Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/1 p. 20-25
  • Iji Ndidi Na-echere Jehova Site Na Nwata M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ndidi Na-echere Jehova Site Na Nwata M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye A Zụrụ Ịtụkwasị Jehova Obi
  • Mkpagbu ahụ Esiwanye Ike
  • Mkpirikpi Oge nke Ọrụ Ịnụ Ọkụ n’Obi Ime Mmụọ
  • Nkwado Site n’Aka Ụmụnna Ime Mmụọ M
  • Jehova Na-agbapụta Ndị Ohu Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe
  • Gịnị Ka M Nwere Ike Iji Kwụọ Jehova Ụgwọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ịtụkwasị Obi ná Nlekọta Ịhụnanya Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/1 p. 20-25

Iji Ndidi Na-echere Jehova Site Na Nwata M

DỊ KA RUDOLF GRAICHEN SI KỌỌ

Dị ka osise nke àmụ̀mà, ọdachi dakwasịrị ezinụlọ m mgbe m gbara nanị afọ 12. Nke mbụ, a tụbara nna m n’ụlọ mkpọrọ. E mesịa, a kpọpụrụ mụ na nwanne m nwanyị n’ụlọ n’ike ma ziga anyị isoro ndị anyị na-amabughị biri. Mgbe e mesịrị, ndị Gestapo jidere mụ na nne m. Agara m mkpọrọ, ọ chọtakwara onwe ya n’ogige ịta ahụhụ.

IHE omume ndị ahụ sochiri onwe ha kara akara nanị mmalite nke oge mkpagbu na-egbu mgbu m nwetara na nwata m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Nazi Gestapo nwere aha ọjọọ nakwa Stasi nke Ọwụwa Anyanwụ Germany gbalịrị imebi iguzosi ike n’ezi ihe m nye Chineke. Ugbu a, mgbe afọ 50 nke ozi a raara nye ya gasịrị, m pụrụ ikwu dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru: “Ọtụtụ mgbe ka ha kpagbuworo m site na mgbe m dị na nwata: ma otú ọ dị, ha apụghị imegide m.” (Abụ Ọma 129:2) Lee aha ekele m nwere nye Jehova!

A mụrụ m na June 2, 1925, n’obodo nta bụ́ Lucka nke dị nso Leipzig, Germany. Ọbụna tupu a mụọ m, nne na nna m, bụ́ Alfred na Teresa, ghọtara ụda nke eziokwu Bible ná mbipụta nke Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. M na-echeta kwa ụbọchị ka m na-ele ihe osise nke ihe omume Bible kosa n’ahụ ụlọ anyị. Otu ihe osise gosiri anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ, nwa ewu na agụ, nwa ehi na nwa ọdụm—ha nile nọcha n’udo, n’ịbụ ndị nwatakịrị na-edu. (Aịsaịa 11:6-9) Ụdị ihe osise ndị ahụ nwere mmetụta na-adịgide adịgide n’ahụ m.

Mgbe ọ bụla o kwere mee, nne na nna m tinyere m n’ihe omume ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, na February 1933, nanị ụbọchị ole na ole mgbe Hitler weghasịịrị ọchịchị, e gosiri “Foto Ihe Nkiri nke Okike”—ya na ihe nkiri slide ya, sịnịma, na okwu nkọwa a gụnyere na tepụ—n’obodo nta anyị. Lee oké mkpali m nwere, nwa okoro gbara nanị afọ asaa, nọ n’azụ gwongworo azụ ya ghere oghe na-agbagharị n’obodo dị ka akụkụ nke ịzọ njem mkpọsa maka “Foto Ihe Nkiri” ahụ! N’oge a na oge ndị ọzọ, ụmụnna mere m ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye bara uru nọ n’ọgbakọ n’agbanyeghị nwata m bụ. Ya mere malite na nwata, Jehova ziri m ihe, Okwu ya nwekwara mmetụta n’ahụ.

Onye A Zụrụ Ịtụkwasị Jehova Obi

N’ihi nnọpụiche siri ike nke ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nazi. N’ihi ya, na 1933 ndị Nazi tiri iwu na-egbochi anyị ime nkwusa, inwe nzukọ, na ọbụna ịgụ akwụkwọ anyị e ji amụ Bible. Na September 1937 ndị Gestapo jidere ụmụnna nile n’ọgbakọ anyị, tinyere nna m. Nke ahụ wutere m nke ukwuu. A mara nna m ikpe ịga mkpọrọ afọ ise.

Ihe siiri anyị oké ike n’ụlọ. Ma anyị mụtara ngwa ngwa ịtụkwasị Jehova obi. Otu ụbọchị mgbe m si akwụkwọ lọta, nne m nọ na-agụ Ụlọ Nche. Ọ chọrọ ịkwadebere m nri ehihie dị mfe, ya mere ọ tụkwasịrị magazin ahụ n’elu kọbọd ntakịrị. Mgbe e risịrị nri ehihie, ka anyị na-ebupụsị efere, a kụrụ aka dara oké ụda n’ibo ụzọ. Ọ bụ onye uwe ojii chọrọ inyocha ụlọ anyị maka akwụkwọ e ji amụ Bible. Ụjọ tụrụ m nke ukwuu.

Ọ bụ ụbọchị anyanwụ na-achasi nnọọ ike. Ya mere ihe mbụ onye uwe ojii ahụ mere bụ ikpupụ okpuígwè ya ma tụkwasị ya n’elu table. O wee malitezie nnyocha ya. Mgbe ọ na-ele anya n’okpuru table, okpuígwè ya malitere ịdapụ. Ya mere nne m ghọtara okpuígwè ahụ ngwa ngwa ma tụkwasị ya n’elu kọbọd ahụ kpọmkwem n’elu Ụlọ Nche ahụ! Onye uwe ojii ahụ fọkasịchara ụlọ anyị ma ọ hụghị akwụkwọ ọ bụla. Otú ọ dị, o cheghị echiche ile anya n’okpuru okpuígwè ya. Mgbe o jikeere ịla, o ji olu dị ala rịọ nne m mgbaghara ka o welara aka azụ iwere okpuígwè ya. Lee ka m si kudaa ume ndụ!

Ahụmahụ ndị yiri nke ahụ kwadebere m maka ule ndị siri ike karị. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ akwụkwọ a rụgidere m isonyere òtù Ndị Ntorobịa Hitler, bụ́ ebe a na-azụ ụmụaka n’ọrụ agha ma jiri nkà mmụta ndị Nazi zighasịa ha isi. Ụfọdụ ndị nkụzi nwere ihe mgbaru ọsọ onwe onye nke ime ka ụmụ akwụkwọ nile kere òkè. Onye nkụzi m, Herr Schneider, aghaghị ichewo na ya adawaala afọ n’ihi na, n’adịghị ka ndị nkụzi ndị ọzọ nile n’ụlọ akwụkwọ m, otu onye n’ime ụmụ akwụkwọ ya nile ekereghị òkè. M bụ nwa akwụkwọ ahụ.

Otu ụbọchị Herr Schneider maara klas nile ọkwa, sị: “Ụmụ okoro, echi anyị ga-eme mkpapụ dị ka otu klas.” Echiche ahụ masịrị onye ọ bụla. Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere: “Unu nile kwesịrị iyiri yunifọm Ndị Ntorobịa Hitler unu ka ọ ga-abụ mgbe anyị na-azọ njem n’okporo ámá, mmadụ nile ga-ahụ na unu bụ ụmụ okoro ọma nke Hitler.” Ụtụtụ echi ya ụmụ okoro ahụ nile yiiri yunifọm ha pụta e wezụga m. Onye nkụzi ahụ kpọpụtara m n’ihu klas ma gwa m, sị: “Legharịa ụmụ okoro ndị ọzọ anya ma lee onwe gị anya.” Ọ gbakwụnyere: “Amaara m na ndị mụrụ gị dara ogbenye, ha apụghịkwa ịzụtara gị yunifọm, ma ka m gosi gị.” Ọ kpọtara m na table ya, mepee otu drọwa, wee sị: “Achọrọ m inye gị yunifọm a dị ọhụrụ. Ọ̀ bụ na ọ maghị mma?”

Ọ ga-akara m mma ịnwụ anwụ karịa iyiri yunifọm Nazi. Mgbe onye nkụzi m hụrụ na ọ bụghị nzube m iyiri ya, iwe were ya, klas nile chịrị m ọchị. Mgbe ahụ ọ kpọọrọ anyị gawa mkpapụ ahụ ma gbalịa izobe m site n’ime ka m na-aga n’etiti ụmụ okoro ndị ọzọ ahụ nile yicha yunifọm ha. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị mmadụ n’obodo pụrụ ịhụ m ka m gbara iche n’etiti ụmụ klas ibe m. Onye ọ bụla maara na mụ na nne na nna m bụ Ndịàmà Jehova. Ekelere m Jehova maka inye m ume ime mmụọ dị mkpa mgbe m bụ nwata.

Mkpagbu ahụ Esiwanye Ike

Otu ụbọchị ná mmalite 1938, a kpọpụtara mụ na nwanne m nwanyị n’ụlọ akwụkwọ wee jiri obere ụgbọala ndị uwe ojii buga anyị ogige mgbazi ndị àgwà ọjọọ nke dị na Stadtroda, ihe dị ka kilomita 80 site n’ebe ahụ. N’ihi gịnị? Ụlọikpe ekpebiwo ka a kpọpụ anyị ná mmetụta nke ndị mụrụ anyị ma mee ka anyị ghọọ ụmụ ndị Nazi. N’oge na-adịghị anya onye ọrụ na-elekọta ogige ahụ chọpụtara na mụ na nwanne m nwanyị nwere omume nkwanye ùgwù ma na-erube isi, ọ bụ ezie na anyị nọsiri ike ná nnọpụiche ndị Kraịst anyị. O metụrụ onye nduzi ahụ n’ahụ nke ukwuu nke na ọ chọrọ izute nne m n’onwe ya. E mere ihe a na-adịghị emebu, e kwekwara ka nne m bịa leta anyị. Nwanne m nwanyị, nne m, na mụ nwere nnọọ obi ụtọ na ekele nye Jehova maka inye anyị ohere ịnọkọ ọnụ maka ịgbarịta onwe anyị ume n’otu ụbọchị dum. Ọ dị anyị mkpa n’ezie.

Anyị nọgidere n’ogige ahụ ruo ihe dị ka ọnwa anọ. E mesịa e zigara anyị isoro otu ezinụlọ na Pahna biri. E nyere ha ntụziaka ime ka anyị ghara iru ndị ikwu anyị nso. E nyedịghị nne m ohere ịbịa leta anyị. Ma, ugboro ole na ole, ọ hụrụ ụzọ isi kpọtụrụ anyị. N’iji ohere ndị ahụ na-adịghị abịakebe eme ihe, nne m mere ike ya nile iji kụnye n’ime anyị mkpebisi ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, n’agbanyeghị ule na ọnọdụ ndị ọ ga-ekwe ka ha dịrị.—1 Ndị Kọrint 10:13.

Ule ndị ahụ bịakwara. Na December 15, 1942, mgbe m gbara nanị afọ 17, ndị Gestapo kpọọrọ m ma tụnye m n’ụlọ nga dị na Gera. Ihe dị ka otu izu mgbe ọ gasịrị, e jidekwara nne m, mụ na ya nọkọkwara n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ. Ebe m ka bụ nwata, ụlọikpe apụghị ikpe m ikpe. Ya mere mụ na nne m nọrọ ọnwa isii n’ụlọ mkpọrọ ka ụlọikpe na-echere ka m gbaa afọ 18. Kpọmkwem n’ụbọchị ahụ m gbara afọ 18, e kpere mụ na nne m ikpe.

Tupu mụ amara ihe na-aganụ, nke na-emenụ emechaala. Amatụghị m na agaghị m ahụ nne m anya ọzọ. Ihe ikpeazụ m na-echeta banyere ya bụ ịhụ ya ka ọ nọdụrụ n’akụkụ m kpọmkwem n’elu bench osisi dị ojii n’ime ụlọikpe. E kwuru na ikpe mara anyị abụọ. Amara m ikpe ịga mkpọrọ afọ anọ, nne m kwa otu afọ na ọkara.

N’oge ahụ e nwere ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova e jichiri n’ime ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ. Otú ọ dị, e zijere m n’ụlọ mkpọrọ dị na Stollberg, ebe m bụ nanị Onyeàmà. Anọrọ m ihe karịrị otu afọ n’ụlọ mkpọrọ otu onye, ma Jehova nọnyeere m. Ịhụnanya m zụliteworo maka ya na nwata bụ isi ihe mere m ji lanarị n’ụzọ ime mmụọ m.

Na May 9, 1945, mgbe m nọsịrị afọ abụọ na ọkara n’ụlọ mkpọrọ, anyị natara ozi ọma—agha ebiela! A tọhapụrụ m n’ụbọchị ahụ. Mgbe m ji ụkwụ gasịa kilomita 110, erutere m ụlọ, na-arịa ọrịa sitere n’ike ọgwụgwụ na ịnọ n’agụụ. O were m ọtụtụ ọnwa ịgbake.

Ngwa ngwa m rutere, ozi na-enye nsogbu n’obi tiri m aka ọjọọ. Nke mbụ banyere nne m. Mgbe ọ nọsịrị mkpọrọ ruo otu afọ na ọkara, ndị Nazi gwara ya ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ iji jụ okwukwe ya n’ebe Jehova nọ. Ọ jụrụ ajụ. Ya mere ndị Gestapo kpọgara ya n’ogige ịta ahụhụ nke ndị inyom, na Ravensbrück. Oké ịba ahụ ọkụ gburu ya n’ebe ahụ n’oge na-adịghị anya tupu agha ebie. Ọ bụ onye Kraịst nwere nnọọ obi ike—onye na-alụsi ọgụ ike nke na-adaghị mbà ma ọlị. Ka Jehova jiri obi ebere cheta ya.

E nwekwara ozi banyere nwanne m nwoke nke tọrọ m, Werner, bụ́ onye ọ na-adịghị mgbe ọ raara onwe ya nye Jehova. O sonyerewo ndị agha Germany, e gbukwara ya na Russia. Nna m kwanụ? Ọ lọtara ụlọ, ma n’ụzọ dị mwute, ọ bụ otu onye n’ime Ndịàmà ole na ole bịanyere aka n’akwụkwọ ọjọọ ahụ ha jiri jụ okwukwe ha. Mgbe m mesịrị hụ ya, o yiri onye ihe na-ewute na onye isi na-ezughị ezu.—2 Pita 2:20.

Mkpirikpi Oge nke Ọrụ Ịnụ Ọkụ n’Obi Ime Mmụọ

Na March 10, 1946, agara m mgbakọ mbụ m gara mgbe agha gasịrị na Leipzig. Lee ihe ọṅụ ọ bụ mgbe a mara ọkwa na baptism ga-ewere ọnọdụ n’otu ụbọchị ahụ! Ọ bụ ezie na ararawo m ndụ m nye Jehova ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, nke a bụ ohere mbụ m nwere ime baptism. Agaghị m echezọ ụbọchị ahụ ma ọlị.

Na March 1, 1947, mgbe m sụsịrị ụzọ otu ọnwa, a kpọrọ m ịbịa Betel dị na Magdeburg. Bọmbụ ndị a tụrụ bibiri ụlọ ọrụ Society nke ukwuu. Lee ihe ùgwù ọ bụ inye aka n’ọrụ nrụzigharị ahụ! Mgbe oge okpomọkụ ahụ gasịrị e kenyere m ọrụ ịga obodo Wittenberge dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’ụfọdụ ọnwa m na-etinye ihe karịrị hour 200 n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze Chineke. Lee obi ekele m nwere inwere onwe m ọzọ—agha adịghị, mkpagbu adịghị, mkpọrọ adịghị!

N’ụzọ dị mwute, nnwere onwe ahụ adịteghị anya. Mgbe agha ahụ gasịrị e kewara Germany, ógbè ebe m biri nọ n’okpuru ọchịchị ndị Kọmunist. Na September 1950 ndị uwe ojii nzuzo nke Ọwụwa Anyanwụ Germany, ndị a maara dị ka ndị Stasi, malitere ijide ụmụnna n’usoro n’usoro. Ebubo ndị e boro m na-atọ ọchị. E boro m ebubo ịbụ onye nledo maka gọọmenti America. Ha zigara m n’ụlọ mkpọrọ ndị kasị njọ nke ndị Stasi ná mba ahụ, na Brandenburg.

Nkwado Site n’Aka Ụmụnna Ime Mmụọ M

N’ebe ahụ ndị Stasi ekweghị m hie ụra n’ehihie. E mesịa ha ga-agba m ajụjụ abalị nile. Mgbe a tasịrị m ahụhụ a ruo ụbọchị ole na ole, ihe kara njọ. Otu ụtụtụ, kama ịlaghachi na nga m, ha kpọgara n’otu n’ime U-Boot Zellen ọjọọ ha (nke a maara dị ka nga okpuru mmiri n’ihi ebe ha dị n’ime ime ala). Ha meghere otu ibo ụzọ ígwè tara nchara, nke meworo ochie wee gwa m ka m banye. M ṅefere ihe ntụbichi dị elu. Mgbe m wedara ụkwụ m, achọpụtara m na mmiri kpuchiri ala ụlọ ahụ nile. A kwachiri ibo ụzọ ahụ n’ụzọ dara oké ụda. E nweghị ọkụ, e nweghịkwa window. Ebe nile gbara ọchịchịrị.

N’ihi mmiri ahụ ruru ọtụtụ inch n’omimi n’ala ụlọ ahụ, enweghị m ike ịnọdụ ala, idina ala, ma ọ bụ ịrahụ ụra. Mgbe m cheresịrị ruo ihe yiri mgbe ebighị ebi, a kpọghachiri m maka ịgba ajụjụ ọzọ n’okpuru ọkụ na-achasi ike. Amaghị m nke ka njọ—iguzo ọtọ otu ụbọchị n’ime mmiri n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọchịchịrị kpam kpam ka ọ̀ bụ idi ọkụ na-achasi ike nke na-egbu mgbu nke e chere ihu n’ebe m nọ abalị ahụ nile.

N’ọtụtụ oge ha yiri egwu ịgba m égbè. Mgbe ụfọdụ abalị nke ịgba ajụjụ gasịrị, otu onye isi ndị agha Russia nọ n’ọkwá dị elu bịara leta m n’otu ụtụtụ. Enwere m ohere ịgwa ya na ndị Stasi Germany na-emeso m omume ọjọọ karịa ka ndị Nazi Gestapo meworo. Agwara m ya na Ndịàmà Jehova nọpụrụ iche n’okpuru gọọmenti Nazi, ha nọpụkwara iche n’okpuru gọọmenti ndị Kọmunist nakwa na anyị adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe ọ bụla n’ụwa. M kwuru na n’ụzọ dị iche, ọtụtụ ndị bụ ugbu a ndị isi Stasi abụworị ndị òtù nke òtù Ndị Ntorobịa Hitler, bụ́ ebe o yikarịrị ka ha mụtara otú e si akpagbu ndị aka ha dị ọcha n’ụzọ obi ọjọọ. Ka m na-ekwu okwu, ahụ nọ na-ama m jijiji n’ihi oyi, agụụ, na ike ọgwụgwụ.

N’ụzọ na-eju anya, onye isi agha ndị Russia ahụ ewesoghị m iwe. Kama nke ahụ, ọ sakwasịrị m blanket ma mesoo m ihe n’ụzọ obiọma. Nwa mgbe nta ọ bịasịrị nleta ya, a kpọghachiri m n’ụlọ nga dị mma n’ahụ karị. Ụbọchị ole na ole n’ihu, e nyefere m n’aka ụlọikpe Germany. Ka okwu m ka nọ na-echere, enwere m ezi ihe ùgwù nke isoro Ndịàmà ise ndị ọzọ nọrọ n’otu ụlọ nga. Mgbe m disịrị mmeso obi ọjọọ dị ukwuu, lee ihe na-enyeghachi ume ọ bụụrụ m iso ụmụnna ime mmụọ m kpakọrịta!—Abụ Ọma 133:1.

N’ụlọikpe e kwuru na ikpe nledo mara m, a makwara m ikpe ịga ụlọ mkpọrọ afọ anọ. E weere nke ahụ dị ka ntaramahụhụ na-adịchaghị njọ. A mara ụfọdụ n’ime ụmụnna ahụ ikpe ịnọ ihe karịrị afọ iri. E zijere m ụlọ mkpọrọ ebe a kasị eche nche. Echere m na ọbụnadị òké enweghị ike isite n’ụlọ mkpọrọ ahụ mịpụ ma ọ bụ mịbata—nchebe ya siri ike nke ukwuu. Ma, site n’enyemaka Jehova ụfọdụ ụmụnna nwere obi ike nwere ike izobata Bible dum. E debere ya iche ma kewasịa ya gaa n’akwụkwọ ya nke ọ bụla ma kesaa ya n’etiti ụmụnna nọ mkpọrọ.

Olee otú anyị si mee ya? Ọ tara nnọọ akpụ. Nanị oge anyị zutere onwe anyị bụ mgbe a na-akpọga anyị n’ebe anyị ga-asa ahụ izu abụọ ọ bụla. N’otu oge, ka m na-asa ahụ, otu nwanna takwụnyere m ná ntị na ya ezowo ụfọdụ peji Bible n’ákwà nhicha ahụ ya. Mgbe m sasịrị ahụ m gaje iwere ákwà nhicha ahụ ya kama iwere nke m.

Otu n’ime ndị nche hụrụ ka nwanna ahụ na-atakwụnyere m ihe wee jiri mkpara kụnye ya isi aba okpu. Eweere m ákwà nhicha ahụ ahụ ngwa ngwa ma sonyere ndị mkpọrọ ndị ọzọ. Dị ka ihe obi ụtọ e jideghị m ka m ji peji Bible ndị ahụ. Ma ọ bụghị ya usoro iri nri ime mmụọ anyị gaara anọ n’ihe ize ndụ. Anyị nwere ọtụtụ ahụmahụ yiri nke ahụ. Anyị na-agụ Bible anyị mgbe nile na nzuzo nakwa n’oké ihe ize ndụ. Okwu nke Pita onyeozi, bụ́ “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche,” kwesịrị nnọọ ekwesị.—1 Pita 5:8.

N’ihi ihe ụfọdụ, ndị ọchịchị ahụ kpebiri ịkpọfe ụfọdụ n’ime anyị mgbe mgbe site n’otu ụlọ mkpọrọ gaa n’ọzọ. N’ime afọ anọ, a kpọfere m n’ihe dị ka ụlọ mkpọrọ iri dị iche iche. Ma, m na-enwe ike achọta ụmụnna mgbe nile. Abịara m hụ ụmụnna ndị a nile n’anya nke ukwuu, ana m enwekwa oké obi mwute ịhapụ ha mgbe ọ bụla a kpọfere m n’ebe ọzọ.

N’ikpeazụ e zigara m Leipzig, n’ebe ahụkwa a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ. Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ nke tọhapụrụ m asịghị m gaa nke ọma, kama, “Anyị ga-ahụ gị ọzọ n’oge na-adịghị anya.” Uche ọjọọ ya chọrọ ka m bịaghachi ná mkpọrọ. M na-echekarị banyere Abụ Ọma 124:2, 3, ebe ọ na-asị: “A sị na ọ bụghị Jehova nke dịịrị anyị, mgbe mmadụ biliri imegide anyị: mgbe ahụ ha ga-eloworị anyị ná ndụ, mgbe iwe ha dị ọkụ n’ahụ anyị.”

Jehova Na-agbapụta Ndị Ohu Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe

Ugbu a abụrụwo m onye nweere onwe ya ọzọ. Ejima m, bụ́ Ruth, na Nwanna Nwanyị Herta Schlensog nọ n’ebe ahụ n’ọnụ ámá na-echere m. N’oge ndị a nile m gara mkpọrọ, Herta ziteere m otu ntakịrị ngwugwu nri kwa ọnwa. Ekwenyere m n’ezie na e wezụga ngwugwu nta ndị ahụ, m gaara anwụ n’ụlọ mkpọrọ. Ka Jehova jiri obi ebere cheta ya.

Kemgbe a tọhapụrụ m, Jehova ejiriwo ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi gọzie m. Ejere m ozi ọzọ dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche, na Gronau, Germany, nakwa dị ka onye nlekọta sekit n’Ebe Ugwu nke Germany. Mgbe e mesịrị, a kpọrọ m òkù ka m denye aha na klas nke 31 nke Watchtower Bible School of Gilead maka ndị ozi ala ọzọ. Ngụsị akwụkwọ anyị weere ọnọdụ n’Ámá Egwuregwu Yankee n’oge mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na 1958. Enwere m ihe ùgwù nke ịgwa oké ìgwè ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị okwu na ịkọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ m.

Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ emere m njem gaa Chile ije ozi dị ka onye ozi ala ọzọ. N’ebe ahụ ejere m ozi ọzọ dị ka onye nlekọta sekit, n’ebe ime ime ndịda nke Chile—e zigara m nnọọ ná nsọtụ nke ụwa. Na 1962, alụrụ m Patsy Beutnagel, ọmarịcha onye ozi ala ọzọ sitere San Antonio, Texas, U.S.A. M nụrụ ụtọ ọtụtụ afọ magburu onwe ha nke ijere Jehova ozi, ya ana-akwado m.

N’ihe karịrị afọ 70 nke ndụ m, enwewo m ọtụtụ oge obi ụtọ na ọtụtụ ọdachi. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19) Na 1963, mgbe anyị ka nọ na Chile, ọnwụ ọjọọ nke nwa anyị nwanyị dakwasịrị mụ na Patsy. Ka oge na-aga, Patsy dara oké ọrịa, anyị kwagakwara Texas. Mgbe ọ gbara nanị afọ 43, ọ nwụrụ, n’okpuru ọnọdụ ndị dịkwa njọ. M na-ekpekarị ekpere ka Jehova jiri obi ebere cheta ezi nwunye m.

Ugbu a, ọ bụ ezie na m na-arịa ọrịa, kaakwa nká, m nwere ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile na okenye na Brady, Texas. N’eziokwu, ndụ adịbeghị mfe mgbe nile, a ka nwekwara ule ndị ọzọ m ka ga-eche ihu. Otú ọ dị, dị ka ọbụ abụ ahụ apụrụ m ikwu, sị: “Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile.”—Abụ Ọma 71:17.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

(1) Ije ozi taa dị ka okenye na ọsụ ụzọ, (2) mụ na Pasty, n’oge na-adịghị anya tupu agbamakwụkwọ anyị, (3) n’ime klas Herr Schneider, (4) nne m, Teresa, bụ́ onye nwụrụ na Ravensbrück

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya