Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/15 p. 5-7
  • A Pụrụ Iweghachi Obi Ike!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Pụrụ Iweghachi Obi Ike!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Si na Ya Pụta? Mmekọrịta Na-adịghị Agazi Agazi
  • Ònye Ka Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
  • Iweghachi Obi Ike
  • N’ihi Gịnị Ka Nsogbu Ji Dị n’Inwe Obi Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ime Ka Obi Ike Anyị n’Ezi Omume Chineke Sikwuo Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Mere Anyị Ji Na-aka Nká Ma Na-anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Jehova Kwesịrị Ịbụ Obi Ike Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/15 p. 5-7

A Pụrụ Iweghachi Obi Ike!

Ọ BỤ ezie na nsogbu dị ugbu a n’inwe obi ike bụ ihe àmà nke “mgbe ikpeazụ,” ịdị ụkọ nke obi ike pụtakwara ìhè ọtụtụ puku afọ ndị gara aga. (2 Timoti 3:1) O bu ụzọ bilite n’ebe ọ na-eyitụghị nnọọ ka ọ ga-esi apụta—na paradaịs. Bible na-ekwu banyere ebe ahụ, sị: “Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige n’Iden, n’Ihu anyanwụ; O wee tinye mmadụ ahụ n’ebe ahụ, bụ́ onye Ọ kpụrụrịị. Jehova, bụ́ Chineke, wee mee ka osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri; osisi nke ndụ kwa n’etiti ubi ahụ a gbara ogige, na osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 2:8, 9.

Amaokwu ndị na-esonụ mere ka otú nke a si metụta nsogbu dị ugbu a n’inwe obi ike pụta ìhè. Anyị na-agụ, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee nye mmadụ ahụ iwu, sị, Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Adam ò nwere ihe ọ bụla mere ọ ga-eji nwee obi abụọ banyere ihe Jehova kwuru?

Anyị na-agụkwu: “Ma agwọ dị aghụghọ karịa anụ ọhịa ọ bụla nke Jehova, bụ́ Chineke, mererịị. O wee sị nwanyị ahụ, Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige? Nwanyị wee sị agwọ ahụ, Anyị na-eri mkpụrụ osisi nile nke ubi a a gbara ogige: ma mkpụrụ nke osisi ahụ nke dị n’etiti ubi a a gbara ogige, Chineke asịwo, Unu erila mkpụrụ sitere na ya, unu emetụkwala ya aka, ka unu wee ghara ịnwụ anwụ. Agwọ wee sị nwanyị, Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ. Nwanyị wee hụ na osisi ahụ dị mma ihe oriri, na ọ bụkwa ihe na-agụ anya agụụ ile, na ihe a na-achọsi ike ka osisi ahụ bụkwa ime ka mmadụ nwee uche, o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie; o nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.”—Jenesis 3:1-6.

N’ileghara ịdọ aka ná ntị doro anya nke Chineke anya, Adam na Iv gosipụtara enweghị obi ike n’ebe Jehova nọ. Ha yiri onye iro Chineke bụ́ Setan, bụ́ onye siteworo n’agwọ nkịtị gwa Iv okwu. Setan enweghị obi ike n’ụzọ Jehova si achị. N’ihi nke a nakwa n’ihi obi dị mpako na nke nwere oké ọchịchọ, o nupụụrụ Chineke isi ma duhie ụmụ mmadụ gaa n’ime otu ihe ahụ. Ọ kpaliri ha gaa n’iche na e kwesịghị ịtụkwasị Chineke obi.

Gịnị Si na Ya Pụta? Mmekọrịta Na-adịghị Agazi Agazi

Ị pụrụ ịhụwo na ndị na-adịghị atụkwasị ndị ọzọ obi na-enwe ihe isi ike ịnọgide n’ọbụbụenyi. Publilius Syrus, bụ́ onye edemede Latin nke narị afọ mbụ T.O.A., dere, sị: “Obi ike bụ nanị nkekọ nke ọbụbụenyi e nwere.” Site n’omume nnupụisi ha, Adam na Iv gosiri na ha atụkwasịghị Chineke obi. N’ihi ya, Chineke enweghị n’ezie ihe mere ọ ga-eji tụkwasị ha obi. Dị ka ihe si ná ndakpọ nke ntụkwasị obi, ma ọ bụ obi ike, pụta, ndị mmadụ mbụ ahụ tụfuru ọbụbụenyi Chineke. E nweghị ihe gosiri na Jehova gwara ha okwu mgbe ọ bụla ọzọ mgbe ọ masịrị ha ikpe n’ihi nnupụisi ha.

Mmekọrịta dị n’etiti Adam na Iv jọkwara njọ. Jehova dọrọ Iv aka ná ntị, sị: “N’ihe mgbu ka ị ga-amụ ụmụ; n’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) The Jerusalem Bible na-asị: “Ọ ga-abụ onyenwe gị.” Kama igosipụta ịbụisi n’ebe nwunye ya nọ n’ụzọ ịhụnanya, dị ka Chineke chọworo, Adam ghọrọ ugbu a nna ya ukwu, bụrụ onyenwe ya.

Mgbe ha mehiesịworo, Adam gbalịrị ibugara nwunye ya ụta ahụ. N’echiche ya, ọ bụ n’ihi ihe Iv meworo ka e ji chụpụ ha site n’ogige zuru okè baa n’elu ala a na-emezichabeghị emezi, ịbụ ohu n’okpuru ọnọdụ na-ezughị okè tupu ha alaghachi n’ájá. (Jenesis 3:17-19) Anyị pụrụ iche nke ọma na nke a bụ ihe kpatara esemokwu n’etiti ha abụọ. Adam pụrụ imeghachiworị omume n’ụzọ gabigara ókè, na-ekwu na ya agaghị ege Iv ntị ọzọ ma ọlị. Ikekwe o chere na ya ziri ezi n’ịgwa ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ‘Site ugbu a gawa, ọ bụ m bụ ọga!’ N’aka nke ọzọ, Iv pụrụ ịhụworị na Adam adawo n’ọrụ ya dị ka onyeisi ezinụlọ, na-eme ka ọ ghara inwe obi ike n’ebe Adam nọ. Ka o sina dị, site n’igosipụta enweghị obi ike n’ebe Chineke nọ, ụmụ mmadụ tụfuru ọbụbụenyi ha na ya ma mebie mmekọrịta ha na ibe ha.

Ònye Ka Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Ọ bụghị mmadụ nile kwesịrị ka anyị nwee obi ike n’ebe ha nọ, dị ka ihe atụ Adam na Iv na-egosi. Olee otú anyị pụrụ isi mara onye kwesịrị na onye na-ekwesịghị ka anyị nwee obi ike n’ebe ọ nọ?

Abụ Ọma 146:3 na-adụ anyị ọdụ, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” Na Jeremaịa 17:5-7 kwa, anyị na-agụ, sị: “Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ obi, wee mee ka anụ ahụ, bụ́ mmadụ, bụrụ ogwe aka ya, onye obi ya na-esikwa n’ebe Jehova nọ wezụga onwe ya.” N’aka nke ọzọ, “onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị Jehova obi, onye Jehova bụ ihe ntụkwasị obi ya.”

N’eziokwu, inwe obi ike n’ebe ụmụ mmadụ nọ adịghị njọ mgbe nile. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ na-ekwu nanị na inwe obi ike n’ebe Chineke nọ abụghị nke hiere ụzọ ma ọlị, ma inwe obi ike n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ pụrụ iduga n’ọdachi mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mmadụ ndị na-atụkwasị ụmụ mmadụ obi ime ihe nanị Chineke pụrụ ime—iweta nzọpụta na iweta udo zuru ezu na ịnọ ná ntụkwasị obi—na-eche ndakpọ olileanya ihu.—Abụ Ọma 46:9; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.

N’ezie, ụmụ mmadụ na ụlọ ọrụ ụmụ mmadụ kwesịrị ka e nwee obi ike n’ebe ha nọ ruo nanị n’ókè ha meruru omume n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke ma gosipụta ụkpụrụ ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ga-akpali ndị ọzọ inwe obi ike n’ebe anyị nọ, anyị aghaghị ikwu eziokwu, bụrụ ndị na-eme ihe n’eziokwu na ndị a pụrụ ịdabere na ha. (Ilu 12:19; Ndị Efesọs 4:25; Ndị Hibru 13:18) Nanị site n’ịkpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible ka ntụkwasị obi ndị ọzọ nwere n’ebe anyị nọ ga-ezi ezi ma bụrụ isi iyi nke ume na agbamume e nwekọrọ ọnụ.

Iweghachi Obi Ike

Ndịàmà Jehova nwere ihe ndabere siri ike maka inwe obi ike n’ebe Chineke nọ na ịgba ndị ọzọ ume ime otú ahụ. Jehova bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, na-eguzosikwa ike n’ihe, onye a pụrụ ịdabere na ya mgbe nile ime ihe o kwuworo, n’ihi na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ Obi ike e nwere n’ebe Chineke nke ịhụnanya nọ agaghị eduga ná ndakpọ olileanya ma ọlị.—Ndị Hibru 6:18; Abụ Ọma 94:14; Aịsaịa 46:9-11; 1 Jọn 4:8.

A na-akwali ndị mmadụ bụ́ ndị dị n’otu n’inwe obi ike n’ebe Jehova nọ, ndị na-adịkwa ndụ dị ka ụkpụrụ ya si dị n’ụzọ siri ike, igosi obi ike n’ebe ibe ha nọ. N’ụwa nke nwere nsogbu n’inwe obi ike, lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ndị mmadụ bụ́ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi! Chee echiche otú ụwa ga-esi adị iche ma ọ bụrụ na anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’ihe onye ọ bụla ọzọ na-ekwu ma ọ bụ na-eme! Ọ bụ otú a ka ọ ga-adị n’ụwa ọhụrụ ahụ na-abịa nke Chineke kweworo ná nkwa. Ọ dịghị mgbe ọzọ nsogbu ọ bụla ga-adị n’inwe obi ike!

Ọ̀ ga-amasị gị ịdị ndụ mgbe ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, Ndịàmà Jehova na-akpọ gị òkù iwusi obi ike gị n’ebe Chineke nọ nakwa ná nkwa ya dị iche iche ike site n’ịmụkwu banyere ihe ndị ọ chọrọ maka ndụ. Ọmụmụ Bible na-enye ihe àmà na Chineke dị adị, na o nwere mmasị n’ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ, nakwa na ọ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji dozie nsogbu ụwa site n’Alaeze ya. Ọtụtụ nde amụtawo inwe obi ike n’ebe Chineke nọ na n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ndịàmà Jehova ga-eji obi ụtọ gosi gị ozi ọha na eze ha nke usoro ọmụmụ Bible ha na-eduzi n’efu. Ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ iji nwetakwuo ihe ọmụma.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Enweghị obi ike n’ebe Chineke nọ na-eduga ná mmekọrịta mmadụ na-adịghị agazi agazi

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ụmụ mmadụ kwesịrị ka e nwee obi ike n’ebe ha nọ ruo nanị n’ókè ha meruru omume kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya