Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/15 p. 28-31
  • Gịnị Bụ Talmud?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Talmud?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Talmud
  • Mmepụta nke Talmud Abụọ
  • Gịnị ka Talmud Rụzuru?
  • Mishnah na Iwu Chineke Nyere Mosis
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Iwu Ahụ E Nyere N’ọnụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Ya Ede?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndị Karaịt Na Ọchịchọ Ha Na-achọ Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/15 p. 28-31

Gịnị Bụ Talmud?

“Obi abụọ adịghị ya na Talmud bụ otu n’ime akwụkwọ e bipụtaworo ndị kasị dị ịrịba ama.”—The Universal Jewish Encyclopedia.

“[Talmud bụ] otu n’ime ọrụ ọgụgụ isi kasị ukwuu ihe a kpọrọ mmadụ rụzuworo, ihe odide nke na-erikpọ uche, nke bara uru, sie ike nghọta nke na o nyewo uche ndị ọkà ọrụ ruo ihe karịrị otu puku afọ na ọkara.”—Jacob Neusner, ọkà mmụta na onye na-ede akwụkwọ bụ́ onye Juu.

“Talmud bụ ide bụ́ isi [nke okpukpe ndị Juu] nke na-akwado ihe owuwu dum nke ime mmụọ na ọgụgụ isi nke ndụ ndị Juu.”—Adin Steinsaltz, ọkà mmụta na rabaị nke Talmud.

TALMUD n’ụzọ ajụjụ na-adịghị ya enwewo mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị Juu ruo ọtụtụ narị afọ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-ekwekọghị n’okwu ịja mma ndị e hotara n’elu, a katọwo Talmud, kpọọkwa ya “osimiri nke ihe na-edoghị anya na apịtị.” A katọwo ya dị ka ọrụ nkwulu sitere n’aka Ekwensu. Site n’iwu ike nke ndị popu, ugboro ugboro e nyochawo ya, jichie ya, na ọbụna suo ya ọkụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ámá ọha na eze dị iche iche nke Europe.

Gịnị n’ezie bụ akwụkwọ a nke kpaliworo oké esemokwu? Gịnị na-eme Talmud ihe pụrụ iche n’etiti ihe odide nile nke ndị Juu? Gịnị mere e ji dee ya? Olee otú o siworo bịa na-enwe mmetụta dị otú ahụ n’okpukpe ndị Juu? Ò nwere ihe ọ pụtaara ndị na-abụghị ndị Juu?

N’ime afọ 150 sochiri mbibi ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem na 70 O.A., ụlọ akwụkwọ ukwu ndị nkụzi rabaị n’Israel dum chọrọ ngwa ngwa ihe ndabere ọhụrụ maka ijigide usoro ndị Juu. Ha rụrụ ụka ma wusie ọdịnala dị iche iche nke iwu ha a na-edeghị ede ike. N’iwukwasị ihe n’elu ntọala a, ha guzobere ịkpa ókè ndị ọhụrụ na ihe ndị ọhụrụ a chọrọ n’okpukpe ndị Juu, na-enye ntụzi banyere ịdị ndụ dị nsọ kwa ụbọchị n’enweghị ụlọ nsọ. E depụtara ụkpụrụ ime mmụọ ọhụrụ a na Mishnah, nke Judah ha-Nasi chịkọtara ka ọ na-erule ná mmalite nke narị afọ nke atọ O.A.a

Mishnah kwụụrụ onwe ya, n’achọghị ka e gosi izi ezi ya ná ndabere nke ntụaka Bible. Ụzọ ntụle ihe ya na ọbụna ụdị Hibru ya pụrụ iche, dị iche site n’ihe odide Bible. Mkpebi ndị rabaị e hotara na Mishnah ga-emetụta ndụ ndị Juu na-adị kwa ụbọchị n’ebe ọ bụla. N’ezie, Jacob Neusner na-ekwu, sị: “Mishnah ghọrọ ụkpụrụ iwu Israel. . . . Ọ chọrọ nkwenye na nkwekọ n’ụkpụrụ nduzi ya nile.”

Ma gịnị ma ọ bụrụ na ụfọdụ ajụọ ma ikike ndị amamihe e hotara na Mishnah ọ̀ hà n’ezie ka nke Akwụkwọ Nsọ e kpughere ekpughe? Ndị rabaị aghaghị igosi na ozizi nke ndị Tannaim (ndị nkụzi nke iwu a na-edeghị ede) a na-achọta na Mishnah kwekọzuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Inyekwu nkọwa ghọrọ ihe dị mkpa. Ha hụrụ mkpa ọ dị ịkọwa na igosi izi ezi nke Mishnah na ịnwapụta na o sitere n’Iwu e nyere Mosis na Saịnaị. O yiri ndị rabaị ka a rụgidere ha ịnwapụta na iwu a na-edeghị ede na iwu e dere ede nwere otu mmụọ na nzube. Ya mere, kama ịbụ o kwucha o bie n’okpukpe ndị Juu, Mishnah ghọrọ ntọala ọhụrụ maka nkwurịta okwu na arụmụka okpukpe.

Ime Talmud

A maara ndị rabaị nakweere ihe ịma aka ọhụrụ a dị ka ndị Amoraim—“ndị ntụgharị,” ma ọ bụ “ndị nkọwa,” nke Mishnah. Ụlọ akwụkwọ ukwu nke ọ bụla dabeere n’otu rabaị a ma ama. Ìgwè nta nke ndị ọkà mmụta na ụmụ akwụkwọ nwere nkwurịta okwu n’afọ dum. Ma a na-enwe nnọkọ ndị kasị mkpa ugbo abụọ n’afọ, n’ọnwa Ada na Elul, mgbe ọrụ ubi na-ebelata, ọtụtụ narị ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ puku nwekwara ike ịbịa.

Adin Steinsaltz na-akọwa, sị: “Onye isi ụlọ akwụkwọ ukwu ahụ na-anọ n’isi oche, nọrọ n’oche ma ọ bụ n’ute pụrụ iche. N’ahịrị ndị nọ ya n’ihu ka ndị ọkà mmụta dị mkpa, gụnyere ndị ibe ya ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ pụtara ìhè na-anọ, n’azụ ha kwa ka ndị mmụta ndị ọzọ nile na-anọ. . . . Usoro ịnọdụ ala dabeere kpọmkwem n’usoro ịka elu [otú onye ọ bụla si dị mkpa].” A ga-agụ otu akụkụ nke Mishnah. A ga-ejizi nke a tụnyere ihe odide yiri ya ma ọ bụ ihe ntụkwasị ndị Tannaim chịkọtara ma e tinyeghị ha na Mishnah. Usoro nnyocha ga-amalite. A na-ajụ ajụjụ, a na-atụlekwa ihe ndị na-emegiderịta onwe ha iji chọta nkwekọ dị n’ime n’etiti otu ozizi na ọzọ. A na-achọ ihe odide nnwapụta site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru iji kwadoo nkụzi ndị rabaị.

Ọ bụ ezie na e ji nlezianya hazie ha, nkwurịta okwu ndị a na-akpụ ọkụ n’ọnụ, mgbe ụfọdụ na-agba aghara. Otu onye amamihe e hotara na Talmud kwuru banyere “mkpake ọkụ” na-awụpụ n’ọnụ ndị rabaị n’oge otu arụmụka. (Hullin 137b, Talmud nke Babilọn) Steinsaltz na-ekwu nke a banyere nnọkọ ndị ahụ: “Onye isi ụlọ akwụkwọ ukwu ahụ, ma ọ bụ onye amamihe na-ekwu okwu, ga-enye nkọwa nke ya banyere nsogbu. Ọtụtụ mgbe ndị ọkà mmụta na-ege ntị ga-ajụkasị ya ajụjụ ahụ ná ndabere nke akwụkwọ ndị ọzọ, echiche ndị nkọwa ndị ọzọ, ma ọ bụ nkwubi okwu ndị nke ha ezi uche dị na ha. Mgbe ụfọdụ arụmụka ndị ahụ na-adị nnọọ nkenke ma bụrụ ndị a kpaara ókè gaa nanị ná nzaghachi doro anya na nke nkwubi okwu ikpeazụ maka otu ajụjụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ ndị ọkà mmụta ndị ọzọ ga-enye azịza ndị ọzọ, oké arụmụka ga-esochikwa.” Ndị nile bịaranụ nweere onwe ha itinye ọnụ. A ga-eme ka ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ọzọ mara isiokwu ndị e mere ka ha doo anya karị ná nnọkọ ndị a ka ndị ọkà mmụta ndị ọzọ wee tụleghachi ha.

Ma, nnọkọ ndị a abụghị nanị arụmụka usoro iwu na-adịghị ebi ebi. A na-akpọ okwu iwu ndị metụtara ụkpụrụ nduzi na nchịkwa nke ndụ okpukpe ndị Juu Halakah. Okwu a sitere n’okwu Hibru maka “ịga,” ọ na-egosikwa ‘ụzọ ndụ nke mmadụ kwesịrị ịgbaso.’ A na-akpọ okwu ndị ọzọ nile—akụkọ banyere ndị rabaị na ndị a kọrọ maka ha na Bible, okwu amamihe, nchepụta nke nkwenkwe na nkà ihe ọmụma—Haggadah, site n’okwu Hibru bụ́ maka “ịgwa.” A gwakọtara Halakah na Haggadah n’oge arụmụka ndị rabaị.

N’akwụkwọ ya bụ́ The World of the Talmud, Morris Adler na-ekwu, sị: “Onye nkụzi maara ihe ga-eji okwu ọzọ katụ mfe na nke ka na-ewuli elu gbanwee arụmụka usoro iwu dị ogologo na nke siri ike. . . . N’ihi ya anyị na-ahụ ka a gwakọtara akụkọ mgbe ochie na akụkọ ihe mere eme, sayensị oge ahụ na ọdịnala, nkọwa Bible na akụkọ ndụ, okwuchukwu na nkà mmụta okpukpe n’ime ihe ga-eyi ka ajọ nchịkọta nke ihe ọmụma a na-ahazighị ahazi nye onye na-amaghị ụzọ ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ahụ si eme ihe.” Nye ndị ọkà mmụta nọ n’ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ahụ, mgbanwe ndị ahụ nile nwere nzube, e jikọtakwara ha na ihe a na-akpa. Halakah na Haggadah bụ blọk e ji ewu ihe owuwu ọhụrụ ahụ a ka na-ewu ewu n’ụlọ akwụkwọ ukwu dị iche iche nke ndị rabaị.

Mmepụta nke Talmud Abụọ

E mesịa, ụlọ akwụkwọ bụ́ isi nke ndị rabaị na Palestine kwagara na Taịberịas. E nwere ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ọzọ dị mkpa na Sepphoris, Sizaria, na Lida. Ma ọnọdụ akụ̀ na ụba na-aka njọ, mgbanwe ọchịchị mgbe nile, na n’ikpeazụ nrụgide na mkpagbu site n’Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ dubara n’ịkwapụ n’ìgwè gaa n’ógbè ọzọ a ma ama nke ndị Juu n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ—Babilọn.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị mmụta esiwo Babilọn nubata Palestine ịmụ ihe n’okpuru ndị rabaị ukwu n’ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ahụ. Otu onye mmụta dị otú ahụ bụ Abba ben Ibo, onye a na-akpọkwa Abba Arika—Abba onye ogologo—ma bụrụ onye e mesịrị mara nanị dị ka Rab. Ọ laghachiri na Babilọn n’ihe dị ka 219 O.A. mgbe ọ mụsịrị ihe n’okpuru Judah ha-Nasi, nke a kakwara akara mgbanwe nye ịdị mkpa ime mmụọ nke ógbè ndị Juu na Babilọn. Rab hiwere ụlọ akwụkwọ ukwu na Sura, ebe e nwere ọtụtụ ndị Juu ma nwee ndị ọkà mmụta ole na ole. Iwu ewu ya dọtara ndị mmụta 1,200 na-abịachi anya n’ụlọ akwụkwọ ukwu ya, na-enwe ọtụtụ puku ndị ọzọ na-anọ ya n’ọnwa ndị Juu ndị bụ́ Ada na Elul. Onye ibe Rab a ma ama, bụ́ Samuel, hiwere otu ụlọ akwụkwọ ukwu na Nehardea. Ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ọzọ dị mkpa bilitere na Pumbeditha na Mehoza.

Ugbu a e nwekwaghị mkpa ịga Palestine, n’ihi na mmadụ pụrụ ịmụ ihe n’okpuru ndị ọkà mmụta ukwu na Babilọn. Mmepụta nke Mishnah dị ka ihe odide dị iche meghere ụzọ maka ụlọ akwụkwọ ukwu ndị nke Babilọn ịkwụụrụ onwe ha kpam kpam. Ọ bụ ezie na ụzọ na usoro dịgasị iche iche nke ịmụ ihe bilitere ugbu a na Palestine na Babilọn, nzirịta ozi mgbe nile na mgbanwerịta nke ndị nkụzi chebere ịdị n’otu nke ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ahụ.

Ka ọ na-eru ngwụsị narị afọ nke anọ na ná mmalite nke narị ise O.A., ọnọdụ ahụ siwanyere nnọọ ike nye ndị Juu bi na Palestine. Usoro mgbochi na mkpagbu n’okpuru ikike na-arị elu nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ dubara n’ihe omume ikpeazụ nke iwepụ ma Sanhedrin ma ọnọdụ Nasi (nna ochie) n’ihe dị ka na 425 O.A. Ya mere ndị Amoraim nke Palestine malitere ijikọta n’otu mgbalị na-aga were were, nchịkọta nke arụmụka ndị e nwere n’ụlọ akwụkwọ ukwu ndị ahụ iji hụ na e chebere ha. Akwụkwọ a, nke a chịkọtara ọkụ ọkụ n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke anọ O.A., ghọrọ nke a matara dị ka Talmud nke Palestine.b

Ka ụlọ akwụkwọ ukwu ndị dị na Palestine nọ na-adakpọ, ndị Amoraim nke Babilọn na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ikike ha. Abaye na Raba weere ọ̀tụ̀tụ̀ nke arụmụka banye ná nrụrịta ụka ndị dị mgbagwoju anya ma sie ike nghọta bụ́ ndị mesịrị ghọọ ihe nlereanya nke nnyocha Talmud. Ọzọ, Ashi, onye isi nke ụlọ akwụkwọ ukwu dị na Sura (371-427 O.A.), malitere idekọta na idezi nchịkọta nke arụmụka ndị e nwere. Dị ka Steinsaltz na-akọ, o mere otú ahụ “na-atụ egwu na, n’ịbụ nke na-adịghị n’usoro, ihe ka ukwuu n’ihe a na-edeghị ede nọ n’ihe ize ndụ nke ịghọ ihe e chezọsịrị.”

Ihe odide a dị ukwuu karịrị ihe otu onye ma ọ bụ ọbụna otu ọgbọ pụrụ ịhazi. Oge ndị Amoraim jedebere na Babilọn na narị afọ nke ise O.A., ma ọrụ ikpeazụ nke idezicha Talmud nke Babilọn gara n’ihu banye na narị afọ nke isii O.A. site n’aka otu ìgwè a kpọrọ Saboraim, okwu Aramaic nke pụtara “ndị na-akọwa ihe,” ma ọ bụ “ndị nwere echiche.” Ndị ndezi ikpeazụ a jikọtara ọtụtụ puku ihe ndị na-ezughị ezu na ọtụtụ narị afọ nke arụmụka ndị rabaị, na-enye Talmud nke Babilọn otu ụdị na ụkpụrụ nke setịpụrụ ya iche site n’ihe odide mbụ nile nke ndị Juu.

Gịnị ka Talmud Rụzuru?

Ndị rabaị nke Talmud bu n’uche ịnwapụta na Mishnah na Akwụkwọ Nsọ Hibru si n’otu isi iyi ahụ. Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Jacob Neusner na-ekwu, sị: “Ihe a sịrị na-ese okwu bụ ọnọdụ Mishnah. Ma ọkpụrụkpụ ihe a na-arụrụ ụka ghọziri ikike nke onye amamihe ahụ n’onwe ya.” Iji mee ka ikike a siwanye ike, e nyochara, maa aka, kọwaa, meekwa ka ahịrịokwu ọ bụla nke Mishnah, mgbe ụfọdụ mkpụrụ okwu ọ bụla, kwekọọ n’otu usoro. Neusner na-ekwu na n’ụzọ dị otú a ndị rabaị “chigharịrị Mishnah ihu site n’otu akụkụ gaa n’ọzọ.” Ọ bụ ezie na e mepụtara ya dị ka akwụkwọ zuru ezu n’onwe ya, e kerisịwo Mishnah ugbu a. Ka a na-eme nke a, e megharịwo ya, kọwagharịa ya.

Akwụkwọ ọhụrụ a—Talmud—mezuru nzube ndị rabaị. Ha setịpụrụ ụkpụrụ maka nnyocha, n’ihi ya ọ kụziere ndị mmadụ iche echiche ka ndị rabaị. Ndị rabaị kwere na ụzọ ọmụmụ ihe na nnyocha ha na-egosi uche Chineke. Ọmụmụ Talmud n’onwe ya ghọrọ nzube bụ́ isi, ụdị nke ofufe—iji uche eme ihe dị ka e chere iji ṅomie Chineke. Ruo ọtụtụ ọgbọ n’ihu, a ga-eji otu ụzọ a nyochaa Talmud n’onwe ya. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Cecil Roth na-ede, sị: “Talmud . . . nyere [ndị Juu] akara njimara nke doro ha iche n’ebe ndị ọzọ nọ, nakwa ike nguzogide ha dị ịrịba ama na njikọ ọnụ. Ntụgharịta uche na ya mere ka uche ha dị nkọ, nyekwa ha . . . ịdị nkọ nke uche. . . . Talmud nyere onye Juu a na-akpagbu Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya ụwa ọzọ ọ pụrụ ịgbaba n’ime ya . . . O nyere ya ala nna, nke ọ pụrụ ibu na-agagharị mgbe ala nke aka ya funahụrụ ya.”

Site n’ịkụziri ndị ọzọ echiche ndị rabaị, Talmud akpawo ike n’ezie. Ma ajụjụ dịịrị mmadụ nile—ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu—bụ nke a, Talmud ọ̀ na-egosi uche Chineke n’ezie?—1 Ndị Kọrint 2:11-16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere mwepụta na ihe dị na Mishnah, lee isiokwu bụ́ “Mishnah na Iwu Chineke Nyere Mosis” n’Ụlọ Nche nke November 15, 1997.

b A ma Talmud nke Palestine ama dị ka Talmud nke Jerusalem. Otú ọ dị, nke a bụ aha na-ezighị ezi, ebe ụkwụ ndị Juu na-adịghị aba na Jerusalem n’ihe kanụ n’oge ndị Amoraim ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 31]

Talmud Abụọ Ahụ—Olee Otú Ha Dị n’Ihi Ha Tụnyere Ibe Ha?

Okwu Hibru bụ́ “Talmud” pụtara “ọmụmụ ihe” ma ọ bụ “mmụta.” Ndị Amoraim nke Palestine na Babilọn malitere ịmụ, ma ọ bụ inyocha, Mishnah. Talmud abụọ ahụ (nke Palestine na nke Babilọn) na-eme nke a, ma olee otú ha dị n’iji ha tụnyere ibe ha? Jacob Neusner na-ede, sị: “Talmud nke mbụ na-enyocha ihe àmà, nke abụọ na-enyocha ihe ndabere; nke mbụ na-anọgide nanị n’ihe ọ na-azọrọ, nke abụọ na-agabiga ha nke ukwuu.”

Ndezi ka baa ime na nke ka zuo ezuo e deziri Talmud nke Babilọn mere ya ọ bụghị nanị ka o buo ibu karị kamakwa ka o mie emie ma na-abami abami karị n’ụzọ echiche na nnyocha ya. Mgbe e kwuru “Talmud,” ọ na-abụkarị Talmud nke Babilọn ka e bu n’uche. Nke a bụ Talmud nke a mụworo, kwuokwa okwu banyere ya karịsịa na narị afọ ndị gafeworonụ. N’echiche Neusner, Talmud nke Palestine “bụ ọrụ onye maara ọrụ,” Talmud nke Babilọn kwa “bụ ọrụ onye ọkà.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya