Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/15 p. 13-18
  • Nọgide Soro Chineke Na-ejegharị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Soro Chineke Na-ejegharị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ndụ Na-adịghị Agbanwe Agbanwe
  • Zere Ọnyà nke Obi Ike Onwe Onye
  • Ekwela Ka Egwu Mmadụ Chịkwaa Gị
  • Zere Ilelị Ndụmọdụ
  • Inwe Ike Ịnagide Nchegbu nke Ndụ
  • Na-eje Ije N’okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Uru Ndị Dị n’Ịtụ Ezi Chineke ahụ Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isoro Chineke Na-ejegharị—Nzọụkwụ Ndị Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/15 p. 13-18

Nọgide Soro Chineke Na-ejegharị

“Na-ejegharịnụ site na Mmụọ Nsọ, unu agaghị emezukwa agụụ nke anụ ahụ ma ọlị.”—NDỊ GALETIA 5:16.

1. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa, ruokwa ogologo oge hà aṅaa ka Ịnọk na Chineke yịkọrọ jegharịa? (b) Ruo oge hà aṅaa ka Noa na Chineke yịkọrọ jegharịa, oleekwa oké ibu ọrụ o nwere?

BIBLE na-agwa anyị na Ịnọk ‘na Chineke yịkọ na-ejegharị.’ N’agbanyeghị okwu na-awụ akpata oyi na àgwà asọpụrụghị Chineke nke ndị gbara ya gburugburu, ọ nọgidere soro Chineke na-ejegharị ruo ná ngwụsị ndụ ya mgbe ọ gbara afọ 365. (Jenesis 5:23, 24; Jud 14, 15) Noa kwa “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” O mere otú ahụ ka ọ na-azụlite ezinụlọ ya, ka ọ na-agbaso ụwa nke ndị mmụọ ozi nupụrụ isi na ụmụ ha na-eme ihe ike na-akpa ike na ya mgba, na ka ọ na-ahụ maka ihe nile metụtara iwu akatamkpo ụgbọ nke buru ibu karịa ụgbọ mmiri ọ bụla e nwere n’oge ochie. Ọ nọgidere soro Chineke na-ejegharị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ọbụna mgbe nnupụisi megide Jehova bilitere ọzọ na Bebel. N’ezie, Noa nọgidere soro Chineke na-ejegharị ruo kpọmkwem n’ọnwụ ya mgbe ọ gbara afọ 950.—Jenesis 6:9; 9:29.

2. Gịnị ka ‘iso Chineke na-ejegharị’ pụtara?

2 Mgbe ọ na-ekwu na ndị ikom a nke okwukwe sooro Chineke “na-ejegharị,” Bible ji okwu ahụ eme ihe n’echiche ihe atụ. Ọ pụtara na Ịnọk na Noa kpara àgwà n’ụzọ na-agba àmà okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. Ha mere ihe Jehova nyere ha n’iwu ma chịkwaa ndụ ha n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha maara banyere ya site n’ụzọ o si emeso ihe a kpọrọ mmadụ. (Tụlee 2 Ihe E Mere 7:17.) Ọ bụghị nanị na ha kwupụtara na ha kweere n’ihe Chineke kwuru na ihe o mere kama ha mere ihe nile ọ chọrọ—ọ bụghị nanị ụfọdụ n’ime ya kama ha nile ruo n’ókè kwere ha omume dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. N’ihi ya Noa, dị ka ihe atụ, mere kpọmkwem iwu nile Chineke nyere ya. (Jenesis 6:22) Noa emeghị ihe gabiga ntụzi ndị e nyere ya, o meghịkwa ihe dị ala n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe. Dị ka onye ya na Jehova kpachiri anya, nke nweere onwe ya ikpegara Chineke ekpere, ma nwee oké mmasị ná nduzi Jehova, ya na Chineke so na-ejegharị. Ị̀ na-eme nke ahụ?

Ụzọ Ndụ Na-adịghị Agbanwe Agbanwe

3. Gịnị dị oké mkpa nye ndị ohu Chineke nile raara onwe ha nye, e mekwara baptism?

3 Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ na-amalite iso Chineke na-ejegharị. Ka ha na-ewere ezi nzọụkwụ ndị kwekọrọ n’uche Jehova, ha na-enye ihe àmà nke okwukwe, bụ́ nke ma e wezụga ya, ọ dịghị onye pụrụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Hibru 11:6) Lee ka anyị si aṅụrị ọṅụ na kwa afọ, ná nkezi n’ime afọ ise gara aga, ihe karịrị mmadụ 330,000 ararawo onwe ha nye Jehova, bụrụkwa ndị nyeworo onwe ha maka baptism ime mmiri! Ma ọ dịkwa ha na anyị nile mkpa ịnọgide soro Chineke na-ejegharị.—Matiu 24:13; Mkpughe 2:10.

4. Ọ bụ ezie na ha gositụrụ okwukwe, n’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị Israel si n’Ijipt pụọ ji ghara ịbanye Ala Nkwa ahụ?

4 N’ụbọchị Mosis, ọ chọrọ okwukwe n’aka ezinụlọ onye Israel ime Ememe Ngabiga n’Ijipt na ifesa ọbara n’awara ụzọ na n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha. (Ọpụpụ 12:1-28) Otú ọ dị, okwukwe ọtụtụ ndị mara jijiji mgbe ha hụrụ usuu ndị agha Fero kpọmkwem n’azụ ha n’Osimiri Uhie. (Ọpụpụ 14:9-12) Abụ Ọma 106:12 na-egosi na mgbe ha siworo n’ala akọrọ nke oké osimiri ahụ gafere n’enweghị nsogbu, mgbe ha hụwokwara ka oké ogbu mmiri ahụ lara usuu ndị agha Ijipt n’iyi, ha “wee kwere okwu [Jehova] nile” ọzọ. Otú ọ dị, mkpirikpi oge ka e mesịrị n’ọzara, ndị Israel malitere ime mkpesa banyere mmiri ọṅụṅụ, nri, na nduzi. Akụkọ ọjọọ nke ndị nledo 10 n’ime 12 si Ala Nkwa ahụ lata mere ka egwu jide ha. N’okpuru ọnọdụ ndị ahụ, dị ka Abụ Ọma 106:24 na-ekwu, “ha ekweghị okwu [Chineke].” Ha chọrọ ịlaghachi n’Ijipt. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) Okwukwe ọ bụla ha nwere pụtara ìhè nanị mgbe ha hụrụ ngosipụta ụfọdụ pụrụ iche nke ike Chineke. Ha anọgideghị na-esoro Chineke na-ejegharị. N’ihi ya, ndị Israel ahụ abaghị n’Ala Nkwa ahụ.—Abụ Ọma 95:10, 11.

5. Olee otú 2 Ndị Kọrint 13:5 na Ilu 3:5, 6 si metụta iso Chineke na-ejegharị?

5 Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Na-anwanụ onwe unu ma unu dị n’okwukwe anyị, na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Ịdị “n’okwukwe” pụtara ịrapagidesi ike n’ihe dum ndị Kraịst kweere na ha. Nke a dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’isoro Chineke na-ejegharị ụbọchị nile nke ndụ anyị. Iji soro Chineke na-ejegharị, anyị aghaghịkwa igosipụta àgwà bụ́ okwukwe, na-atụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu. (Ilu 3:5, 6) E nwere ọtụtụ ọnyà pụrụ ịmata ndị na-emeghị otú ahụ. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a?

Zere Ọnyà nke Obi Ike Onwe Onye

6. Gịnị ka ndị Kraịst nile maara banyere ịkwa iko nile, oleekwa ihe bụ echiche ha banyere mmehie ndị a?

6 Onye ọ bụla mụworo Bible, rara ndụ ya nye Jehova, bụrụkwa onye e mere baptism maara na Okwu Chineke kagburu ịkwa iko nile. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:1-3; Ndị Hibru 13:4) Ndị dị otú ahụ kwere na nke a bụ eziokwu. Ha chọrọ ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ma, mmekọahụ rụrụ arụ ka bụkwa otu n’ime ọnyà ndị kasị irè nke Setan. N’ihi gịnị?

7. N’Ala Dị Larịị nke Moab, olee otú ndị ikom Israel si tinye aka n’àgwà ha maara na ọ dị njọ?

7 Ná mmalite, ọ pụrụ ịbụ na ndị na-etinye aka n’omume rụrụ arụ dị otú ahụ emeghị atụmatụ ime otú ahụ. Ikekwe nke ahụ bụkwa eziokwu banyere ndị Israel mgbe ha nọ n’Ala Dị Larịị nke Moab. Nye ndị ikom Israel ndị ike ụwa gwụrụ n’ọzara, ọ pụrụ ịbụ na ndị inyom Moab na Midia ahụ rara ha ụrà yiri ndị nwere omume enyi ma na-emesapụ aka. Ma gịnị mere mgbe ndị Israel naara ọkpụkpọ òkù iso ndị na-efe Beal, ọ bụghị Jehova, na-akpakọrịta, ndị kwere ka ụmụ agbọghọ ha (ọbụna site n’ezinụlọ a ma ama) soro ndị ikom na-abụghị di ha na-enwe mmekọahụ? Mgbe ndị ikom sitere n’ọmụma ụlọikwuu Israel malitere ile mkpakọrịta dị otú ahụ anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị, a rabara ha n’ime ihe ndị ha maara na ha ezighị ezi, nke a takwara isi ha.—Ọnụ Ọgụgụ 22:1; 25:1-15; 31:16; Mkpughe 2:14.

8. N’ụbọchị anyị, gịnị nwere ike iduba onye Kraịst ná mmekọahụ rụrụ arụ?

8 Gịnị nwere ike ime ka mmadụ daba n’ọnyà yiri nke ahụ n’ụbọchị anyị? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịma ịdị oké njọ nke mmekọahụ rụrụ arụ, ọ bụrụ na ọ ghọtaghịkwa ihe ize ndụ nke obi ike onwe onye, o nwere ike hapụ onwe ya ịbanye n’ọnọdụ ebe ihe ndọrọ ime omume ọjọọ na-erikpu iche echiche ya.—Ilu 7:6-9, 21, 22; 14:16.

9. Olee ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ ichebe anyị pụọ n’omume rụrụ arụ?

9 N’ezoghị ọnụ, Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị ka anyị ghara ịbụ ndị a rafuru gaa n’iche na anyị siri ike nke na mkpakọrịta ọjọọ agaghị emerụ anyị. Nke ahụ na-agụnye ikiri usoro ihe omume telivishọn ndị na-egosi ụzọ ndụ ndị na-eme omume rụrụ arụ na ikiri magazin ndị na-akpali ọchịchọ ndị rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 10:11, 12; 15:33) Ọbụna iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-akpakọrịta n’okpuru ọnọdụ ndị na-ezighị ezi pụrụ iduga ná nsogbu ndị siri ike. Ndọrọ dị n’agbata nwoke na nwanyị siri ike. N’ihi ya nzukọ Jehova ejiriwo nchegbu ịhụnanya dọọ aka ná ntị megide isoro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nke na-abụghị onye anyị lụrụ ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ anyị nọrọ nanị anyị, n’ebe ndị ọzọ na-adịghị ahụ ihe na-emenụ. Iji nọgide soro Chineke na-ejegharị, ọ dị anyị mkpa izere ọnyà nke obi ike onwe onye ma nụrụ ndụmọdụ ịdọ aka ná ntị ọ na-enye anyị.—Abụ Ọma 85:8.

Ekwela Ka Egwu Mmadụ Chịkwaa Gị

10. Olee otú “egwu mmadụ” si aghọ ọnyà?

10 E mere ka a mara ihe ize ndụ ọzọ n’Ilu 29:25, nke na-asị: “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà.” Ọnyà dinta na-agụnyekarị eriri nke na-esechi n’akpịrị anụmanụ ma ọ bụ ụdọ nke na-amata ụkwụ ya. (Job 18:8-11) N’otu aka ahụ egwu mmadụ pụrụ ijichi ikike mmadụ nwere ikwu okwu n’ezoghị ọnụ na ịkpa àgwà n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ. Ọchịchọ ime ihe na-atọ ndị ọzọ ụtọ kwesịrị ekwesị, nleghara anya n’ụzọ obi ịta mmiri maka ihe ndị ọzọ na-eche abụghịkwa omume ndị Kraịst. Ma nguzozi dị mkpa. Mgbe nchegbu banyere ihe pụrụ ịbụ mmeghachi omume nke ụmụ mmadụ ndị ọzọ mere ka mmadụ mee ihe Chineke machibidoro iwu ma ọ bụ hapụ ime ihe Okwu Chineke nyere n’iwu, a matawo onye ahụ n’ọnyà.

11. (a) Gịnị ga-echebe mmadụ ịghara ikwe ka egwu mmadụ na-achịkwa ya? (b) Olee otú Jehova siworo nyere ndị ohu ya aka bụ́ ndị na-agbaso egwu mmadụ mgba?

11 Nchebe pụọ n’ọnyà dị otú ahụ dị, ọ bụghị n’echiche mmadụ bu pụta ụwa, kama ‘n’ịtụkwasị Jehova obi.’ (Ilu 29:25b) Site n’ịtụkwasị Chineke obi, ọbụna onye na-eme ihere site n’ọmụmụ pụrụ ịbụ onye nwere obi ike na onye na-eguzosi ike n’ihe. Ruo ogologo oge nrụgide nke usoro ihe a nke Setan gbara anyị gburugburu, ọ ga-adị anyị mkpa ịnọ ná nche megide egwu mmadụ nke na-eweta ọnyà. Ọ bụ ezie na Elaịja onye amụma nwere ihe ndekọ dị mma nke ije ozi n’obi ike, mgbe Jezebel yiri egwu igbu ya, o ji ụjọ gbalaga. (1 Ndị Eze 19:2-18) N’okpuru nrụgide, Pita onyeozi ji ụjọ gọnarị ịma Jisọs Kraịst, afọ ole na ole kwa n’ihu o kwere ka egwu mee ya ka ọ kpaa àgwà n’ụzọ megidere okwukwe ahụ. (Mak 14:66-71; Ndị Galetia 2:11, 12) Otú ọ dị, ma Elaịja ma Pita nakweere enyemaka ime mmụọ, sitekwa n’inwe obi ike n’ebe Jehova nọ, nọgide na-ejere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anara.

12. Ihe nlereanya ndị dị aṅaa nke oge a na-egosi otú e siworo nyere ndị mmadụ aka izere ikwe ka egwu mee ka ha laa azụ n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ?

12 Ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova n’ụbọchị anyị amụtawokwa ụzọ isi merie egwu na-eweta ọnyà. Otu Onyeàmà nọ n’afọ iri na ụma na Guyana kwetara, sị: “Ọgụ a na-alụ n’ụlọ akwụkwọ iji merie nrụgide ndị ọgbọ siri ike.” Ma o kwukwara, sị: “Otú ahụ ka okwukwe m n’ebe Jehova nọ sikwara.” Mgbe onye nkụzi ya kwara ya emo n’ihu klas dum n’ihi okwukwe ya, o kpegaara Jehova ekpere na nzuzo. E mesịa, na nzuzo o ji akọ gbaara onye nkụzi ahụ àmà. N’otu nleta o mere n’obodo a mụrụ ya na Benin, otu nwa okorobịa na-amụ ihe Jehova chọrọ kpebisiri ike ibibi otu arụsị nna ya ji nkà meere ya. Nwa okorobịa ahụ maara na ihe oyiyi ahụ adịghị ndụ, ọ tụghịkwa ya egwu, ma ọ makwaara na ndị obodo iwe ji pụrụ ịchọ igbu ya. O kpegaara Jehova ekpere, mgbe ahụkwa n’abalị o ji ihe oyiyi ahụ gaa n’ọhịa ma bibie ya. (Tụlee Ndị Ikpe 6:27-31.) Mgbe otu nwanyị na Dominican Republic malitere ijere Jehova ozi, di ya kwuru ka ọ họrọ ya ma ọ bụ Jehova. Nwoke ahụ yiri ya egwu ịgba ya alụkwaghịm. Egwu ọ̀ ga-eme ya ka ọ gbahapụ okwukwe ya? Ọ zara, sị: “Ihere gaara eme m ma a sị na ọ bụ ihe metụtara ekwesịghị ntụkwasị obi nye di m, ma ihere adịghị eme m n’ihi ijere Jehova Chineke ozi!” Ọ nọgidere soro Chineke na-ejegharị, ka oge na-agakwa di ya sonyeere ya n’ime uche Jehova. Site n’inwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ, anyị onwe anyị kwa pụrụ izere ikwe ka egwu mmadụ mee ka anyị laa azụ n’ime ihe anyị maara na ọ ga-atọ Jehova ụtọ.

Zere Ilelị Ndụmọdụ

13. Banyere ọnyà dị aṅaa ka a dọrọ anyị aka ná ntị ya na 1 Timoti 6:9?

13 Ọ bụ ezie na e mere ọnyà ụfọdụ ndị dinta ji eme ihe ka ha na-amata anụmanụ ọ bụla ọ dabara na o si n’otu ebe gafere, ọnyà ndị ọzọ na-arata anụmanụ site n’ihe ụrà na-adọrọ adọrọ n’ụzọ dị aghụghọ. Nye ọtụtụ mmadụ, akụ̀ na ụba yiri nke ahụ. (Matiu 13:22) Na 1 Timoti 6:8, 9, Bible na-agba anyị ume inwe afọ ojuju n’ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ. Mgbe ahụ ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi.”

14. (a) Gịnị pụrụ igbochi mmadụ iji ndụmọdụ nke inwe afọ ojuju n’ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ mee ihe? (b) Olee ụzọ ịkọwa akụ̀ na ụba n’ụzọ hiere ụzọ pụrụ isi mee ka mmadụ lelịa ndụmọdụ ahụ e dekọrọ na 1 Timoti 6:9? (ch) N’ụzọ dị aṅaa ka “agụụ ihe ọjọọ nke anya” pụrụ isi mee ka ụfọdụ kpuo ìsì n’ebe ọnyà nke na-echere ha dị?

14 N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị a, a na-amata ọtụtụ n’ọnyà n’ihi na ha onwe ha adịghị etinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ. N’ihi gịnị? Ọ̀ pụrụ ịbụ na nganga na-akwaga ha n’ịrapagidesi ike n’ụzọ ndụ nke na-achọ ihe karịrị “ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ,” bụ́ ndị Bible gbara anyị ume inwe afọ ojuju na ha? Hà na-elelị ịdọ aka ná ntị Bible ma eleghị anya n’ihi na ha na-akọwa akụ̀ na ụba na-adabere n’ihe ndị bara oké ọgaranya nwere? Bible na-egosi nanị na ọdịiche dị ná mkpebisi ike ịbụ ọgaranya na inwe afọ ojuju n’ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ. (Tụlee Ndị Hibru 13:5.) “Agụụ ihe ọjọọ nke anya”—ọchịchọ inweta ihe ndị ha na-ahụ, ọbụna na-eji ihe ime mmụọ na-achụ àjà—ọ̀ na-eme ka ha kwaga ọdịmma nke ezi ofufe n’ọnọdụ nke abụọ? (1 Jọn 2:15-17; Hagaị 1:2-8) Lee ka ndị na-aṅa ntị n’ezie na ndụmọdụ Bible ma soro Chineke na-ejegharị site n’ime ijere Jehova ozi ihe bụ isi ná ndụ ha si enwe obi ụtọ ka ukwuu!

Inwe Ike Ịnagide Nchegbu nke Ndụ

15. N’ụzọ kwere nghọta, ọnọdụ ndị dị aṅaa na-akpatara ọtụtụ ndị Jehova nchegbu, banyere ọnyà dịkwa aṅaa ka anyị na-aghaghị ịnọ na nche mgbe anyị nọ n’okpuru nrụgide dị otú ahụ?

15 A na-enwekarị oké nchekasị n’inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ karịa mkpebisi ike ịba ọgaranya. Ọtụtụ ndị ohu Jehova nwere nanị ihe onwunwe dị nta. Ha na-arụsi ọrụ ike ruo ọtụtụ hour iji nweta ọbụna ákwà ndị bụ isi, ebe ezinụlọ ha ga-arahụ n’abalị, na ma ọ dịghị ihe ọzọ nri ụbọchị. Ndị ọzọ na-agbaso nsogbu mgba n’ihi ọrịa ma ọ bụ ịka nká nke ha ma ọ bụ nke ndị òtù ezinụlọ. Lee ka ọ ga-esi dị mfe ikwe ka ọnọdụ ndị dị otú ahụ kpagbuo ọdịmma ime mmụọ ná ndụ ha!—Matiu 13:22.

16. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịnagide nrụgide nke ndụ?

16 N’ụzọ ịhụnanya, Jehova na-agwa anyị banyere ahụ efe a ga-enwe n’okpuru Alaeze Mesaịa. (Abụ Ọma 72:1-4, 16; Aịsaịa 25:7, 8) Ọ na-enyekwara anyị aka ịnagide nrụgide nke ndụ ugbu a site n’inye anyị ndụmọdụ banyere ụzọ isi hazie nke ọma ihe ndị kasị anyị mkpa. (Matiu 4:4; 6:25-34) Site n’ihe ndekọ nke ụzọ o si nyere ndị ohu ya aka n’oge gara aga, Jehova na-emesi anyị obi ike. (Jeremaịa 37:21; Jemes 5:11) Ọ na-ewusi anyị ike site n’ihe ọmụma bụ na, n’agbanyeghị ahụhụ ọ bụla bịakwasịrị anyị, ịhụnanya ya maka ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe adịghị agbanwe agbanwe. (Ndị Rom 8:35-39) Nye ndị tụkwasịrị Jehova obi, ọ na-ekwu, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.

17. Nye ihe atụ nke ụzọ ndị mmadụ na-ata ahụhụ siri ike siworo nwee ike ịnọgide soro Chineke na-ejegharị.

17 N’ịbụ ndị ihe ọmụma a wusiri ike, ezi ndị Kraịst na-eso Chineke na-ejegharị kama ichigharị gaa n’ụzọ nke ụwa. Echiche ụwa zuru ebe nile n’etiti ndị ogbenye n’ọtụtụ ala bụ na iwere ihe onye nwere ọtụtụ ihe ka i wee nwee ike ịzụ ezinụlọ gị abụghị izu ohi. Ma ndị sitere n’okwukwe na-ejegharị na-ajụ echiche ahụ. Ha na-ewere nnwapụta Chineke dị ka ihe ka ihe ọ bụla ọzọ mkpa, na-elegakwara ya anya ka ọ kwụghachi ha ụgwọ maka àgwà ịkwụwa aka ọtọ ha. (Ilu 30:8, 9; 1 Ndị Kọrint 10:13; Ndị Hibru 13:18) N’India, otu nwanyị di ya nwụrụ chọpụtara na ịdị njikere ịrụ ọrụ tinyere ịdị nkọ n’ichepụta ihe nyeere ya aka ịnagide. Kama ịbụ onye iwe na-ewe n’ihi ọnọdụ ya ná ndụ, ọ maara na ọ bụrụ na ya ebute Alaeze Chineke na ezi omume ya ụzọ ná ndụ ya, Jehova ga-agọzi mgbalị ya inweta ihe ndị dị ya na nwa ya nwoke mkpa. (Matiu 6:33, 34) Ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa na-egosi na, n’agbanyeghị ahụhụ ha nwere ike ịta, Jehova bụ ebe mgbaba na ebe ha e wusiri ike. (Abụ Ọma 91:2) Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere gị?

18. Gịnị bụ isi ihe dị n’izere ọnyà nke ụwa Setan?

18 Ruo ogologo oge anyị bi n’usoro ihe nke a, a ga-enwe ọnyà ndị a ga-ezere. (1 Jọn 5:19) Bible na-eme ka a mata ndị a, na-egosikwa anyị ụzọ isi zere ha. Ndị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ma nwee egwu ziri ezi nke ịkpasu ya iwe ga-enwe ike ịnagide ọnyà ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụ na ha ‘anọgide na-ejegharị site na mmụọ nsọ,’ ha agaghị adaba n’ụzọ nke ụwa. (Ndị Galetia 5:16-25) Nye ndị nile na-ewu ndụ ha gburugburu mmekọrịta ha na Jehova n’ezie, e nwere atụmanya dị ebube nke iso Chineke na-ejegharị, iso ya na-akpachi anya ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 25:14.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Olee otú obi ike onwe onye pụrụ isi bụrụ ọnyà?

◻ Gịnị pụrụ ichebe anyị pụọ n’ịbụ ndị egwu mmadụ na-achịkwa?

◻ Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara itinye ndụmọdụ e nyere banyere ihe ize ndụ nke ịchụso ihe onwunwe n’ọrụ?

◻ Gịnị pụrụ ime ka anyị nwee ike izere ịbụ ndị nchegbu nke ndụ matara n’ọnyà?

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ọtụtụ na-anọgide na-esoro Chineke na-ejegharị ná ndụ ha nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya