Ndị A Kpọrọ Asị n’Ihi Okwukwe Ha
“Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—MATIU 10:22.
1, 2. Ị̀ pụrụ ịkọ ụfọdụ ahụmahụ ndị mere eme ndị Ndịàmà Jehova diworo n’ihi ikpe okpukpe ha?
E JIDERE otu onye na-akwụwa aka ọtọ nwe ụlọ ahịa bụ́ onye si n’àgwàetiti Krit ọtụtụ ugboro, kpọtakwa ya n’ihu ụlọikpe ndị dị na Gris ugboro ugboro. Ná ngụkọta, ọ nọrọ ihe karịrị afọ isii n’ụlọ mkpọrọ, na-anọpụ iche n’ebe nwunye ya na ụmụ ya ise nọ. Na Japan, a chụrụ otu nwa akwụkwọ dị afọ 17 n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụ ezie na ọ na-akpa àgwà ọma, na-agbakwa onye mbụ na klas ya nwere ụmụ akwụkwọ 42. Na France, a na-achụ ọtụtụ ndị mmadụ n’ọrụ ozugbo, ọ bụ ezie na ha nwere ihe ndekọ magburu onwe ya nke ịdị uchu na iji akọ na uche na-arụ ọrụ. Gịnị bụ ihe jikọtara ahụmahụ ndị a mere eme?
2 Ndị ahụ nile o metụtara bụcha Ndịàmà Jehova. Gịnị bụ “mpụ” ha mere? N’ụzọ bụ́ isi, ikpe okpukpe ha. Ná nrubeisi nye ozizi Jisọs Kraịst, onye ahụ nwe ụlọ ahịa anọwo na-eso ndị ọzọ ekerịta okwukwe ya. (Matiu 28:19, 20) A mara ya ikpe karịsịa n’okpuru iwu mgbe ochie nke Gris nke na-eme ka ịtọghata ndị ọzọ bụrụ ịda iwu ime mpụ. A chụrụ nwa akwụkwọ ahụ n’ihi na akọ na uche ya e ji Bible zụọ agaghị ekwe ya ikere òkè n’ọzụzụ kendo (nkà iji mma agha alụ ọgụ nke Japan) a manyere amanye. (Aịsaịa 2:4) A gwakwara ndị ahụ a chụrụ n’ọrụ na France na nanị ihe mere e ji chụọ ha bụ na ha bụ Ndịàmà Jehova.
3. N’ihi gịnị ka oké ịta ahụhụ n’aka ndị mmadụ ọzọ ji bụrụ nnọọ ihe na-adịghị emekebe n’ebe ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà Jehova nọ?
3 Ahụmahụ ndị dị otú ahụ tara akpụ bụ ihe atụ nke ihe Ndịàmà Jehova nọ ná mba ụfọdụ diworo na nso nso a. Otú ọ dị, nye ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà Jehova, ịta oké ahụhụ n’aka ndị mmadụ ọzọ bụ ihe na-adịghị emekebe nnọọ. A maara ndị Jehova gburugburu ụwa maka ezi àgwà ha—àgwà mere ka a ghara inwe ezi ihe mere onye ọ bụla ga-eji chọọ imerụ ha ahụ. (1 Pita 2:11, 12) Ha adịghị agba izu mmegide ma ọ bụ na-etinye aka n’akparamàgwà na-adịghị mma. (1 Pita 4:15) N’ụzọ dị iche, ha na-agbalị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Bible nke ibu ụzọ doo onwe onye n’okpuru Chineke, mgbe ahụzi n’okpuru ndị ọchịchị ụwa. Ha na-atụ ụtụ isi iwu chọrọ, na-agbalịkwa ka ha “na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18; 13:6, 7; 1 Pita 2:13-17) N’ọrụ ha nke ịkụzi Bible, ha na-akwalite nkwanye ùgwù nye iwu, ụkpụrụ ezinụlọ, na omume ọma. Ọtụtụ gọọmenti etowo ha maka ịbụ ụmụ amaala na-erube isi n’iwu. (Ndị Rom 13:3) Ma, dị ka paragraf mmeghe na-egosi, ha abụrụwo mgbe ụfọdụ ndị e megidere—n’ala ụfọdụ, ọbụna bụrụ ndị gọọmenti machibidoro iwu. Nke ahụ ò kwesịrị iju anyị anya?
‘Ihe Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Na-efu’
4. Dị ka Jisọs si kwuo, gịnị ka mmadụ pụrụ ịtụ anya ya mgbe ọ ghọrọ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya?
4 Jisọs Kraịst kọwara hoo haa ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ya ga-agụnye. “Ohu adịghị aka onyenwe ya ukwuu,” ka ọ gwara ụmụazụ ya. “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” A kpọrọ Jisọs asị “n’efu.” (Jọn 15:18-20, 25; Abụ Ọma 69:4; Luk 23:22) Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ịtụ anya otu ihe ahụ—mmegide na-enweghị ezi ihe ndabere. N’ihe karịrị otu ugbo, ọ dọrọ ha aka ná ntị, sị: ‘A ga-akpọ unu asị.’—Matiu 10:22; 24:9.
5, 6. (a) Gịnị mere Jisọs ji gbaa ndị na-aga ịghọ ụmụazụ ya ume ka ha “gụkọọ ihe ọ ga-efu”? (b) N’ihi gịnịzi ka ọ na-ekwesịghị iji ju anyị anya mgbe anyị zutere mmegide?
5 N’ihi ya, Jisọs gbara ndị na-aga ịbụ ụmụazụ ya ume ‘ịgụkọ ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ya ga-efu.’ (Luk 14:28, Revised Standard Version) N’ihi gịnị? Ọ bụghị iji kpebie ma hà kwesịrị ịghọ ụmụazụ ya ma ọ bụ na hà ekwesịghị, kama iji kpebisie ike imezu ihe ọ gụnyere. Anyị aghaghị ịdị njikere idi ọnwụnwa ma ọ bụ ihe isi ike ọ bụla ndị na-eso ihe ùgwù ahụ abịa. (Luk 14:27) Ọ dịghị onye na-amanye anyị ijere Jehova ozi dị ka onye na-eso ụzọ Kraịst. Ọ bụ mkpebi afọ ofufo; ọ bụkwa mkpebi dabeere n’ezi ihe ọmụma. Anyị bu ụzọ mara na tụkwasị ná ngọzi ndị anyị ga-enweta site n’iso Chineke banye ná mmekọrịta a raara nye, ‘a ga-akpọ anyị asị.’ Ya mere ọ dịghị eju anyị anya mgbe anyị zutere mmegide. Anyị ‘agụkọwo ihe ọ ga-efu,’ anyị dịkwa nnọọ njikere ịkwụ ya.—1 Pita 4:12-14.
6 N’ihi gịnị ka ụfọdụ, gụnyere ụfọdụ ndị isi gọọmenti, ga-eji achọ imegide ezi ndị Kraịst? Iji nweta azịza ya, ọ bụ ihe ga-enye aka inyocha òtù okpukpe abụọ na narị afọ mbụ O.A. A kpọrọ ha abụọ asị—kama n’ihi ihe ndị dị nnọọ iche.
Nke Na-akpọ Asị na nke A Kpọrọ Asị
7, 8. Ozizi ndị dị aṅaa gosipụtara nlelị n’ebe ndị Jentaịl nọ, àgwà dịkwa aṅaa bilitere n’etiti ndị Juu n’ihi ya?
7 Ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., Israel nọ n’okpuru ịchịisi Rom, okpukpe ndị Juu kwa, bụ́ usoro okpukpe ndị Juu, n’ozuzu ya nọ n’aka mmegbu nke ndị ndú dị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. (Matiu 23:2-4) Ndị ndú a na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè weere Iwu Mosis ndị ahụ e nyere banyere nnọpụiche site ná mba ndị ọzọ ma hịgharịa ha isi ịgụnye ilelị ndị na-abụghị ndị Juu anya. Ka ha na-eme nke ahụ, ha rụpụtara okpukpe nke kpaliri ịkpọ ndị Jentaịl asị, n’aka nke ya kwa, nweta ịkpọasị nke ndị Jentaịl.
8 O sirighị ndị ndú ndị Juu ike ịkpọsa nlelị maka ndị Jentaịl, ebe ọ bụ na ndị Juu n’oge ahụ lere ndị Jentaịl anya dị ka ihe ndị e kere eke rụrụ arụ. Ndị ndú okpukpe ahụ kụziri na nwanyị bụ́ onye Juu agaghị anọ nanị ya na ndị Jentaịl ma ọlị, n’ihi na “a na-enyo ha enyo ịbụ ndị na-adịghị ejide onwe n’ụzọ mmekọahụ.” Nwoke bụ́ onye Juu agaghị “anọ nanị ya na ha ebe ọ bụ na a na-enyo ha enyo ịbụ ndị na-awụfu ọbara.” A gaghị eji mmiri ara ehi onye Jentaịl pịtara mee ihe ọ gwụlakwa ma onye Juu ọ̀ nọ ya iji hụ otú e si pịta ya. Site ná mmetụta nke ndị ndú ha, ndị Juu zụlitere omume nke ọ gbasaghị m na nke nnọpụiche kpam kpam.—Tụlee Jọn 4:9.
9. Mmetụta dị aṅaa ka ozizi ndị ndú ndị Juu ziri banyere ndị na-abụghị ndị Juu nwere?
9 Nkụzi ndị dị otú ahụ banyere ndị na-abụghị ndị Juu mere ihe dị nta n’ịkwalite ezi mmekọrịta n’etiti ndị Juu na ndị Jentaịl. Ndị Jentaịl lewara ndị Juu anya dị ka ndị na-akpọ ihe nile a kpọrọ mmadụ asị. Onye Rom bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus (bụ́ onye a mụrụ n’ihe dị ka 56 O.A.) kwuru banyere ndị Juu na “ha ji ịkpọasị nile nke a na-akpọ ndị iro na-ele mmadụ ndị ọzọ anya.” Tacitus zọkwaara na a kụziiri ndị Jentaịl ghọrọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu ịjụ mba ha ma were ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha dị ka ndị na-abaghị n’ihe. N’ozuzu ha, ndị Rom nabatara ndị Juu, bụ́ ndị siri ike n’ihi ịdị ọtụtụ. Ma nnupụisi ndị Juu na 66 O.A. kpalitere mmegwara kpụ ọkụ n’ọnụ nke ndị Rom, na-eduga ná mbibi nke Jerusalem na 70 O.A.
10, 11. (a) Mmeso dị aṅaa n’ebe ndị ala ọzọ nọ ka Iwu Mosis chọrọ? (b) Ihe dị aṅaa ka anyị na-amụta site n’ihe mere okpukpe ndị Juu?
10 Olee otú ile ndị mba ọzọ anya otú ahụ dị n’iji ya atụnyere ụdị ofufe e depụtara n’Iwu Mosis? Iwu ahụ kwalitere nnọpụiche site ná mba ndị ọzọ n’ezie, ma nke a bụ iji chebe ndị Israel, karịsịa ofufe ha dị ọcha. (Joshua 23:6-8) Ya bụrụgodị otú ahụ, Iwu ahụ chọrọ ka e mesoo ndị ala ọzọ ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi na n’ụzọ dị mma nakwa ka a nabata ha nke ọma—ma ọ bụrụhaala na ha enupụghị isi n’iwu Israel n’ụzọ dị njọ. (Levitikọs 24:22) Site n’ịhapụ nzube ezi uche dị na ya nke pụtara ìhè n’Iwu ahụ banyere ndị ala ọzọ, ndị ndú okpukpe ndị Juu nke ụbọchị Jisọs rụpụtara ụdị ofufe nke kpalitere ịkpọasị, a kpọkwara ya asị. N’ikpeazụ, ihu ọma Jehova funahụrụ mba ndị Juu nke narị afọ mbụ ahụ.—Matiu 23:38.
11 È nwere ihe mmụta dị na nke a nye anyị? Ee, e nwere! Àgwà nke ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye, na nke iche na anyị ka ndị ọzọ mma bụ́ nke na-eleda ndị na-adịghị ekpe okpukpe anyị anya adịghị anọchite anya ofufe dị ọcha nke Jehova n’ụzọ ziri ezi, ọ dịghị atọkwa ya ụtọ. Tụlee ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ. Ha akpọghị ndị na-abụghị ndị Kraịst asị, ha enupụghịkwa isi megide Rom. Ka o sina dị, ‘a kpọrọ ha asị.’ N’ihi gịnị? Sitekwa n’aka ole ndị?
Ndị Kraịst Oge Mbụ —Olee Ndị Kpọrọ Ha Asị?
12. Olee otú o si doo anya site n’Akwụkwọ Nsọ na Jisọs chọrọ ka ụmụazụ ya nwee echiche ziri ezi banyere ndị na-abụghị ndị Kraịst?
12 O doro anya site n’ozizi Jisọs na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya nwee echiche ziri ezi banyere ndị na-abụghị ndị Kraịst. N’otu akụkụ, ọ sịrị na ụmụazụ ya ga-anọpụ iche site n’ụwa—ya bụ, ha ga-ezere omume na àgwà ndị megidere ụzọ ezi omume Jehova. Ha ga-anọpụ iche n’okwu ndị metụtara agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:14, 16) N’aka nke ọzọ, kama ịkwado ilelị ndị na-abụghị ndị Kraịst anya, Jisọs gwara ụmụazụ ya ka ha ‘na-ahụ ndị iro ha n’anya.’ (Matiu 5:44) Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume, sị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, na-azụ ya; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, gị mee ka ọ ṅụọ mmiri.” (Ndị Rom 12:20) Ọ gwakwara ndị Kraịst ka ha “na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.”—Ndị Galetia 6:10.
13. N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu ji nnọọ megide ndị na-eso ụzọ Kraịst?
13 Ma, n’oge na-adịghị anya ndị na-eso ụzọ Kraịst chọtara onwe ha ịbụ ndị ‘a kpọrọ asị’ site n’ebe atọ. Nke mbụ bụ ndị ndú okpukpe ndị Juu. Ka a sịkwa ihe mere ndị Kraịst ji dọrọ mmasị ha ngwa ngwa! Ndị Kraịst ahụ nwere ụkpụrụ dị elu nke omume ọma na iguzosi ike n’ezi ihe, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ere ka ọkụ zie ozi na-akpali olileanya. Ọtụtụ puku gbahapụrụ okpukpe ndị Juu ma nakwere Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 2:41; 4:4; 6:7) Nye ndị ndú okpukpe ndị Juu, ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị Juu abụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ndị si n’ezi ofufe dapụ! (Tụlee Ọrụ 13:45.) Ndị ndú a iwe ji chere na Iso Ụzọ Kraịst mere ka ọdịnala ha gharakwa ịdị irè. Leenụ, ọ jụdịrị echiche ha banyere ndị Jentaịl! Site na 36 O.A. gaa n’ihu, ndị Jentaịl pụrụ ịghọ ndị Kraịst, na-enwe otu okwukwe, sorokwa ndị Juu bụ́ ndị Kraịst na-enwe otu ihe ùgwù ahụ.—Ọrụ 10:34, 35.
14, 15. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji nweta ịkpọasị nke ndị na-ekpere arụsị? Nye otu ihe atụ. (b) Olee òtù nke atọ ‘kpọrọ ndị Kraịst oge mbụ asị’?
14 Nke abụọ, ndị Kraịst nwetara ịkpọasị nke ndị na-ekpere arụsị. Dị ka ihe atụ, n’Efesọs oge ochie, ịkpụ ụlọ nsọ nta nke ọlaọcha nke chi nwanyị bụ́ Daịana bụ achụmnta ego na-eweta uru. Ma mgbe Pọl mere nkwusa n’ebe ahụ, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị Efesọs zaghachiri, na-agbahapụ ofufe Daịana. N’ịbụ ndị e yiri ọrụ ha egwu, ndị ụ́zụ́ ọlaọcha kpasuru ọgba aghara. (Ọrụ 19:24-41) Ihe yiri nke ahụ mere mgbe Iso Ụzọ Kraịst gbasara ruo Bitinia (ebe ugwu ọdịda anyanwụ Turkey ugbu a). N’oge na-adịghị anya mgbe e desịrị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, gọvanọ nke Bitinia, bụ́ Pliny nke Nta, kọrọ na ụlọ nsọ ndị na-ekpere arụsị tọgbọrọ chakoo nakwa na ahịa nri anụ ụlọ a na-enye anụ ndị e ji achụ àjà dalatakwara nke ukwuu. A tara ndị Kraịst ụta—kpagbuokwa ha—ebe ọ bụ na ofufe ha adịghị anabata ịchụ àjà ụmụ anụmanụ na arụsị. (Ndị Hibru 10:1-9; 1 Jọn 5:21) N’ụzọ doro anya, mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst kpara ihe ụfọdụ a na-erite site n’ikpere arụsị aka, mmadụ ndị ma azụmahịa ma ego funahụkwara were iwe megide ya.
15 Nke atọ, ndị Kraịst ghọrọ ndị ndị Rom hụrụ mba ha n’anya ‘kpọrọ asị.’ Na mbụ, ndị Rom maara ndị Kraịst dị ka òtù okpukpe nta na ma eleghị anya nke na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Ma, ka oge na-aga, nanị mmadụ ịsị na ya bụ onye Kraịst ghọrọ ịda iwu na-eweta ọnwụ. N’ihi gịnị ka a ga-eji ele ụmụ amaala na-akwụwa aka ọtọ bụ́ ndị na-ebi ndụ ndị Kraịst anya dị ka ndị kwesịrị mkpagbu na ọnwụ?
Ndị Kraịst Oge Mbụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Kpọọ Ha Asị n’Ógbè Ndị Rom?
16. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst si nọpụ iche site n’ụwa, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji mee ka ha bụrụ ndị a na-ele anya ọjọọ n’ógbè ndị Rom?
16 N’ụzọ bụ́ isi, a kpọrọ ndị Kraịst asị n’ógbè ndị Rom maka ikpe okpukpe ha. Dị ka ihe atụ, ha nọpụrụ iche site n’ụwa. (Jọn 15:19) Ya mere ha anọghị n’ọkwá ọchịchị, ha jụkwara ije ozi agha. N’ihi ya, ‘e gosiri ha dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ebe ụwa dị, na ndị na-abaghị uru n’ihe omume nile nke ndụ,’ ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Augustus Neander na-ekwu. Ịnọpụ iche site n’ụwa pụtakwara izere ụzọ ọjọọ nke ógbè rụrụ arụ nke ndị Rom. “Ógbè nta dị iche iche nke ndị Kraịst na-enye ụwa ikpere arụsị ahụ nke ihe ụtọ na-emebi isi nsogbu site n’ime nsọ nsọ ha na ịdị ọcha ha,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-akọ. (1 Pita 4:3, 4) Site n’ịkpagbu na igbu ndị Kraịst, ndị Rom pụrụ ịchọwo ịbịanyụ ndị Kraịst ahụ na-enye nsogbu.
17. Gịnị na-egosi na ọrụ nkwusa nke ndị Kraịst narị afọ mbụ dị irè?
17 Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji ịnụ ọkụ n’obi a na-apụghị imebi emebi kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ka ọ na-erule ihe dị ka 60 O.A., Pọl pụrụ ikwu na e ‘kwusawo ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:23) Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ, ụmụazụ Jisọs emewo ndị na-eso ụzọ n’Alaeze Ukwu Rom nile—n’Esia, Europe, nakwa n’Africa! Ọbụna ụfọdụ n’ime “ndị nke ezinụlọ Siza” ghọrọ ndị Kraịst.a (Ndị Filipaị 4:22) Nkwusa a e ji ịnụ ọkụ n’obi mee kpalitere iwe. Neander na-ekwu, sị: “Iso Ụzọ Kraịst nọgidere na-enwe ihe ịga nke ọma n’etiti ndị mmadụ nọ n’ọkwá nile, na-eyikwa egwu ịkwatu okpukpe nke obodo.”
18. Olee otú inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa si mee ka ndị Kraịst na ọchịchị ndị Rom ghara ịdị ná mma?
18 Ụmụazụ Jisọs nyere Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Matiu 4:8-10) Ikekwe akụkụ a nke ofufe ha tinyere ha n’iro ha na ndị Rom karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ndị Rom kwere ka okpukpe ndị ọzọ dịrị, ọ bụrụhaala na ndị na-ekpe ha na-ekerekwa òkè n’ife eze ukwu. Ndị Kraịst oge mbụ apụghị nnọọ ikere òkè n’ofufe dị otú ahụ. Ha lere onwe ha anya dị ka ndị ga-aza ajụjụ nye ịbụisi nke ka ọchịchị Rom elu, ya bụ, nke Jehova Chineke. (Ọrụ 5:29) N’ihi ya, n’agbanyeghị otú onye Kraịst bụruru ezi nwa amaala n’akụkụ ndị ọzọ nile, e lere ya anya dị ka onye iro nke ọchịchị.
19, 20. (a) Olee ndị kpatara n’ụzọ dị ukwuu nkwutọ ahụ jọgburu onwe ya nke a gbasara banyere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi? (b) Ebubo ụgha ndị dị aṅaa ka e welitere megide ndị Kraịst?
19 A ka nwere ihe ọzọ mere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ji bụrụ ndị ‘a kpọrọ asị’ n’ógbè ndị Rom: Nkwutọ jọgburu onwe ya megide ha ghọrọ ihe e kweere ngwa ngwa, bụ́ ebubo ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere aka dị ukwuu na ya. (Ọrụ 17:5-8) N’ihe dị ka 60 ma ọ bụ 61 O.A., mgbe Pọl nọ na Rom na-echere ikpe nke Eze Ukwu bụ́ Nero ga-ekpe ya, ndị Juu na-edu ndú kwuru banyere ndị Kraịst, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Obi abụọ adịghị ya na Nero nụrụ akụkọ nkwutọ dị iche iche banyere ha. Na 64 O.A., mgbe a tara ya ụta maka ọkụ repịara Rom, a kọrọ na Nero họpụtara ndị Kraịst ahụ a dị mbụ na-ekwugide dị ka ndị ga-eburu ụta ahụ. Nke a yiri ka ọ kpaliteworị oké mkpagbu dị ike nke e zubere iji kpochapụ ndị Kraịst.
20 Ebubo ụgha ndị e boro ndị Kraịst bụkarịrị ngwakọta nke ụgha pụtara ìhè na nhịgharị nke nkwenkwe ha. N’ihi na ha kwere nanị n’otu Chineke, ha adịghịkwa efe eze ukwu ofufe, a sịrị na ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke. Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ na-abụghị ndị Kraịst megidere ndị ikwu ha bụ́ ndị Kraịst, e boro ndị Kraịst ebubo na ha na-etisa ezinụlọ. (Matiu 10:21) A kọwara ha dị ka ndị na-eri anụ mmadụ, bụ́ ebubo, ka ụfọdụ ndị na-ekwu, dabeere ná nhịgharị nke okwu Jisọs kwuru n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.—Matiu 26:26-28.
21. N’ihi ihe abụọ dị aṅaa ka ndị Kraịst ji bụrụ ndị ‘a kpọrọ asị’?
21 Ya mere, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị ndị Rom ‘kpọrọ asị’ n’ihi ihe abụọ bụ́ isi: (1) nkwenkwe na omume ha ndị dabeere na Bible, na (2) ebubo ụgha ndị e boro ha. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ndị mmegide ahụ nwere nanị otu ebumnobi—ịkwụsị Iso Ụzọ Kraịst. N’ezie, ndị na-akpalite mkpagbu nke ndị Kraịst n’ezie bụ ndị mmegide karịrị ụmụ mmadụ ike, bụ́ ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya.—Ndị Efesọs 6:12.
22. (a) Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na Ndịàmà Jehova na-agbalị ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ’? (Lee igbe dị na peji nke 11.) (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 Dị ka ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà Jehova n’oge ndị a abụwo ndị ‘a kpọrọ asị’ n’ala dị iche iche. Ma ha adịghị akpọ ndị na-abụghị Ndịàmà asị; ha akpalitetụbeghịkwa nnupụisi megide gọọmenti dị iche iche. N’ụzọ dị iche, a maara ha gburugburu ụwa maka inwe ezi ịhụnanya nke na-agabiga ihe mgbochi ọha, agbụrụ na ebo dị iche iche. Gịnịzi mere e jiworo kpagbuo ha? Oleekwa otú ha si emeghachi omume n’ebe mmegide dị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu ahụ bụ́ “ndị nke ezinụlọ Siza” adịghị ezocha aka ná ndị òtù ezinụlọ Nero kpọmkwem, bụ́ onye na-achị achị mgbe ahụ. Kama, ọ pụrụ imetụta ndị odibo na-eje ozi n’ụlọ na ndị isi na-anọghị n’ọkwá ukwu, bụ́ ndị ma eleghị anya jere ozi ndị dị n’ụlọ dị ka isi nri na nhicha maka ezinụlọ na ndị ọrụ eze ukwu ahụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji gbaa ndị na-aga ịghọ ụmụazụ ya ume ịgụkọ ihe ịbụ ndị na-eso ụzọ ga-efu?
◻ Echiche jupụtara ebe nile banyere ndị na-abụghị ndị Juu nwere mmetụta dị aṅaa n’okpukpe ndị Juu, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?
◻ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nke oge mbụ chere mmegide ihu site n’ebe atọ dị aṅaa?
◻ N’ihi ihe ndị dị aṅaa bụ́ isi ka ndị Kraịst oge mbụ ji bụrụ ndị ndị Rom ‘kpọrọ asị’?
[Igbe dị na peeji nke 11]
‘Ịrụ Ezi Ihe n’Ebe Mmadụ Nile Nọ’
Ndịàmà Jehova na-agbalị ịṅa ntị ná ndụmọdụ Bible bụ́ ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.’ (Ndị Galetia 6:10) N’oge mkpa, ịhụnanya maka ndị agbata obi na-akwali ha inyere ndị na-anọghị n’okpukpe ha aka. Dị ka ihe atụ, n’oge ọnọdụ ọdachi ahụ mere na Rwanda na 1994, Ndịàmà si Europe wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ịga Africa iji nye aka n’ọrụ enyemaka. A rụrụ ogige ndị a haziri nke ọma na ụlọ ọgwụ n’ogige dị iche iche ngwa ngwa iji nye aka. E jiwo ụgbọelu buga ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke nri, ákwà, na blanket. Ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ ritere uru site n’ọrụ enyemaka a ji ihe karịrị okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji ịnụ ọkụ n’obi a na-apụghị imebi emebi kwusaa ozi ọma ahụ