Jehova Ji Ọmịiko Na-achị
N’AKỤKỌ ihe mere eme nile ọtụtụ ndị ọchịchị bụ́ mmadụ ejiwo ike mee ihe n’iji obi ịta mmiri eleghara ahụhụ nke ndị ha na-achị anya. Otú ọ dị, Jehova gosiri ọdịiche site n’ịhọrọ otu mba—Israel—na ịchị ya n’ụzọ ọmịiko.
Mgbe ndị Israel ka bụ ohu n’Ijipt oge ochie, Jehova nụrụ ákwá ha maka enyemaka. “Ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu. . . . N’ịhụnanya Ya na n’ọmịiko Ya Ya onwe ya gbapụtara ha.” (Aịsaịa 63:9) Jehova zọpụtara Israel, nye ha nri ọrụ ebube, napụtakwa ha baa n’ala nke aka ha.
Àgwà ọmịiko Jehova pụtakwuru ìhè n’iwu ndị o nyere mba a. O nyere ndị Israel iwu imeso ụmụ mgbei, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, na ndị ala ọzọ ihe n’ụzọ ọmịiko. Ha agaghị erigbu ndị nwere nkwarụ.
Iwu ahụ chọrọ ka e gosi ndị nọ ná mkpa ọmịiko. Ndị ogbenye pụrụ ịchịkọta ihe mgbe owuwe ihe ubi gasịrị. A na-akagbu ụgwọ n’afọ Sabat (nke asaa). A ghaghị iweghachi ala nketa nile e reworo n’afọ Jubile (nke 50). Ancient Israel—Its Life and Institutions na-akọ, sị: “N’Israel, ọ dịghị nnọọ mgbe e nwere ọkwá dị iche iche n’echiche ya nke oge a.” “N’oge mmalite ebe obibi ahụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị Israel nile nwere otu ọnọdụ obibi ndụ.”—Levitikọs 25:10; Deuterọnọmi 15:12-14; 24:17-22; 27:18.
Iṅomi Ọmịiko Jehova
Ọmịiko Chineke na-akpali ndị ohu ya. Dị ka ihe atụ, n’akụkọ ihe mere eme nile, ụfọdụ ndị eze ọhụrụ egbuwo ndị òtù lanarịrịnụ nke usoro ọchịchị ndị eze bu ha ụzọ. Ma ohu Jehova bụ́ Devid emeghị nke a. Mgbe ọnwụ Eze Sọl gasịrị, Devid chebere Mefiboshet, nwa nwa na onye nketa Sọl fọrọ ndụ. “Eze nwere ọmịiko n’ahụ Mefiboshet, nwa Jonatan nwa Sọl.”—2 Samuel 21:7.
Ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla ṅomiworo ọmịiko Jehova dị ka Jisọs mere. Ọtụtụ n’ime ọrụ ebube ya bụ ndị ọmịiko Chineke kpaliri. N’otu oge otu onye ekpenta rịọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ọmịiko kpaliri Jisọs, o metụkwa ya aka, na-asị: “Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” (Mak 1:40-42) N’oge ọzọ oké ìgwè mmadụ sooro Jisọs. N’etiti ụzụ ahụ, Jisọs gere ndị ìsì abụọ ntị bụ́ ndị nọ na-eti: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid . . . Ebe O nwere ọmịiko n’ahụ ha, O wee metụ anya ha aka: ngwa ngwa e wee mee ka ha hụ ụzọ.”—Matiu 20:29-34.
Oké ìgwè mmadụ emenyụghị mmetụta Jisọs maka ndị ọzọ. N’ihi na ha eribeghị nri ruo oge ụfọdụ, o kwuru n’otu oge: “Enwere m ọmịiko n’ahụ ìgwè mmadụ a.” Ya mere, o nyere ha nri n’ụzọ ọrụ ebube. (Mak 8:1-8) Mgbe Jisọs jegharịrị, ọ bụghị nanị na o ziri ìgwè mmadụ ihe kama ọ hụtara mkpa ha. (Matiu 9:35, 36) Mgbe njegharị dị otú ahụ gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya enweghị oge izu ike ọbụna iji rie nri. Akụkọ Bible ahụ na-agwa anyị, sị: “Ha wee jee n’ụgbọ ha iche ruo ebe bụ ọhịa. Ma ọtụtụ mmadụ hụrụ ha mgbe ha na-eje, ha matakwara ha, wee si n’obodo ahụ nile gbakọta n’ebe ahụ n’ụkwụ ala, buru ha ụzọ. O wee pụta, hụ oké ìgwè mmadụ, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha: O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.”—Mak 6:31-34.
Ihe kpaliri Jisọs abụghị nanị ọrịa na ịda ogbenye nke ndị ahụ kama ọnọdụ ime mmụọ ha. Ndị ndú ha anọwo na-erigbu ha, ya mere Jisọs ‘nwere ọmịiko n’ahụ ha.’ Okwu Grik maka “nwee ọmịiko n’ahụ” pụtara “inwe agụụ sitere n’afọ.” Jisọs bụ n’ezie onye nwere ọmịiko!
Ọmịiko n’Ime Ụwa nke Obi Ọjọọ
Jisọs Kraịst bụ ugbu a Eze nke Alaeze eluigwe Jehova. Dị ka o mere n’Israel oge ochie, taa Chineke ji ọmịiko na-achị ndị ya. “Ha ga-abụkwa nke m, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, n’ụbọchị ahụ mgbe Mụ onwe m ga na-eme ihe, bụ́ ihe nke aka m; M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ ha.”—Malakaị 3:17.
Ndị chọrọ ịnata ọmịiko Jehova aghaghị iṅomi ụzọ ya. Eziokwu, anyị bi n’ụwa ebe ndị mmadụ nwere mmasị n’ichebe ụzọ ndụ ha karịa n’inyere ndị nọ ná mkpa aka. Ndị nọ n’isi na-achọkarị uru site n’iji nchebe nke ndị ọrụ na ndị ahịa chụọ àjà. Na 2 Timoti 3:1-4, Bible na-akọwa n’ụzọ ziri ezi ọnọdụ omume nke oge anyị nke gbuworo ọmịiko n’obi ọtụtụ ndị.
Ma, anyị nwere ike ịchọta ohere dị iche iche iji gosi ọmịiko. Ànyị pụrụ inye ndị agbata obi anyị enyemaka ụfọdụ dị mkpa? È nwere onye ahụ na-adịghị anyị pụrụ ileta? Ànyị pụrụ ime ndị dara mbà n’obi obi ụtọ, n’ikwekọ na ndụmọdụ ahụ bụ́: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka”?—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.
Ọmịiko ga-enyekwara anyị aka izere imeghachi omume n’iwe mgbe ndị ọzọ hiere ụzọ. A gwara anyị, sị: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu: nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:31, 32.
Ọmịiko ga-enyere anyị aka izere ọchịchọ iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Bible na-ekwu, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Obi dị umeala na-enyere anyị aka itinye onwe anyị n’ọnọdụ ndị anyị na-elekọta. Ịbụ onye nwere ọmịiko gụnyere ịdị obi umeala na inwe ezi uche karịa ịbụ onye ọ na-esi ike imeta mma. Ịdị irè ekwesịghị ịbụ ihe ngọpụ maka imeso ndị mmadụ dị ka nanị akụkụ dị iche iche nke ígwè ọrụ. Ọzọ, n’ime ezinụlọ ndị di nwere ọmịiko na-echeta na nwunye ha bụ ndị na-adịghị ike karị. (1 Pita 3:7) Ịtụgharị uche n’ihe nlereanya ọmịiko Jisọs pụrụ inyere anyị aka n’ihe a nile.
Ebe ọ bụ na Jisọs nwere mmetụta dị omimi otú a maka ndị mmadụ n’oge ozi elu ala ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụ ugbu a, na ọ ga-anọgidekwa na-abụ, Onye Ọchịchị dị ọmịiko. Abụ Ọma 72 na-ekwu banyere ya n’ụzọ amụma, sị: “Ọ ga-ekpe ndị e wedara n’ala n’etiti ndị Gị ikpe, Ọ ga-enye ụmụ nke ogbenye nzọpụta, zọpịakwa onye mmegbu. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.”—Abụ Ọma 72:4, 8, 13.
Okwu Chineke na-ebu amụma, sị: “Ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa . . . Mee ka ndị na-emebi iwu nwụọ.” Mgbe ọ kọwasịrị otú ọbụna ụfọdụ ndị obi ọjọọ, ndị dị ka anụ ọhịa ga-esi gbanwee ụzọ ha, amụma ahụ gara n’ihu, na-asị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:4-9) Amụma a na-ekwe nnọọ nkwa òtù ụmụ mmadụ zuru ụwa ọnụ ndị maara Jehova, na-eṅomikwa ụzọ ọmịiko ya nile!