Ndị Nne na Nna—Chebenụ Ụmụ Unu!
N’OTU ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Nigeria, ọ na-amasị otu nwa agbọghọ a maara maka mmekọahụ rụrụ arụ ịkọrọ ụmụ akwụkwọ ndị nwanyị ibe ya ihe ndị metụtara mmekọahụ. Otu n’ime ọgwụ ọ tụrụ aro ya maka isikwopụ afọ ime bụ biya staụtụ nke a gwara ụtaba n’ebe o buru ibu. Akụkọ ya, bụ́ ndị o nwetara site n’akwụkwọ na-akpali agụụ mmekọahụ, kpaliri mmasị ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe ya. Ụfọdụ malitere ịnwale mmekọahụ, otu n’ime ha tụkwaara ime. Iji sikwopụ afọ ime, ọ ṅụrụ ngwakọta staụtụ na ụtaba ahụ. N’ime hour ole na ole, ọ malitere ịgbọ ọbara. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, ọ nwụrụ n’ụlọ ọgwụ.
N’ụwa taa, ọtụtụ ndị ntorobịa adịghị ekwubi okwu ekwubi banyere mmekọahụ, na-ewetara ndị na-ege ntị na-ekweta ihe ọsọ ọsọ mbibi. Olee ndị ka ndị na-eto eto kwesịrị ichigharịkwuru iji nweta ezi ihe ọmụma nke ga-echebe ha? Lee ka o si dị mma mgbe ha pụrụ ilegara nne na nna ha na-asọpụrụ Chineke anya, bụ́ ndị nwere ibu ọrụ nke ịzụlite ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.
Àgwà Ndị Africa n’Ebe Mmụta Mmekọahụ Dị
Gbaa ụwa gburugburu, ọ na-esiri ọtụtụ nne na nna ike isoro ụmụ ha kwurịta ihe ndị metụtara mmekọahụ. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’Africa. Donald, otu nna na Sierra Leone, kwuru, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a dịghị ekwu ya ekwu. Ime otú ahụ abụghị akụkụ ọdịbendị Africa.” Otu nwanyị Nigeria aha ya bụ Confident na-ekweta, sị: “Nne na nna m na-ele mmekọahụ anya dị ka ihe a na-ekwesịtụdịghị ịkpọ aha hoo haa; a na-asọ ya nsọ n’ụzọ ọdịbendị.”
N’ọdịbendị ụfọdụ nke Africa, a na-agụ ya dị ka ihe rere ure ịkpọ okwu ndị metụtara mmekọahụ aha dị ka amụ, ọbara ọcha, ma ọ bụ nsọ nwanyị. Otu nne bụ́ onye Kraịst machibidodịrị ada ya iji okwu bụ́ “mmekọahụ” mee ihe, ọ bụ ezie na ọ sịrị na ada ya pụrụ iji okwu bụ́ “ịkwa iko” mee ihe. N’ụzọ dị iche, Okwu Chineke bụ́ Bible adịghị ezo ọnụ banyere mmekọahụ na akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ. (Jenesis 17:11; 18:11; 30:16, 17; Levitikọs 15:2) Nzube nke a abụghị ime ka akpata oyi wụọ ndị Chineke ma ọ bụ ka ha nwee mkpali kama iji chebe ma nye ha ntụziaka.—2 Timoti 3:16.
E wezụga ịsọ ihe nsọ n’ọdịbendị, otu nna bụ́ onye Nigeria kwupụtara ihe ọzọ mere ụfọdụ nne na nna ji ala azụ: “Ọ bụrụ na mụ na ụmụ m ekwurịta banyere mmekọahụ, ọ pụrụ ịkpali ha inwe mmekọahụ rụrụ arụ.” Ma ihe ọmụma dị ùgwù, nke dabeere na Bible banyere mmekọahụ ọ̀ na-agba ụmụaka ume ịgbapụ gaa mee nnwale? Ee e, ọ dịghị eme otú ahụ. N’eziokwu, ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ka ihe ọmụma ndị na-eto eto nwere dị nta, otú ahụ ka o yikarịrị ka ha ga-abanye ná nsogbu. “Amamihe [nke dabeere n’ezi ihe ọmụma] bụ ndo,” ka Bible na-ekwu.—Eklisiastis 7:12.
N’ilu Jisọs, nwoke nwere uche, n’ịhụ na a pụrụ inwe oké ifufe n’ọdịnihu, wuru ụlọ ya n’elu oké nkume ebe nwoke nzuzu wuru nke ya n’elu ájá, ọdachi wee dakwasị ya. (Matiu 7:24-27) N’otu aka ahụ, nne na nna bụ́ ndị Kraịst nwere uche, n’ịmara na ụmụ ha ga-eche nrụgide ndị yiri oké ifufe ime ka ha kwekọọ n’ụkpụrụ mmekọahụ na-adịghị ọcha nke ụwa ihu, na-eji ezi ihe ọmụma na nghọta ga-enyere ha aka ịnọgide na-eguzosi ike wusie ụmụ ha ike.
Otu nwanyị bụ́ onye Africa kwuru ihe ọzọkwa mere ọtụtụ nne na nna na-adịghị eso ụmụ ha akparịta banyere mmekọahụ: “Mgbe m bụ onye ntorobịa, nne na nna m bụ́ Ndịàmà esoghị m kwurịta ihe ndị metụtara mmekọahụ, n’ihi ya ọ batabeghị m n’uche iso ụmụ m kwurịta ihe ndị a.” Otú ọ dị, nrụgide ndị na-adịkwasị ndị na-eto eto taa karịrị ndị dịkwasịrị ndị na-eto eto n’afọ 10 ma ọ bụ 20 gara aga. Nke a adịghị eju anya. Okwu Chineke buru amụma na “na mgbe ikpeazụ . . . , ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”—2 Timoti 3:1, 13.
Eziokwu bụ́ na ọtụtụ ụmụaka na-ala azụ ma ọ bụ adịghị enwe ike ịkọrọ nne na nna ha ihe nzuzo na-atụkwasị ihe ná nsogbu ahụ. A dịghị enwekọrịta ezi nkwurịta okwu ọbụna n’ụmụ irighiri ihe. Onye ntorobịa dị afọ 19 kwara arịrị, sị: “Adịghị m akọrọ nne na nna m ihe. Ezi nkwurịta okwu adịghị n’etiti mụ na nna m. Ọ naghị ege ntị.”
Ndị na-eto eto pụkwara ịtụ ụjọ na ịjụ ase banyere ihe ndị metụtara mmekọahụ ga-arụpụta ihe ndị dị njọ. Nwa agbọghọ dị afọ 16 kwuru, sị: “Adịghị m akọrọ nne na nna m nsogbu mmekọahụ n’ihi otú ha si emeghachi omume nye ụdị ihe ndị ahụ. N’oge gara aga nwanne m nwanyị nke tọrọ m jụrụ mama anyị ajụjụ ụfọdụ metụtara mmekọahụ. Kama mama anyị ga-enyere ya aka ná nsogbu ya, o nyowere ebumnuche ya enyo. Mgbe mgbe mama anyị ga-akpọ m wee jụọ m banyere nwanne m nwanyị, mgbe ụfọdụ na-ewebata okwu ndị na-adịghị mma banyere omume ya. Achọghị m ịnọ n’egwu nke enwekwaghị ịhụnanya mama anyị, n’ihi ya adịghị m eme ka ọ mara nsogbu m.”
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Ntụziaka?
Inye ụmụ anyị ntụziaka ruo n’ókè zuru ezu n’ihe ndị metụtara mmekọahụ abụghị nanị ihe ziri ezi ime kamakwa ihe obiọma ime. Ọ bụrụ na nne na nna akụzighịrị ụmụ ha banyere mmekọahụ, ndị ọzọ ga-eme ya—ọtụtụ mgbe ngwa ngwa karịa otú nne na nna tụrụ anya, ọ na-afọkwa nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe a na-eme ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Otu nwa agbọghọ dị afọ 13 kwara iko n’ihi na nwa akwụkwọ ibe ya gwara ya na ọ bụrụ na ọ maghị nwoke, ọ ga-enwe ihe mgbu dị egwu n’ọdịnihu. “Ha ga-eji mkpà chapụ gị ihe i ji bụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,” ka a gwara ya. Mgbe e mesịrị jụọ ya ihe mere na ọ gwaghị nne ya bụ́ onye Kraịst ihe ọ nụrụ, nwa agbọghọ ahụ zaghachiri na a dịghị eso ndị toworo eto akparịta ụdị ụka ndị ahụ ma ọlị.
Otu nwa agbọghọ bụ́ onye Nigeria kwuru, sị: “Ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ nwara ime ka m kweta na mmekọahụ bụ ihe mmadụ nile ahụ dị mma na-aghaghị inwe. Ha gwara m na ọ bụrụ na mụ enweghị mmekọahụ ugbu a, mgbe m ruru afọ 21, m ga-amalite ịrịa ọrịa nke ga-enwe ajọ mmetụta n’ịbụ onye inyom m. Ya mere, iji zere ihe ize ndụ dị egwu dị otú ahụ, ka ha kwuru, ọ dị mma inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye.”
Ebe ya na nne na nna ya nweworo ezi nkwurịta okwu, ọ ghọtara ozugbo ihe dị iche n’ihe ọ mụtaworo n’ụlọ. “Dị ka m na-eme, alaghachiri m n’ụlọ wee gwa mama m ihe ha gwaworo m n’ụlọ akwụkwọ.” Nne ya nwere ike ikwu ihe ndị megidere ihe ọmụma ụgha ahụ.—Tụlee Ilu 14:15.
Site n’inye ihe ọmụma dị mkpa iji nyere ụmụaka aka inweta amamihe Chineke n’ihe ndị metụtara mmekọahụ, nne na nna na-akwadebe ha ịghọta ọnọdụ ndị dị ize ndụ na ịmata ndị chọrọ irigbu ha. Ọ na-enye aka iji chebe ha megide obi mgbu nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ na ime ọkwà. Ọ na-atụnye ụtụ n’ùgwù onwe onye ha na ùgwù ndị ọzọ na-akwanyere ha. Ọ na-eme ka ha nwere onwe ha pụọ ná nghọta ndị na-ezighị ezi na nchegbu. Ọ na-akwalite inwe ezi àgwà, nke dị mma n’ebe mmekọahụ kwesịrị ekwesị dị, na-atụnye ụtụ n’obi ụtọ ma ha mesịa lụọ di ma ọ bụ nwunye. Ọ pụrụ inyere ha aka ịnọgide na-enwe nguzo a nwapụtara anwapụta n’ebe Chineke nọ. Ka ụmụaka na-ahụkwa nchegbu ịhụnanya a na-egosi ha, ọ pụrụ ịkpali ha ịkwanyere nne na nna ha ùgwù na ịhụ ha n’anya karị.
Ezi Nkwurịta Okwu
Ka nne na nna wee mee ka ndụmọdụ kwekọọ ná mkpa ụmụ ha, a ghaghị ịdị na-enwekọrịta nkwurịta okwu. Ọ gwụla ma nne na nna hà maara ihe ndị dị ụmụ ha n’uche na n’obi, ọbụna ezi ndụmọdụ agaghị abacha uru, dị nnọọ ka ebe dọkịta nwara idepụta ọgwụ n’amaghị ụdị ọrịa ji onye ọrịa. Iji bụrụ ezi ndị ndụmọdụ, nne na nna aghaghị ịmara n’ezie ihe ụmụ ha na-eche na mmetụta ha na-enwe. Ọ dị ha mkpa ịghọta nrụgide na nsogbu ndị ụmụ ha na-eche ihu na ajụjụ ndị na-esogbu ha. Ọ dị mkpa iji nlezianya gee ụmụaka ntị, ịbụ “onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu.”—Jemes 1:19; Ilu 12:18; Eklisiastis 7:8.
Ọ na-ewe oge, ndidi, na mgbalị ka nne na nna zụlite ma nọgide soro ụmụ ha na-enwe mmekọrịta chiri anya, mmekọrịta nke ụmụaka na-adịghị ala azụ na ya ikpughe mmetụta ha kasị omimi. Ma lee otú o si maa mma mgbe e nwere nke a! Otu nna bụ́ onye Ọdịda Anyanwụ Africa nke nwere ụmụ ise na-ekwu, sị: “Abụ m ma nna ma onye a na-akọrọ ihe nzuzo. Ụmụ m adịghị ala azụ iso m kparịta isiokwu nile, tinyere mmekọahụ. Ọbụna ndị nke nwanyị na-akọrọ m ihe nzuzo. Anyị na-eji nwayọọ akparịta nsogbu ha. Ha na-esokwa m ekerịta ọṅụ ha.”
Bola, otu n’ime ụmụ ya ndị nwanyị, na-asị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla m na-ezoro nna m. Nna m na-echebara ndị ọzọ echiche ma nwee ọmịiko. Ọ dịghị eyi anyị egwu ma ọ bụ emeso anyị n’aka ike, ọbụna mgbe anyị mere ihe ọjọọ. Kama iwe iwe, ọ ga-atụle okwu ahụ ma gosi anyị ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ ihe anyị na-ekwesịghị imeworị. Ọ na-ezokarị aka n’akwụkwọ Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ na akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.”a
Mgbe o kwere omume, ọ dị mma nne na nna ịmalite na-agwa ụmụ ha banyere mmekọahụ mgbe ụmụ ahụ dị nnọọ obere. Nke a na-eguzobe ihe ndabere maka nkwurịta okwu na-adịgide gabiga afọ iri na ụma ndị ahụ na-esikarị ike. Mgbe a na-amaliteghị nkwurịta okwu n’oge, ọ na-esi ike mgbe ụfọdụ ịmalite ha mgbe e mesịrị, ma a pụrụ ime ya. Otu nne nke ụmụ ise kwuru, sị: “Amanyere m onwe m ikwu banyere ya ruo n’ikpeazụ mgbe ọ na-adịkwaghị eme m, ma ọ bụkwanụ nwa ahụ, ihere.” Ebe nnukwu ihe dị n’ihe ize ndụ, mgbalị ndị dị otú ahụ bara uru n’ezie.
Ndị E Nyere Nchebe ma Nwee Obi Ụtọ
Ụmụaka na-enwe mmasị ná ndị nne na nna na-eji ihe ọmụma nke ga-echebe ha wee na-akwadebe ha n’ụzọ ịhụnanya. Tụlee ihe Ndịàmà Jehova ụfọdụ bụ́ ndị Africa kwuru:
Mojisola kwuru mgbe ọ dị afọ 24, sị: “Aga m anọgide mgbe nile na-enwe obi ekele nye mama m. Ọ kụziiri m ihe ndị dị mkpa banyere mmekọahụ n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ezie na o mere m ihere mgbe ọ na-ekwu banyere ihe ndị ahụ n’oge dị anya gara aga, ugbu a ana m ahụ ihe ọma ndị mama m meere m.”
Iniobong gbakwụnyere, sị: “Obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m leghachiri anya azụ ma chee banyere ihe mama m meere m site n’inye m ọzụzụ zuru ezu banyere mmekọahụ. Ọ bụwo ihe enyemaka dị nnọọ mkpa n’iduzi m gaa n’ịbụ onye inyom. Ana m aṅụ iyi imere ụmụ m n’ọdịnihu otu ihe ahụ.”
Kunle dị afọ 19 kwuru, sị: “Nne na nna m enyeworo m aka iguzogide nrụgide ndị sitere n’aka ndị inyom ụwa na-enye onwe ha maka mmekọahụ. A sị na ọ bụghị n’ihi ọzụzụ ha nyere m, agaara m adaba ná mmehie. Aga m na-enwe ekele mgbe nile maka ihe ha mere.”
Christiana kwuru, sị: “Ana m enweta ọtụtụ abamuru site n’isoro mama m kparịta ụka banyere mmekọahụ. E chebewo m pụọ n’ọrịa ndị na-egbu egbu na ime ọkwà, enwewokwa m ike isetịpụrụ ụmụnne m ndị m tọrọ ezi ihe nlereanya ịgbaso. Enwetawokwa m nkwanye ùgwù site n’aka ndị mmadụ, di ga-alụ m ga-akwanyekwara m ùgwù. Nke ka mkpa, enwere m ezi mmekọrita n’ebe Jehova Chineke nọ n’ihi idebe ihe o nyere n’iwu.”
Bola, onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kwuru, sị: “Enwere m nwa klas nke sịrị na e kwesịrị inwe mmekọahụ n’alụghị di. Nye ya, ọ bụ ikpori ndụ. Otú ọ dị, ọ hụrụ na ọ bụghị ikpori ndụ mgbe ọ tụụrụ ime wee ghara inwe ike iso anyị lee ule satifiketi ụlọ akwụkwọ. A sị na mụ enweghị ezigbo nna iduzi m, ikekwe agaara m adị ka ya, na-amụta ihe n’ụzọ siri ike.”
Lee ngọzi ọ bụ mgbe nne na nna bụ́ ndị Kraịst nyeere ụmụ ha aka ịbụ ‘ndị amamihe ịnata nzọpụta’ n’ụwa a ara mmekọahụ na-agba! (2 Timoti 3:15) Ntụziaka ha dabeere na Bible yiri ihe olu dị oké ọnụ ahịa nke na-achọ ụmụaka mma n’anya Chineke. (Ilu 1:8, 9) Ụmụaka na-enwe mmetụta ịnọ ná nchebe, nne na nna na-enwekwa afọ ojuju miri emi. Otu nna bụ́ onye Africa nke na-agba mbọ mgbe nile ighewe ụzọ nkwurịta okwu ya na ụmụ ya na-eto eto oghe kwuru, sị: “Anyị nwere udo nke uche. Anyị nwere obi ike na ụmụ anyị maara ihe na-atọ Jehova ụtọ; ndị nọ n’èzí apụghị iduhie ha. Anyị nwere obi ike na ha agaghị eme ihe ndị ga-ewetara ezinụlọ anyị ihe mgbu. Ana m ekele Jehova na ha egosiwo na obi ike anyị ehieghị ụzọ.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị na-anata ihe ọmụma dabeere na Bible site n’aka ndị nne na nna pụrụ ịjụ akụkọ gbagọrọ agbagọ ndị ndị ntorobịa ndị ọzọ na-akọ