Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/1 p. 9
  • “Ihe Siri Ike Ma Na-eme Ka E Kwenye”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ihe Siri Ike Ma Na-eme Ka E Kwenye”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Broshuọ Ọhụrụ A Ga-enyefe!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/1 p. 9

“Ihe Siri Ike Ma Na-eme Ka E Kwenye”

“MALITE echi, m ga-eji ya na-eme ihe n’ọrụ nkwusa, n’ihi na arụmụka dị n’ime ya siri nnọọ ike ma na-eme ka e kwenye,” ka otu n’ime Ndịàmà Jehova si France dere. Otu Onyeàmà si United States dere, sị: “Agụrụ m ya ozugbo, apụghịkwa m ichere echere iji ya eme ihe n’ozi ubi, ebe anyị na-ezute nnọọ ọtụtụ ndị na-adịghị egosi mmasị na ndị na-atụkwasịghị Bible obi ma ọlị.” Gịnị ka ha na-akọwa? Broshuọ ahụ dị peji 32 a kpọrọ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile nke Watch Tower Society wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” e nwere na 1997/98.

E nwere ndị e bu n’uche kpọmkwem kwadebe mbipụta a—ndị ọ pụrụ ịbụ na ha gụrụ akwụkwọ ma ha maara ihe dị nta banyere Bible. Ọtụtụ ndị dị otú ahụ nwere ihe ha na-eche kpọmkwem banyere Bible, ọ bụ ezie na ha agụtụbeghị ya n’onwe ha. Nzube nke broshuọ a bụ ime ka onye na-agụ ya kwere na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, Bible ruru eru ka e nyochaa ya. Broshuọ ahụ adịghị amanye onye na-agụ ya ịnakwere echiche nke na Bible sitere na mmụọ Chineke. Kama, ọ na-ekwe ka ihe ndị bụ eziokwu kwuo ọnụ ha. Okwu ndị e ji mee ihe adịghị ada oké ụda kama ha doro anya ma na-aga n’ihe kpọmkwem.

Dị ka okwu ndị e hotara n’elu na-egosi, ọ dị ndị nọ ná mgbakọ ndị ahụ ọkụ n’obi iji broshuọ a mee ihe n’ozi ubi ha. Dị ka ihe atụ, na France a haziri otu mkpọsa ịgba àmà pụrụ iche maka August 23 na 24 mgbe ọtụtụ narị puku ndị nleta na-eto eto sitere gburugburu ụwa zukọrọ na Paris maka Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa. Ihe dị ka Ndịàmà 2,500 (karịsịa malite n’afọ ndụ nke 16 ruo 30) tinyere broshuọ 18,000 na Bekee, French, German, Italian, Polish, na Spanish.

Ee, ka anyị jiri broshuọ a, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, mee ihe n’ozi anyị. Ka mbipụta a baa uru n’ime ka ndị nwere ezi uche kwenye na ha kwesịrị inyocha Bible n’onwe ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya