Betel—Obodo Ezi Ihe na Ihe Ọjọọ
OBODO ụfọdụ na-aghọ ndị a ma ama—ma ọ bụ ndị nwere aha ọjọọ—n’ihi ihe ndị mere n’ime ha. Otú ọ dị, Betel pụrụ iche n’ihi na ọ ghọrọ nke e ji ma ezi ihe ma ihe ọjọọ mara. Nna ochie ahụ bụ́ Jekọb kpọrọ obodo ahụ Betel, nke pụtara “Ụlọ Chineke.” Ma otu puku afọ mgbe e mesịrị, Hosea onye amụma kpọrọ obodo ahụ “Ụlọ nke Ihe Mgbu.” Olee otú obodo a si gbanwee site n’ezi ihe gaa n’ihe ọjọọ? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ ya?
Njikọ nke Betel na ndị Chineke malitere na 1943 T.O.A. mgbe Abraham ka dị ndụ. N’oge ahụ, a maara obodo ahụ dị ka Luz, bụ́ aha Kenean mbụ ya. Ọ dị n’elu ugwu, ihe dị ka kilomita 17 n’ebe ugwu Jerusalem. Jiri anya nke uche hụ ka Abraham na nwa nwanne ya bụ́ Lọt nọ n’ebe dị mma n’elu ugwu ndị gbara Betel gburugburu na-eleda anya n’ala dị larịị nke Ndagwurugwu Jọdan dị ná mgbada. N’ụzọ akọ, Abraham emee ka Lọt mara ihe isi ike dị n’ikepụta ebe ịta ahịhịa maka ìgwè atụrụ ha buru ibu: “Biko, ka ise okwu ghara ịdị n’etiti mụ na gị, na n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke gị; n’ihi na nwanne ka anyị bụ. Ala nke a nile, ọ́ dịghị n’ihu gị? biko, kewapụ onwe gị n’ahụ m: ọ bụrụ aka ekpe, m ga-ejekwa n’aka nri: ma ọ bụrụ aka nri, m ga-ejekwa n’aka ekpe.”—Jenesis 13:3-11.
Abraham azọrọghị na ọ bụ ya ka o ruuru ibu ụzọ họrọ. Kama, ọ hapụrụ onye ọ tọrọ ka o were ebe kasị mma. Anyị pụrụ iṅomi àgwà ọma Abraham. Anyị pụrụ ime ka ihe na-ese okwu dajụọ site n’ibute ụzọ n’ikwu okwu n’ụzọ dị nwayọọ ma na-eme omume n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị.—Ndị Rom 12:18.
Ọtụtụ afọ n’ihu mgbe nwa nwa Abraham bụ́ Jekọb mara ụlọikwuu na Luz, ọ rọrọ nrọ pụrụ iche. Ọ hụrụ “ubube nke e guzoro n’ala, ma elu ya na-emetụ ebe eluigwe dị: ma, lee, ndị mmụọ ozi Chineke na-arịgo na-arịda na ya. Ma, lee, Jehova na-eguzo n’elu ya.” (Jenesis 28:11-19; tụlee Jọn 1:51.) Nrọ ahụ nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Ndị mmụọ ozi ahụ Jekọb hụrụ ga-ejere ya ozi n’imezu nkwa ahụ Chineke kwere ya banyere mkpụrụ ya. Ọnọdụ e buliri elu nke Jehova n’elu ubube ahụ gosiri na ọ ga-eduzi ndị mmụọ ozi ahụ n’ọrụ a.
Mmesi obi ike a nke nkwado Chineke metụrụ Jekọb n’ahụ nke ukwuu. Mgbe o si ná nrọ ahụ teta, ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, nke pụtara “Ụlọ Chineke,” ma kwe Jehova nkwa, sị: “Ihe nile Ị ga-enye m, aghaghịkwa m inye Gị otu ụzọ n’ụzọ iri.”a (Jenesis 28:20-22) N’ịmata na ihe nile o nwere sitere n’aka Chineke, o nwere ọchịchọ inyeghachi akụkụ dị ukwuu dị ka ngosipụta nke obi ekele ya.
Ndị Kraịst taa nwekwara ndị mmụọ ozi na-eje ozi maka ha. (Abụ Ọma 91:11; Ndị Hibru 1:14) Ha pụkwara igosipụta obi ekele ha maka ngọzi nile ha nwetara site n’ijupụta “n’ọtụtụ ekele a na-ekele Chineke.”—2 Ndị Kọrint 9:11, 12.
Ka oge na-aga, ụmụ Jekọb ghọrọ otu mba. Onye ndú ha bụ́ Joshua meriri eze Betel na-ekpere arụsị ngwa ngwa a malitesịrị imeri Kenean. (Joshua 12:16) N’oge Ndị Ikpe, onye amụma nwanyị bụ́ Debora biri na nso Betel ma kọọrọ ndị ahụ okwu Jehova. Samuel n’otu aka ahụ jere Betel ugboro ugboro ka ọ na-ekpe mba Israel ikpe.—Ndị Ikpe 4:4, 5; 1 Samuel 7:15, 16.
Betel Aghọọ Ebe Bụ́ Isi nke Ndapụ n’Ezi Ofufe
Ma njikọ nke Betel na ofufe dị ọcha kwụsịrị mgbe e kewasịrị Alaeze ahụ na 997 T.O.A. Eze Jeroboam guzobere Betel dị ka ebe bụ́ isi maka ofufe nwa ehi, nwa ehi a sịrị na ọ na-anọchite anya Jehova. (1 Ndị Eze 12:25-29) Ọ bụ nke ahụ mere na mgbe ọ na-ebu amụma banyere mbibi Betel, Hosea zoro aka na ya dị ka “Bet-even,” nke pụtara “Ụlọ nke Ihe Mgbu.”—Hosea 10:5, 8.
Ọ bụ ezie na Betel aghọwo ebe bụ́ isi nke ihe mgbu ime mmụọ, ihe omume ndị metụtara ya nọgidere na-enye ihe mmụta ndị dị mkpa. (Ndị Rom 15:4) Otu n’ime ihe mmụta dị otú ahụ metụtara otu onye amụma a na-akpọghị aha bụ́ onye e zigara site na Juda gaa Betel ibu amụma banyere mbibi nke ebe ịchụàjà na ndị nchụàjà ya. Jehova gwakwara ya ka ọ laghachi na Juda—dị nanị kilomita ole na ole gaa n’ebe ndịda—n’erighị ihe ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Onye amụma a ji anyaike kwupụta otu amụma n’ihu Jeroboam, bụ́ eze Israel, na-akọcha ebe ịchụàjà Betel. Ma e mesịa, o nupụụrụ Chineke isi site n’iri ihe n’ụlọ otu onye amụma ochie nọ na Betel. N’ihi gịnị? Onye amụma ahụ meworo agadi ji ụgha zọrọ na otu mmụọ ozi Jehova enyewo ya iwu ka o lee onye amụma ibe ya ọbịa. Nnupụisi nke onye amụma ahụ si Juda dugara ná nnwụchu ọnwụ ya.—1 Ndị Eze 13:1-25.
Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị atụọ arọ ka anyị mee ihe yiri ihe a na-enyo enyo, olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume? Cheta na ọbụna ndụmọdụ e nyere n’ezi obi pụrụ imerụ ahụ ma ọ bụrụ na o zighị ezi. (Tụlee Matiu 16:21-23.) Site n’ịchọ ntụziaka n’aka Jehova site n’ekpere na ịmụ Okwu ya, anyị ga-ezere ihie ụzọ na-eweta ọdachi nke onye amụma ahụ a na-akpọghị aha.—Ilu 19:21; 1 Jọn 4:1.
Ihe dị ka afọ 150 mgbe e mesịrị, onye amụma bụ́ Emọs mekwara njem gaa n’ebe ugwu iji buo amụma megide Betel. Emọs katọsiri ndị na-ege ya ntị bụ́ ndị na-enweghị omume enyi ike, gụnyere onye nchụàjà bụ́ Amazaịa, onye ji nganga gwa Emọs ka ọ “gbalaga n’ala Juda.” Ma n’atụghị egwu Emọs gwara Amazaịa banyere ọdachi ndị ga-adakwasị ezinụlọ nke onye nchụàjà ahụ. (Emọs 5:4-6; 7:10-17) Ihe nlereanya ya na-echetara anyị na Jehova pụrụ ime ka ndị ozi ya dị obi umeala nwee anyaike.—1 Ndị Kọrint 1:26, 27.
N’ikpeazụ, Eze Josaịa kwesịrị ntụkwasị obi nke Juda kwaturu ‘ebe ịchụàjà dị na Betel, suree ebe ahụ dị elu ọkụ, supịa ya mee ka ọ ghọọ uzuzu, surekwaa Ashera ọkụ.’ (2 Ndị Eze 23:15, 16) Ndị okenye taa pụrụ iṅomi ezi ihe nlereanya ya site n’iji ịdị uchu na-agbaso ntụziaka Chineke na site n’ibute ụzọ n’idebe ọgbakọ ọcha.
Ihe ndị a mere n’akụkọ ihe mere eme nke Betel na-egosi n’ụzọ doro anya ihe ndị na-esite n’ezi omume na n’ajọ omume apụta, ihe ndị na-esite n’irubere na n’inupụrụ Jehova isi apụta. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Mosis etinyewo nhọrọ a n’ihu mba Israel: “Etinyewo m n’ihu gị taa ndụ na ezi ihe, na ọnwụ na ihe ọjọọ.” (Deuterọnọmi 30:15, 16) Ịtụgharị uche n’akụkọ ihe mere eme nke Betel ga-agba anyị ume isonyere “Ụlọ Chineke,” ebe a na-efe ezi ofufe, kama isonyere “Ụlọ nke Ihe Mgbu.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ma Jekọb ma Abraham nyere otu ụzọ n’ụzọ iri n’afọ ofufo.
[Foto dị na peeji nke 23]
Mkpọmkpọ ebe nke ebe Betel dị, bụ́ ebe Jeroboam guzobere ebe bụ́ isi maka ofufe nwa ehi