Gịnị Na-eme Ndị Na-eto Eto?
AKỤKỌ ọma ka ọ̀ bụ akụkọ ọjọọ—olee nke ị chọrọ ibu ụzọ nụ? Mgbe a jụrụ ha ajụjụ a, ọtụtụ ndị na-ahọrọ ibu ụzọ nụ akụkọ ọjọọ n’olileanya nke na akụkọ ọma ga-adịgide n’uche.
Mgbe anyị na-enyocha ihe na-eme ndị na-eto eto, buru ụzọ tụlee ọnọdụ dị ugbu a. Ndị agadi n’ozuzu ha na-ekwu na ndị na-eto eto taa adịghị ka ndị ntorobịa nke oge ndị gara aga. N’aka nke ọzọ, ndị na-eto eto na-ewe iwe megide ihe ọ bụla na-egosi na ha adịghị eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke afọ ndị gara aga. Otú o sina dị, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekiri ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwere na ndị ntorobịa nke taa dị iche.
Olee Otú Ha Si Dị Iche?
Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’ozuzu ha kweere na ndị na-eto eto kwesịrị inwe ezi àgwà, echiche nke ibu ọrụ, na nkwanye ùgwù maka ndị ọzọ, ihe na-eme eme adịghị erutụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọma ndị a. Dị ka otu nnyocha e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent nke London si kwuo, ndị na-eto eto “na-azụlite ‘mmụọ nnupụisi ọhụrụ’ megide ụwa nke ha na-ahụ dị ka nke mechuworo ha ihu n’ụzọ dị ukwuu.” E gosipụtara “mmụọ nnupụisi ọhụrụ” a ná nchọpụta nke bụ na ndị ntorobịa ole na ole karị n’oge a na-achọ iwere onwe ha dị ka “ndị nwere ezi uche na ndị ji ihe akpọrọ ihe.” Kama nke ahụ, a ga-ewere ha dị ka “ndị na-eme ara ara na ndị a na-ejighi n’aka.”
Dị ka ihe atụ, na Britain, mpụ ndị e mere mkpesa ha—nke ndị na-eto eto mere ihe ka ọtụtụ n’ime ha—ji okpukpu iri rịa elu n’agbata 1950 na 1993. Ịrị elu nke iji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na àgwà ahụ ha nhata. N’otu oge ahụ, ka The Times nke London na-ekwu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile mepere emepe ahụwo “mmụba dị ukwuu n’ọgba aghara uche na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’etiti ndị ntorobịa kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ.” Dị ka David J. Smith, prọfesọ nke ihe ọmụmụ banyere mpụ si kwuo, nsogbu ndị a “esiteghị n’ụzọ ọ bụla a pụrụ ịghọta n’ụkọ nke ihe ndị dị mkpa ma ọ bụ mmụba nke ịba ọgaranya.” Nchọpụta na-egosi na ọdịiche ka ukwuu apụtawo ìhè ugbu a n’etiti ndị na-eto eto na ndị agadi.
Ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma taa na-eche nrụgide na-arị elu ihu. Okwu banyere igbu onwe onye, ndị a nwara ime ma ọ bụ ndị e mesịrị mee, aghọwo ihe na-eme ebe nile. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 12 ịnwa igbu onwe ha mụbara okpukpu abụọ n’ihe na-erughị afọ iri, ka The Herald ndị Glasgow nke Scotland na-akọ. Ụmụaka ndị toworo eto karị na-ekwe ka obi nkoropụ duba ha n’otu ihe ahụ. “Ha bụ ihe ndị gabigara ókè si ná mmụba nke nsogbu uche n’etiti ndị na-eto eto pụta bụ́ nke na-eyi egwu imebi ihe ndị a na-eme iji nyere ha aka,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.
Ònye Ka A Ga-ata Ụta?
Ọ na-adịrị ndị okenye mfe ịta ndị na-eto eto ụta maka echiche “dị iche” nke ndị ntorobịa. Ma, n’ikwu eziokwu, ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị okenye ka ụta ka ukwuu dịịrị maka ihe na-eme ugbu a n’etiti ndị na-eto eto? Ịchọ okwu, nleghara anya nne na nna, enweghị ndị nlereanya ndị ndị ntorobịa pụrụ ịtụkwasị obi, bụ ihe ndị a na-ezokarị aka na ha n’ịkọwa ya. “Ịda mbà n’obi nke ọha mmadụ adịghị karịa otú ọ dị n’afọ 30 gara aga,” ka Prọfesọ Sir Michael Rutter na-ekwu, bụ́ onye isi Kansụl Ime Nchọpụta Ọgwụ nke Ngalaba Ọrịa Uche Ụmụaka nke Britain. “Ma,” ka ọ na-agbakwụnye, “ịdị adị ya n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma na ụmụ okorobịa na agbọghọbịa arịwo elu nke ukwuu. . . . Obi abụọ adịghị ya na ndakpọ ezinụlọ na-ekere òkè; ọ bụghị nanị ịgba alụkwaghịm, kama ọnọdụ nile nke adịghị n’otu na esemokwu n’etiti ndị okenye.”
Otu onye nchọpụta na-azọrọ na ndị na-eto eto “na-ajụ iso omenala.” N’ihi gịnị? “N’ihi na omenala ndị ahụ abụghị maka ha.” Were echiche na-agbanwe agbanwe nke ihe bụ ọrụ nwoke na nwanyị dị ka ihe atụ. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-anakwere àgwà nke e jikarị mara ndị nwoke nke bụ́ mwakpo na ime ihe ike, ebe ụmụ okorobịa na-eme onwe ha ka ha yie ndị inyom. Lee otú nke a si dị iche n’ụzọ ndụ nke oge ndị gara aga!
Ma gịnị mere anyị ji ahụ oké mgbanwe ndị dị otú ahụ ugbu a? Oleekwa akụkọ ọma e nwere banyere ndị na-eto eto taa? Olee otú ha pụrụ isi nwee ọdịnihu dị nchebe? Isiokwu anyị na-esonụ na-atụle azịza nke ajụjụ ndị a.