Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 9/1 p. 24-28
  • Amụtara M Ịdabere na Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Amụtara M Ịdabere na Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Ule Ndị Kpụ Ọkụ n’Ọnụ
  • Okwu Banyere Imebi Okwukwe
  • Mkpagbu ahụ Arịa Elu
  • Njem Gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ—Mgbapụzi
  • Nnwere Onwe na Ọdachi Ọzọ
  • Nnwere Onwe n’Ikpeazụ!
  • Okwukwe n’Okpuru Ule na Slovakia
    Teta!—2003
  • Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche
    Teta!—2002
  • Anyị Kpebisiri Ike Ịdịnyere Ịchịisi Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 9/1 p. 24-28

Amụtara M Ịdabere na Jehova

DỊ KA JÁN KORPA-ONDO SI KỌỌ

Ọ bụ na 1942, ndị agha Hungary na-echekwa m nche na nso Kursk, Russia. Anyị bụ ndị Njikọ Germany na Mba Ndị Òtù Ya bụ́ ndị na-alụso ndị Russia ọgụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ji eji. E gwuru ili m, e nyekwara m minit iri iji kpebie ma m ga-abịanye aka n’akwụkwọ kwuru na mụ abụghịzi otu n’ime Ndịàmà Jehova. Tupu mụ akọọ ihe ọzọ merenụ, ka m gwa gị otú m si nọrọ n’ebe ahụ.

AMỤRỤ m na 1904 n’obodo nta bụ́ Zahor, nke dị ugbu a n’ebe ọwụwa anyanwụ Slovakia. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Zahor ghọrọ akụkụ nke mba e guzobere ọhụrụ bụ́ Czechoslovakia. Obodo anyị nwere ebe obibi 200 na chọọchị abụọ, otu bụ Katọlik ndị Gris, nke ọzọ bụ Okpukpe Calvin.

Ọ bụ ezie na m jere Chọọchị Okpukpe Calvin, ebiri m ndụ nke ime ihe rụrụ arụ. Otu nwoke dị nnọọ iche bi n’ebe na-adịghị anya site n’ebe m bi. Otu ụbọchị ọ malitere ịkpanyere m ụka ma gbazinye m Bible. Ọ bụ nke mbụ m na-ejide akwụkwọ ahụ n’aka m. Ihe dị ka n’oge a, na 1926, alụrụ m Barbora, n’oge na-adịghịkwa anya anyị mụtara ụmụ abụọ, Barbora na Ján.

Amalitere m ịgụ Bible, ma e nwere ọtụtụ ihe ndị m na-aghọtaghị. Ya mere ejekwuuru m pastọ m ma rịọ ya ka o nyere m aka. “Bible bụ nanị maka ndị gụrụ akwụkwọ,” ka o kwuru, “anwadịla anwa ịghọta ya.” Mgbe ahụ ọ gwara m ka anyị zụọ kaadị.

Mgbe nke ahụ gasịrị agakwuuru m nwoke ahụ gbazinyere m Bible ahụ. Ọ bụ Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. O nwere obi ụtọ inyere m aka, mgbe oge ụfọdụ gasịkwara, anya malitere imeghe m. Akwụsịrị m ịṅụ oké mmanya ma malite ibi ndụ dị ocha; amalitere m ọbụna ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova. Eziokwu Bible agbanyewo mkpọrọgwụ na Zahor ná mmalite afọ ndị 1920, n’oge na-adịghịkwa anya e guzobere ìgwè na-arụsi ọrụ ike nke Ndị Mmụta Bible.

Ka o sina dị, e nwere mmegide okpukpe siri ike. Onye ụkọchukwu nọ n’ógbè ahụ mere ka ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ m na-emegide m, na-azọrọ na ara agbaala m. Ma amalitere m inwe nzube ná ndụ, ekpebisikwara m ike ijere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi. N’ihi ya, na 1930, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova, e mekwara m baptism.

Mmalite nke Ule Ndị Kpụ Ọkụ n’Ọnụ

Na 1938, Hungary, bụ́ nke dụnyeere Germany úkwù n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, malitere ịchị ógbè anyị. N’oge ahụ anyị nwere ihe dị ka Ndịàmà 50 n’obodo anyị nke nwere ihe na-erughị otu puku ndị mmadụ. Anyị nọgidere na-eme nkwusa ọ bụ ezie na ime otú ahụ tinyere ndụ na nnwere onwe anyị n’ihe ize ndụ.

Na 1940, e debara aha m n’òtù ndị agha Hungary. Gịnị ka m ga-eme? Agụwo m amụma Bible banyere ụmụ mmadụ ịkpụgharị ngwá agha ha ka ha bụrụ ngwá ọrụ nke udo, amakwaara m na ka oge na-aga, Chineke ga-ewepụ agha nile n’ụwa. (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4) N’ihi ya, akpọwo m agha asị, ekpebikwara m na m gaghị abanye n’òtù ndị agha ahụ, n’agbanyeghị ihe ndị ga-esi na ya pụta.

A tụrụ m mkpọrọ ọnwa 14, anọkwara m oge mkpọrọ m na Pécs, Hungary. Ndịàmà ise ọzọ nọ n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ, inwe ike ịkpakọrịta tọkwara anyị ụtọ. Otú ọ dị, ruo oge ụfọdụ, a kpọchiri nanị m, tụọ m ịga n’ụkwụ. Mgbe anyị jụrụ ịrụ ọrụ metụtara agha ahụ, e tiri anyị ihe. Ọzọkwa, a manyere anyị ịkwụrụ ọtọ ụbọchị nile, e wezụga hour abụọ n’ehihie. Ahụmahụ ọjọọ a gara n’ihu ruo ọtụtụ ọnwa. Ma anyị nwere obi ụtọ n’ihi na anyị nwere akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke anyị.

Okwu Banyere Imebi Okwukwe

Otu ụbọchị, otu ìgwè nke ndị ụkọchukwu Katọlik 15 bịara ịnwa ime ka anyị kweta na ọ dị mkpa ka anyị kwado agha ahụ site n’isonyere òtù ndị agha. N’oge mkparịta ụka ahụ anyị kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu pụrụ igosi site na Bible na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ nakwa na anyị ga-aga eluigwe ma ọ bụrụ na anyị anwụọ n’agha, anyị ga-esonyere òtù ndị agha.” N’ezie, ha enweghị ike igosi nke ahụ, ha achọghịkwa ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ.

Na 1941 anọsịrị m oge mkpọrọ m, anọkwa m na-elepụ anya ịnọnyeghachiri ezinụlọ m. Kama nke ahụ, a kpọọrọ m n’ịga gaa n’ogige ndị agha dị na Sárospatak, Hungary. Mgbe anyị bịarutere, e nyere m ohere nke ịbụ onye a tọhapụrụ. “Nanị ihe ị ga-eme,” ka a gwara m, “bụ ịbịanye aka ná nkwa a na ị ga-akwụ pengö 200 mgbe ị laruru.”

“Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume?” ka m jụrụ. “Gịnị ka unu chọrọ iji ego ahụ mee?”

“Maka ego ahụ ị ga-akwụ,” ka a gwara m, “ị ga-anata satifiketi na ị gafeghị nnyocha ahụ ike maka ndị agha.”

Nke a bụụrụ m mkpebi siri ike ime. Ruo ihe karịrị otu afọ, e mesowo m mmeso afọ ịta mmiri; ike agwụwala m. Ugbu a, site n’ikwere ịkwụ ego ụfọdụ, m pụrụ inwere onwe m. “M ga-echebara ya echiche,” ka m kwuru n’olu dị ala.

Mkpebi dị aṅaa ka m ga-eme? M ga-echebara nwunye m na ụmụ m echiche. N’ihe dị ka oge ahụ anatara m akwụkwọ ozi sitere n’aka onye Kraịst ibe m nke ọ nọ na ya nye m agbamume. O hotara Ndị Hibru 10:38, ebe Pọl onyeozi hotara okwu Jehova: “Onye ezi omume nke m ga-esite n’okwukwe dị ndụ: ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ọfịsa Hungary abụọ nọ n’ogige ndị agha ahụ sooro m kwurịta okwu, otu na-ekwu, sị: “Ị maghị ókè anyị na-akwanyeruru gị ùgwù maka ijigidesi ụkpụrụ Bible ike! Adala mbà!”

N’echi ya ejekwuuru m ndị ahụ sịrị ka m kwụọ pengö 200 iji tọhapụ m wee sị: “Ebe Jehova Chineke kwere ka a tụọ m mkpọrọ, ọ ga-ahụkwa na a tọhapụrụ m. Agaghị m akwụ ụgwọ iji bụrụ onye a tọhapụrụ.” Ya mere a tụrụ m mkpọrọ afọ iri. Ma nke ahụ abụghị njedebe nke mgbalị ndị e mere iji mee ka m mebie okwukwe m. Ụlọikpe kwuru na a ga-agbaghara m ma ọ bụrụ na m ga-ekweta ije ozi n’òtù ndị agha nanị ọnwa abụọ, na agaghịdị m ebu ngwá agha! Ajụkwara m nke ahụ, mkpọrọ m malitekwara.

Mkpagbu ahụ Arịa Elu

A kpụgara m ọzọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Pécs. N’oge a mmekpọ ọnụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ ọbụna karị. E kelara m aka n’azụ, e jikwa ha kowe m n’elu ruo ihe dị ka hour abụọ. N’ihi ya, ọkpụkpụ ubu m abụọ chikwapụrụ. E meghachiri mmekpọ ọnụ dị otú ahụ ruo ihe dị ka ọnwa isii. M ga-ekele nanị Jehova na adaghị m mbà.

Na 1942 a kpụụrụ anyị—ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị Juu, na Ndịàmà Jehova 26—gaa n’obodo Kursk dị n’ógbè ebe usuu ndị agha Germany nọ. E nyefere anyị n’aka ndị Germany, ha tinyekwara ndị mkpọrọ ahụ n’ọrụ nke ibugara ndị soja nọ n’ihu agha nri, ngwá agha, na uwe. Anyị bụ́ Ndịàmà jụrụ ịrụ ọrụ ahụ n’ihi na o mebiri nnọpụiche ndị Kraịst anyị. N’ihi ya, a kpụghachiiri anyị ndị Hungary.

E mesịa, a tụbara anyị n’ụlọ mkpọrọ dị n’ógbè Kursk. Ruo ọtụtụ ụbọchị e jiri okpiri rọba tie anyị ihe ugbo atọ n’ụbọchị. A kụrụ m ihe n’akụkụ ihu m m wee daa. Ka a na-eti m ihe, echere m n’echiche, ‘Ịnwụ ọnwụ arachaghị ahụ.’ Ahụ m nile kụnwụrụ, n’ihi ya apụghị m inwe mmetụta ọ bụla. Ruo ụbọchị atọ e nyeghị anyị nri ma ọlị. Mgbe nke ahụ gasịrị a kpụụrụ anyị gaa n’ụlọikpe, a makwara mmadụ isii ikpe ọnwụ. Mgbe e gburu ha, ọ fọdụzie anyị mmadụ 20.

Ule nke okwukwe ndị anyị nwetara n’ụbọchị ndị ahụ na Kursk n’October 1942 bụ nke kasị kpụ ọkụ n’ọnụ m nwetụrụla. Mmetụta anyị nwere bụ́ nke Eze Jehoshafat nke oge ochie kwupụtara nke ọma mgbe ndị ya chere ndị mmegide karịrị ha ukwuu ihu: “Ike adịghị n’ime anyị n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba nke na-abịa imegide anyị; anyị onwe anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme: kama ọ bụ Gị ka anya anyị na-adịkwasị.”—2 Ihe E Mere 20:12.

A kpụpụrụ anyị mmadụ 20 igwu ili anyị, ebe ndị soja 18 nke Hungary na-eche anyị nche. Mgbe anyị gwuchara, a gwara anyị na anyị nwere minit iri iji bịanye aka n’otu akwụkwọ, nke akụkụ ya na-agụ, sị: “Ozizi Ndịàmà Jehova ezighị ezi. Agakwaghị m ekwere ya ma ọ bụ kwado ya. Aga m alụrụ ala ndị Hungary ọgụ . . . Eji m mbịanye aka m na-emesi ya ike na m na-esonyere Chọọchị Roman Katọlik.”

Mgbe minit iri ahụ gasịrị e nyere iwu bụ́: “Tụgharịa n’aka nri! Gawanụ n’ili!” Mgbe ahụ, e nyeziri iwu bụ́: “Onye mkpọrọ nke mbụ na nke atọ banye n’olulu!” E nyere mmadụ abụọ a minit iri ọzọ iji kpebie ịbịanye aka n’akwụkwọ ahụ. Otu n’ime ndị soja ahụ rịọrọ, sị: “Jụ okwukwe gị ma si n’ili ahụ pụta!” Ọ dịghị onye tụpụrụ ọnụ. Mgbe ahụ onye ọfịsa okwu ahụ dị n’aka gbagburu ha abụọ.

“Gịnị banyere ndị ọzọ?” ka otu soja jụrụ ọfịsa ahụ okwu ahụ dị n’aka.

“Kee ha agbụ,” ka ọ zara. “Anyị ga-emekpọtụkwu ha ọnụ ma gbagbuo ha n’elekere anya isii n’ụtụtụ.”

Na mberede ụjọ tụwara m, ọ bụghị na m ga-anwụ, kama na m enweghị ike idi mmekpọ ọnụ ahụ m wee mebie okwukwe m. Ya mere ejekwuuru m ya ma sị: “Nna anyị ukwu, anyị ejehiewo dị ka ụmụnna anyị ndị ị ka gbagbuchara ugbu a jehiere. Gịnị mere na ị gaghị agbagbukwu anyị?”

Ma ha agbagbughị anyị. E kelara anyị aka azụ. A kwụwaziri anyị aka n’elu. Mgbe anyị na-amaghịkwa onwe anyị, ha ga-awụsa anyị mmiri. Ihe mgbu ahụ dị egwu n’ihi na ịdị arọ nke ahụ anyị mere ka ubu anyị chikwapụ. Mmekpọ ọnụ a dịgidere ruo ihe dị ka hour atọ. Mgbe ahụ, na mberede, e nyere iwu ka a ghara ịgbagbu onye ọzọ n’ime Ndịàmà Jehova.

Njem Gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ—Mgbapụzi

Izu atọ ka e mesịrị, a kwụrụ anyị n’ahịrị ruo ụbọchị ole na ole ruo mgbe anyị ruru n’ụsọ Osimiri Don. Ndị okwu anyị dị n’aka gwara anyị na a gaghị akpụghachi anyị ná ndụ. N’ehihie, e nyere anyị ọrụ na-abaghị n’ihe, igwu okokoro na ikpochikwa ha. N’anyasị, anyị nwetụrụ onwe anyị ịgagharị agagharị.

Dị ka m si hụ ya, anyị nwere ike ime ihe abụọ. Anyị pụrụ ịnwụ n’ebe ahụ kpọmkwem, ma ọ bụ anyị pụrụ ịgbapụ n’aka ndị Germany ma nyefee ndị Russia onwe anyị. Nanị anyị mmadụ atọ kpebiri ịgbalị ịgbapụ gafee Osimiri Don nke jụrụ oké oyi. Na December 12, 1942, anyị kpekuru Jehova ekpere ma malite njem. Anyị rutere n’ihu agha ndị Russia, a tụbakwara anyị ozugbo n’ụlọ mkpọrọ nke nwere ihe dị ka ndị mkpọrọ 35,000. Ka ọ na-erule n’oge opupu ihe ubi, nanị ihe dị ka ndị mkpọrọ 2,300 ka dị ndụ. Agụụ agụgbuchaala ndị ọzọ.

Nnwere Onwe na Ọdachi Ọzọ

Alanarịrị m n’agha ndị fọdụrụnụ, gụnyere ọtụtụ ọnwa mgbe o bisịrị, dị ka onye ndị Russia ji eji. N’ikpeazụ, na November 1945, alara m Zahor bụ́ obodo m. Ubi anyị emebichaala, ya mere aghaghị m ịmalitekwa n’isi. Nwunye m na ụmụ m arụwo ọrụ n’ubi ahụ n’oge agha ahụ, ma n’October 1944, ka ndị Russia bịarutere, e buuru ha gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ. A kwakọrọchaala ihe nile anyị nwere.

Nke kasị njọ, mgbe m lọghachiri ụlọ, nwunye m na-arịa oké ọrịa. Na February 1946, ọ nwụrụ. Ọ gbara nanị afọ 38. Anyị nwere nnọọ obere oge iji nụ ụtọ njikọghachi anyị mgbe ihe karịrị afọ ise dị ogologo, tara akpụ nke nkewa gasịrị.

Enwetara m nkasi obi n’etiti ụmụnna ime mmụọ m, ije nzukọ na ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ. Na 1947, agbazitere m ego ma mee njem gaa Brno, njem nke ihe dị ka kilomita 400, iji jee otu mgbakọ. Anatara m nkasi obi na agbamume dị ukwuu n’ebe ahụ, n’etiti ụmụnna m ndị Kraịst, gụnyere Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society mgbe ahụ.

Anyị anụghị ụtọ nnwere onwe anyị mgbe agha biri ruo ogologo oge. Na 1948 ọchịchị Kọmunist malitere ịkpagbu anyị. Na 1952, e jidere ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị na-edu ndú n’ọrụ Ndịàmà Jehova na Czechoslovakia, e nyekwara m ibu ọrụ ilekọta ọgbakọ dị iche iche. Na 1954, e jidekwara m, a tụkwara m mkpọrọ afọ anọ. A tụkwara nwa m nwoke, bụ́ Ján, na nwa ya nwoke bụ́ Juraj mkpọrọ n’ihi ịnọgide ná nnọpụiche ndị Kraịst ha. Anọrọ m afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ nke steeti Pankrác dị na Prague. E kwupụtara mgbaghara ndị ọchịchị na 1956, a tọhapụkwara m.

Nnwere Onwe n’Ikpeazụ!

N’ikpeazụ, na 1989, Ọchịchị Kọmunist dara na Czechoslovakia, e debakwara ọrụ Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. N’ihi ya, anyị nweere onwe anyị izukọta ọnụ na ime nkwusa n’ezoghị ezo. N’oge ahụ Zahor nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị Ndịàmà, nke pụtara na ihe dị ka 1 n’ime mmadụ 10 n’obodo ahụ bụ Onyeàmà. Afọ ole na ole gara aga, anyị wuru otu ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze buru ibu na Zahor, nke nwere oche ga-abata ihe dị ka mmadụ 200.

Ahụ esichakwaghị m ike, ya mere ụmụnna na-akwọrọ m n’ụgbọala gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ana m enweta ọṅụ ịnọ n’ebe ahụ, na-enwekwa ọṅụ ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Enwere m obi ụtọ karịsịa n’ịhụ ndị na-anọchi anya ọgbọ atọ nke ezinụlọ m ka ha na-ejere Jehova ozi, gụnyere ọtụtụ ụmụ ụmụ. Otu n’ime ndị a jere ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova na Czechoslovakia ruo mgbe ibu ọrụ ezinụlọ ya gbochiri ya ịrụzu ọrụ ya.

Ana m ekele Jehova maka ime ka m sie ike n’ọtụtụ oge ule m. Ọ bụ ilekwasị anya n’ebe ọ nọ—‘dị ka m na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya’—kwagidere m. (Ndị Hibru 11:27) Ee, enwewo m mmetụta nke aka nnapụta ya dị ike. Ọ bụ ya mere, ọbụna ugbu a, anọgidere m na-agbalị ịnọ ná nzukọ ọgbakọ nile na ikere òkè n’ịkpọsa aha ya n’ozi ihu ọha ruo n’ókè m nwere ike.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Zahor

[Foto dị na peeji nke 26]

Enwere m ekele maka ihe ùgwù nke ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya