Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ hụwo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche dị ka ihe bara ezigbo uru nye gị? Mgbe ahụ gịnị mere ị gaghị eji ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ikike ncheta gị?
◻ Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti “ụbọchị Onyenwe anyị” na “ụbọchị Jehova”? (Mkpughe 1:10; Joel 2:11)
‘Ụbọchị Onyenwe anyị’ na-agụnye mmezu nke ọhụụ 16 a kọwara ná Mkpughe isi nke 1 ruo 22 nakwa ihe omume nile gbara ọkpụrụkpụ Jisọs buru amụma ha ná nzaghachi nye ajụjụ nke ndị na-eso ụzọ ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. Dị ka oge kasị dị ịrịba ama nke ụbọchị Onyenwe anyị, ụbọchị dị egwu nke Jehova ga-etiwapụ mgbe ọ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ụwa rụrụ arụ nke Setan. (Matiu 24:3-14; Luk 21:11)—12/15, peji nke 11.
◻ Gịnị bụgasị ụfọdụ akụkụ dị ịrịba ama nke Bible Makarios?
Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro 3,500 na Bible Makarios. Otu ọkà mmụta akwụkwọ okpukpe na Russia sịrị: “Nsụgharị [ahụ] kwekọrọ n’ihe odide Hibru, asụsụ nke nsụgharị ahụ enweghị mmerụ, kwesịkwa isiokwu ya.”—12/15, peji nke 27.
◻ Gịnị bụ “eziokwu ahụ” nke Jisọs sịrị na ọ ga-eme ka anyị pụọ n’ohu? (Jọn 8:32)
N’ịsị “eziokwu ahụ,” Jisọs bu n’uche ihe ọmụma sitere n’ike Chineke—karịsịa ihe ọmụma banyere uche Chineke—nke e chekwara n’ime Bible.—1/1, peji nke 3.
◻ Olee ndị bụ Jihu na Jehonadab nke oge a?
Jihu sere onyinyo Jisọs Kraịst, bụ́ onye “Israel nke Chineke,” bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ na-anọchite anya ya n’ụwa. (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 12:17) Dị nnọọ ka Jehonadab bịara izute Jihu, “oké ìgwè mmadụ” sitere ná mba dị iche iche abịawo ịkwado ndị na-anọchite anya Jisọs n’ụwa. (Mkpughe 7:9, 10; 2 Ndị Eze 10:15)—1/1, peji nke 13.
◻ Gịnị ka ‘isoro Chineke na-ejegharị’ pụtara? (Jenesis 5:24; 6:9)
Nke a pụtara na ndị na-eme otú ahụ, dị ka Ịnọk na Noa, kpara àgwà n’ụzọ na-agba àmà okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. Ha mere ihe Jehova nyere ha n’iwu ma chịkwaa ndụ ha n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha maara banyere ya site n’ụzọ o si emeso ihe a kpọrọ mmadụ.—1/15, peji nke 13.
◻ N’ihi gịnị ka mmadụ kwesịrị iji buru ụzọ mee atụmatụ adịghị ama ama ọ nwụọ?
N’otu echiche, ime ndokwa dị otú ahụ bụ onyinye nye ezinụlọ mmadụ. Ọ na-egosi ịhụnanya. Ọ na-egosi ọchịchọ ‘ichere ndị ezinụlọ nke aka mmadụ ihe na-akpa ha’ ọbụna mgbe onye ahụ na ha na-anọkwaghị. (1 Timoti 5:8)—1/15, peji nke 22.
◻ Gịnị ka “ọgbụgba ndụ ochie ahụ” rụzuru? (2 Ndị Kọrint 3:14)
O nyere ihe atụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sitekwa n’àjà ya a na-achụ ugboro ugboro, gosipụta oké mkpa nke mgbapụta site ná mmehie na ọnwụ dị mmadụ. Ọ bụ “onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst.” (Ndị Galetia 3:24)—2/1, peji nke 14.
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-adịru ebighị ebi? (Ndị Hibru 13:20)
Nke mbụ, n’adịghị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, a gaghị edochi ya ma ọlị. Nke abụọ, ihe ndị si n’ịrụ ọrụ ya pụta na-adịgide adịgide. Nke atọ kwa, ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ala ga-anọgide na-erite uru site ná ndokwa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’ime Narị Afọ Iri ahụ dum.—2/1, peji nke 22.
◻ Olee uru ndị na-esite n’inwe obi ekele?
Ikpo ọkụ mmadụ na-enweta n’ihi inwe obi ekele na-atụnye ụtụ n’obi ụtọ na udo ya. (Tụlee Ilu 15:13, 15.) N’ịbụkwa àgwà ziri ezi, obi ekele na-echebe mmadụ pụọ ná mmetụta na-ezighị ezi ndị dị ka iwe, ekworo, na ibu iwe n’obi.—2/15, peji nke 4.
◻ N’ime ọgbụgba ndụ ndị dị aṅaa ka a kpọbaworo ndị e ji mmụọ nsọ mụta?
Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke Jehova sooro ndị òtù nke Israel ime mmụọ gbaa, na ọgbụgba ndụ ahụ maka Alaeze, nke Jisọs sooro ụmụazụ ya e tere mmanụ gbaa. (Luk 22:20, 28-30)—2/15, peji nke 16.
◻ Olee ememe ukwu atọ e nyere ndị Israel iwu ije?
Ememe Achịcha Na-ekoghị Eko, nke sochiri ngwa ngwa mgbe Ememe Ngabiga nke Nisan 14 gasịrị; Ememe nke Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa, n’ụbọchị nke 50 site na Nisan 16; na Ememe Nchịkọta, ma ọ bụ Ememe Ụlọ Ntu, n’ọnwa nke asaa. (Deuterọnọmi 16:1-15)—3/1, peji nke 8, 9.
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù ịga mgbakọta ndị Kraịst?
Jisọs sịrị: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha.” (Matiu 18:20; 28:20) Ọzọkwa, otu ụzọ dị mkpa e si enye nri ime mmụọ bụ site ná nzukọ ọgbakọ na mgbakọta ndị ka ukwuu. (Matiu 24:45)—3/1, peji nke 14.
◻ Olee otú aha ahụ bụ́ Nimrọd si malite?
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta nwere echiche bụ́ na aha ahụ bụ́ Nimrọd abụghị aha a gụrụ n’ọmụmụ. Kama, ha na-ele ya anya dị ka aha a gụrụ mgbe e mesịrị iji kwekọọ n’omume nnupụisi ya mgbe ọ pụtasịrị ìhè.—3/15, peji nke 25.
◻ Olee otú ezinụlọ dịruru ọha mmadụ mkpa?
Ezinụlọ bụ ihe dị mmadụ mkpa. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ka ndokwa ezinụlọ na-adakpọ, otú ahụ ka ike nke ógbè na mba dị iche iche na-adalata. Ya mere ezinụlọ nwere mmetụta kpọmkwem ná nguzosi ike nke ọha na eze na ọdịmma nke ụmụaka na ọgbọ ndị na-abịa n’ihu.—4/1, peji nke 6.
◻ Gịnị bụ ihe atọ na-anwapụta na Bible bụ Okwu Chineke?
(1) O ziri ezi na nkà mmụta sayensị; (2) o bu ndụmọdụ ndị dabara n’oge nile bụ́ ndị dị irè maka ibi ndụ n’oge a; (3) o bu amụma ndị a kapịrị ọnụ ndị e mezuworo, dị ka ihe ndị mere eme n’akụkọ na-anwapụta.—4/1, peji nke 15.