Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/1 p. 14-19
  • “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe”!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Guzogide Omume Rụrụ Arụ
  • Kwanyere Ịbụisi Chineke Guzobere Ùgwù
  • “Debe Onwe Unu n’Ịhụnanya Chineke”
  • Anyị Ga-agbasi Mbọ Ike Ka Anyị Nọgide n’Eziokwu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Kpachara Anya Banyere Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Kpachara Anya Maka Ndị Ozizi Ụgha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Jọn na Jud
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/1 p. 14-19

“Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe”!

“Na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka nanị otu mgbe idebe.”—JUD 3.

1. N’echiche dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst taa na-ebu agha?

NDỊ soja na-alụ agha ebiwo ndụ siri ike mgbe nile. Cheedị banyere iyiri ihe agha zuru ezu na ịzọ njem gaa ọtụtụ kilomita n’okpuru ụdị ọnọdụ ihu igwe nile, na-anara ọzụzụ siri oké ike n’ụzọ e si eji ngwá agha eme ihe, ma ọ bụ ichebe onwe gị megide ụdị nile nke ime ihe ike ndị na-eyi ndụ egwu ma na-emerụ ahụ. Otú ọ dị, ezi ndị Kraịst adịghị ekere òkè n’agha nke mba nile. (Aịsaịa 2:2-4; Jọn 17:14) Ma, anyị agaghị echefu ma ọlị na anyị nile nọ n’agha n’otu echiche. Setan jupụtara n’ịkpọasị megide Jisọs Kraịst na ụmụazụ ya nọ n’elu ụwa. (Mkpughe 12:17) Ndị nile na-ekpebi ijere Jehova Chineke ozi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-edebanye aha ha dị ka ndị soja iji buo agha ime mmụọ.—2 Ndị Kọrint 10:4.

2. Olee otú Jud si na-akọwa agha ndị Kraịst, oleekwa otú akwụkwọ ozi ya pụrụ isi enyere anyị aka ịtachi obi na ya?

2 N’ụzọ dabara adaba, onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jud na-ede, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe m na-anụ ọkụ nile n’obi idegara unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ a zọpụtakọrọ anyị, ọ dị m mkpa idegara unu akwụkwọ na-arịọ unu ka unu na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka nanị otu mgbe idebe.” (Jud 3) Mgbe Jud gbara ndị Kraịst ume ‘ịgbasi mgba ike n’ihi okwukwe,’ o jiri okwu e jikọrọ ya na okwu pụtara “oké ihe mgbu” mee ihe. Ee, ọgụ a pụrụ ịta akpụ, ọbụna na-egbu mgbu! Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịtachi obi n’agha a? Akwụkwọ ozi Jud dị nkenke ma dị ike pụrụ inyere anyị aka. Ọ na-agba anyị ume iguzogide omume rụrụ arụ, ịkwanyere ịbụisi Chineke guzobere ùgwù, na ịnọgide na-edebe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke. Ka anyị hụ otú anyị ga-esi tinye ndụmọdụ a n’ọrụ.

Guzogide Omume Rụrụ Arụ

3. Olee ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke chere ọgbakọ ndị Kraịst n’oge Jud ihu?

3 Jud pụrụ ịhụ na ọ bụghị ndị Kraịst ibe ya nile na-emeri n’agha ahụ megide Setan. Ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa chere ìgwè atụrụ ahụ ihu. Ndị ikom rụrụ arụ ‘egbebawo,’ ka Jud na-ede. Ndị ikom ndị a na-eji aghụghọ na-akwalite omume rụrụ arụ. Ha jikwa akọ na-agọpụ ihe ndị ha mere, “na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.” (Jud 4) Ikekwe, dị ka ụfọdụ ndị Gnostic oge ochie, ha na-eche na ka mmadụ na-emewanye mmehie, otú ahụ ka ọ na-anatawanye ebere Chineke—n’ihi ya, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ ka mma imekwu mmehie! Ma ọ bụ ikekwe ha na-eche na Chineke obiọma agaghị enye ha ntaramahụhụ ma ọlị. Otú o sina dị, ha dara ya.—1 Ndị Kọrint 3:19.

4. Olee ihe atụ Akwụkwọ Nsọ atọ nke ikpe Jehova ndị gara aga Jud zoro aka na ha?

4 Jud gbaghara echiche ọjọọ ha site n’ihota ihe atụ atọ nke ikpe Jehova n’oge ndị gara aga: megide ndị Israel “na-ekweghị ekwe”; megide “ndị mmụọ ozi . . . hapụrụ ebe obibi nke aka ha” iji soro ndị inyom mee mmehie; nakwa megide ndị bi na Sọdọm na Gọmọra, bụ́ ndị “raara onwe ha nye n’ịkwa iko n’ụzọ dị otú ndị a mere, wee pụọ soro anụ ahụ dị iche.” (Jud 5-7; Jenesis 6:2-4; 19:4-25; Ọnụ Ọgụgụ 14:35) N’ọnọdụ nke ọ bụla, Jehova wetara ikpe ziri ezi megide ndị ahụ mehierenụ.

5. Site n’onye amụma ochie dị aṅaa ka Jud hotara ihe, oleekwa otú amụma ahụ si egosi ịbụ ihe e ji nnọọ mmezu ya n’aka?

5 E mesịa, Jud zoro aka n’ikpe nwere mmetụta ka nnọọ ukwuu. Ọ na-ehota otu amụma Ịnọk—akụkụ okwu na-adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ.a (Jud 14, 15) Ịnọk buru amụma oge mgbe Jehova ga-ekpe ndị nile na-adịghị asọpụrụ Chineke na omume asọpụrụghị Chineke ha ikpe. N’ụzọ na-akpali mmasị, Ịnọk kwuru okwu n’ụdị na-egosi ihe gara aga, n’ihi na ikpe Chineke bụ nnọọ ihe e ji n’aka dị ka a ga-asị na ha emeworị. Ọ pụrụ ịbụ na ndị mmadụ achịworị Ịnọk ọchị ma mesịa chịakwa Noa, ma ndị ọchị nile dị otú ahụ lara n’iyi n’Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ.

6. (a) Banyere gịnị ka ọ dị mkpa ka e chetara ndị Kraịst nọ n’oge Jud? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji buru ihe ncheta Jud n’obi?

6 N’ihi gịnị ka Jud ji dee banyere ikpe Chineke ndị a? N’ihi na ọ maara na ụfọdụ ndị sonyeere ọgbakọ ndị Kraịst n’ụbọchị ya na-eme mmehie ndị rere ure ma kwesị ịta ụta dị ka ndị ahụ kpasuru ikpe ndị ahụ gara aga. N’ihi ya, Jud na-ede na ọ dị mkpa ichetara ọgbakọ ndị ahụ ụfọdụ eziokwu ime mmụọ gbara ọkpụrụkpụ. (Jud 5) Ihe àmà na-egosi na ha echezọwo na Jehova Chineke hụrụ ihe ha na-eme. Ee, mgbe ndị ohu ya ma ụma mebie iwu ya, na-emetọ onwe ha na ndị ọzọ, ọ na-ahụ. (Ilu 15:3) Omume ndị dị otú ahụ na-ewute ya nke ukwuu. (Jenesis 6:6; Abụ Ọma 78:40) Ọ bụ echiche na-atụ egwu na anyị bụ́ nanị ụmụ mmadụ pụrụ imetụta Ọkaaka Onyenwe eluigwe na ala. Ọ na-ele anyị anya kwa ụbọchị, mgbe anyị mekwara ike anyị nile ịgbaso nzọụkwụ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, mgbe ahụ omume anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa. Ya mere, ya adịla mgbe anyị ga-ajụ ihe ncheta ndị dị otú ahụ dị ka Jud na-enye kama buru ha n’uche.—Ilu 27:11; 1 Pita 2:21.

7. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka ndị meworo mmehie dị oké njọ chọọ enyemaka ozugbo? (b) Olee otú anyị nile pụrụ isi zere omume rụrụ arụ?

7 Ọ bụghị nanị na Jehova na-ahụ kama ọ na-eme ihe. Ebe ọ bụ Chineke nke ikpe ziri ezi, ọ na-eweta ntaramahụhụ n’isi ndị na-eme ihe ọjọọ—n’oge ya. (1 Timoti 5:24) Ndị na-eche na ikpe ya bụ nanị akụkọ mgbe ochie nakwa na ihe ọjọọ ha na-eme agbasaghị ya na-aghọgbu nnọọ onwe ha. Lee ka o si dị oké mkpa ka onye ọ bụla taa bụ́ onye tinyere aka n’omume rụrụ arụ chọọ enyemaka ozugbo site n’aka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst! (Jemes 5:14, 15) Anyị nile pụrụ ịbụ ndị iyi egwu nke omume rụrụ arụ n’agha ime mmụọ anyị ga-etiba n’oké echiche. Kwa afọ a na-enwe ndị agha na-eri—ndị a na-achụpụ n’etiti anyị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha maka ime omume rụrụ arụ n’enweghị nchegharị. Anyị aghaghị ikpebisi ike iguzogide ọnwụnwa ọ bụla ndị na-amalitedị iduga anyị n’ụzọ dị otú ahụ.—Tụlee Matiu 26:41.

Kwanyere Ịbụisi Chineke Guzobere Ùgwù

8. Olee ndị bụ “ndị nọ n’ebube” a kpọtụrụ aha na Jud nke 8?

8 Nsogbu ọzọ nke Jud kwuru okwu banyere ya bụ enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi Chineke guzobere. Dị ka ihe atụ, n’amaokwu nke 8 ọ na-ebo otu ndị ajọ omume ahụ ebubo ‘ikwulu ndị nọ n’ebube.’ Ndị ole bụ ‘ndị a nọ n’ebube’? Ha bụ ndị ikom na-ezughị okè, ma mmụọ nsọ Jehova nyere ha ibu ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọgbakọ ndị ahụ nwere ndị okenye, bụ́ ndị e nyefere ọrụ ịzụ ìgwè atụrụ Chineke. (1 Pita 5:2) E nwekwara ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, dị ka Pọl onyeozi. Òtù ndị okenye nọ na Jerusalem rụkwara ọrụ dị ka òtù na-achị isi, na-eme mkpebi ndị na-emetụta ọgbakọ ndị Kraịst n’ozuzu ya. (Ọrụ 15:6) Jud nwere nchegbu dị ukwuu na ụfọdụ ndị n’ọgbakọ na-akparị ma ọ bụ na-ekwulu ndị ikom dị otú ahụ.

9. Olee ihe atụ ndị metụtara akwanyeghịrị ịbụisi ùgwù ndị Jud zoro aka na ha?

9 Iji katọọ ụdị okwu mkparị ahụ, n’amaokwu nke 11, Jud na-ehota ihe atụ atọ ọzọ dị ka ihe ncheta: Ken, Belam, na Kora. Ken leghaara ndụmọdụ ịhụnanya Jehova anya ma mara ụma chụsoo ụzọ nke ya nke ịkpọasị na-akpata igbu ọchụ. (Jenesis 4:4-8) Belam natara ịdọ aka ná ntị mgbe mgbe ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha sitere n’ebe karịrị ike mmadụ—ọbụna nne ịnyịnya ibu ya gwara ya okwu! Ma Belam ji ịchọ ọdịmma onwe onye nanị gaa n’ihu na-akpa nkata megide ndị Chineke. (Ọnụ Ọgụgụ 22:28, 32-34; Deuterọnọmi 23:5) Kora nwere ọnọdụ ibu ọrụ nke ya, ma o jughị ya afọ. Ọ kpasuru nnupụisi megide nwoke ahụ kasị dị umeala n’obi n’elu ala, bụ́ Mosis.—Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 16:1-3, 32.

10. Olee otú ụfọdụ ndị taa pụrụ isi daba n’ọnyà nke ‘ikwulu ndị nọ n’ebube,’ n’ihi gịnịkwa ka a ga-eji zere ụdị okwu ahụ?

10 Lee ka ihe atụ ndị a si na-ezi anyị n’ụzọ doro anya ige ntị ná ndụmọdụ na ịkwanyere ndị Jehova ji na-eme ihe n’ọnọdụ ibu ọrụ ùgwù! (Ndị Hibru 13:17) Ọ dị nnọọ mfe ịchọpụta mmejọ n’ebe ndị okenye a họpụtara ahọpụta nọ, n’ihi na ha ezughị okè, dị ka anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. Ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya ná mmejọ ha ma ghara ịkwanyere ha ùgwù, ọ̀ pụrụ ịbụ na anyị ‘na-ekwulu ndị nọ n’ebube’? N’amaokwu nke 10, Jud na-ekwu banyere ndị “na-ekwulu ihe nile, ka ha hà, bụ́ ihe ha na-amataghị.” Mgbe ụfọdụ, ndị ụfọdụ ga-akatọ mkpebi òtù ndị okenye ma ọ bụ kọmitii ikpe mere. Ma, ha amaghị ihe nile ndị okenye tụlere iji ruo n’otu mkpebi. Ya mere n’ihi gịnị ka ha ga-eji na-ekwu okwu nkwulu banyere ihe ha na-amaghị n’ezie? (Ilu 18:13) Ndị nọgidere n’okwu dị otú ahụ na-adịghị mma pụrụ ịkpata nkewa n’ọgbakọ na ikekwe ọbụna bụrụ ndị a ga-eji atụnyere “nkume zoro ezo” ndị dị ize ndụ ná nnọkọ nke ndị kwere ekwe ibe ha. (Jud 12, 16, 19) Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ ịbụrụ ndị ọzọ ihe ize ndụ ime mmụọ. Kama nke ahụ, ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebie inwe ekele maka ndị ikom nwere ibu ọrụ maka nrụsi ọrụ ike ha na nrara ha raara onwe ha nye ìgwè atụrụ Chineke.—1 Timoti 5:17.

11. N’ihi gịnị ka Maịkael ji zere ikpe Setan ikpe nkwulu?

11 Jud na-ehota otu ihe atụ nke onye kwanyeere ịbụisi e guzobere nke ọma ùgwù. Ọ na-ede, sị: “Maịkael onyeisi mmụọ ozi, mgbe ya na ekwensu na-arụrịta ụka banyere ahụ Mosis, ka ọ na-ekwugide ya, o nweghị anyaike ikpe ya ikpe nkwulu, kama ọ sịrị, Ka Onyenwe anyị baara gị mba.” (Jud 9) Akụkọ a na-adọrọ mmasị, nke nanị Jud kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ, na-akụzi ihe mmụta abụọ. N’otu akụkụ, ọ na-akụziri anyị ịhapụrụ Jehova ikpe. Ihe àmà na-egosi na Setan chọrọ iji ahụ nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Mosis mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji kwalite ofufe ụgha. Lee ihe obi ọjọọ ọ bụ! Ma, Maịkael ji obi umeala zere ikpe ikpe, n’ihi na nanị Jehova nwere ikike ime otú ahụ. Mgbe ahụ, lee ka o si dị anyị mkpa nke ukwuu karị izere ikpe ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi ikpe bụ́ ndị na-agbalị ijere Jehova ozi.

12. Gịnị ka ndị nọ n’ọnọdụ ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Maịkael?

12 N’akụkụ nke ọzọ, ndị nwere ikike ụfọdụ n’ọgbakọ pụkwara ịmụta ihe site n’aka Maịkael. E kwuwerị, ọ bụ ezie na Maịkael bụ “onyeisi mmụọ ozi,” o jighị ọkwá ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọbụna mgbe a kpasuru ya iwe. Ndị okenye kwesịrị ntụkwasị obi na-agbaso ihe nlereanya ahụ n’ụzọ chiri anya, na-aghọta na iji ikike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi adịghị akwanyere ọkaaka Jehova ùgwù. Akwụkwọ ozi Jud nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ndị ikom nwere ọnọdụ a na-akwanyere ùgwù n’ime ọgbakọ ma jiri ike ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, n’amaokwu 12 ruo 14, Jud dere nkatọ kpụ ọkụ n’ọnụ banyere “ndị na-azụ onwe ha dị ka atụrụ.” (Tụlee Ezikiel 34:7-10.) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmasị mbụ ha bụ iritere onwe ha uru, ọ bụghị ìgwè atụrụ Jehova. Ndị okenye taa pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya ọjọọ dị otú ahụ. N’ezie, okwu Jud n’ebe a na-akọwa nke ọma ihe anyị na-ekwesịghị ịbụ. Mgbe anyị malitere ịchọ ọdịmma onwe anyị nanị, anyị apụghị ịbụ ndị soja Kraịst; anyị ji ọrụ n’aka nke ukwuu na-alụ ọgụ maka onwe anyị. Kama nke ahụ, ka anyị nile bie ndụ kwekọrọ n’okwu Jisọs: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

“Debe Onwe Unu n’Ịhụnanya Chineke”

13. N’ihi gịnị ka anyị nile kwesịrị iji chọsie ike ịnọgide n’ịhụnanya Chineke?

13 Ka ọ na-eru ná njedebe nke akwụkwọ ozi ya, Jud na-enye ndụmọdụ a na-enye obi ụtọ: “Debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke.” (Jud 21) Ọ dịghị ihe ga-enyere anyị aka n’agha ndị Kraịst karịa otu ihe a, ịnọgide na-abụ ndị Jehova Chineke hụrụ n’anya. E kwuwerị, ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke Jehova. (1 Jọn 4:8) Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “E mewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụisi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:38, 39) Ma, olee otú anyị ga-esi anọgide n’ịhụnanya ahụ? Rịba ama atọ n’ime ihe ndị anyị pụrụ ime, dị ka Jud kwuru.

14, 15. (a) Gịnị ka iwuli onwe anyị elu n’elu “okwukwe anyị dịkarịsịrị nsọ” pụtara? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa ọnọdụ ihe agha ime mmụọ anyị?

14 Nke mbụ, Jud na-agwa anyị ka anyị nọgide na-ewulite onwe anyị elu dị ka ụlọ n’elu ‘okwukwe anyị dịkarịsịrị nsọ.’ (Jud 20) Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, nke a bụ usoro na-aga n’ihu n’ihu. Anyị dị ka ụlọ nke chọkwuru nkwagidesi ike megide mwakwasị dị njọ nke ọdịdị ihu igwe. (Tụlee Matiu 7:24, 25.) Ya mere ka anyị ghara inwebiga obi ike ókè ma ọlị. Kama nke ahụ, ka anyị hụ ebe anyị pụrụ iwulite onwe anyị elu ná ntọala nke okwukwe anyị, na-aghọ ndị soja Kraịst siwanyere ike, na-ekwesị ntụkwasị obi karị. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịtụle akụkụ nile nke uwe ihe agha ime mmụọ nke a kọwara ná Ndị Efesọs 6:11-18.

15 Gịnị bụ ọnọdụ nke ihe agha ime mmụọ nke anyị onwe anyị? ‘Ọta anyị nke bụ́ Okwukwe’ ò siri ike otú ọ dị mkpa ka o sie? Ka anyị na-elela anya azụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ànyị na-ahụ ụfọdụ ihe àmà nke ịda mbà, dị ka nselata aka n’ịga nzukọ, enwekwaghị ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ, ma ọ bụ ndalata nke mmasị maka ọmụmụ ihe onwe onye? Mgbaàmà ndị dị otú ahụ dị ize ndụ! Ọ dị anyị mkpa ime ihe ugbu a iji wulite ma wusie onwe anyị ike n’eziokwu ahụ.—1 Timoti 4:15; 2 Timoti 4:2; Ndị Hibru 10:24, 25.

16. Gịnị ka ikpe ekpere n’ime mmụọ nsọ pụtara, gịnịkwa bụ otu ihe anyị kwesịrị ịdị na-arịọ Jehova mgbe nile?

16 Ụzọ nke abụọ a ga-eji anọgide n’ịhụnanya Chineke bụ ịnọgide ‘na-ekpe ekpere n’ime Mmụọ Nsọ.’ (Jud 20) Nke ahụ pụtara ikpe ekpere n’okpuru mmetụta nke mmụọ nsọ Jehova nakwa n’ikwekọ n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Ekpere bụ ụzọ dị oké mkpa anyị ji abịaru Jehova nso n’onwe anyị ma na-ekwupụta nrara anyị nye ya. Ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị ileghara ihe ùgwù a magburu onwe ya anya! Mgbe anyị na-ekpekwa ekpere, anyị pụrụ ịrịọ—n’ezie, nọgide na-arịọ—maka mmụọ nsọ. (Luk 11:13) Ọ bụ mmetụta kasị ike anyị pụrụ inweta. Site n’enyemaka dị otú ahụ, anyị pụrụ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke mgbe nile ma na-atachi obi dị ka ndị soja Kraịst.

17. (a) N’ihi gịnị ka ihe nlereanya Jud n’ihe banyere ebere ji dị nnọọ ịrịba ama? (b) Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi nọgide na-eme ebere?

17 Nke atọ, Jud na-agba anyị ume ịnọgide na-eme ebere. (Jud 22) Ihe nlereanya ya n’akụkụ a dị ịrịba ama. E kwuwerị, o ziri ezi ịbụ onye àgwà na-ezighị ezi, omume rụrụ arụ, na ndapụ n’ezi ofufe na-egbebata n’ọgbakọ ndị Kraịst nyere nsogbu n’obi. Ka o sina dị, o kweghị ka ụjọ jide ya, na-eche na oge ahụ dịtụ oké ize ndụ nke na a pụghị igosi ụdị àgwà “dị nro” dị ka ebere. Ee e, ọ gbara ụmụnna ya ume ịnọgide na-eme ebere mgbe ọ bụla o kwere omume, jiri obiọma soro ndị na-enwe obi abụọ na-atụgharị uche na ọbụna “na-agụpụta” ndị na-akparu mmehie dị oké njọ nso “n’ọkụ.” (Jud 23; Ndị Galetia 6:1) Lee ezi agbamume nke ahụ bụ maka ndị okenye n’oge ndị a jupụtara ná nsogbu! Ha onwe ha kwa na-agbalị ime ebere ebe ọ bụla e nwere ihe ndabere maka ya, ka ha na-akwụsikwa ike mgbe ọ dị mkpa. Anyị nile n’otu aka ahụ kwesịrị imere ibe anyị ebere. Dị ka ihe atụ, kama ibu iwe n’obi n’ihi ụmụ irighiri ihe, anyị pụrụ ịdị na-agbaghara n’ụzọ dị ukwuu.—Ndị Kọlọsi 3:13.

18. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị ga-emeri n’agha ime mmụọ anyị?

18 Agha anyị na-ebu abụghị nke dị mfe. Dị ka Jud na-ekwu, ọ bụ ‘mgba siri ike.’ (Jud 3) Ndị iro anyị dịcha ike. Ọ bụghị nanị Setan kama ajọ ụwa ya na ezughị okè nke onwe anyị na-ebucha agha megide anyị. Ma, anyị pụrụ nnọọ inwe obi ike na anyị ga-emeri! N’ihi gịnị? N’ihi na anyị nọ n’akụkụ Jehova. Jud mechiri akwụkwọ ozi ya site n’ichetara anyị na n’ụzọ ziri ezi e nyere Jehova “otuto na ịdị ukwuu na ike na ịchịisi, mgbe oge a nile aka-erughị, ugbu a kwa, wee ruokwa mgbe nile ebighị ebi.” (Jud 25) Nke ahụ ọ̀ bụghị echiche na-akpata egwu? Mgbe ahụ, à pụrụ inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na otu Chineke a “pụrụ iche unu nche ka unu ghara ịsụ ngọngọ”? (Jud 24) Ọ dịghị ma ọlị! Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike ịnọgide na-eguzogide omume rụrụ arụ, na-akwanyere ịbụisi Chineke guzobeworo ùgwù, na-edebekwa onwe anyị n’ịhụnanya Chineke. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-enwetakọ mmeri dị ebube.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwu na Jud na-ehota ihe sitere na Book of Enoch nke apọkrịfa. Otú ọ dị, R. C. H. Lenski na-ekwu, sị: “Anyị na-ajụ, sị: ‘Olee ebe e si nweta ihe a e dere n’akwụkwọ a, bụ́ Book of Enoch?’ Akwụkwọ a bụ ihe ntụkwasị e ji ntakịrị ntakịrị dee, ọ dịghịkwa onye ji n’aka ụbọchị e dere akụkụ ya dị iche iche . . . ; ọ dịghị onye pụrụ ijide n’aka na, ikekwe, ụfọdụ okwu ya abụghị nke e sitere na Jud n’onwe ya wepụta.”

Ajụjụ Maka Ntụleghachi:

◻ Olee otú akwụkwọ ozi Jud si akụziri anyị iguzogide omume rụrụ arụ?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịkwanyere ịbụisi Chineke guzobere ùgwù?

◻ Gịnị dị oké njọ banyere iji ikike ọgbakọ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi na-arụ ọrụ iji nọgide n’ịhụnanya Chineke?

[Foto dị na peeji nke 15]

N’adịghị ka ndị soja Rom, ndị Kraịst na-ebu agha ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-eje ozi, ọ bụghị site n’ịchọ ọdịmma onwe ha nanị, kama site n’ịhụnanya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya