Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ozi Jizọs Jere na Peria
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime Ka A Zọpụta Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị̀ Natawo “Mmụọ Nke Eziokwu Ahụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jisọs gbara ume, sị: “Jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na ọtụtụ mmadụ, ka M sị unu, ga-achọ ịba n’ime ya, ma ha agaghị enwe ike.” (Luk 13:24) Gịnị ka o bu n’uche, oleekwa ụzọ o si baa uru taa?

Anyị pụrụ ịghọta akụkụ okwu a na-adọrọ mmasị n’ụzọ kasị mma site n’ịtụle ọnọdụ gbara ya gburugburu. Ihe dị ka ọnwa isii tupu ọnwụ ya, Jisọs nọ na Jerusalem n’oge ememe mgbaafọ nke ịraraghachi ụlọ nsọ ahụ nye. O kwuru banyere ịbụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ Chineke ma gosipụta na ndị Juu n’ozuzu ha esoghị n’atụrụ ndị dị otu ahụ n’ihi na ha jụrụ ịṅa ntị. Mgbe ọ sịrị na ya na Nna ya bụ “otu,” ndị Juu tụtụụrụ nkume ịtụ ya. Ọ gbapụrụ jee Perea n’ofe Jọdan.—Jọn 10:1-40.

N’ebe ahụ otu nwoke jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, Ndị a na-azọpụta [hà] dị mmadụ ole na ole?” (Luk 13:23) Nke ahụ bụ ajụjụ kwesịrị ekwesị ya ịjụ, ebe ọ bụ na ndị Juu nke oge ahụ kwere na nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ruru eru inweta nzọpụta. N’ile àgwà ha na-akpa anya, o sighị ike ịmata ndị ha chere mejupụtara ole na ole ahụ. Lee otú ha si hie ụzọ, dị ka ihe ndị mesịrị mee ga-egosi!

Ruo ihe dị ka afọ abụọ, Jisọs anọwo n’etiti ha, na-akụzi ihe, na-arụ ọrụ ebube, na-esetịpụkwa ohere nke ha ịghọ ndị nketa nke Alaeze eluigwe. Gịnị si na ya pụta? Ha, na ndị ndú ha karịsịa, ji ịbụ ụmụ Abraham na ịbụ ndị e tinyere Iwu Chineke n’aka eme ọnụ. (Matiu 23:2; Jọn 8:31-44) Ma ha amataghị ma zaghachi n’olu Ezi Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ. E nwewo ihe yiri ụzọ ghere oghe n’ihu ha, na-enwe ịghọ ndị òtù nke Alaeze ahụ dị ka ụgwọ ọrụ bụ́ isi maka isi na ya banye, ma ha jụrụ. Ọ bụ nanị ole na ole, karịsịa site na ndị ọnọdụ ha dị ala, nụrụ ozi eziokwu nke Jisọs, zaghachi, ma raparakwa n’ahụ ya.—Luk 22:28-30; Jọn 7:47-49.

N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ọ bụ ndị ikpeazụ a bụ ndị nọ n’ọnọdụ ịbụ ndị e ji mmụọ tee mmanụ. (Ọrụ 2:1-38) Ha esoghị na ndị na-arụ ọrụ ajọ omume nke Jisọs kpọtụrụ uche bụ́ ndị ga-akwa ákwá ma taa ikekere ezé n’ihi ejighị ohere e nyere ha mee ihe.—Luk 13:27, 28.

N’ihi ya, na narị afọ mbụ “ọtụtụ mmadụ” ahụ bụ ndị Juu n’ozuzu ha, karịsịakwa ndị ndú okpukpe. Ndị a zọọrọ na ha chọrọ ihu ọma Chineke—ma ọ bụ nanị dị ka ụkpụrụ na ụzọ ha si dị, ọ bụghị nke Chineke. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, “ole na ole” ahụ bụ́ ndị ji ezi mmasị zaghachi n’ịbụ akụkụ nke Alaeze ahụ ghọrọ ndị òtù e tere mmanụ nke ọgbakọ ndị Kraịst.

Ugbu a tụlee nkọwa ka saa mbara nke na-ewere ọnọdụ n’oge anyị. A kụziworo ọtụtụ ndị na-aga chọọchị Krisendọm na ha ga-aga eluigwe. Otú o dị, atụmanya a, adabereghị n’ezi nkụzi nke Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ọ dị ndị Juu na mbụ, ndị a chọrọ ihu ọma nke Chineke nanị site n’ụzọ dị ha onwe ha mma.

Otú ọ dị, e nwewo nnọọ ole na ole n’oge anyị bụ́ ndị jiri obi umeala zaghachi n’ozi Alaeze ahụ, rara onwe ha nye Jehova, ma banye n’ọnọdụ ịnata ihu ọma ya. Nke a edujewo na ha ịghọ “ụmụ alaeze,” (Matiu 13:38) A malitere ịkpọ “ụmụ” e tere mmanụ dị otú ahụ na Pentikọst nke 33 O.A. Ndịàmà Jehova ekwerewo eri ogologo oge na ihe àmà nke ụzọ Chineke si emeso ndị ya na-enye echiche na n’ụzọ bụ́ isi a kpọwo òtù ndị ahụ ga-eje eluigwe. N’ihi ya, ndị mụworo Bible n’afọ ndị na-adịchabeghị anya aghọtawo na a na-esetịpụ ugbu a olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs. Ọnụ ọgụgụ ndị a akarịwo nke ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ na-adalata adalata, bụ́ ndị nwere atụmanya ịga eluigwe n’ezie. N’ụzọ bụ isi Luk 13:24 emetụtaghị ndị ahụ na-atụghị anya ịga eluigwe, ma n’ezie o nwere okwu ndụmọdụ amamihe dị na ya maka ha.

Site n’ịgba anyị ume ijisi ike, Jisọs anaghị ekwu na ya ma ọ bụ Nna ya na-etinye ihe mgbochi n’ụzọ anyị iji gbochie anyị. Kama anyị na-aghọta site na Luk 13:24 na ihe ndị Chineke chọrọ dị n’ụdị nke na ha ga-agụpụ ndị na-erughị eru. “Jisienụ ike” na-enye echiche ịgbalịsi ike, ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ. Otú a anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ana m adọgbu onwe m n’ọrụ?’ A pụrụ ikwughachi isi ihe dị na Luk 13:24 ịbụ, ‘Ọ dị m mkpa ijisi ike isi n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara baa n’ihi na ọtụtụ ga-achọ ịba n’ime ya ma ha agaghị enwe ike. Ya mere àna m ejisi ike n’ezie? Àdị m ka onye na-eme egwuregwu n’ámá egwuregwu oge ochie bụ́ onye na-etinye ihe nile o nwere iji rite ihe mgbata n’ọsọ? Ọ dịghị onye na-eme egwuregwu dị otú ahụ ga-enwe obi e kewara ekewa, na-eme nwayọọ nwayọọ. Àdị m otu ahụ?’

Okwu Jisọs na-enye echiche na ụfọdụ pụrụ ịchọ ‘isi n’ọnụ ụzọ ahụ baa’ nanị ma ọ dịrị ha mfe, n’ụzọ dị nwayọọ nke ha họọrọ. Àgwà dị otu ahụ pụrụ imetụta Ndịàmà n’otu n’otu. Ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘Amaara m ezi ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ́ ndị dọgburu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ afọ, na-achụ ọtụtụ ihe n’àjà; ma, ka ọ na-erule oge ọnwụ ha, ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a abịabeghị. Ya mere ikekwe ọ ga-akara m mma iji nwayọọ, bikwuo ndụ ntụsara ahụ.’ Ọ dị mfe iche echiche otú ahụ, ma amamihe ọ̀ dị na ya n’ezie?

Dị ka ihe atụ, ndị ozi hà chere otú ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Ha nyere ihe nile ha nwere maka ezi ofufe—kpọmkwem ruo n’ọnwụ ha. Pọl, dị ka ihe atụ, pụrụ ikwu, sị: “[Kraịst ka] anyị na-ekwusa . . . ana m adọgbukwa onwe m n’ọrụ ime ihe a, na-agbasi mgba ike dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Ya si dị, nke na-arụsi ike n’ime m n’ike.” O mesịrị dee, sị: “Ọ bụ iru nke a ka anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike, n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ, Onye bụ́ Onye nzọpụta mmadụ nile, ma nke kachasịnụ Onye nzọpụta nke ndị kwere ekwe.”—Ndị Kọlọsi 1:28, 29; 1 Timọti 4:10.

Anyị mara na Pọl mere ihe ziri nnọọ ezi n’ijisi ike. Lee afọ ojuju onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe inwe ike ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.” (2 Timọti 4:7) Ya mere n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs e dekọrọ na Luk 13:24, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ sị, ‘Èji m ịdị uchu na ịgba mbọ na-etinye onwe m? Ee, àna m enye ihe àmà zuru ezu nke chiri anya na ana m aṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs, bụ́: “Jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa”?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya