Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
“[Nye] ndị ketaworo okwukwe dị oké ọnụ ahịa hà ka nke anyị ketaworo.”—2 PITA 1:1.
1. Gịnị ka Jisọs kwuru n’ịdọ ndị ozi ya aka ná ntị, ma gịnị ka Pita turu ọnụ ya?
N’UHURUCHI ahụ tupu ọnwụ Jisọs, o kwuru na ndị ozi ya nile ga-agbahapụ ya. Otu n’ime ha, Pita, turu ọnụ, sị: “Ọ bụrụ na a ga-eme mmadụ nile ka ha ma n’ọnyà n’ahụ Gị, a gaghị eme ka mụ onwe m ma n’ọnyà mgbe ọ bụla.” (Matiu 26:33, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ma Jisọs maara ihe dị iche. Ọ bụ ya mere o ji gwa Pita n’otu mgbe ahụ, sị: “Mụ onwe m rịọrọ arịrịọ banyere gị, ka okwukwe gị ghara ịgwụ agwụ: gị onwe gị, mgbe ị ga-echigharịworị, gị meekwa ka ụmụnna gị guzosie ike.”—Luk 22:32.
2. N’agbanyeghị obi ike gabigara ókè nke Pita, omume dịgasị aṅaa o mere gosiri na okwukwe ya esighị ike?
2 Pita, onye nwebigaworo obi ike ókè banyere okwukwe ya, gọnahụrụ Jisọs n’abalị ahụ kpọmkwem. Ugbo atọ ọ gọrọ na ya amatụghị Kraịst! (Matiu 26:69-75) Mgbe o ‘chigharịrị,’ okwu Onyenwe ya, bụ́ “meekwa ka ụmụnna gị guzosie ike,” aghaghị ịdasiwo ụda ike ma doo anya ná ntị ya. Ndụmọdụ ahụ metụtara ihe fọrọ ná ndụ Pita nke ukwuu, dị ka akwụkwọ ozi abụọ o dere na-agba àmà, bụ́ ndị e chekwara n’ime Bible.
Ihe Mere Pita Ji Dee Akwụkwọ Ozi Ya
3. N’ihi gịnị ka Pita ji dee akwụkwọ ozi mbụ ya?
3 Ihe dị ka afọ 30 Jisọs nwụsịrị, Pita dere akwụkwọ ozi ya mbụ, na-edegara ya ụmụnna ya nọ na Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia, ógbè ndị mejupụtara ugbu a ebe ugwu na ọdịda anyanwụ nke Turkey. (1 Pita 1:1) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Juu, ndị ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịghọwo ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A., so ná ndị Pita degaara akwụkwọ. (Ọrụ 2:1, 7-9) Ọtụtụ bụ ndị Jentaịl ndị na-enwe ule kpụ ọkụ n’ọnụ n’aka ndị mmegide. (1 Pita 1:6, 7; 2:12, 19, 20; 3:13-17; 4:12-14) Ya mere Pita degaara ụmụnna a akwụkwọ iji gbaa ha ume. Nzube ya bụ inyere ha aka ịnata “ihe okwukwe [ha] ga-eweta, bụ́ nzọpụta nke mkpụrụ obi [ha].” N’ihi ya, na ndụmọdụ ya iji sị ka o mesịa, ọ gbara ume, sị: “Na-eguzogidenụ [Ekwensu], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe.”—1 Pita 1:9; 5:8-10.
4. N’ihi gịnị ka Pita ji dee akwụkwọ ozi nke abụọ ya?
4 E mesịa, Pita degaara ndị Kraịst a akwụkwọ ozi nke abụọ. (2 Pita 3:1) N’ihi gịnị? N’ihi na ọbụna ihe ize ndụ ka njọ dị. Ndị rụrụ arụ n’omume ga-anwa ịkwalite àgwà ha na-emerụ emerụ n’etiti ndị kwere ekwe ma duhie ụfọdụ! (2 Pita 2:1-3) Ọzọkwa, Pita dọrọ aka ná ntị banyere ndị na-akwa emo. O dewo n’akwụkwọ ozi mbụ ya na “ọgwụgwụ ihe nile dị nso,” ugbu a kwa o doro anya na ụfọdụ na-achị echiche dị otú ahụ ọchị. (1 Pita 4:7; 2 Pita 3:3, 4) Ka anyị tụlee akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pita ma hụ ụzọ o si gbaa ụmụnna ahụ ume iguzosi ike n’okwukwe. N’isiokwu mbụ a, anyị ga-atụle 2 Pita isi 1.
Nzube nke Isi 1
5. Olee otú Pita si kwadebe ndị na-agụ akwụkwọ ya maka ntụle nke nsogbu dị iche iche?
5 Pita atụleghị ozugbo ajọ nsogbu ndị ahụ. Kama nke ahụ, ọ kwadebere ụzọ maka ntụle nke nsogbu ndị a site n’iwulite mmasị ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya maka ihe ha natara mgbe ha ghọrọ ndị Kraịst. Ọ na-echetara ha nkwa Chineke ndị dị ebube na ikwesị ndabere nke amụma Bible nile. Ọ na-eme nke a site n’ịkọ banyere nnwogha ahụ, ọhụụ ahụ ọ hụrụ n’onwe ya banyere Kraịst n’ike Alaeze.—Matiu 17:1-8; 2 Pita 1:3, 4, 11, 16-21.
6, 7. (a) Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’okwu mmeghe nke akwụkwọ ozi Pita? (b) Ọ bụrụ na anyị na-enye ndụmọdụ, ihe dị aṅaa ka ọ pụrụ inye aka mgbe ụfọdụ ka anyị kweta?
6 Ànyị pụrụ ịmụta ihe site n’okwu mmeghe Pita? Ọ̀ bụ na ndụmọdụ adịghị aka mfe nnakwere ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ soro ndị na-ege ntị tụleghachi akụkụ dị iche iche nke olileanya Alaeze dị ebube nke anyị nile na-ewere dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa? Gịnịkwa banyere iji ahụmahụ onwe onye eme ihe? Ma eleghị anya, mgbe Jisọs nwụsịrị, ugboro ugboro Pita kọrọ banyere ịhụ ọhụụ ahụ nke Kraịst n’ebube Alaeze.—Matiu 17:9.
7 Chetakwa na o yikarịrị nnọọ ka ma ọ na-erule oge Pita dere akwụkwọ ozi nke abụọ ya, e kesawo Oziọma Matiu na akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Galetia nke ukwuu. Ya mere mmejọ Pita dị ka mmadụ nakwa ihe ndekọ ya nke okwukwe pụrụ ịbụ nke ndị oge ya mawooro nke ọma. (Matiu 16:21-23; Ndị Galetia 2:11-14) Otú ọ dị, nke a anapụghị ya nkwuwa okwu ya. N’ezie, ọ pụrụ imewo ka akwụkwọ ozi ya na-adọrọkwu adọrọ nye ndị maara adịghị ike nke ha. Ya mere, mgbe a na-enyere ndị nwere nsogbu aka, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị irè ikweta na anyị onwe anyị pụkwara ịdahie?—Ndị Rom 3:23; Ndị Galetia 6:1.
Ekele nke Na-ewusi Ike
8. N’echiche dị aṅaa ka o yiri ka Pita ji okwu bụ “okwukwe” mee ihe?
8 Ugbu a tụlee ekele Pita. O welitere ozugbo isiokwu nke okwukwe, na-akpọ ndị na-agụ akwụkwọ ya “ndị ketaworo okwukwe dị oké ọnụ ahịa hà ka nke anyị ketaworo.” (2 Pita 1:1) N’ebe a okwu bụ́ “okwukwe” yiri ka ọ pụtara “nkwenyesi ike” ma na-ezo aka ná nchịkọta nke nkwenkwe ma ọ bụ nkụzi ndị Kraịst, bụ́ ndị a na-akpọ mgbe ụfọdụ “eziokwu” n’ime Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Galetia 5:7; 2 Pita 2:2; 2 Jọn 1) A na-ejikarị okwu bụ́ “okwukwe” eme ihe n’echiche a karịa n’echiche izugbe nke ntụkwasị obi ma ọ bụ obi ike e nwere n’ahụ mmadụ ma ọ bụ n’ebe ihe dị.—Ọrụ 6:7; 2 Ndị Kọrint 13:5; Ndị Galetia 6:10; Ndị Efesọs 4:5; Jud 3.
9. N’ihi gịnị ka ekele Pita na-aghaghị ijiwo kpoo ọkụ nye ndị Jentaịl karịsịa?
9 Ekele Pita aghaghị ikpowo ọkụ karịsịa nye ndị Jentaịl na-agụ ya. Ndị Juu adịghị eso ndị Jentaịl enwe mmekọ ọ bụla, ọbụna na-akpọ ha asị, ajọ mbunobi megide ndị Jentaịl dịgidekwara n’etiti ndị Juu ghọworo ndị Kraịst. (Luk 10:29-37; Jọn 4:9; Ọrụ 10:28) Ma, Pita, onye Juu site n’ọmụmụ na onyeozi Jisọs Kraịst, kwuru na ndị na-agụ okwu ya—ndị Juu na ndị Jentaịl—so ya na-eketakọ otu okwukwe ahụ ma na-enwe ihe dị oké ọnụ ahịa hà nhata.
10. Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site n’ekele Pita?
10 Chee banyere ihe ọma ndị ekele Pita na-akụziri anyị taa. Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu; ọ dịghị egosi otu agbụrụ ma ọ bụ mba ihu ọma karịa ọzọ. (Ọrụ 10:34, 35; 11:1, 17; 15:3-9) Dị ka Jisọs n’onwe ya kụziri, ndị Kraịst nile bụ ụmụnna, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iche na ya ka ndị ọzọ. Ọzọ, ekele Pita na-emesi ike na anyị bụ n’ezie òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, ndị nwere okwukwe “dị oké ọnụ ahịa hà” ka nke Pita na ndị ozi ibe ya nwere.—Matiu 23:8; 1 Pita 5:9.
Ihe Ọmụma na Nkwa Chineke
11. Mgbe ekele ya gasịrị, olee ihe ndị dị mkpa Pita mesiri ike?
11 Mgbe ekele ya gasịrị, Pita na-ede, sị: “Ka e mee ka amara baara unu ụba, ya na udo.” Olee otú e si eme ka amara na udo baara anyị ụba? “N’ime mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị,” ka Pita na-aza. Mgbe ahụ ọ na-asị: ‘Ike O ji bụrụ Chineke enyewo n’aka anyị ihe nile dịịrị ndụ na nsọpụrụ Chineke n’efu.’ Ma olee otú anyị si anata ihe ndị a dị mkpa? “Site ná mmazu nke Onye ahụ Onye ji ebube na ịdị mma nke aka Ya kpọọ anyị.” Otú a ugbo abụọ Pita mesiri ike na ezi ihe ọmụma nke Chineke na Ọkpara ya dị mkpa.—2 Pita 1:2, 3; Jọn 17:3.
12. (a) N’ihi gịnị ka Pita ji mesie ịdị mkpa nke mmazu ike? (b) Iji nweta nkwa Chineke, gịnị ka anyị na-aghaghị ibuwo ụzọ mee?
12 “Ndị ozizi ụgha” Pita dọrọ aka ná ntị banyere ha n’isi nke 2 na-eji “okwu nrafu” eduhie ndị Kraịst. N’ụzọ dị otú a ha na-anwa ịrabanyeghachi ha n’omume rụrụ arụ bụ́ nke e si na ya gbapụta ha. Ihe ndị ọ ga-arụpụtara onye ọ bụla e siteworo ná “mmazu nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst” zọpụta, bụ́ onye mesịkwara daba n’ụdị nduhie ahụ dị oké njọ. (2 Pita 2:1-3, 20) Dị ka ihe àmà na-egosi, n’atụmanya nke ịtụle nsogbu a ma e mesịa, Pita mesiri ike kpọmkwem ná mmalite akwụkwọ ozi ya òkè mmazu na-ekere n’ịnọgide na-enwe nguzo dị ọcha n’ebe Chineke nọ. Pita na-ekwu na Chineke ‘enyewo n’aka anyị nkwa nile ahụ dị oké ọnụ ahịa dịkwa ukwuu hie nne; ka unu wee site n’ihe ndị a ghọọ ndị na-enwekọ ihe O ji bụrụ Chineke.’ Ma, iji nweta nkwa ndị a, ndị bụ akụkụ doro anya nke okwukwe anyị, ka Pita na-ekwu, anyị aghaghị ibu ụzọ ‘gbanarị mmebi nke dị n’ụwa site n’agụụ ihe ọjọọ.’—2 Pita 1:4.
13. Gịnị ka ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ kpebiri ijisi ike?
13 Olee otú i si ele nkwa Chineke anya? Ọ̀ bụ n’ụzọ ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ si ele ha? Na 1991, Frederick Franz, onye isi oche Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ, bụ́ onye jeworo ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 75, chịkọtara mmetụta ndị na-ele anya iso Kraịst chịa: “Anyị na-ejigidesi aka ike ruo kpọmkwem n’oge hour nke a, anyị ga-anọkwa na-ejigidesi aka ike ruo mgbe Chineke ga-egosipụtaworị n’ezie na ya ga-emezu ‘nkwa nile ahụ dị oké ọnụ ahịa, dịkwa ukwuu hie nne.’” Nwanna Franz nọgidere na-enwe obi ike ná nkwa Chineke nke mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe, o jisikwara okwukwe ahụ ike ruo ọnwụ ya n’afọ ndụ 99. (1 Ndị Kọrint 15:42-44; Ndị Filipaị 3:13, 14; 2 Timoti 2:10-12) N’otu aka ahụ, ọtụtụ nde mmadụ na-ejisi okwukwe ahụ ike, na-elekwasị anya ná nkwa Chineke nke paradaịs elu ala ebe ndị mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’obi ụtọ. Ị̀ bụ otu n’ime ndị a?—Luk 23:43; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.
Nzaghachi Nye Nkwa Chineke
14. N’ihi gịnị ka Pita ji depụta ịdị mma dị ka àgwà mbụ a ga-enyezu okwukwe?
14 Ànyị nwere obi ekele nye Chineke n’ihi ihe o kweworo ná nkwa? Ọ bụrụ otú ahụ, ka Pita na-arụ ụka ya, anyị kwesịrị igosi ya. “N’ihi otu ihe a” (n’ihi na Chineke enyewo anyị nkwa ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa), anyị kwesịrị itinye ezi mgbalị iji mee ihe. Afọ apụghị iju anyị na nanị ịnọ n’okwukwe ahụ ma ọ bụ nanị ịmata eziokwu Bible. Nke ahụ ezughị! Ikekwe n’ụbọchị Pita ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ kwuru oké okwu banyere okwukwe ma tinye aka n’àgwà rụrụ arụ. Ọ dị mkpa na akparamàgwà ha bụ nke dị mma, ya mere Pita na-agba ume, sị: “Nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu.”—2 Pita 1:5; Jemes 2:14-17.
15. (a) N’ihi gịnị ka e ji depụta ihe ọmụma mgbe e depụtasịrị ịdị mma dị ka àgwà a ga-enyezu okwukwe? (b) Olee àgwà ndị ọzọ ga-ejikere anyị ijisi okwukwe ike?
15 Mgbe ọ kpọtụsịrị ịdị mma, Pita depụtara àgwà isii ọzọ a na-aghaghị inyezu, ma ọ bụ ịtụkwasị n’okwukwe anyị. Nke ọ bụla n’ime ndị a dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ‘ga-eguzosi ike n’okwukwe.’ (1 Ndị Kọrint 16:13) N’ihi na ndị dapụrụ n’ezi ofufe ‘na-atụgharị akwụkwọ nsọ’ ma na-akwalite “ozizi nduhie” (NW), Pita depụtaziri ihe ọmụma dị ka ihe dị mkpa, na-asị: “Nyezuokwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu.” Mgbe ahụ ọ gara n’ihu: “Nyezuokwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu; nyezuokwa ntachi obi n’ijisi onwe unu ike; nyezuokwa nsọpụrụ Chineke n’ime ntachi obi unu; nyezuokwa ịhụnanya ụmụnna n’ime nsọpụrụ Chineke unu; nyezuokwa ịhụnanya n’ịhụnanya ụmụnna unu.”—2 Pita 1:5-7; 2:12, 13; 3:16.
16. Gịnị ga-eme ma e nyezuo okwukwe àgwà ndị ahụ Pita depụtara, ma gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na e nyezughị ya ha?
16 Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na e nyezuo okwukwe anyị ihe asaa ndị a? “A sị na unu nwere ihe ndị a, a sịkwa na unu nwere ha hie nne,” ka Pita na-aza, “ha na-edo unu ndị na-abụghị ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ruo ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (2 Pita 1:8, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) N’aka nke ọzọ, ka Pita na-ekwu: “Onye ahụ ihe ndị a na-adịghị ya nso bụ onye kpuru ìsì, onye na-ahụ inyoghị inyoghị, ebe o chezọrọ nsachapụ nke mmehie ochie ya nile.” (2 Pita 1:9) Rịba ama na Pita gbanwere site n’iji “unu” na “anyị” eme ihe gaa n’iji “onye ahụ,” “o,” na “ya.” Ọ bụ ezie na, n’ụzọ dị mwute, ụfọdụ kpuru ìsì, na-echezọ ihe, ma ruo unyi, Pita n’obiọma adịghị enye echiche na onye na-agụ akwụkwọ ya bụ otu n’ime ndị a.—2 Pita 2:2.
Ime Ka Ụmụnna Ya Guzosie Ike
17. Gịnị pụrụ ịkpaliwo arịrịọ dị nro nke Pita ime “ihe ndị a”?
17 Ikekwe n’ihi ịmata na ọ pụrụ ịdị mfe iduhie ndị ọhụrụ karịsịa, Pita na-agba ha ume n’ụzọ dị nro, sị: “Ụmụnna m, na-anụnụ ọkụ n’obi karị ime ka ọkpụkpọ unu na nhọpụta unu bụrụ ihe na-eguzosi ike: n’ihi na a sị na unu emee ihe ndị a, unu agaghị asụ ngọngọ mgbe ọ bụla ma ọlị.” (2 Pita 1:10; 2:18) Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nyezuru okwukwe ha ihe asaa ndị a ga-enweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu hie nne, dị ka Pita na-ekwu: “A ga-enyezu unu n’akụ̀ mbata ahụ unu ga-abata n’ime alaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst.” (2 Pita 1:11) “Atụrụ ọzọ” ahụ ga-anata ihe nketa ebighị ebi n’ógbè elu ụwa nke Alaeze Chineke.—Jọn 10:16; Matiu 25:33, 34.
18. N’ihi gịnị ka Pita ji nwee ọchịchọ ịdị ‘na-echetara ụmụnna ya ihe mgbe dum’?
18 Pita n’ezi obi chọrọ ụgwọ ọrụ dị ukwuu otú ahụ maka ụmụnna ya. “N’ihi nke a,” ka ọ na-ede, “mgbe dum agaje m ichetara unu ihe ndị a, ọ bụ ezie na unu matara ha, e mewokwa ka unu guzosie ike n’eziokwu ahụ.” (2 Pita 1:12) Pita jiri okwu Grik bụ́ ste·riʹzo mee ihe, bụ́ nke a sụgharịrị “guzosie ike” n’ebe a ma bụrụ nke e ji mee ihe na ndụmọdụ Jisọs nyeburu Pita: “Meekwa ka ụmụnna gị guzosie ike.” (Luk 22:32) Iji okwu ahụ mee ihe pụrụ ịtụ aro na Pita na-echeta ndụmọdụ ahụ dị ike ọ natara site n’aka Onyenwe ya. Ugbu a Pita na-ekwu, sị: “Ana m agụ ya n’ihe ziri ezi, ka oge hà m nọ n’ụlọikwuu a [anụ ahụ mmadụ], ịkpali unu n’ichetara unu; ebe m matara na ntụpụ nke ụlọikwuu m nke a na-abịa ọsọ ọsọ.”—2 Pita 1:13, 14.
19. Ihe enyemaka dịgasị aṅaa dị anyị mkpa taa?
19 Ọ bụ ezie na Pita ji obiọma kwuo na ndị na-agụ akwụkwọ ya ‘guzosiri ike n’eziokwu,’ ọ matara na okwukwe ha pụrụ ikpu dị ka ụgbọ. (1 Timoti 1:19) Ebe ọ maara na ọ gaje ịnwụ n’isi nso, o mere ka ụmụnna ya guzosie ike site n’ịkpọtụ ihe ndị ha pụrụ imesịa cheta aha iji nọgide na-ewusi onwe ha ike n’ime mmụọ. (2 Pita 1:15; 3:12, 13) N’otu aka ahụ, ihe ncheta ndị na-abịa mgbe nile dị anyị onwe anyị taa mkpa iji nọgidesie ike n’okwukwe. N’agbanyeghị onye anyị bụ na ogologo oge anyị nọworo n’eziokwu, anyị apụghị ileghara ọgụgụ Bible mgbe nile, ọmụmụ ihe onwe onye, na ịga nzukọ ọgbakọ nile anya. Ụfọdụ na-enye ihe ngọpụ maka agaghị, na-asị na ike gwụkasịrị ha ahụ ma ọ bụ na nzukọ ndị ahụ bụ ikwughachi ihe e kwuburu ma ọ bụ na a dịghị eme ihe omume nke ọma, ma Pita maara ụzọ onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi ghara inwekwa okwukwe ngwa ngwa ma ọ bụrụ na anyị nwebiga obi ike ókè.—Mak 14:66-72; 1 Ndị Kọrint 10:12; Ndị Hibru 10:25.
Ihe Ndabere Siri Ike Maka Okwukwe Anyị
20, 21. Olee otú nnwogha ahụ si wusie okwukwe Pita na ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya, gụnyere anyị taa, ike?
20 Okwukwe anyị ọ̀ dabeere nanị n’akụkọ ndị e ji nkà chepụta? Pita na-aza n’ụzọ dị ike, sị: “Anyị esoghị akụkọ ifo nke e ji amamihe kọọ, mgbe anyị mere ka unu mara ike na [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ma e mere anyị ka anyị bụrụ ndị hụrụ ịdị ukwuu nke Onye ahụ.” Pita, Jemes, na Jọn so Jisọs nọrọ mgbe ha hụrụ ọhụụ banyere ya n’ike Alaeze. Pita na-akọwa: “Ọ natara nsọpụrụ na ebube n’aka Chineke, bụ́ Nna, mgbe Ebube ahụ nke kwesịrị ịdị ukwuu mere ka olu dị otú a daara Ya, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị Mụ onwe m ezi mma: olu a ka anyị [onwe] anyị nụkwara ka ọ na-esi n’eluigwe daa, mgbe anyị na Ya nọ n’ugwu ahụ dị nsọ.”—2 Pita 1:16-18.
21 Mgbe Pita, Jemes, na Jọn hụrụ ọhụụ ahụ, Alaeze ahụ ghọrọ n’ezie ihe dị adị nye ha! Pita na-ekwu, sị: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya.” Ee, ndị na-agụ akwụkwọ ozi Pita, gụnyere anyị taa, nwere ihe dị ike mere anyị ga-eji ṅaa ntị n’amụma dị iche iche banyere Alaeze Chineke. N’ụzọ dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị? Pita na-aza: “Dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tibe n’obi unu.”—2 Pita 1:19; Daniel 7:13, 14; Aịsaịa 9:6, 7.
22. (a) Nye gịnị ka ọ dị obi anyị mkpa ịnọ na nche? (b) Olee otú anyị si aṅa ntị n’okwu amụma ahụ?
22 Obi anyị ga-agba ọchịchịrị ma e nweghị ìhè nke okwu amụma ahụ. Ma site n’ịṅa ntị na ya, obi ndị Kraịst anọwo na nche nye chi ọbụbọ mgbe “kpakpando chi ọbụbọ,” Jisọs Kraịst, tibere n’ebube Alaeze. (Mkpughe 22:16) Olee otú anyị onwe anyị taa si aṅa ntị n’okwu amụma ahụ? Site n’ọmụmụ Bible, site n’ịkwadebe na ikere òkè ná nzukọ, na site ‘n’ijisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha.’ (1 Timoti 4:15) Ọ bụrụ na okwu amụma ahụ ga-adị ka oriọna na-enwu “n’ebe gbara ọchịchịrị” (obi anyị), anyị aghaghị ikwe ka o metụta anyị n’ụzọ miri emi—ọchịchọ, mmetụta uche, nkwali, na ihe mgbaru ọsọ anyị nile. Ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị na-amụ Bible, n’ihi na Pita mechiri isi 1, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 Pita 1:20, 21.
23. Maka gịnị ka isi mbụ nke 2 Pita jikewooro ndị na-agụ ya?
23 N’isi mbụ nke akwụkwọ ozi ya nke abụọ, Pita nyere ihe nkwali dị ike maka anyị ijisi okwukwe anyị dị oké ọnụ ahịa ike. Anyị dị njikere ugbu a maka ntụle nke okwu ndị siri ike ndị sochiri. Isiokwu na-esonụ ga-atụle isi nke 2 nke 2 Pita, ebe onyeozi ahụ tụlere ihe ịma aka nke mmetụta omume rụrụ arụ ndị gbebataworo n’ime ọgbakọ ndị ahụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka Pita ji mesie ịdị mkpa nke mmazu ike?
◻ Gịnị ka ọ pụrụ ịbụ ya kpatara e ji depụta ịdị mma dị ka àgwà mbụ a ga-atụkwasị n’okwukwe?
◻ N’ihi gịnị ka Pita ji nwee ọchịchọ ịdị na-echetara ụmụnna ya ihe mgbe dum?
◻ Ihe ndabere dị aṅaa siri ike ka Pita nyere maka okwukwe anyị?
[Foto dị na peeji nke 9]
Njehie Pita emeghị ka ọ gbahapụ okwukwe ya