Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/15 p. 4-7
  • Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzọpụta—Ọ̀ Dị n’Okpukpe Nile?
  • Ezi Ihe Ọmụma Banyere Jisọs Dị Mkpa Maka Nzọpụta
  • Ezi Ihe Ọmụma Banyere Chineke Dịkwa Mkpa
  • N’ime Mmụọ na Eziokwu
  • Okwukwe Na-akpali Ime Ihe
  • Ihe Nzọpụta Pụrụ Ịpụtara Gị
  • Mee Ka “Olileanya Nzọpụta” Gị Na-egbukepụ Egbukepụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gịnị Bụ Nzọpụta?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mmadụ Ịsị “Ekweere M na Jizọs” Ọ̀ Bụ Naanị Ya Ga-eme Ka A Zọpụta Ya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Ọ Bụ Naanị Ha Ka A Ga-azọpụta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/15 p. 4-7

Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie

‘À ZỌPỤTAWO gị?’ Mgbe mgbe, ndị na-ajụ ajụjụ a na-eche na a zọpụtawo ha n’ihi na ha ‘anarawo Jisọs dị ka Onye Nzọpụta ha.’ Ma ndị ọzọ na-eche na e nwere ọtụtụ ụzọ na-eduga ná nzọpụta nakwa na ọ bụrụhaala na ‘Jisọs nọ n’ime obi gị,’ ihe i kwere ma ọ bụ ọbụna chọọchị ị nọ na ya adịghị ihe o mere.

Bible na-asị na ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta mmadụ nile.” (1 Timoti 2:3, 4) N’ihi ya nzọpụta dịịrị ndị nile ga-anakwere ya. Ma gịnị kpọmkwem ka ịbụ onye a zọpụtara pụtara? Ọ̀ bụ n’ezie ihe ga-eme gị nnọọ n’etinyeghị mgbalị ọ bụla?

Okwu ahụ bụ́ “nzọpụta” pụtara “nnapụta site n’ihe ize ndụ ma ọ bụ mbibi.” N’ihi ya ezi nzọpụta na-agụnye ihe karịrị ọnọdụ uche dị jụụ. Ọ na-apụta ịbụ onye a zọpụtara site ná mbibi nke ajọ usoro ihe a na n’ikpeazụ site n’ọnwụ n’onwe ya! Ma ònye kpọmkwem ka Chineke ga-azọpụta? Iji zaa ya, ka anyị nyochaa ihe Jisọs Kraịst kụziri n’isiokwu a. Ihe ndị ga-esi ná nchọpụta anyị pụta pụrụ ịtụ gị n’anya.

Nzọpụta—Ọ̀ Dị n’Okpukpe Nile?

N’otu oge, Jisọs sooro otu nwanyị Sameria nwee mkparịta ụka. Ọ bụ ezie na ọ bụghị onye Juu, o kwere nnọọ n’ụzọ ziri ezi na Mesaịa ga-abịa bụ́ “Onye a na-akpọ Kraịst.” (Jọn 4:25) Nkweta dị otú ahụ ò zuru ezu ime ka ọ bụrụ onye a zọpụtara? Mba, n’ihi na Jisọs ji obi ike gwa nwanyị ahụ, sị: “Unu onwe unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị.” Jisọs maara na ọ bụrụ na nwanyị a ga-enweta nzọpụta, ọ ghaghị ịgbanwe ụzọ o si efe ofufe. Ya mere Jisọs kọwara, sị: “Ma oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.”—Jọn 4:22, 23.

Oge ọzọ Jisọs kpughere echiche ya banyere nzọpụta metụtara ndị Farisii, otu ịrọ òtù a ma ama nke okpukpe ndị Juu. Ndị Farisii ewulitewo otu usoro ofufe ma kwere na o nwere nnwapụta nke Chineke. Ma gee ntị n’okwu Jisọs gwara ndị Farisii: “Unu ndị ihu abụọ! Aịsaịa ziri ezi mgbe o buru amụma banyere unu, sị: ‘Ndị a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha, ma obi ha dị anya n’ebe m nọ. N’efu ka ha na-efe m; ozizi ha bụ nanị ụkpụrụ nduzi mmadụ kụziri.’”—Matiu 15:7-9, New International Version.

Gịnị banyere ọtụtụ òtù okpukpe taa ndị na-azọrọ na ha kwere na Kraịst? Jisọs ọ̀ ga-akwadocha ha nile dị ka ụzọ zichara ezi isi nweta nzọpụta? Ọ dịghị mkpa anyị ịkọ nkọ n’akụkụ a, n’ihi na Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha Gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ànyị ejighịkwa aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.

Ezi Ihe Ọmụma Banyere Jisọs Dị Mkpa Maka Nzọpụta

Okwu Jisọs ndị a nwere ihe ndị na-akpali echiche ha na-atụ aro ya. Ha na-egosi na ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe adịghị ‘eme ihe Nna ya na-achọ.’ Mgbe ahụ, olee otú mmadụ pụrụ isi nweta ezi nzọpụta? Timoti nke Mbụ 2:3, 4 na-aza, sị: “[Chineke] na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Tụlee Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

Ihe ọmụma dị otú ahụ dị mkpa iji nweta nzọpụta. Mgbe otu onye nche ụlọ mkpọrọ Rom jụrụ Pọl onyeozi na onye ibe ya, bụ́ Saịlas, ajụjụ, sị, “Gịnị dị mkpa ka m mee ka e wee zọpụta m?” ha zara, sị: “Kwere n’Onyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụtakwa gị, gị onwe gị na ezinụlọ gị.” (Ọrụ 16:30, 31) Nke ahụ ọ̀ na-apụta na nanị ihe dị onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya mkpa ime bụ inwe otu ụdị mmetụta n’obi ha? Mba, otu ihe bụ na ha apụghị n’eziokwu ‘ikwere n’Onyenwe anyị Jisọs’ ọ gwụla ma ha nwere nghọta ụfọdụ banyere onye Jisọs bụ, ihe o mere, na ihe ọ kụziri.

Dị ka ihe atụ, Jisọs kụziri banyere nguzobe nke otu ọchịchị eluigwe—“alaeze Chineke.” (Luk 4:43) O setịpụkwara ụkpụrụ banyere omume na akparamàgwà ndị Kraịst. (Matiu, isi nke 5-7) O gosipụtara nguzo ndị na-eso ụzọ ya ga-ewere mgbe a bịara n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 15:19) O guzobere usoro izi ihe zuru ụwa ọnụ ma nye ụmụazụ ya iwu ikere òkè na ya. (Matiu 24:14; Ọrụ 1:8) Ee, ‘ikwere na Jisọs’ pụtara ịghọta ọtụtụ ihe! Mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ ihe mere Pọl na Saịlas jiri “gwa [onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ] okwu Onyenwe anyị, ya na ndị nile nọ n’ụlọ ya” tupu e mee ndị ọhụrụ a kwere ekwe baptism.—Ọrụ 16:32, 33.

Ezi Ihe Ọmụma Banyere Chineke Dịkwa Mkpa

Otu akụkụ dị mkpa nke ikwere na Jisọs n’ezie na-agụnye ife Chineke ahụ nke Jisọs n’onwe ya na-efe ofufe. Jisọs kpere ekpere, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

N’oge ije ozi elu ala ya, Ọkpara Chineke dọọrọ uche mgbe nile gaa n’ebe Nna ya nọ, ọ bụghịkwa na ya onwe ya. Ọ dịghị mgbe ọ zọọrọ na ya bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. (Jọn 12:49, 50) N’ọtụtụ oge Jisọs mere ka ọnọdụ ya ná ndokwa Chineke doo anya site n’ikwupụta na ya nọ n’okpuru Nna ya. (Luk 22:41, 42; Jọn 5:19) Leenụ, Jisọs kwupụtara, sị: “Nna m ka Mụ onwe m ukwuu.” (Jọn 14:28) Chọọchị gị ọ̀ kụziworo gị ezi mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Kraịst? Ka è dujewo gị n’ikwere na Jisọs n’onwe ya bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile? Nzọpụta gị na-adabere n’inwe nghọta ziri ezi.

N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ikpe ekpere, sị: “Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị Bible ekpuchiwo aha Chineke, na-asụgharị ya ịbụ “Onyenwe anyị.” Ma n’ihe odide ochie nke “Agba Ochie,” aha Chineke pụtara ihe karịrị ugboro puku isii! N’ihi ya Abụ Ọma 83:18 na-agụ, sị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) À kụziworo gị iji aha Chineke, bụ́ Jehova, eme ihe? Ma ọ bụghị otú ahụ, nzọpụta gị dị n’ihe ize ndụ, n’ihi na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha [Jehova, NW], a ga-azọpụta ya”!—Ọrụ 2:21; tụlee Joel 2:32.

N’ime Mmụọ na Eziokwu

Jisọs Kraịst dọkwaara uche gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Mgbe ọ na-akọwa echiche Chineke n’okwu ụfọdụ, ọ na-ekwu mgbe mgbe, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị.” (Matiu 4:4, 7, 10; 11:10; 21:13) Abalị ahụ tupu ya anwụọ, Jisọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Were eziokwu doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.

N’ihi ya inwe nghọta nke ozizi nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ ihe ọzọ dị mkpa maka nzọpụta. (2 Timoti 3:16) Nanị Bible na-aza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị bụ nzube nke ndụ? N’ihi gịnị ka Chineke ji hapụ ajọ omume ka ọ dịgide ruo ogologo oge otú a? Gịnị na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ? Chineke ọ̀ na-emekpa ụmụ mmadụ ahụ na hel dị ọkụ? Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?a Mmadụ apụghị ife Chineke ofufe n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’enweghị nghọta ziri ezi nke okwu ndị ahụ, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23.

Okwukwe Na-akpali Ime Ihe

Nzọpụta na-agụnye ihe karịrị nanị inweta ihe ọmụma. N’obi na-anabata ihe, ezi ihe ọmụma nke Chineke na-arụpụta okwukwe. (Ndị Rom 10:10, 17; Ndị Hibru 11:6) Okwukwe dị otú ahụ na-akpali mmadụ ime ihe. Dị ka ihe atụ, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ya mere chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu Onyenwe anyị bịa otú a.”—Ọrụ 3:19.

Ee, nzọpụta na-agụnyekwa ime onwe onye ka o kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke maka àgwà na omume ọma. N’okpuru mmetụta na-enwogha enwogha nke Okwu Chineke, ịkwụwa aka ọtọ na ikwu eziokwu na-anọchi àgwà ịgha ụgha na aghụghọ bụ́ ndị riworo mmadụ ahụ. (Taịtọs 2:10) A na-agbahapụ omume rụrụ arụ, ndị dị ka ndina ụdị onwe, ịkwa iko nile, ma were omume dị ọcha dochie ha. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Nke a abụghị nsepụ aka na-adị nwa oge nke dabeere ná mmetụta uche kama ọ bụ mgbanwe na-adịgide adịgide na-esite n’iji nlezianya mụọ ma tinye Okwu Chineke n’ọrụ.—Ndị Efesọs 4:22-24.

Ka oge na-aga, ịhụnanya na obi ekele maka Chineke na-akpali onye nwere obi eziokwu ime nraranye zuru ezu nye Chineke na igosipụta ya site na baptism ime mmiri. (Matiu 28:19, 20; Ndị Rom 12:1) Ndị Kraịst e mere baptism bụ ndị a zọpụtara azọpụta n’anya Chineke. (1 Pita 3:21) Ná mbibi na-abịa abịa nke ajọ ụwa a, Chineke ga-azọpụta ha kpam kpam site n’ichebe ha gabiga mkpagbu ahụ.—Mkpughe 7:9, 14.

Ihe Nzọpụta Pụrụ Ịpụtara Gị

O doro anya site ná ntule a dị mkpirikpi na inweta nzọpụta na-agụnye ihe karịrị ‘inwe Onyenwe anyị Jisọs n’ime obi gị.’ Ọ na-apụta ịnara ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na mmadụ ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ya. Ime nke a pụrụ ịda ka ihe siri oké ike, ma Ndịàmà Jehova dị njikere inyere gị aka n’ihe omume a. Site n’ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, ha pụrụ inyere gị aka ịmalite ịga ije n’ụzọ na-eduga n’ezi nzọpụta.b

N’ihi ịdị nso nke ụbọchị ikpe nke Chineke na-abịanụ, ime otú ahụ dị ngwa karịa ka ọ dịtụworo! Ugbu a bụ oge ige ntị n’okwu onye amụma ahụ: “Mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:2, 3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle nke isiokwu ndị a, biko lee Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Ọ bụrụ na ọmụmụ Bible ebe obibi ga-amasị gị, biko kpọtụrụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị. Ma ọ bụ ị pụrụ idetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.

[Igbe dị na peeji nke 6]

NZỌPỤTA NA-ESITE...

◻ N’inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke na Jisọs.—Jọn 17:3.

◻ N’inwe okwukwe.—Ndị Rom 10:17; Ndị Hibru 11:6.

◻ N’ichegharị na ichigharị.—Ọrụ 3:19; Ndị Efesọs 4:22-24.

◻ Ná nraranye na baptism.—Matiu 16:24; 28:19, 20.

◻ N’ịnọgide na-eme nkwupụta ihu ọha.—Matiu 24:14; Ndị Rom 10:10.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịmụ Bible, itinye ihe a na-amụta n’ọrụ, nraranye, na baptism bụ nzọụkwụ ndị na-eduje ná nzọpụta

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya