Ememe Obi Ụtọ—Ngụsị Akwụkwọ Klas 104 nke Gilead
“TAA bụ ụbọchị obi ụtọ, anyị nile na-aṅụrịkwa ọṅụ.” Carey Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ji okwu ndị ahụ meghee ememe ngụsị akwụkwọ klas nke 104 nke Watchtower Bible School of Gilead na March 14, 1998. A gwara mmadụ 4,945 na-ege ntị ka ha malite ihe omume ahụ site n’ịbụ abụ Alaeze nke 208, nke isiokwu ya bụ “Abụ nke Aṅụrị.”
Ndụmọdụ Dị Irè Iji Nọgide Na-enwe Obi Ụtọ
Akụkụ mmeghe nke usoro ihe omume ahụ, bụ́ usoro isiokwu nke okwu ise dị mkpirikpi ndị dabeere na Bible, nyere ụfọdụ ndụmọdụ dị irè banyere ụzọ a ga-esi nọgide na-enwe mmụọ ọṅụ ahụ nke jupụtara ụbọchị ngụsị akwụkwọ ahụ.
Onye kwuru okwu mbụ bụ Joseph Eames nke Ngalaba Ide Ihe. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ṅomie Mmụọ nke Ndị Na-eguzosi Ike n’Ihe” nke dabeere n’ihe ndekọ Bible dị na 2 Samuel isi nke 15 na 17, ebe Absalọm, bụ́ nwa Devid, kpara nkata iweghara alaeze nke Chineke nyere nna ya site n’ịkpasu nnupụisi. Otú ọ dị, e nwere ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye onye Jehova tere mmanụ, bụ́ Eze Devid. Olee ihe ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ pụrụ ịmụta na nke a? “Ebe ọ bụla unu gara n’ọrụ ozi ala ọzọ unu, jirinụ iguzosi ike n’ihe kwalite mmụọ nke imekọ ihe ọnụ na nsọpụru nye ịbụisi ọchịchị Chineke. Nyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ,” ka Nwanna Eames kwubiri.
Onye sochiri n’usoro ihe omume ahụ bụ David Sinclair, bụ́ onye kwupụtara ihe iri a chọrọ maka ịbụ ọbịa ‘n’ụlọikwuu Jehova,’ ndị a kpọtụrụ uche n’Abụ Ọma nke 15. Okwu ya, nke isiokwu ya bụ “Nọgidenụ Dị Ka Ndị Ọbịa n’Ụlọikwuu nke Ozi Ala Ọzọ Unu,” gbara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume itinye abụ ọma nke a n’ọrụ n’ozi ala ọzọ ha, bụ́ ebe ha ga-abụ ndị ọbịa. Nwanna Sinclair mesiri ike mkpa ọ dị ibi ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị n’oge ọ bụla. Gịnị ka ọ ga-arụpụta n’ikpeazụ? Abụ Ọma 15:5 na-ekwu, sị: “Onye na-eme ihe ndị a, a gaghị ewezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
John Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi, sochiri ma dọrọ uche gaa na mmetụta na-enye ume ọhụrụ nke ịbụ abụ ná nzukọ ndị Kraịst na-enwe. Ma gịnị bụ abụ kasị enye ọṅụ nke a na-abụ gburugburu ụwa taa? Ọ bụ ozi ọma nke Alaeze Mesaịa nke Chineke. Gịnị bụ ihe si n’ịbụ abụ, ma ọ bụ nkwusa nile a banyere Alaeze ahụ apụta? Ahịrị nke abụọ nke abụ 208 chịkọtara ya n’ụzọ dị otú a: “N’ikwusa Alaeze na ozizi ndị Kraịst, a na-adọrọ ọtụtụ nye Jehova. Ndị a na-enyekwa olu abụ nke ọṅụ, na-abụsi ha ike ruo ebe dị anya!” Ee, kwa ụbọchị a na-eme ihe dị ka 1,000 ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism. Nwanna Barr mechiri okwu ya, sị: “Ọ́ bụghị ihe dị ịtụnanya iche, ụmụnna m, na a na-eziga unu n’ókèala dị iche iche izute ụdị ndị ga-anọ nnọọ na-echere ịnụ abụ otuto unu?”
“Geenụ Ntị n’Olu Ahụmahụ” bụ isiokwu nke okwu James Mantz nke Ngalaba Ide Ihe kwuru. Ọ kọwapụtara na a pụrụ ịmụta ihe ụfọdụ nanị site n’ahụmahụ onwe onye. (Ndị Hibru 5:8) Otú o sina dị, Ilu 22:17 na-agba anyị ume ‘ịtọ ntị anyị n’ala, nụrụ okwu nile nke ndị maara ihe,’ ma ọ bụ ndị nweworo ahụmahụ. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site n’aka ndị bu ha ụzọ gaa. “Ha maara otú e si esoro ndị obodo ahụ nwere ụlọ ahịa ekwe ọnụ ahịa. Ha maara akụkụ obodo ahụ a ga-ezere n’ihi ihe ize ndụ anụ ahụ ma ọ bụ nke omume. Ha maara otú ihe si emetụta ndị obodo ahụ n’ahụ ngwa ngwa. Ndị ozi ala ọzọ ahụ nọworo ogologo oge maara ihe dị gị mkpa iji nwee obi ụtọ na ihe ịga nke ọma n’ọrụ e kenyere gị,” ka Nwanna Mantz kwuru.
Ka ọ na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Nweenụ Ekele Maka Ọrụ Ọchịchị Chineke Unu,” Wallace Liverance, bụ́ onye na-edebanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, kọwara na ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ, dị ka Pọl onyeozi, Timoti, na Banabas, nwetara ọrụ ha n’aka Chineke site na mmụọ nsọ ma ọ bụ ngosipụta ụfọdụ nke ọrụ ebube, ọ bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ekenye ndị ozi ala ọzọ e nyere ọzụzụ na Gilead ọrụ n’otu ebe n’ubi nke ụwa. (Matiu 24:45-47) O ji ọrụ e kenyere ndị ozi ala ọzọ ahụ tụnyere ebe Gideon kenyere ndị ikom ya bụ́ ndị ga-alụso ndị Midian agha. (Ndị Ikpe 7:16-21) “Nweenụ ekele maka ọrụ ije ozi ala ọzọ nke ọchịchị Chineke e kenyere unu. Dị nnọọ ka ndị agha Gideon ‘guzo, nwoke ọ bụla n’ọnọdụ ya,’ leenụ ọrụ e kenyere unu anya dị ka ebe unu ga-anọ. Nweenụ okwukwe na Jehova pụrụ iji unu mee ihe dị nnọọ ka o ji narị mmadụ atọ nke Gideon mee ihe,” ka Nwanna Liverance gbara ume ya.
Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ Na-eweta Obi Ụtọ
Ụlọ Nche kwuru n’otu mgbe, sị: “Kama iwulite nmasi-ayi na ndu-ayi nebe ihe nile ahu di nke emeputara nime ndokwa nke oge a, bú ihe di iche iche ndi anejigh n’aka na ha gadigide, le ka o si di mma karia burukwa ihe negosikari amam-ihe, bú ime ka ndi madu buru ebe anyi nenwe nmasi n’ezie na imuta inwe ezi ọṅu n’imere ndi ọzọ ihe di iche iche.” N’ikwekọ na nke ahụ, Nwanna Mark Noumair, otu n’ime ndị nkụzi Ụlọ Akwụkwọ Gilead, sooro otu ìgwè nke ụmụ akwụkwọ kparịta banyere ahụmahụ ozi ubi ha ma kwuo, sị: “Igosi mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ bụ ihe ga-eme ka unu bụrụ ezigbo ndị ozi ala ọzọ.”
Ihe Ndị Bụ́ Isi Na-eweta Obi Ụtọ n’Ubi Ala Ọzọ
Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi na-eweta ihe ịga nke ọma na obi ụtọ n’ọrụ ozi ala ọzọ? Nwanna Charles Woody nke Ngalaba Ije Ozi na Harold Jackson, onye bụbu onye ozi ala ọzọ na Latin America, bụrụkwa onye inye aka na Kọmitii Izi Ihe, gbara ndị òtù Kọmitii Alaka dị iche iche ajụjụ ọnụ bụ́ ndị na-aga klas nke itoolu nke ụlọ akwụkwọ maka ndị ọrụ alaka. Ndị a bụ ihe atụ nke ndụmọdụ ndị a nyere:
Albert Musonda si Zambia kwuru, sị: “Mgbe onye ozi ala ọzọ na-ebute ụzọ ịga kelee ụmụnna, ọ ga-eme ka e nwee mmụọ dị nnọọ mma n’ihi na ụmụnna ahụ ga-abịaru onye ozi ala ọzọ ahụ nso, onye ozi ala ọzọ ahụ ga-abịarukwa ha nso.”
Rolando Morales nke Guatemala tụrụ aro na mgbe ndị nwere omume enyi nyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ihe ọṅụṅụ, ha pụrụ ịzaghachi n’ụzọ obiọma na n’ụzọ akọ, sị: “Abịara m ọhụrụ na mba a. Ọ gaara amasị m ma a sị na m pụrụ ịṅụ ya, ma ahụ m enweghị ihe na-alụso ọrịa ọgụ nke ahụ gị nwere. Enwere m olileanya na otu ụbọchị m pụrụ ịnara ya, obi ga-adịkwa m ụtọ ime otú ahụ.” Gịnị bụgasị abamuru nke ụdị nzaghachi ahụ? “Ndị mmadụ agaghị abụ ndị e mejọrọ, ndị ozi ala ọzọ ahụ ga-abụkwa ndị mesoro ndị ọzọ ihe n’obiọma.”
Gịnị pụrụ inyere ndị ozi ala ọzọ aka ịnọgide n’ebe e kenyere ha ọrụ? Nwanna Paul Crudass, onye gụsịrị akwụkwọ na klas 79 nke Gilead, bụ́ onye nọworo na-eje ozi na Liberia kemgbe afọ 12 gara aga, kwuru ihe a: “Amaara m na ọ bụ eziokwu na agụụ ụmụ ha na-agụ ndị nne na nna. Ma e nwere mgbe onye ozi ala ọzọ ga-agbalị ime ka mba, gburugburu ebe obibi, ọdịbendị, na ndị ala ahụ mara ya ahụ. Ọ pụrụ ịdị ya ka ọ bụ ya hapụ. Ọ bụrụ na o nweta akwụkwọ ozi sitere n’ụlọ nke na-asị, ‘Agụụ gị na-agụ anyị nke ukwuu; anyị amaghị ihe anyị ga-eme ma ị nọghị ya,’ nke ahụ pụrụ ịbụ nanị ihe ọ chọrọ iji kwakọrọ ngwongwo ya laa. Ọ dị oké mkpa ka ndị ikwu nọ n’ebe a taa cheta nke ahụ.”
Mgbe e nwesịrị ịgba ajụjụ ọnụ ndị ahụ, Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu ikpeazụ nke usoro ihe omume ahụ. Isiokwu ya bụ: “Debenụ Alaeze ahụ n’Ọnọdụ Mbụ ná Ndụ Unu.” Olee otú ndị ozi ala ọzọ pụrụ isi na-ele anya otu ebe wee ghara ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha n’ọrụ ha? Ọ gbara ha ume inwe ndokwa maka ọmụmụ Bible onwe onye, nke ga-enyere ha aka idebe ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ ná ndụ. E nwekwara ihe ncheta a bịara n’ezi oge: “Ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ elegharawo ọmụmụ ihe onwe onye anya n’ihi na ha emikpuwo onwe ha na ngwá electronic, E-mail, na kọmputa. Anyị kwesịrị inwe ezi echiche inwe ezi nguzozi n’iji ngwá ọrụ ọ bụla eme ihe, gharakwa itinye oge gabigara ókè n’ihe pụrụ igbochi ọmụmụ ihe onwe onye anyị nke Okwu Chineke.”
Ihe sochiri okwu Nwanna Jaracz bụ inye diplọma na ịgụ akwụkwọ ozi ekele sitere na klas ahụ. Onye nnọchiteanya klas ahụ kwupụtara mmetụta nke onye ọ bụla otú a: “Anyị hụrụ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ nke ịhụnanya Jisọs sịrị na a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya, nke a emesiwokwa anyị obi ike na n’agbanyeghị ebe anyị nọ, e nwere nzukọ na-ekpo ọkụ, na-ahụ n’anya, nke yikwara nne, bụ́ nke na-akwado anyị. N’inwe nkwado dị otú ahụ, anyị dị njikere ịga n’ebe nile ụwa sọtụrụ.” Ọ bụ mmechi na-akpali akpali maka ụbọchị ngụsị akwụkwọ obi ụtọ nye klas 104 nke Gilead.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Ihe Banyere Klas ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 16
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Ọnụ ọgụgụ di na nwunye: 24
Nkezi afọ ndụ: 33
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12
[Foto dị na peeji nke 25]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klas 104 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu ga n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla
(1) Romero, M.; Howarth, J.; Blackburne-Kane, D.; Hohengasser, E.; West, S.; Thom, S. (2) Colon, W.; Glancy, J.; Kono, Y.; Drews, P.; Tam, S.; Kono, T. (3) Tam, D.; Zechmeister, S.; Gerdel, S.; Elwell, J.; Dunec, P.; Tibaudo, H. (4) Taylor, E.; Hildred, L.; Sanches, M.; Anderson, C.; Bucknor, T.; Hohengasser, E. (5) Howarth, D.; Ward, C.; Hinch, P.; McDonald, Y.; Sanches, T.; Thom, O. (6) Drews, T.; Tibaudo, E.; Elwell, D.; Dunec, W.; Blackburne-Kane, D.; Ward, W. (7) Anderson, M.; Zechmeister, R.; McDonald, R.; Bucknor, R.; Glancy, S.; Gerdel, G. (8) Romero, D.; Hinch, R.; Hildred, S.; Taylor, J.; Colon, A.; West, W.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụmụnna ndị soro kụziere klas nke 104 ahụ ihe: (site n’aka ekpe) W. Liverance, U. Glass, K. Adams, M. Noumair