Michael na Alphina mụrụ ụmụ nwanyị anọ—Thembekile, Siphiwe, Tholakele, na Thembekani. Ha nile bụcha ndị nkwusa oge nile nke ozi ọma Alaeze Chineke. Abụọ n’ime ụmụ ha ndị ikom na-eje ozi dị ka ndị isi oche ndị nlekọta n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Nwa ha nwoke nke atọ, onye nwunye ya bụkwa onye nkwusa oge nile, na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi.
Ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ nne na nna nwere ezinụlọ buru ibu abụrụwo ndị e ji ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ha gọzie. Otú ọ dị, ụfọdụ ụmụaka natara ezigbo ọzụzụ nne na nna na-agbahapụ eziokwu ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị nne na nna ha na-eburu n’uche ilu Jisọs nke nwa mmefu ahụ ma na-enwe olileanya na nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwanyị ga-echegharị ma mesịa bịaruo nzọpụta.—Luk 15:21-24.
Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ụwa na-anapụ ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ụmụ ha nile. Nke a karịsịa bụ ihe na-akpata nchegbu n’akụkụ ụfọdụ nke Africa bụ́ ebe o yiri ka ụmụaka na-eme nke ọma ruo mgbe ha ruru n’afọ iri na ụma ha. Mgbe ahụ, ná ntoju ntorobịa, ụzọ rụrụ arụ nke ụwa Setan na-arata ha. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, ọtụtụ ndị bụ́ nna adịghị eru eru ije ozi dị ka ndị okenye ọgbakọ. (1 Timoti 3:1, 4, 5) N’ụzọ pụtara ìhè, nna bụ́ onye Kraịst kwesịrị iwere nzọpụta nke ezinụlọ ya dị ka ihe dị oké mkpa. Ya mere, gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji zọpụta ndụ ụmụ ha?
Bụrụ Ezi Enyi
Ọ bụghị nanị na Jisọs zuru okè kamakwa ọ ka mmadụ ọ bụla n’ihe ọmụma na ahụmahụ n’ụzọ dị ukwuu. Ka o sina dị, o mesoro ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè dị ka ezi ndị enyi. (Jọn 15:15) Ọ bụ ya mere ha ji chọọ iso ya nọkọọ, nweekwa ihe ịga nke ọma mgbe ọ nọ ya. (Jọn 1:14, 16, 39-42; 21:7, 15-17) Ndị nne na nna pụrụ ịmụta ihe na nke a. Dị ka ihe ọkụkụ dị nta nke akwụkwọ ya chere ihu n’ìhè anyanwụ, ụmụaka na-eme nke ọma mgbe e nwere ọnọdụ enyi, nke ịhụnanya n’ụlọ.
Ndị nne na nna, ụmụ unu hà na-enwere onwe ha iji nchegbu ha nile bịakwute unu? Ùnu na-ege ha ntị? Tupu unu eruo ná nkwubi okwu, ùnu na-adọpụta echiche ha na mmetụta ha ka unu wee ghọta ihe n’ụzọ ka zuo ezu? Ùnu na-eji ndidi na-enyere ha aka ịchọta azịza nye ajụjụ ụfọdụ site n’isoro ha mee nnyocha ná mbipụta dị iche iche nke Bible?
Otu nne bụ́ onye South Africa na-akọwa, sị: “Malite n’ụbọchị mbụ nwa anyị nwanyị gara ụlọ akwụkwọ, anyị gbara ya ume ịkọ ihe mere n’ụbọchị. Dị ka ihe atụ, m ga-ajụ, sị: ‘Ònye ka gị na ya nọkọrọ n’oge izu ike iri nri ehihie? Kọọrọ m banyere onye nkụzi ọhụrụ unu. Olee otú ọ dị? Ihe omume ndị dị aṅaa ka e mere atụmatụ ya maka izu a?’ N’otu oge, nwa anyị nwanyị lọtara ma kwuo na onye na-akụziri ha Bekee na-aga ịkpọrọ klas ha gaa ebe ha ga-ekiri sịnịma bụ́ nke ha ga-emesịa dee ihe ntụleghachi banyere ya. Isiokwu nke sịnịma ahụ adịghị mma. Mgbe e nyochara ya, anyị chọpụtara na ọ gaghị ekwesị onye Kraịst. Anyị tụlere ya dị ka ezinụlọ. Echi ya nwa anyị nwanyị gakwuuru onye nkụzi ahụ, na-akọwa na ya achọghị ikiri sịnịma ahụ, ebe omume ọ na-egosipụta agaghị ekwekọ na nkwenkwe ndị Kraịst ya. Onye nkụzi ahụ chebaara okwu ahụ echiche ma mesịa kelee nwa anyị nwanyị, na-asị na ya achọghị ịkpọrọ klas ahụ gaa ka ha kirie ihe ọ ga-akwa ụta ya.” Mmasị ịhụnanya nke ndị nne na nna ndị a nọgidere na-egosi ná nzọpụta nke nwa ha nwanyị mịrị ezi mkpụrụ. Ọ bụ onye obi ụtọ, nwere nchekwube, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society dị na South Africa.
Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’imeso ụmụ ndị ọzọ ihe. Nnọkọ ya na ha tọrọ ya ụtọ. (Mak 10:13-16) Lee ka ndị nne na nna kwesịrị isi nwee obi ụtọ isoro ụmụ ha na-emekọ ihe! N’ụfọdụ akụkụ Africa, nna na-eme ihere ịbụ onye a hụrụ ka ya na ụmụ ya ndị nwoke na-agba bọl ma ọ bụ na-egwuri ụdị egwu ndị ọzọ. Ma ọ dịghị mgbe nna bụ́ onye Kraịst kwesịrị iche na ya dị oké mkpa ịbụ onye a hụrụ ka ya na ụmụ ya na-emekọrịta ihe. Ndị na-eto eto chọrọ ndị nne na nna ọ na-atọ ụtọ iso ha nọkọọ. Nke a na-eme ka ọ kara ụmụaka mfe ikwupụta nchegbu ha. Mgbe e leghaara ụdị mkpa mmetụta uche ndị dị otú ahụ anya, ụmụaka pụrụ ịbụ ndị a kpasuru iwe ma ọ bụ ndị na-agaghị ekwupụta obi ha, karịsịa ọ bụrụ na a na-agbazi ha olu mgbe nile.
N’idegara ndị Kọlọsi akwụkwọ banyere mmekọrịta ezinụlọ, Pọl sịrị: “Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Nke a pụrụ igosi na e nwere ahaghị nhata nke inye ahụhụ gabigara ókè na ọbụbụenyi dị nnọọ nta. Ụmụaka, tinyere ndị nọ n’afọ iri na ụma, ndị a hụrụ n’anya ma jiri kpọrọ ihe yikarịrị ka ha ga-anara ọzụzụ dị mkpa.
Ịhụnanya Chineke
Ihe nketa kasị baa uru nke ndị nne na nna pụrụ inye ụmụ ha bụ ihe nlereanya ha onwe ha nke igosi ịhụnanya. Ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ ma nụ ka nne na nna ha na-ekwupụta ma na-egosi ezi ịhụnanya Chineke. Otu nwa okorobịa na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society dị na South Africa na-akọwa: “Mgbe m bụ nwata, m na-enyere nna m aka n’ọrụ dị n’ụlọ. Inyere ya aka na-atọ m ụtọ, nanị n’ihi na papa m n’ezie na-eji ntakịrị ihe m mere kpọrọ ihe. Ọ ga-eji oge ahụ na-agwa m ọtụtụ ihe banyere Jehova. Dị ka ihe atụ, m na-echeta otu Saturday mgbe anyị na-arụsi ọrụ ike n’ịsụchasị ahịhịa. Okpomọkụ dị n’ezie. Papa m na-agba ọsụsọ, ya mere m ji ọsọ gaa kute iko mmiri abụọ ma tinye ice n’ime ha. Papa m sịrị: ‘Nwa m, ị̀ hụrụ otú Jehova si mara ihe? Ice na-ese n’elu mmiri. Ọ bụrụ na o mikpuo n’ime mmiri, ihe nile dị ndụ n’ala ọdọ mmiri na iyi ga-anwụcha. Kama nke ahụ, ice na-arụ ọrụ dị ka ihe na-egbochi okpomọkụ! Nke ahụ ọ́ dịghị enyere anyị aka ịmara Jehova nke ọma karị?’a E mesịa, mgbe a tụrụ m mkpọrọ maka ijigide nnọpụiche, enwere m oge iche echiche. N’ịbụ onye dara mbà n’obi otu abalị n’ụlọ mkpọrọ m, echetara m okwu papa m ndị ahụ. Lee oké ihe ha pụtara! M ga-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi ma m nwee ike ya.”
Ee, ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ ka e gosipụtara ịhụnanya Chineke n’ihe nile nne na nna ha na-eme. E kwesịrị ịhụ ịhụnanya Chineke na ịdị njikere irubere ya isi karịsịa dị ka ike na-akwali ịnọ ná nzukọ ndị Kraịst, ikere òkè n’ozi ubi, nakwa ọgụgụ na ọmụmụ Bible ezinụlọ. (1 Ndị Kọrint 13:3) Nke kasị mkpa, e kwesịrị igosipụta ịhụnanya Chineke n’ekpere ezinụlọ ji obi dum na-ekpe. A pụghị ikwubiga okwu ókè banyere ịdị mkpa nke inye ụmụ gị ihe nketa dị otú ahụ. Ọ bụ ya mere e ji nye ndị Israel iwu, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:5-7; tụlee Matiu 22:37-40.
Oké ihe na-egbochi ịhụ Chineke n’anya na irubere ya isi bụ ọdịdị ime mmehie anyị ketara eketa. (Ndị Rom 5:12) Ya mere, Bible na-enyekwa iwu, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) Echiche ọjọọ na-edubakarị n’omume ọjọọ. Iji zere ndị a, nwatakịrị aghaghịkwa ịzụlite àgwà ọzọ dị mkpa.
Egwu Chineke
Ịhụnanya e tinyekọrọ iji nsọpụrụ atụ egwu imejọ Jehova bụkwa ihe ọzọ a na-achọsi ike. Jisọs Kraịst n’onwe ya setịpụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè nke onye “egwu Jehova” tọrọ ụtọ. (Aịsaịa 11:1-3) Ụdị egwu ahụ dị oké mkpa ka nwatakịrị na-eru ntoju ntorobịa ma malite inwe mkpali mmekọahụ dị ike. Egwu Chineke pụrụ inyere onye ntorobịa aka iguzogide nrụgide ụwa ndị pụrụ iduga n’omume rụrụ arụ. (Ilu 8:13) N’obodo ụfọdụ, ndị nne na nna na-ezere ịkụziri ụmụ ha otú ha ga-esi anagide ọnwụnwa inwe mmekọahụ. N’ezie, ọtụtụ na-eche na ọ dị njọ ikwurịta ihe ndị a. Ma gịnị ka ụdị nleghara anya nne na nna ahụ rụpụtaworo?
Mmadụ atọ bụ́ ọkachamara n’okwu ahụ ike aha ha bụ Buga, Amoko, na Ncayiyana gbara ụmụ agbọghọ 1,702 na ụmụ okorobịa 903 sitere n’ime ime obobo bụ́ Transkei, South Africa, ajụjụ ọnụ. Magazin bụ́ South African Medical Journal kọrọ na “76% nke ụmụ agbọghọ na 90.1% nke ụmụ okorobịa ná nnyocha a enweworị mmekọahụ.” Nkezi afọ nke ụmụ agbọghọ bụ afọ 15, a manyekwara ọtụtụ inwe mmekọahụ. Ihe karịrị 250 atụwo ime otu ugboro ma ọ bụ karịa. Ihe ọzọ si na ya pụta bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ.
N’ụzọ pụtara ìhè, ọtụtụ ndị nne na nna adịghị ahụ mkpa nke ịkụziri ụmụ ha otú ha ga-esi zere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye. Kama nke ahụ, magazin ahụ e kwuru maka ya na-akọwa, sị: “Ịmụ ụmụ na ịbụ nne bụ àgwà ịbụ nwanyị a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu n’ọha mmadụ nke ime obodo Transkei, ụmụ agbọghọ ka na-etofe oge ịgba ajị na-aghọtakwa nke a ngwa ngwa.” E dekọrọ ụdị nsogbu ahụ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.
Ọtụtụ ndị na-eto eto n’Africa na-akatọ ndị mụrụ ha n’ihi na ha enyereghị ha aka ịghọta ọnọdụ inwe mmekọahụ ha. Ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst emewo ihere nke ukwuu iji akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya eme ihe.b Na peji nke 20-23, ọ na-akọwa iji akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ eme ihe n’ụzọ dị ùgwù na mgbanwe ndị na-ewere ọnọdụ n’oge ịgba ajị.
A ga-aja ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ndị na-emeri ihe ịma aka nke isoro ụmụ ha tụlee echiche Chineke banyere mmekọahụ mma. Ọ kasị mma ime nke a n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, dị ka ikike nwatakịrị ịghọta ihe si dị. N’ịdabere n’ụdị ihe dị ka afọ ndụ nwatakịrị, ọ pụrụ ịdị ndị nne na nna mkpa ịkpọ okwu aha n’izo aka n’akụkụ ahụ na ọrụ ha. Ma ọ́ bụghị ya, onye ntorobịa na-enweghị ahụmahụ nwere ike ọ gaghị aghọta ihe a na-ekwu.—1 Ndị Kọrint 14:8, 9.
Otu nwoke South Africa mụtara ụmụ nwanyị abụọ na otu nwoke na-akọwa, sị: “N’ọtụtụ oge, enwere m ohere isoro ọbụna ndị nke nwanyị kwurịta isiokwu chọrọ nlezianya ndị metụtara mmekọahụ. Otú ọ dị, nwunye m tinyere uche ya karịsịa n’ebe ụmụ anyị nwanyị nọ, na-eji akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya na-eme ihe. [Lee peji nke 26-31.] Mgbe nwa m nwoke dị afọ 12, ekpebiri m ịkpọrọ ya gaa ije dị ogologo n’ugwu. N’oge ahụ, anyị kwurịtara n’ụzọ sara mbara ntolite nke ahụ nwa okorobịa na nzube dị ùgwù nke a ga-emesịa nwee n’alụmdi na nwunye. M sokwa ya kwurịta mkpa ọ dị izere àgwà na-emerụ emerụ nke imetọ ahụ onwe onye nakwa iji nsọpụrụ na nkwanye ùgwù na-ele ụmụ agbọghọ anya—dị ka o si ele nne ya na ụmụnne ya nwanyị.”
Ụgwọ Ọrụ Na-enye Ọṅụ
Nne na nna ahụ a ka kpọtụrụ aha n’elu rụsiri ọrụ ike, ha nwekwara obi ụtọ na ịzụlite ụmụ ha atọ rụpụtaara ha ezi ihe. Ha atọ bụ ugbu a ndị toruworo ogo mmadụ, ndị lụrụ ndị Kraịst na-ekwesi ntụkwasị obi. Nwa ha nwoke na di ụmụ ha na-ejecha ozi dị ka ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, abụọ n’ime di na nwunye ndị ahụ anọwo n’ọrụ nkwusa oge nile ruo ọtụtụ afọ.
Ee, ndị nne na nna na-arụsi ọrụ ike maka nzọpụta nke ezinụlọ ha pụrụ ịtụ anya ụgwọ ọrụ na-enye ọṅụ site n’aka ụmụ na-ahọrọ ịnara ụdị ozizi Bible ahụ, n’ihi na Ilu 23:24, 25 na-asị: “Onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa.” Chee banyere ezinụlọ ahụ buru ibu e hotara n’okwu mmalite nke isiokwu a. “Mgbe m chere banyere ọganihu nke ụmụ m nweworo,” ka Alphina na-ekwu, “obi m na-ejupụta n’ọṅụ.” Ka ndị nne na nna nile bụ́ ndị Kraịst rụọ ọrụ iji nweta ụgwọ ọrụ obi ụtọ a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ka ịjụ oyi mmiri na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụkọ, ịdị arọ ya na-ebelata, o wee see n’elu. Lee peji nke 137-138 nke akwụkwọ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Leekwa Questions Young People Ask—Answers That Work, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 23]
Nna pụrụ idokwa maka ọnọdụ kwesịrị ekwesị iji kọwaa eziokwu nke ndụ