Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/1 p. 21-25
  • Ekele Maka Ogologo Ndụ n’Ozi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekele Maka Ogologo Ndụ n’Ozi Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịbụ Ndị Echiche Okpukpe Metụtara
  • Nguzo M Maka Eziokwu Bible
  • Ije Ozi na Betel
  • Obi Ike n’Olileanya Alaeze
  • Ọrụ n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ
  • Ọrụ E Mere Ka Ọ Dịghachi Ọhụrụ Mgbe Agha ahụ Gasịrị
  • Ime Ihe M Pụrụ Ime
  • Inwe Okwukwe Ruo Ọgwụgwụ
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/1 p. 21-25

Ekele Maka Ogologo Ndụ n’Ozi Jehova

DỊ KA OTTILIE MYDLAND SI KỌỌ

Ná ngwụsị narị afọ nke 19, a dọbara ọtụtụ ụgbọ mmiri n’akụkụ ibe ha n’ọdụ ụgbọ mmiri Kopervik n’ebe ọdịda anyanwụ Norway. N’oge ndị ahụ, ndị mmadụ na ịnyịnya na-adọkpụgharị ụgbọala n’okporo ámá. Ndị mmadụ jiri ọkụ mpanaka ahụ ụzọ, e jikwa nkụ na icheku eme ka ụlọ osisi ndị e tere ágbá ọcha kporo ọkụ. A mụrụ m n’ebe ahụ na June 1898, nke abụọ n’ime ụmụ ise.

NA 1905, nna m enweghị ọrụ, ya mere ọ gara United States. Mgbe afọ atọ gasịrị, o bu akpati jupụtara n’onyinye na-eme obi ụtọ maka ụmụ ya na ákwà silk na ihe ndị ọzọ maka nne m lọta. Ma ihe onwunwe ya ndị kasị oké ọnụ ahịa bụ mpịakọta nke Charles Taze Russell a kpọrọ Studies in the Scriptures.

Nna m malitere ịgwa ndị enyi na ndị ikwu ya ihe ndị ọ mụtara site n’akwụkwọ ndị a. Ná nzukọ ụlọ ekpere dị n’ebe ahụ, o ji Bible gosi na e nweghị hel na-ere ọkụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Na 1909, afọ sochiri nke ahụ nna m si United States lọta, Nwanna Russell letara Norway ma kwuo okwu na Bergen na Kristiania, bụ́ Oslo ugbu a. Nna m gara Bergen ịnụrụ okwu ya.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ boro nna m ebubo ịkwalite ozizi ụgha. Ebere ya meere m, m wee nyere ya aka ikesara ndị agbata obi traktị ndị dabeere na Bible. Na 1912, enyere m nwa nwanyị onye ụkọchukwu otu traktị kwuru banyere hel. Ọ kpọrọ mụ na nna m iyi. Ọ wụrụ m akpata oyi na nwa nwanyị onye ụkọchukwu pụrụ ikwu okwu rụrụ arụ otú ahụ!

Ndị Mmụta Bible ndị ọzọ, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, letara anyị na Kopervik site n’oge ruo n’oge, tinyere Theodor Simonsen, bụ́ ezigbo ọkà okwu. M na-akpọ ndị mmadụ òkù maka okwu ndị o kwuru n’ụlọ anyị. Tupu okwu ya ọ na-akpọ ụbọ zither ma bụọ abụ, mgbe o kwusikwara okwu ya ọ na-abụ abụ mmechi. Anyị nwere nkwanye ùgwù miri emi maka ya.

Onye ọzọ na-abịa n’ụlọ anyị bụ Anna Andersen, onye colporteur, ma ọ bụ onye ozi oge nile. Ọ na-esite n’otu obodo gaa n’obodo ọzọ na Norway nile, na-eji ịnyịnya ígwè karịsịa, na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ọ dịwo mgbe ọ bụ onye okwuchukwu nke Salvation Army, marakwa ụfọdụ ndị isi Salvation Army nọ na Kopervik. Ha nyere ya ikike ikwu okwu dabere na Bible n’ụlọ nzukọ ha, m kpọkwara ndị mmadụ òkù ka ha bịa gee ya ntị.

Onye colporteur ọzọ letara anyị na Kopervik bụ Karl Gunberg. Nwoke a dị obi umeala, nwayọọ, na-akpakwa ọchị jekwara ozi site n’oge ruo n’oge dị ka onye nsụgharị n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Oslo. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị anyị rụkọrọ ọrụ n’ebe ahụ.

Ịbụ Ndị Echiche Okpukpe Metụtara

N’oge ahụ, ọ bụghị nanị na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nwere okwukwe siri ike na Chineke na Bible kama nkwenkwe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, dị ka ọkụ ala mmụọ na Atọ n’Ime Otu. N’ihi ya, o butere oké ọgba aghara mgbe Ndị Mmụta Bible ahụ kụziri na nkwenkwe ndị a ekwekọghị na Bible. Ebubo siri ike nke ndị agbata obi anyị nke bụ́ na nna m bụ onye jụrụ okwukwe metụtara m. Ọbụna na m gwara ya otu mgbe, sị: “Ihe ị na-ezi abụghị eziokwu. Ọ bụ ozizi nduhie!”

“Bịa ebe a, Ottilie,” ka ọ gbara m ume, “hụkwa ihe Bible na-ekwu.” Mgbe ahụ ọ gụụrụ m ihe site n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, obi ike m n’ebe ọ nọ na ihe ọ na-akụzi toro. Ọ gbara m ume ịgụ Studies in the Scriptures ahụ, n’ihi ya n’oge okpomọkụ nke 1914, ana m anọdụkarị n’elu ntakịrị ugwu na-elefe anya n’obodo ahụ wee na-agụ akwụkwọ.

N’August 1914 ndị mmadụ gbakọrọ na mbara ụlọ akwụkwọ akụkọ dị n’ebe ahụ na-agụ banyere ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ. Nna m bịarutere ma hụ ihe na-eme. “Ekele dịrị Chineke!” ka o tiri ná mkpu. Ọ ghọtara site ná ntiwapụ nke agha ahụ mmezu amụma Bible ndị ọ nọworị na-ekwusa banyere ha. (Matiu 24:7) Ọtụtụ Ndị Mmụta Bible mgbe ahụ kweere na a ga-akpọga ha eluigwe n’oge na-adịghị anya. Mgbe nke a na-emeghị, ụfọdụ nwere ndakpọ olileanya.

Nguzo M Maka Eziokwu Bible

Na 1915, mgbe m dị afọ 17, m jesịrị kọleji ma malite ịrụ ọrụ n’ọfịs. Amaliteziri m ịgụchi Ụlọ Nche anya. Ma ọ bụ n’afọ 1918 ka a malitere inwechi nzukọ anya na Kopervik. Ná mmalite, anyị dị ise ndị na-aga. Anyị gụrụ mbipụta Watch Tower Society, ndị dị ka Studies in the Scriptures, ma tụlee ihe ọmụmụ ahụ n’ụzọ ajụjụ na azịza. Ọ bụ ezie na nne m na-agwa ndị ọzọ ihe ọma banyere Ndị Mmụta Bible, ọ dịghị mgbe ọ ghọrọ otu n’ime anyị.

N’ọfịs ebe m rụrụ ọrụ, na-amalite na 1918, mụ na Anton Saltnes matara, bụ́ onye m nwere ike inyere aka ịghọ Onye Mmụta Bible. N’oge a aghọrọ m onye nkwusa na-ejechi ozi anya ma bụrụ onye e mere baptism n’otu mgbakọ na Bergen na 1921.

Na May 1925 e nwere mgbakọ maka Scandinavia nile n’Örebro, Sweden. Ihe karịrị 500 bịara, gụnyere Joseph F. Rutherford, onye isi oche Watch Tower Society. Ihe dị ka anyị 30 ji ụgbọ okporo ígwè site n’Oslo mee njem ná nkebi ụgbọ okporo ígwè e doro iche.

A mara ọkwa ná mgbakọ a na a ga-enwe Ọfịs Ebe Ugwu Europe na Copenhagen, Denmark, ilekọta ọrụ nkwusa ahụ na Scandinavia na mba Baltic dum. E kenyere William Dey sitere Scotland ilekọta ọrụ nkwusa ahụ. Ihe ya masịrị ọtụtụ ndị, n’oge na-adịghịkwa anya a matara ya dị ka Nwoke Ukwu onye Scotland. Ná mmalite Nwanna Dey amaghị asụsụ ọ bụla nke Scandinavia, ya mere ọ na-anọdụ n’azụ n’oge nzukọ na mgbakọ dị iche iche ma na-elekọta ụmụaka ka ndị mụrụ ha wee nwee ike ịtụkwasị uche n’ihe a na-ekwu n’ikpo okwu.

Ụlọ Nche nke March 1, 1925, tụlere Mkpughe isi 12, ma kọwaa na isi akwụkwọ a bụ banyere ọmụmụ nke Alaeze Chineke nakwa na ọmụmụ a weere ọnọdụ n’eluigwe na 1914. O siiri m ike ịghọta, ya mere agụrụ m ya ugboro ugboro. Mgbe m mesịrị ghọta ya, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.

Mgbe e mere mgbanwe ụfọdụ ná nghọta anyị nke isiokwu Bible, ụfọdụ asụwo ngọngọ ma wezụga onwe ha n’ebe ndị Chineke nọ. Ma mgbe mgbanwe dị otú ahụ siri ike ịghọta, ana m agụghachi ihe ahụ ugboro ugboro iji ghọta ihe ọ na-ekwu. Ya bụrụkwa na aghọtabeghị m nkọwa ọhụrụ ahụ, m na-echere maka ihe idokwu anya. Ugboro ugboro enwetawo m ụgwọ ọrụ site na ndidi dị otú ahụ.

Ije Ozi na Betel

Ruo afọ ụfọdụ m rụrụ ọrụ dị ka onye na-edekọ ihe ndebe ego, odeakwụkwọ, na onye ngụkọ ego obodo. Na 1928 onye hụworo maka ndekọ ego Society dara ọrịa, o wee dị mkpa ka ọ hapụ Betel. Ebe m nwere ahụmahụ n’ọrụ dị otú ahụ, a gwara m ka m weghara ya. Amalitere m ozi Betel na June 1928. Mgbe ụfọdụ, Nwanna Dey na-eleta anyị ma gụkọọ ndekọ ego m. Ezinụlọ Betel anyị na-ebutekwa ụzọ n’ọrụ ime nkwusa ihu ọha n’Oslo, bụ ebe anyị nwere nanị otu ọgbakọ mgbe ahụ.

Ụfọdụ n’ime anyị nyeere ohu na-elekọta mbupụ akwụkwọ na Betel, bụ́ Nwanna Sakshammer, aka n’ikechi na izipụ The Golden Age (Teta! ugbu a). Nwanna Simonsen na Nwanna Gunberg so ná ndị nyere aka. Anyị nwere oge obi ụtọ, na-agụkarị abụ ka anyị na-arụ ọrụ.

Obi Ike n’Olileanya Alaeze

Na 1935 anyị ghọtara na “oké ìgwè mmadụ” ahụ abụghị ndị òtù eluigwe nke abụọ. Anyị mụtara na kama nke ahụ ọ na-anọchi anya òtù ndị ga-alanarị oké mkpagbu ahụ ma nwee ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Mkpughe 7:9-14) N’ihi nghọta ọhụrụ a, ụfọdụ ndị riworo ihe nnọchianya Ememe Ncheta ghọtara na ha nwere olileanya ibi n’ụwa, ha kwụsịkwara iri ya.

Ọ bụ ezie na ọ dịtụghị mgbe m nwere obi abụọ banyere olileanya eluigwe m, ana m eche mgbe mgbe, ‘N’ihi gịnị ka Chineke ji chọọ m?’ Ọ dị m ka mụ erughị eru inwe oké ùgwù dị otú ahụ. Dị ka obere nwanyị, na-eme ihere, ahụrụ m ya dị ka ihe na-adabaghị adaba iche banyere onwe m dị ka eze so Kraịst na-achị n’eluigwe. (2 Timoti 2:11, 12; Mkpughe 5:10) Otú ọ dị, atụgharịrị m uche n’okwu Pọl onyeozi na “ọ dịghị ọtụtụ ndị ike,” ka a kpọrọ, kama “ọ bụkwa ihe na-adịghị ike nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka O wee mee ka ihere mee ihe dị ike.”—1 Ndị Kọrint 1:26, 27.

Ọrụ n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ

N’April 9, 1940, usuu ndị agha Germany wakporo Norway, n’oge na-adịghịkwa anya weghara mba ahụ. N’ihi agha ahụ, ọtụtụ malitere ịṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ. Site n’October 1940 ruo June 1941, anyị tinyere ihe karịrị akwụkwọ na akwụkwọ nta 272,000. Nke ahụ pụtara na onye ọ bụla n’ime Ndịàmà 470 nọ na Norway mgbe ahụ tinyere, ná nkezi, ihe karịrị akwụkwọ na akwụkwọ nta 570 n’ime ọnwa itoolu ahụ!

Na July 8, 1941, ndị Gestapo letara ndị isi oche ndị nlekọta nile ma gwa ha na ọ bụrụ na ọrụ nkwusa ahụ akwụsịghị, a ga-eziga ha n’ogige ịta ahụhụ. Ndị ọrụ uwe ojii Germany ise bịara na Betel ma jichie ọtụtụ n’ihe onwunwe nke Watch Tower Society. A kpọpụrụ ezinụlọ Betel ma gbaa ha ajụjụ, ma e nweghị onye ọ bụla n’ime anyị a tụrụ mkpọrọ. E mesịa, na July 21, 1941, e jichiri ihe owuwu Society, dị na Inkognitogaten 28 B, a machibidokwara ọrụ nkwusa anyị iwu. Alaghachiri m na Kopervik ma nweta ọrụ iji kwadoo onwe m.

N’oge ahụ, nna m na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ. Otu ụbọchị, ndị Nazi bịara ma nyochaa ụlọ nna m. Ha chịịrị akwụkwọ ya nile, gụnyere Bible ya na akwụkwọ ndepụta ya nke okwu Bible. Anyị natara nanị ntakịrị nri ime mmụọ n’ime oge a. Iji nọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ, anyị mụrụ ma mụgharịa akwụkwọ ndị ochie ọtụtụ ugboro, dị ka akwụkwọ bụ́ Government, anyị nọgidekwara na-eme nkwusa.

N’ụzọ dị mwute, n’ọtụtụ ebe ụmụnna ahụ kewara ekewa. Ụfọdụ chere na anyị kwesịrị ime nkwusa n’ihu ọha ma na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ebe ndị ọzọ chere na anyị kwesịrị ije ozi n’ụzọ dị nzuzo karị, na-akpọtụrụ ndị mmadụ n’ụzọ ndị ọzọ. N’ihi ya ụmụnna a ma ama, bụ ndị rụkọburu ọrụ nke ọma, bụkwa ndị anyị hụrụ n’anya nke ukwuu, anazighị ekwunyere ibe ha okwu. Nkewa ahụ dị n’etiti ha kpataara m oké ihe mgbu nke obi karịa ka ọnọdụ ọ bụla ọzọ ná ndụ m dị ka Onyeàmà meworo.

Ọrụ E Mere Ka Ọ Dịghachi Ọhụrụ Mgbe Agha ahụ Gasịrị

Mgbe agha biri, n’oge okpomọkụ nke 1945, Nwanna Dey letara Norway ma hazie nzukọ n’Oslo, Skien, na Bergen. Ọ rịọrọ ụmụnna ahụ ka ha dịghachi ná mma ma gwa ndị nile chọrọ ime otú ahụ ka ha bilie ọtọ. Mmadụ nile biliri ọtọ! E doziri nsogbu ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide na December 1945, mgbe Nathan H. Knorr, onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, mesịrị nleta.

Ka ọ dịgodị, na July 17, 1945, anatara m teligram sitere n’aka ohu alaka, bụ́ Nwanna Enok Öman, nke na-asị: ‘Olee mgbe ị pụrụ ịlọghachi na Betel?’ Ụfọdụ sịrị na m kwesịrị ịnọrọ n’ụlọ ma lekọta nna m, bụ́ onye dị ihe karịrị afọ 70 mgbe ahụ. Ma nna m gbara m ume ịmaliteghachi ozi Betel, bụ́ nke m mere. Na 1946, Marvin F. Andersen, otu nwanna sitere United States, ghọrọ onye nlekọta alaka anyị, a hazigharịkwara ọrụ nkwusa ahụ.

N’oge ezumike okpomọkụ m ga-alaghachi Kopervik ịhụ ezinụlọ m. Ụmụnne m ndị nwoke abụọ na ndị nwanyị abụọ aghọghị Ndịàmà, ma ha na nna m na mụ dị ná mma mgbe nile. Otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke ghọrọ onye nlekọta ọdụ ụgbọ mmiri na onye nduzi ụgbọ mmiri, ma nke ọzọ bụ onye nkụzi. Ọ bụ ezie na m nwere ihe onwunwe dị nta, nna m ga-agwa ha, sị: “Ottilie bara ọgaranya karịa unu.” Ọ bụkwa eziokwu! A pụghị iji ihe ndị ha kpataworo tụnyere akụ̀ ime mmụọ m nọ na-anụ ụtọ ha! Nna m nwụrụ na 1951 mgbe ọ dị afọ 78. Nne m anwụworị na 1928.

Otu ihe dị oké mkpa ná ndụ m bụ ịga mgbakọ mba nile nke ndị Jehova na New York City na 1953. N’afọ ahụ ubi ụwa gafere akara ndị nkwusa 500,000, ihe karịkwara 165,000 bịara mgbakọ ahụ! Tupu mgbakọ 1953 ahụ, m rụrụ ọrụ otu izu na Betel Brooklyn, bụ́ isi ụlọ ọrụ nke nzukọ Jehova n’elu ụwa.

Ime Ihe M Pụrụ Ime

N’afọ ndị a, ọhụhụ ụzọ m ajọọla njọ n’ihi ọrịa cataract. N’iji enyo anya na enyo na-eme ka ihe bukwuo ibu, m ka pụrụ ịgụtụ ihe odide dị okpotokpo. Ụmụnna nwanyị ndị Kraịst na-eletakwa m ma na-agụrụ m ihe ugboro abụọ n’izu, bụ́ nke m nwere ekele dị ukwuu maka ya.

Ọrụ nkwusa m bụkwa nke a kpaara ókè. N’oge okpomọkụ, ụmụnna nwanyị ndị Kraịst akpọrọwo m mgbe ụfọdụ n’oche nkwagharị m gaa n’ebe m pụrụ imetụ nkwusa. Ana m ezigakwara ụlọ akwụkwọ ndị dị na Kopervik magazin na broshụọ mgbe nile, dị ka n’ụlọ akwụkwọ elementrị ebe m gụrụ akwụkwọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 100 gara aga. Obi dị m ụtọ na ọ ka kwere m mee ịbụ onye nkwusa na-ejechi ozi anya.

N’ụzọ ihe ndabara, ebe a na-eri nri na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’otu ala ụlọ ahụ ọnụ ụlọ m na Betel dị, bụ́ nke dị na Ytre Enebakk ná mpụga Oslo kemgbe 1983. N’ihi ya apụrụ m iji mkpara ịga ije gaa ofufe ụtụtụ, iri ihe, na nzukọ anyị. Enwekwara m obi ụtọ na m ka pụrụ ịga mgbakọ dị iche iche. Ọ na-atọ m ụtọ izute ndị enyi m mawooro eri ọtụtụ afọ, nakwa ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ọhụrụ na ọtụtụ ọmarịcha ụmụaka.

Inwe Okwukwe Ruo Ọgwụgwụ

Ọ bụ ngọzi ịbụ onye ndị na-arụsi ọrụ ike, nwere ọṅụ, nakwa ndị mmadụ ime mmụọ gbara gburugburu na Betel ebe a. Mgbe m malitere ozi Betel m, ndị mejupụtara ezinụlọ ahụ dum bụ ndị nwere olileanya eluigwe. (Ndị Filipaị 3:14) Ugbu a onye ọ bụla nọ na Betel ma e wezụga m na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.

N’ezie, anyị tụrụ anya na Jehova gaara emeworị ihe tupu ugbu a. Otú ọ dị, m na-aṅụrị ọṅụ n’ịhụ ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-ebuwanye ibu. Lee aha mmụba ndị m hụworo! Mgbe m keere òkè n’ozi ahụ na nke mbụ ya, e nwere ihe dị ka ndị nkwusa 5,000 n’ụwa nile. Ugbu a e nwere ihe karịrị 5,400,000! N’ezie, ahụwo m ka ‘onye nta ghọrọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta aghọọ mba nwere ume.’ (Aịsaịa 60:22) Ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-ele anya Jehova, dị ka Habakuk onye amụma dere: “Ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa.”—Habakuk 2:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya