Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/1 p. 14-19
  • Ka Ịhụnanya Ụmụnna Unu Dịgide!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Ịhụnanya Ụmụnna Unu Dịgide!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gosi Mmetụta Maka Ndị Ọzọ
  • Igosi Mmasị
  • Ọrụ Obiọma Ịhụnanya
  • Kpebisienụ Ike na ‘Ịhụnanya Ụmụnna Unu Ga-adịgide’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ịchọta Ụzọ E Si Enweta Ịhụnanya Ụmụnna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Afọ 2016
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/1 p. 14-19

Ka Ịhụnanya Ụmụnna Unu Dịgide!

“Ka ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ dịgide.”—NDỊ HIBRU 13:1.

1. Gịnị ka ị ga-eme iji mee ka ọkụ nọgide na-enwu n’abalị oyi dị, ibu ọrụ dị aṅaa yiri ya ka anyị nile nwere?

OKÉ oyi dị n’èzí, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ na-ada n’ike n’ike. Nanị ebe e si enweta okpomọkụ n’ụlọ gị bụ ọkụ na-agba kịtị kịtị n’ekwú ọkụ. Ọtụtụ ndụ dabeere na gị ime ka ọ dịgide. Ị̀ ga-anọdụ nnọọ ala ma na-ekiri ka ire ọkụ ahụ na-adanyụ, onwunwu nke icheku ọkụ ewee na-anyụ ma ghọọ ntụ nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị. Ike anaghị agwụ gị n’itinye ya nkụ iji mee ka ọ nọgide na-enwu. N’otu echiche, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọrụ yiri nke ahụ mgbe a bịara n’ihe banyere “ọkụ” ka nnọọ mkpa—nke kwesịrị ịdị na-enwu n’ime obi anyị—ịhụnanya.

2. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya ajụwo oyi na mgbe ikpeazụ ndị a? (b) Olee otú ịhụnanya si dị mkpa nye ezi ndị Kraịst?

2 Anyị na-ebi n’oge mgbe, dị ka Jisọs buru n’amụma ogologo oge gara aga, ịhụnanya na-ajụ oyi n’etiti ndị sị na ha bụ ndị Kraịst gburugburu ụwa. (Matiu 24:12) Jisọs na-ezo aka n’ụdị ịhụnanya kasị mkpa, ịhụnanya maka Jehova Chineke na maka Okwu ya, bụ́ Bible. Ụdị ndị ọzọkwa nke ịhụnanya na-adalata. Bible buru n’amụma na na “mgbe ikpeazụ,” ‘ihe mmadụ ibe ha agaghị atọ ọtụtụ ndị ụtọ.’ (2 Timoti 3:1-5) Lee ka nke a si bụrụ eziokwu! Ezinụlọ kwesịrị ịbụ ebe mmetụta ịhụnanya jupụtara, ma ọbụna n’ebe ahụ, ime ihe ike na mmetọ—nke obi ọjọọ n’ụzọ na-emenye ụjọ mgbe ụfọdụ—abụrụwo ihe a na-ahụkarị. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọnọdụ enweghị ọmịiko nke ụwa a, e nyere ndị Kraịst iwu ọ bụghị nanị inwe ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ kama inwe ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà, na-ebute ndị ọzọ ụzọ tupu onwe ha. Anyị ga-egosipụta ịhụnanya a n’ụzọ pụtara ìhè nke na mmadụ nile ga-ahụ ya, na-aghọ akara e ji amara ọgbakọ ezi ndị Kraịst.—Jọn 13:34, 35.

3. Gịnị bụ ịhụnanya ụmụnna, gịnịkwa ka ime ka ọ dịgide pụtara?

3 E nyere Pọl onyeozi mmụọ nsọ inye iwu, sị: “Ka ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ dịgide.” (Ndị Hibru 13:1) Dị ka otu akwụkwọ ndị ọkà mmụta si kwuo, okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ịhụnanya ụmụnna’ (phi·la·del·phiʹa) “na-ezo aka n’ịhụnanya dị nro, igosi obiọma, ọmịiko, inye aka.” Gịnịkwa ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị na anyị kwesịrị ikwe ka ịhụnanya dị otú ahụ dịgide? “O kwesịghị ịjụ oyi mgbe ọ bụla,” ka otu akwụkwọ ahụ na-ekwu. Ya mere o zughị ezu inwe mmetụta maka ụmụnna anyị; anyị aghaghị igosipụta ya. Ọzọkwa, anyị aghaghị ime ka ịhụnanya a dịgide, n’ekweghị ma ọlị ka ọ jụọ oyi. Ọ̀ bụ ihe ịma aka? Ee, ma mmụọ Jehova pụrụ inyere anyị aka ịzụlite ịhụnanya ụmụnna ma mee ka ọ dịgide. Ka anyị tụlee ụzọ atọ isi tinye nkụ n’ọkụ nke ịhụnanya a n’obi anyị.

Gosi Mmetụta Maka Ndị Ọzọ

4. Gịnị bụ mmetụta maka ndị ọzọ?

4 Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ịhụnanya ka ukwuu maka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị Kraịst gị, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ibu ụzọ nwee mmetụta maka ha, igosi ha mmetụta ọmịiko n’ule na ihe ịma aka ndị ha na-eche ihu ná ndụ. Pita onyeozi tụrụ aro otu ihe ahụ mgbe o dere, sị: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, [gosinụ mmetụta maka ndị ọzọ, NW], bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” (1 Pita 3:8) Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a maka igosi “mmetụta maka ndị ọzọ” pụtara “iso hụkọọ ahụhụ.” Otu akwụkwọ na-akọwa Grik e ji dee Bible na-ekwu banyere okwu a, sị: “Ọ na-akọwa ọnọdụ uche nke na-adị mgbe anyị banyere ná mmetụta ndị ọzọ ka a ga-asị na ha bụ nke anyị.” N’ihi ya, mmetụta ọmịiko dị mkpa. Otu ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nke meworo agadi kwuru n’otu oge, sị: “Mmetụta ọmịiko bụ ihe mgbu gị n’obi m.”

5. Olee otú anyị si mara na Jehova nwere mmetụta maka ndị ọzọ?

5 Jehova ò nwere ụdị mmetụta ahụ maka ndị ọzọ? Kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ banyere nhụjuanya nke ndị ya bụ́ Israel, sị: “Ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu.” (Aịsaịa 63:9) Ọ bụghị nanị na Jehova hụrụ nsogbu ha; o nwere mmetụta maka ndị ahụ. A na-egosipụta ókè mmetụta ya hà kpọmkwem n’okwu Jehova n’onwe ya gwara ndị ya, nke e dekọrọ na Zekaraịa 2:8: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m].”a Otu onye na-enye nkọwa na-arịba ama banyere amaokwu a, sị: “Anya bụ otu n’ime ihe ndị kasị dị mgbagwoju anya ma dị peke peke n’ahụ mmadụ; nwa anya kwa—oghere ebe ìhè eluigwe si abanye maka nzube nke ịhụ ụzọ—akụkụ kasị enwe mmetụta, na nke kasị mkpa, nke ebe ahụ. Ọ dịghị ihe pụrụ inye echiche ka mma nke nlekọta ọma dị nro nke Jehova nwere maka ihe ọ hụrụ n’anya.”

6. Olee otú Jisọs Kraịst siri gosi mmetụta maka ndị ọzọ?

6 Jisọs gosikwara ndị ọzọ mmetụta dị ukwuu mgbe nile. Ugboro ugboro o ‘nwere ọmịiko’ n’ihi ọnọdụ ndị mmadụ ibe ya bụ́ ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nwere nsogbu. (Mak 1:41; 6:34) O gosiri na mgbe onye ọ bụla na-emesoghị ụmụazụ ya e tere mmanụ n’ụzọ obiọma, ọ na-adị ya ka ọ bụ ya onwe ya na-enweta mmeso ahụ. (Matiu 25:41-46) Taakwa, dị ka “onyeisi nchụàjà” anyị nke eluigwe, ọ bụ onye pụrụ “iji obi so anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị.”—Ndị Hibru 4:15.

7. Olee otú mmetụta maka ndị ọzọ pụrụ isi nyere anyị aka mgbe nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị kpasuru anyị iwe?

7 “Iji obi so anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị”—nke ahụ ọ́ bụghị echiche na-akasi obi? Mgbe ahụ, n’ezie anyị kwesịrị imere ibe anyị otú ahụ. N’eziokwu, ọ dị mfe nke ukwuu ịchọpụta adịghị ike nke onye ọzọ. (Matiu 7:3-5) Ma mgbe ọzọ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị kpasuru gị iwe, gịnị ma ị nwalee nke a? Were ya na ị nọ n’ọnọdụ onye ahụ, nwee ụdị nzụlite ahụ, ụdị mmadụ ahụ, ụdị njehie onwe onye ndị ahụ ịgbaso mgba. Ị̀ pụrụ ijide n’aka na ị gaghị ehie otu ụzọ ndị ahụ—ma ọ bụ ikekwe ọbụna ndị ka njọ? Kama ịtụ anya ihe gabigara ókè n’aka ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịdị na-egosi mmetụta maka ndị ọzọ, bụ́ nke ga-enyere anyị aka inwe ezi uche dị ka Jehova, onye “na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14; Jemes 3:17) Ọ maara erughị eru anyị nile. Ọ dịghị mgbe ọ na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka anyị karịa ka anyị pụrụ ime n’ezie. (Tụlee 1 Ndị Eze 19:5-7.) Ka anyị nile na-egosi ndị ọzọ mmetụta dị otú ahụ.

8. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-agabiga ihe isi ike ụfọdụ?

8 Pọl dere na ọgbakọ yiri ahụ mmadụ nke nwere akụkụ dịgasị iche iche ndị na-aghaghị ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụrụkwa na otu ihe nke dị n’ahụ na-ahụ ahụhụ, ihe nile dị n’ahụ ahụ sooro ya na-ahụkọ ahụhụ.” (1 Ndị Kọrint 12:12-26) Ọ dị anyị mkpa isoro hụkọọ ahụhụ, ma ọ bụ gosi ọmịiko, n’ahụ ndị ahụ na-agabiga ụfọdụ ahụmahụ ọjọọ. Ndị okenye na-ebute ụzọ n’ime nke ahụ. Pọl dekwara, sị: “Ònye na-adịghị ike, nke mụ onwe m na-esoghị ya n’adịghị ike? ònye ka a na-eme ka ọ maa n’ọnyà, nke mụ onwe m na-ereghị ọkụ n’ihi ya?” (2 Ndị Kọrint 11:29) Ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eṅomi Pọl n’akụkụ a. N’okwu ha, n’ọrụ ọzụzụ atụrụ ha, na ọbụna n’ịnụrụ okwu ikpe ha, ha na-agbalị igosi mmetụta maka ndị ọzọ. Pọl tụrụ aro, sị: “Na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá.” (Ndị Rom 12:15) Mgbe atụrụ ghọtara na ndị ọzụzụ atụrụ na-egosi mmetụta ọmịiko n’ezie maka ha, ghọta erughị eru ha, ma na-egosi ọmịiko n’ihe isi ike ha na-eche ihu, ha na-adịkarị njikere ịnara ndụmọdụ, ntụzi, na ahụhụ. Ha na-eji ikpo ọkụ na-aga nzukọ, na-enwe obi ike na ha ga-achọta ‘izu ike nye mkpụrụ obi ha.’—Matiu 11:29.

Igosi Mmasị

9. Olee otú Jehova si egosi na ya nwere mmasị n’ezi ihe dị n’ime anyị?

9 Ụzọ nke abụọ isi kwalite ịhụnanya ụmụnna bụ site n’igosi mmasị. Iji gosi ndị ọzọ mmasị, anyị aghaghị ilekwasị anya n’àgwà ọma na mgbalị ha ma jiri ha kpọrọ ihe. Mgbe anyị mere otú ahụ, anyị na-eṅomi Jehova n’onwe ya. (Ndị Efesọs 5:1) Kwa ụbọchị ọ na-agbaghara anyị ọtụtụ mmehie na-adịghị oké njọ. Ọbụna na ọ na-agbaghara mmehie ndị dị oké njọ ọ bụrụhaala na e nwere ezi nchegharị. Mgbe ahụ ozugbo ọ gbaghaara mmehie anyị, ọ dịghị atụkwasị uche na ha. (Ezikiel 33:14-16) Ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Ihe Jehova na-elekwasị anya bụ ihe ọma ndị anyị na-eme n’ijere ya ozi.—Ndị Hibru 6:10.

10. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị ize ndụ nye di na nwunye ma ọ bụrụ na ha adịkwaghị egosi mmasị n’ebe ibe ha nọ? (b) Gịnị ka onye na-enwekwaghị mmasị n’ebe onye òtù ọlụlụ ya nọ kwesịrị ime?

10 Ọ dị mkpa karịsịa ịgbaso ihe ilereanya nke a n’ime ezinụlọ. Mgbe nne na nna na-egosirịta onwe ha mmasị, ha na-esetịpụrụ ezinụlọ ahụ ụkpụrụ. N’oge a nke enweghị mmasị n’alụmdi na nwunye, ọ dị mfe nke ukwuu iwere di ma ọ bụ nwunye dị ka onye na-adịghị mkpa na ime ka ntụpọ buo ibu na ime ka ọ dịghị ihe ezi àgwà bụ. Echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ na-ebibi alụmdi na nwunye, na-agbanwe ya ịbụ ibu arọ na-adịghị enye ọṅụ. Ọ bụrụ na mmasị i nwere n’ebe onye òtù ọlụlụ gị nọ na-ada ada, jụọ onwe gị sị, ‘Ọ̀ bụ na onye m na-alụ enweghị àgwà ọma n’ezie?’ Chee echiche laa azụ n’ihe ndị mere unu ji hụrịta onwe unu n’anya ma lụọ. Ihe ndị ahụ nile mere i ji hụ onye a bụ́ ọpụrụiche n’anya hà apụọla n’anya n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị; ya mere rụsie ọrụ ike igosi mmasị n’ihe ọma dị n’ime onye òtù ọlụlụ gị, tinyekwa mmasị gị n’okwu ọnụ.—Ilu 31:28.

11. Ọ bụrụ na ịhụnanya alụmdi na nwunye agaghị abụ nke ihu abụọ, omume ndị dị aṅaa ka a na-aghaghị izere?

11 Igosi mmasị na-enyekwara di na nwunye aka ime ka ịhụnanya ha ghara ịbụ nke ihu abụọ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 6:6; 1 Pita 1:22.) Ịhụnanya dị otú ahụ, nke e ji mmasị sitere n’obi akwalite, agaghị enye ohere maka mmeso obi ọjọọ na nzuzo, agaghị enye ohere maka okwu ndị na-emerụ ahụ ma na-emenye ihere, agaghị enye ohere maka mmeso egosighị mmasị ebe ọtụtụ ụbọchị pụrụ ịgafe n’enweghị okwu obiọma ma ọ bụ nke nkwanye ùgwù e kwuru, agaghịkwa enye ohere n’ezie maka iti ihe. (Ndị Efesọs 5:28, 29) Di na nwunye nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ n’ezie na-asọpụrụ onwe ha. Ha na-eme otú ahụ ọ bụghị nanị mgbe ha nọ n’ihu ọha kama mgbe ọ bụla ha nọ n’ebe Jehova na-ahụ ha—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’oge nile.—Ilu 5:21.

12. Gịnị mere ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji ekwupụta mmasị maka ihe ọma dị n’ime ụmụ ha?

12 Ọ dịkwa ụmụaka mkpa ịmata na e nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụghị na nne na nna kwesịrị iji otuto ọnụ efu na-asa ha ahụ, kama ha kwesịrị ịja àgwà ndị kwesịrị otuto na ezi ihe nke ụmụ ha na-eme mma. Cheta ihe ilereanya Jehova n’ikwupụta nnwapụta ọ nwapụtara Jisọs. (Mak 1:11) Chetakwa ihe ilereanya Jisọs dị ka “onye nwe[nụ]” n’otu ilu. Ọ jara ‘ezi ndị ohu abụọ kwesịrị ka a tụkwasị ha obi’ mma hà nhata, ọ bụ ezie na e nwere ihe dị iche n’ihe e nyere onye nke ọ bụla na ihe dịkwa iche otú ahụ n’ihe onye nke ọ bụla rụpụtara. (Matiu 25:20-23; tụlee Matiu 13:23.) N’otu aka ahụ ndị nne na nna maara ihe na-achọ ụzọ isi kwupụta mmasị maka àgwà, ikike, na nrụzu ndị pụrụ iche nke nwa nke ọ bụla. N’otu mgbe ahụ, ha na-agbalị ka ha ghara ịdị na-ekwubiga okwu ókè banyere ihe ndị a rụzuru nke na a na-enunye ụmụ ha enunye ime ihe mgbe nile. Ha achọghị ka ụmụ ha tolite ịbụ ndị a kpasuru iwe ma ọ bụ ndị obi furu.—Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21.

13. Olee ndị na-ebute ụzọ n’igosi mmasị maka onye òtù ọ bụla nke ọgbakọ?

13 N’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ebute ụzọ n’igosi onye òtù ọ bụla nọ n’ìgwè atụrụ Chineke mmasị. Ha nọ n’ọnọdụ siri ike, ebe ọ bụ na ha onwe ha kwa nwere ibu dị arọ inye ọzụzụ n’ezi omume, ime ka ndị na-agahie agahie guzozie na mmụọ nke ịdị nwayọọ, na inye ndị ọ dị mkpa ndụmọdụ siri ike. Olee otú ha si eme ka ibu ọrụ ndị a dịgasị iche nwee nguzozi?—Ndị Galetia 6:1; 2 Timoti 3:16.

14, 15. (a) Olee otú Pọl siri gosi nguzozi n’ihe banyere inye ndụmọdụ siri ike? (b) Olee otú ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta pụrụ isi mee ka mkpa e nwere idozi mmehie ihe na nke ịja mma guzozie? Nye ihe atụ.

14 Ihe ilereanya Pọl na-enye aka dị ukwuu. Ọ bụ onye nkụzi, okenye, na onye ọzụzụ atụrụ a rịbara ama. O mere ihe banyere ọgbakọ ndị nwere nsogbu ndị siri ike, o jighịkwa ụjọ ghara inye ndụmọdụ ndị siri ike mgbe ọ dị mkpa. (2 Ndị Kọrint 7:8-11) Ntụle dị mkpirikpi nke ije ozi Pọl na-egosi na o jighị ịba mba mee ihe ọtụtụ ugboro—nanị mgbe ọnọdụ mere ka ọ dị mkpa ma ọ bụ kwesị ekwesị. O gosipụtara amamihe Chineke na nke a.

15 Ọ bụrụ na e ji ozi onye okenye na-eje n’ime ọgbakọ tụnyere otu egwú, mgbe ahụ ịba mba na nkatọ ga-adị ka otu akara ụda egwú nke ya na egwú ahụ dum nwere nkwekọ. Akara ụda egwú ahụ dị mma n’ọnọdụ ya. (Luk 17:3; 2 Timoti 4:2) Cheedị echiche banyere abụ nke nwere nanị otu akara ụda egwú ahụ, nke a na-agụghachi ugboro ugboro. Ọ ga-amalite ịgbaka agbaka ná ntị anyị ngwa ngwa. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-agbalị ime ka ozizi ha ruo ihe a chọrọ, na-ejikwa ihe dịgasị iche iche eme ka ọ dịkwuo mma. Ha adịghị eme ka o jedebe nanị n’idozi nsogbu dị iche iche. Kama nke ahụ, ụda ya dum na-ewuli elu. Dị ka Jisọs Kraịst, ndị okenye na-ahụ n’anya na-ebu ụzọ achọ ihe dị mma ha ga-aja mma, ọ bụghị mmejọ ha ga-akatọ. Ha na-enwe mmasị n’ọrụ siri ike ndị Kraịst ibe ha na-arụ. Ha na-enwe obi ike na n’ozuzu ya, onye ọ bụla na-eme ike ya ijere Jehova ozi. Ndị okenye na-ekwupụtakwa mmetụta ndị dị otú ahụ n’egbughị oge.—Tụlee 2 Ndị Tesalọnaịka 3:4.

16. Mmetụta dị aṅaa ka àgwà Pọl nke igosi mmasị na mmetụta ọmịiko nwere n’ahụ ndị Kraịst ibe ya?

16 Obi abụọ adịghị ya na ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst Pọl jeere ozi chọpụtara na o nwere mmasị n’ebe ha nọ, gosikwa mmetụta maka ha. Olee otú anyị si mara nke a? Lee otú ha siri were Pọl. Ha atụghị ya egwu, n’agbanyeghị na o nwere ikike dị ukwuu. Ee e, ọ bụ onye a hụrụ n’anya na onye dị mfe ngakwuru. Leenụ, mgbe ọ na-ahapụ otu ógbè, ndị okenye ‘dakwasịrị ya n’olu, sutụkwa ya ọnụ’! (Ọrụ 20:17, 37) Lee aha ekele ndị okenye—na anyị nile—kwesịrị inwe na anyị nwere ihe ilereanya Pọl iṅomi! Ee, ka anyị na-egosi mmasị n’ebe ibe anyị nọ.

Ọrụ Obiọma Ịhụnanya

17. Gịnị bụ ụfọdụ mmetụta dị mma na-esite n’ime ihe ọma n’ọgbakọ apụta?

17 Otu n’ime ihe ndị kasị akwalite ịhụnanya ụmụnna bụ ime obere ihe ọma. Dị ka Jisọs kwuru, “ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ma ànyị na-enye n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ ihe onwunwe, ma ọ bụ oge na ike anyị, ọ bụghị nanị na anyị na-eme ndị ọzọ obi ụtọ kama anyị na-emekwa onwe anyị obi ụtọ. N’ime ọgbakọ, obiọma na-efe efe. Otu ihe ọma e mere na-akpata ime ihe ndị yiri nke ahụ. Tupu ọ dịtee anya, ịhụnanya ụmụnna na-ejupụta!—Luk 6:38.

18. Gịnị ka “obiọma” e kwuru banyere ya na Maịka 6:8 pụtara?

18 Jehova gbara ndị ya bụ́ Israel ume igosipụta obiọma. Na Maịka 6:8, anyị na-agụ, sị: “Gị mmadụ, O gosiwo gị ihe dị mma; ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ [obiọma, NW] n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” Gịnị ka ọ pụtara “ịhụ obiọma n’anya”? Okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a maka “obiọma” (cheʹsedh) abụrụwokwa nke a sụgharịrị gaa n’Igbo dị ka “ebere.” Dị ka akwụkwọ bụ́ The Soncino Books of the Bible si kwuo, okwu a “na-apụta ihe dị irè karịa okwu Igbo nkịtị bụ́ ebere. Ọ pụtara ‘ebere e tinyere n’ọrụ,’ obiọma ịhụnanya mmadụ gosiri n’onwe ya, ọ bụghị nanị nye ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpa, kama nye ndị mmadụ ibe ya dum.” N’ihi ya ọkà mmụta ọzọ na-ekwu na cheʹsedh pụtara “ịhụnanya e tinyere n’ọrụ.”

19. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị nwere ike isi bute ụzọ n’igosi ndị ọzọ obiọma n’ọgbakọ? (b) Nye ihe atụ otú e siworo gosi gị ịhụnanya ụmụnna.

19 Ịhụnanya ụmụnna anyị abụghị ihe dị nanị n’echiche, ma ọ bụ ihe nkịtị. Ọ bụ ihe dị nnọọ adị. N’ihi ya, chọọ ụzọ ndị ị ga-esi meere ụmụnna gị ndị nwoke na ụmụnna gị ndị nwanyị ihe ọma. Yie Jisọs, onye na-adịghị echere nnọọ mgbe nile ka ndị mmadụ bịakwute ya ịrịọ maka enyemaka kama onye butere ụzọ ugboro ugboro n’onwe ya. (Luk 7:12-16) Na-eche echiche karịsịa banyere ndị nọ ná mkpa. Onye agadi ma ọ bụ onye ahụ na-adịkwaghị ike ọ̀ chọrọ ka e leta ya ma ọ bụ ikekwe ka e nyere ya aka ije ozi ụfọdụ? ‘Nwa mgbei’ ọ̀ chọrọ oge na nlebara anya ụfọdụ? Onye dara mbà n’obi ọ̀ chọrọ onye ga-ege ya ntị ma ọ bụ okwu ụfọdụ na-agụgụ mmadụ? Ruo n’ókè anyị nwere ike, ka anyị wepụta oge maka ime ihe ọma ndị dị otú ahụ. (Job 29:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14; Jemes 1:27) Echezọla mgbe ọ bụla na n’ime ọgbakọ nke ndị na-ezughị okè juru, otu n’ime ihe ọma kasị mkpa bụ mgbaghara—ịdị ngwa n’ịghara ibu iwe n’obi, ọbụna mgbe e nwere ezi ihe mere a ga-eji mee mkpesa. (Ndị Kọlọsi 3:13) Ịdị njikere ịgbaghara na-enye aka ime ka ọgbakọ ghara inwe nkewa, mkpasu iwe, na iserịta okwu, bụ́ ndị yiri blanket dị mmiri nke na-adanyụ ọkụ nke ịhụnanya ụmụnna.

20. Olee otú anyị nile kwesịrị isi nọgide na-enyocha onwe anyị?

20 Ka anyị nile kpebisie ike ime ka ọkụ ịhụnanya a dị mkpa nọgide na-enwu n’obi anyị. Ka anyị nọgide na-enyocha onwe anyị. Ànyị na-egosi mmetụta maka ndị ọzọ? Ànyị na-egosi ndị ọzọ mmasị? Ànyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma? Ọ bụrụhaala na anyị na-eme otú ahụ, ọkụ nke ịhụnanya ga-eme ka òtù ụmụnna anyị kporo ọkụ n’agbanyeghị otú ụwa a ruru n’ịjụ oyi na enweghị mmetụta. Mgbe ahụ, gbalịsienụ ike “ka ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ dịgide”—ugbu a na mgbe ebighị ebi!—Ndị Hibru 13:1.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ nsụgharị na-enye echiche n’ebe a na onye na-emetụ ndị Chineke aka na-emetụ, ọ bụghị anya Chineke, kama nke Israel ma ọ bụ ọbụna nke ya. Ndehie ihe a sitere n’aka ndị odeakwụkwọ nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya ndị, ná mgbalị hiere ụzọ ha nke idezigharị ihe odide ndị ha lere anya dị ka nke na-egosighị nkwanye ùgwù, gbanwere amaokwu a. Ha si otú ahụ kpuchie ịdị ike nke mmetụta ọmịiko Jehova n’onwe ya.

Gịnị Ka I Chere?

◻ Gịnị bụ ịhụnanya ụmụnna, n’ihi gịnịkwa ka anyị na-aghaghị iji mee ka ọ dịgide?

◻ Olee otú inwe mmetụta maka ndị ọzọ si enyere anyị aka ijigide ịhụnanya ụmụnna anyị?

◻ Òkè dị aṅaa ka igosi mmasị na-ekere n’ịhụnanya ụmụnna?

◻ Olee otú ime ihe ọma si eme ka ịhụnanya ụmụnna jupụta n’ọgbakọ ndị Kraịst?

[Igbe dị na peeji nke 16]

Ịhụnanya E Tinyere n’Ọrụ

Ụfọdụ afọ gara aga, otu nwoke ya na Ndịàmà Jehova mụworo Bible ruo oge ụfọdụ ka na-enwetụ obi abụọ banyere ịhụnanya ụmụnna. Ọ maara na Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ma o siiri ya ike ikwere. Otu ụbọchị ọ dabara na ọ hụrụ ịhụnanya ndị Kraịst e tinyere n’ọrụ.

N’agbanyeghị na ọ pụghị isi n’oche nkwagharị bilie, nwoke a na-eme njem aga ebe dị anya site n’ebe o bi. Na Betlehem, Israel, ọ gara otu nzukọ ọgbakọ. N’ebe ahụ, onye Arab bụ́ Onyeàmà siri ọnwụ ka Onyeàmà ọzọ na-eme njem nleta nọnyere ezinụlọ ya n’abalị ahụ, a kpọkwara onye a a na-amụrụ Bible ka o sonye. Tupu ọ labaa ụra, nwa akwụkwọ ahụ rịọrọ onye ọ nọ na nke ya ikike ịga n’ihu ụlọ n’ụtụtụ iji kirie anyanwụ mgbe ọ na-awa. Onye ọ nọ n’ụlọ ya dọsiri ya aka ná ntị ike ka ọ ghara ịnwa anwa ime nke ahụ. N’echi ya nwanna nwoke a bụ́ onye Arab kọwara ihe kpatara ya. Site n’ọnụ onye nsụgharị, ọ sịrị na ọ bụrụ na ndị agbata obi ya amara na ya ­nwere ndị ọbịa bụ́ ndị Juu​—⁠bụ́ nke onye a na-amụrụ Bible bụ⁠—​ha ga-agba ụlọ ya ọkụ gbakọta ya na ezinụlọ ya n’ime ya. N’inwe mgbagwoju anya, onye ahụ a na-amụrụ Bible jụrụ ya, “Gịnị meziri i jiri tinye onwe gị n’ihe ize ndụ dị otú ahụ?” N’abụghị site n’ọnụ onye nsụgharị, nwanna nwoke ahụ bụ́ onye Arab lekwasịrị ya anya n’anya ma kwuo nanị sị, “Jọn 13:35.”

Ịbụ eziokwu nke ịhụnanya ụmụnna metụrụ onye ahụ a na-amụrụ Bible n’ahụ nke ukwuu. E mere ya baptism n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọdịdị omume enyi na igosi mmasị nke Pọl onyeozi mere ya ka ọ dị mfe ngakwuru

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya