Mgbapụ nke Ndị Hugues Gaa ná Nnwere Onwe
“N’aha Eze na Eze Nwanyị, . . . Anyị nọ ebe a Na-ekwupụta, Na ndị Protestant France nile ndị ga-achọ Ebe Mgbaba ha na, ma Bata n’ime Alaeze Anyị a, ọ bụghị nanị na ha ga-enwe Nchebe Eze Anyị . . . Kamakwa Anyị ga-eme Ihe ọ bụla Anyi Pụrụ Ime n’Ụzọ Nile ezi uche dị na ya iji Kwadoo, ma Nyere ha Aka . . . ka obibi na ọnụnọ ha n’Alaeze a wee nwee ike ịbụ nke ntụsara ahụ na nke ga-adịrị ha mfe.”
OTÚ a ka nkwupụta okwu 1689 nke William na Mary, eze na eze nwanyị England si agụ. Ma n’ihi gịnị ka ndị Protestant bụ́ ndị France, ma ọ bụ ndị Hugues, dị ka e mesịrị mara ha, ji nwee mkpa ịchọ ebe mgbaba na nchebe n’ebe na-abụghị France? N’ihi gịnị ka mgbapụ ha site na France n’ihe dị ka afọ 300 gara aga kwesịrị iji masị anyị taa?
Agha na esemokwu ndị metụtara okpukpe kpara Europe nke narị afọ nke 16 aka ọjọọ. France, ya na Agha Okpukpe ya (1562-1598) n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant, agbanahụghị oké ọgba aghara a. Otú ọ dị, na 1598, Eze Henry nke Anọ nke France bịanyere aka n’iwu nke ikwe ibe nọrọ, bụ́ Iwu Nantes, na-enye ndị Protestant bụ́ ndị Hugues nnwere onwe ụfọdụ nke okpukpe. Nnakwere nke a iwu nakweere okpukpe abụọ pụrụ iche na Europe. Ruo oge ụfọdụ ọ kwụsịrị ọgba aghara okpukpe ahụ nke mekpọworo France nke narị afọ nke 16 ọnụ ruo ihe karịrị afọ 30.
Ọ bụ ezie na e zubere ka ọ bụrụ “ihe ga-adịgide mgbe nile na ihe a na-apụghị ịkagbu akagbu,” na 1685 Iwu Fontainebleau kagburu Iwu Nantes. Ọkà ihe ọmụma France bụ́ Voltaire mesịrị kọwaa nkagbu a dị ka “otu n’ime ọdachi ukwu nke France.” Ngwa ngwa, ọ kpaliri mgbapụ nke ihe dị ka ndị Hugues 200,000 gaa ná mba ndị ọzọ. Otú ọ dị, mmetụta ndị o nwere, gakwuru ọbụna n’ihu. Ma n’ihi gịnị ka e ji kagbuo iwu mbụ ahụ nke na-akwado okpukpe ikwe ibe nọrọ?
E Megidere Ya Site ná Mmalite
Ọ bụ ezie na Iwu Nantes ahụ nọ n’ọrụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 90, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ dị mbụ “na-anwụ anwụ mgbe e gburu ya na 1685.” N’ezie, e wukwasịghị iwu ahụ na ntọala ndị siri ike. Site ná mmalite, ọ tụnyere ụtụ n’ihe a kọwaworo dị ka “agha nzuzo” n’etiti ndị ụkọchukwu Katọlik na ihe ha kpọrọ “R.P.R.” (Ihe a si na ọ bụ Okpukpe A Gbanwere Agbanwe) Site na mgbe e nyere ya na 1598 ruo ihe dị ka 1630, mmegide n’ebe Iwu Nantes dị hiwere isi n’arụmụka ihu ọha n’etiti ndị Protestant na ndị Katọlik nakwa ná mbipụta nke edemede ndị òtù okpukpe. Otú ọ dị, ekweghị ibe nọrọ nwere ọtụtụ akụkụ.
Mgbe ha lụsosịrị ndị Protestant agha site na 1621 ruo 1629, gọọmenti France gbalịrị ịmanye ha ịba n’òtù Katọlik site n’ọtụtụ ụzọ mmegbu. Mmaja a kawanyere njọ n’oge ọchịchị Louis nke Iri na Anọ, bụ́ “Eze Anyanwụ.” Ụkpụrụ ya nke mkpagbu dugara ná nkagbu nke Iwu Nantes ahụ.
Ihe Mgbochi
Dị ka akụkụ nke ihe mgbochi ahụ, e ji nwayọọ nwayọọ wepụ iwu ihe ruuru nwa amaala Protestant. N’agbata 1657 na 1685, e mere ihe dị ka mkpebi 300, nke ọ bụ ndị ụkọchukwu na-atụkarị aro ya, megide ndị Hugues. Mkpebi ndị ahụ megidere akụkụ nile nke ndụ ha. Dị ka ihe atụ, a machibidoro ndị Hugues ịrụ ọtụtụ ọrụ, dị ka nke ọgwụ, nke iwu, na ọbụna nke ịghọ nwa. Banyere ịghọ nwa, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme tụgharịrị uche, sị: “Ò si aṅaa kwe omume iwere ndụ mmadụ nyefee n’aka onye jụrụ okwukwe nke nzube ya bụ ịla usoro ihe nke dị adị n’iyi?”
E mere ka mmegbu ahụ sikwuo ike na 1677. A na-eri onye Hugues ọ bụla e jidere ebe ọ na-anwa ịtọghata onye Katọlik nhá otu puku pound France. E jiri ego steeti nke sitere n’ụtụ isi dị oké ọnụ mee ihe iji metụta ndị Hugues ịgbanwe okpukpe ha. Na 1675 ndị ụkọchukwu Katọlik nyere Eze Louis nke Iri na Anọ nde pound France 4.5, na-asị: “Ugbu a ị ga-aga n’ihu ná ngosi nke obi ekele gị site n’iji ikike gị kpochapụ ịjụ okwukwe a kpam kpam.” Ụzọ a nke “ịzụrụ” ndị a tọghatara dugara ná ntọghata nke ihe dị ka mmadụ 10,000 gaa na Katọlik n’ime afọ atọ.
Na 1663 e mere ka ntọghata gaa n’okpukpe Protestant bụrụ ihe iwu na-akwadoghị. E nwekwara ihe mgbochi banyere ebe ndị Hugues pụrụ ibi. Otu ihe atụ nke ihe ndị gabigara ókè e mere bụ na ụmụaka ndị nọ n’afọ asaa pụrụ ịghọ ndị Katọlik n’ụzọ megidere ọchịchọ nke ndị mụrụ ha. A manyere ndị nne na nna bụ́ ndị Protestant ịkwụ ụgwọ agụmakwụkwọ ụmụ ha gụrụ n’aka ndị Jesuit ma ọ bụ ndị nkụzi Katọlik ndị ọzọ.
Ngwá agha ọzọ e ji mee ihe n’ịbịachi ndị Hugues ọnụ bụ Compagnie du Saint-Sacrement (Òtù Sakrament Dị Nsọ) dị na nzuzo. Nke a bụ otu òtù Katọlik nke ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Janine Garrisson kwuru na ọ bụ “njikọ sara mbara” nke na-agbasaru France nile. N’ịbanye n’akụkụ ndị kasị elu nke ọha mmadụ, o nweghị ụkọ ego ma ọ bụ nke ihe ọmụma banyere ndị iro. Garrisson na-akọwa na ụzọ o si eme ihe dị ọtụtụ: “Site ná nrụgide ruo n’ihe mgbochi, ntigharị anya ruo ná nkatọ, Compagnie ahụ ji ụzọ nile mee ihe iji belata ikike nke ndị Protestant.” Otú o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ndị Hugues nọgidere na France n’oge mkpagbu a. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Garrisson na-arịba ama, sị: “O siri ike ịghọta ihe mere ndị Protestant na-ejighị hapụ Alaeze ahụ n’ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ka ibu iro ahụ a na-ebuso ha ji nwayọọ nwayọọ rịa elu.” Otú ọ dị, mgbapụ gaa ná nnwere onwe mesịrị ghọọ ihe dị mkpa.
Ịmalitekwa Ụwa n’Isi
Udo Nymegen (1678) na Nkwụsịtụ Agha nke Ratisbon (1684) mere ka Eze Louis nke Iri na Anọ nwere onwe ya pụọ n’agha sitere n’èzí. N’ofe Osimiri ahụ dị n’England, otu onye Katọlik ghọrọ eze na February 1685. Louis nke Iri na Anọ pụrụ iji ohere ọhụrụ nke a mee ihe. Afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ndị ụkọchukwu Katọlik nọ na France enyeworị Akụkụ Iwu Gallican Anọ, nke kpaara ike ndị popu ókè. Mgbe ahụ, Popu Innocent nke Iri na Otu “lere Chọọchị France anya dị ka nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke na-akpata nkewa.” N’ihi ya, site n’ịkagbu Iwu Nantes ahụ, Louis nke Iri na Anọ pụrụ imeziwanye aha ya e tetọworo ma weghachi mmekọrịta kwesịrị ekwesị nke ya na popu.
Ụkpụrụ ime ihe eze n’ebe ndị Protestant nọ ghọrọ ihe doro anya nke ọma. Ihe àmà na-egosi na usoro ịdị nro ahụ (nrụgide na ime iwu) arụghị ọrụ. N’aka nke ọzọ, iji mmanye eme ihea nke ha malitere ọhụrụ nwere ihe ịga nke ọma. Ya mere na 1685, Louis nke Iri na Anọ bịanyere aka n’Iwu Fontainebleau, na-akagbu Iwu Nantes. Mkpagbu obi ọjọọ nke nkagbu a kpatara tinyere ndị Hugues n’ọnọdụ dị njọ ọbụna karịa nke ha nọ tupu Iwu Nantes ahụ. Gịnị ka ha ga-eme ugbu a?
Izo, Ịlụ Ọgụ, Ka Ọ̀ Bụ Ịgbapụ?
Ụfọdụ ndị Hugues họọrọ ife ofufe ná nzuzo. Ebe ọ bụ na e mebisiwo ụlọ nzukọ ha, machibidokwa ofufe ihu ọha ha iwu, ha malitere ‘Chọọchị nke Ọzara,’ ma ọ bụ ofufe okpuru ala. Nke a bụ n’agbanyeghị eziokwu bụ́ na ndị na-enwe nzukọ ndị dị otú ahụ na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a mara ikpe ọnwụ, dị ka otu iwu e mere na July 1686 si kwuo. Ụfọdụ ndị Hugues gọnarịrị okwukwe ha, na-eche na ọ ga-adị mfe ịlọghachi mgbe e mesịrị. Ụdị ndị a a tọghatara kpere Okpukpe Katọlik elu ọnụ nke ọgbọ ndị na-abịa n’ihu ga-amụrụ.
Gọọmenti nwara imesiwanye ntọghata ike. Iji nweta ọrụ, ndị ọhụrụ a tọghatara ga-eweta asambodo nke na-egosi na ha na-ekpe okpukpe Katọlik nke ụkọchukwu parish bịanyere aka na ya, bụ́ onye gosiri na ọ na-abịa chọọchị. Ọ bụrụ na e meghị ụmụaka baptism, zụlitekwa ha dị ka ndị Katọlik, a pụrụ ịnapụ ha n’aka ndị mụrụ ha. Ụlọ akwụkwọ ga-akwalite agụmakwụkwọ Katọlik. E mere mgbalị iji bipụta akwụkwọ okpukpe nke na-akwado Katọlik maka “ndị mmadụ nke Akwụkwọ ahụ [Bible],” dị ka a na-akpọbu ndị Protestant. Gọọmenti bipụtara ihe karịrị otu nde akwụkwọ ma ziga ha n’ógbè ndị a tọghataworo ọnụ ọgụgụ buru ibu. Atụmatụ ndị ahụ gafere ókè nke ukwuu nke na ọ bụrụ na onye nọ n’ọrịa jụrụ ịnara ụka ikpeazụ nke ndị Katọlik ma mesịa gbakee, a tụrụ ya mkpọrọ ma ọ bụ tinye ya n’ime ụgbọ mmiri n’ogologo ndụ ya nile. Mgbe o mesịkwara nwụọ, a na-atụfu ozu ya dị ka a ga-asị na ọ bụ ihe mkpofu, a na-ejichikwa ihe onwunwe ya.
Ụfọdụ ndị Hugues malitere iji ngwá agha eguzogide ndị na-emegide ha. N’ógbè Cévennes, nke a maara maka ịnụrụ okpukpe ọkụ n’obi, ndị Hugues na-alụ ọgụ bụ́ ndị a na-akpọ ndị Camisard nupụrụ isi na 1702. N’imeghachi omume nye ozuzo nakwa mwakpo oge anyasị nke ndị Camisard, ndị agha gọọmenti gbara ụfọdụ obodo ọkụ. Ọ bụ ezie na mwakpo ndị ndị Hugues na-eme ha nọkata ha emee dịgidere ruo oge ụfọdụ, ka ọ na-erule 1710 ndị agha Eze Louis etipịasịwo ndị Camisard ahụ.
Mmeghachi omume ọzọ nke ndị Hugues bụ isi France gbapụ. Nkwapụ a abụrụwo nke a kpọrọ nke mere eme. Ọtụtụ ndị Hugues gba aka mgbe ha gbapụrụ n’ihi na ndị ọchichi ejichisịwo ihe onwunwe ha, ebe Chọọchị Katọlik na-eketakwa akụkụ ụfọdụ nke ihe onwunwe ndị ahụ. Ya mere ọ dịghị mfe ịgbapụ. Gọọmenti France meghachiri omume ngwa ngwa banyere ihe na-emenụ, na-eche nche n’ụzọ mgbapụ dị iche iche, na-enyochakwa ụgbọ mmiri. Ndị ohi oké osimiri tọọrọ ụgbọ mmiri ndị na-ahapụ France, n’ihi na e nwere ihe nrita maka ijide ndị na-agbapụ agbapụ. E nyere ndị Hugues e jidere ka ha na-agbapụ ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Iji mee ka ihe sikwuo ike, ndị nledo na-arụ ọrụ gburugburu ógbè ndị ahụ gbalịrị ịchọpụta aha ndị na-eme atụmatụ ịgbapụ na ụzọ ha ga-esi agbapụ. Akwụkwọ ozi e jichiri ejichi, ihe adịgboroja, na aghụghọ ghọrọ ihe na-ewu ewu.
Ebe Mgbaba A Nabatara
Mgbapụ ndị Hugues site na France na nnabata a nabatara ha ná mba ndị ha batara ka a maara dị ka Ebe Mgbaba. Ndị Hugues gbagara Holland, Switzerland, Germany, na England. E mesịa ụfọdụ gbagara Scandinavia, America, Ireland, West Indies, South Africa, na Russia.
Ọtụtụ mba Europe mere iwu ndị na-agba ndị Hugues ume ịbata ná mba ha. N’etiti ihe mkpali ndị e nyere bụ ịghọ nwa amala n’efu, akwụghị ụtụ isi, na ịbata n’òtù ọrụ aka n’efu. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Elisabeth Labrousse si kọọ, ndị Hugues ahụ bụkarị “ụmụ nwoke na-eto eto . . . na-agba mbọ, ndị gbasiri ike ma nwee omume ọma ndị pụrụ iche.” Otú a France, n’uju nke ike ya, tụfuru ndị ọrụ nwere nkà n’ọtụtụ ọrụ dị iche iche. Ee, “ihe onwunwe, akụ na ụba na nkà” gara mba. Ihe ndị metụtara okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị tinyekwara aka n’inye ndị Hugues ebe mgbaba. Ma gịnị bụ ihe ndị na-adịte aka nke nkwapụ a rụpụtaworo?
Nkagbu nke Iwu Nantes ahụ na mkpagbu ndị so ya kpasuru mmeghachi omume dị njọ nke mba nile. William nke Orange ji ohere nke omume mmegide nke France mee ihe iji ghọọ onye ọchịchị nke ndị Netherland. Site n’enyemaka nke ndị isi nke ndị Hugues, ọ ghọkwara eze Great Britain, na-anọchi James nke Abụọ bụ́ onye Katọlik. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Philippe Joutard na-akọwa na “ụkpụrụ ime ihe Protestant nke Louis nke Iri na Anọ tụrụ bụ otu n’ime isi ihe ndị kpatara nkwatu a kwaturu James nke Abụọ n’ọchịchị [na] nguzobe nke njikọ Augsburg. . . . Ihe omume [ndị a] na-aka akara oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere Europe, na-eduga n’iji ịbụisi England dochie ịbụisi France.”
Ndị Hugues keere òkè ọdịbendị dị mkpa na Europe. Ha ji nnwere onwe ọhụrụ ha mee ihe n’ibipụta akwụkwọ ndị nyere aka n’ịkpụzi nkà ihe ọmụma nke Ihe Ọmụma na echiche nke ikwe ibe nọrọ. Dị ka ihe atụ, otu onye France bụ́ onye Protestant sụgharịrị ihe ọkà ihe ọmụma England bụ́ John Locke dere, na-akpọsa ihe ndị ruuru mmadụ nke mmadụ chepụtara. Ndị edemede ndị ọzọ bụ́ ndị Protestant mesiri ịdị mkpa nke nnwere onwe nke akọ na uche ike. Echiche ahụ kọwara na nrubeisi nye ndị ọchịchị bụ nke a kpaara ókè, bụrụkwa nke a pụru ileghara anya ma ọ bụrụ na ha mebiri nkwekọrịta dị n’etiti ha na ndị mmadụ. N’ihi ya, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Charles Read na-akọwa, nkagbu a kagburu Iwu Nantes bụ “otu n’ime ihe ndị doro anya kpatara Mgbanwe Ọchịchị France ahụ.”
Ọ̀ Dị Ihe Ndị A Mụtara?
N’ịtụle ọdachi si ná mkpagbu pụta nakwa ọtụtụ mmadụ bara uru ndị funahụrụ mba ahụ, Marquis de Vauban, bụ́ onye na-enye Eze Louis nke Iri na Anọ ndụmọdụ n’ihe metụtara agha, gbara eze ahụ ume ka o weghachi Iwu Nantes ahụ, na-asị: “Ntọghata nke obi dịịrị nanị Chineke.” Ya mere n’ihi gịnị ka Ọchịchị France na-ejighị mụta ihe ma gbanwee mkpebi ya? N’ezie otu ihe tụnyere ụtụ bụ na eze ahụ tụrụ ụjọ ibelata ike ọchịchị ya. Ọzọkwa, ọ ka mma ịnọ n’agbata ntụte nke Katọlik na ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe nke France nke narị afọ nke 17.
Ihe omume ndị gbara nkagbu ahụ gburugburu emewo ka ụfọdụ jụọ, sị, “Ngwakọta ụbara mmadụ hà aṅaa ka ọha mmadụ pụrụ ịnabata ma nagide?” N’ezie, dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme rịbaworo ama, o kweghị omume ịtụle akụkọ ndị Hugues n’echeghị banyere “usoro nke inweta ike na iji ha eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma.” N’ọha mmadụ taa nke ọtụtụ agbụrụ na-emejupụtawanye nakwa nke dị iche iche n’ụzọ okpukpe, mgbapụ ndị Hugues gaa ná nnwere onwe bụ ihe ncheta na-emetụ n’obi nke ihe ndị na-eme mgbe e debere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke chọọchị kpaliri n’ọkwá mbụ karịa ọdịmma nke ụmụ mmadụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]
a Lee igbe dị na peji nke 28.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Mmanye Ahụ
Ntọghata Site n’Iyi Egwu
Ụfọdụ lere ndị mmanye ahụ anya dị ka “ndị ozi ala ọzọ magburu onwe ha.” Otú ọ dị, ha kpaliri oké ụjọ n’etiti ndị Hugues, n’ọnọdụ ụfọdụ kwa, obodo dum na-aghọ ndị Katọlik ma ha nụ na ha abịala. Ma olee ndị bụ ndị mmanye a?
Ndị mmanye bụ ndị agha bu ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka, ndị bi n’ụlọ ndị Hugues n’atụmanya nke imenye ndị bi n’ụlọ ndị ahụ ụjọ. Ojiji e ji ndị mmanye a mee ihe n’ụzọ dị otú a ka a maara dị ka iji mmanye eme ihe. Iji mee ka ibu arọ a tụkwasịrị n’isi ezinụlọ dị iche iche bukwuo ibu, ndị agha e zigara n’ụlọ dị iche iche gabigara okè karịa ihe onwunwe ezinụlọ ndị ahụ. E nyere ndị mmanye ahụ ike imekpọ ezinụlọ ọnụ, mee ka ha ghara ihi ụra, ma mebisịa ihe onwunwe ha. Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọ ahụ ga-agọnarị okwukwe Protestant, ndị mmanye ahụ ga-apụ.
E ji mmanye mee ihe iji tọghata ndị mmadụ na 1681 na Poitou, Ọdịda Anyanwụ France, bụ́ ógbè nke ndị Hugues dị ọtụtụ. N’ime ọnwa ole na ole, a tọghatara mmadụ dị site 30,000 ruo 35,000. E jikwa otu ụzọ ahụ mee ihe na 1685 n’ógbè ndị ọzọ nke ndị Hugues. N’ime ọnwa ole na ole, e nwetara ngọnarị okwukwe dị site 300,000 ruo 400,000. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jean Quéniart si kọọ, ịga nke ọma nke iji mmanye eme ihe “mere ka Nkagbu a kagburu [Iwu ikwe ibe nọrọ nke Nantes] bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere, n’ihi na o yiri ihe kwere omume ugbu a.”
[Ebe E Si Nweta Foto]
Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris
[Foto dị na peeji nke 25]
Nkwupụta okwu 1689 a chebere ndị France bụ́ ndị Protestant bụ́ ndị na-achọ ahụ efe pụọ ná mmegbu okpukpe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke Ọ́bá Akwụkwọ Ndị Hugues, Òtù Ndị Hugues nke Great Britain na Ireland, London
[Foto dị na peeji nke 26]
Nkagbu nke Iwu Nantes ahụ, 1685 (E gosiri peji nke mbụ nke nkagbu ahụ)
[Ebe E Si Nweta Foto]
Documents conservés au Centre Historique des Archives nationales à Paris
[Foto dị na peeji nke 26]
E bibiri ọtụtụ ụlọ nsọ ndị Protestant
[Ebe E Si Nweta Foto]
Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris