Ichebe Ozi Ọma ahụ n’Ụzọ Iwu
RUO ogologo oge nile mmadụ nọworo na-ewu obodo, ọ nọwo na-ewu mgbidi. Karịsịa n’oge ndị gara aga, ihe mgbochi ndị a bụ ihe nchebe. Site n’elu ihe mgbochi a, ndị nchebe pụrụ ịlụ ọgụ iji gbochie ndị mwakpo ịkụpu ma ọ bụ kwatuo mgbidi ahụ. Ọ bụghị nanị na a na-echebe ndị bi n’obodo ahụ kamakwa mgbe mgbe ndị bi n’obodo ndị dị ya gburugburu na-agbabakwa n’ime ya.—2 Samuel 11:20-24; Aịsaịa 25:12.
N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova ewuwo mgbidi—mgbidi iwu kwadoro—nke nchebe. E wughị mgbidi a iji kewapụ Ndịàmà n’ebe ọha na eze nọ, n’ihi na a maara Ndịàmà Jehova maka ịbụ ndị ha na ndị ọzọ na-emekọrịta ihe, na ndị nwere omume enyi. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka nkwa nnwere onwe ndị bụ́ isi iwu kwadoro maka mmadụ nile sie ike. N’otu oge ahụ, ọ na-echebe ikike ndị iwu kwadoro nke Ndịàmà nwere, ka ha wee nwee ike nwere onwe ha ife ofufe ha. (Tụlee Matiu 5:14-16.) Mgbidi a na-echebe ụzọ ha si efe ofufe na ikike ha nwere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Gịnị bụ mgbidi a, oleekwa otú e siworo wuo ya?
Iwu Mgbidi Nchebe nke Iwu Kwadoro
Ọ bụ ezie na e nyere Ndịàmà Jehova nnwere onwe okpukpe n’ọtụtụ ala, ná mba ụfọdụ a wakpowo ha n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe e guzogidere nnwere onwe ife ofufe ha site n’izukọ ọnụ ma ọ bụ site n’ikwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha achụsowo okwu ndị ahụ n’ụzọ iwu. Okwu ikpe ndị metụtara Ndịàmà eruwo ọtụtụ puku n’ụwa nile.a Ọ bụghị ha nile laara ha. Ma mgbe ụlọikpe ndị dị ala kpegidere ha, ha etinyewo akwụkwọ mkpegharị ikpe mgbe mgbe n’ụlọikpe ndị ka elu. Gịnị ka ọ rụpụtara?
N’ime ọtụtụ iri afọ nke narị afọ nke 20, mmeri n’okwu ikpe ndị e nwere n’ọtụtụ ala eguzobewo ụkpụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ha bụ́ ndị Ndịàmà Jehova legawooro anya maka enyemaka n’okwu ikpe ndị ọzọ. Dị ka brik ma ọ bụ nkume ndị e ji wuo mgbidi, mkpebi ndị a laara ha na-emejupụta mgbidi nchebe nke iwu kwadoro. Site n’elu mgbidi ụkpụrụ iwu a, Ndịàmà anọgidewo na-alụ ọgụ maka nnwere onwe okpukpe iji na-efe ofufe ha.
Tụlee, dị ka ihe atụ, okwu ikpe Murdock megide Commonwealth nke Pennsylvania, bụ́ nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States kpebiri na May 3, 1943. Ajụjụ e welitere n’okwu ikpe ahụ bụ nke a: Ò kwesịrị ka Ndịàmà Jehova na-enweta akwụkwọ ikike azụmahịa maka ikesa akwụkwọ okpukpe ha? Ndịàmà Jehova kwusiri ike na e kwesịghị ịchọ ka ha mee otú ahụ. Ọrụ nkwusa ha abụghị—ọ dịbeghịkwa mgbe ọ bụ—nke azụmahịa. Nzube ha abụghị ịkpata ego, kama ikwusa ozi ọma ahụ. (Matiu 10:8; 2 Ndị Kọrint 2:17) Ná mkpebi Murdock ahụ, Ụlọikpe ahụ kwenyeere Ndịàmà, na-ekwu na ọchịchọ ọ bụla a chọrọ ka a tụọ ụtụ isi ịnata ikike dị ka ihe a na-aghaghị ime tupu a na-ekesa akwụkwọ okpukpe enweghị nkwado iwu.b Mkpebi a setịpụrụ ụkpụrụ dị mkpa, Ndịàmà enwewokwa ihe ịga nke ọma n’ilegara ya anya maka enyemaka dị ka ikike n’ọtụtụ okwu ikpe kemgbe ahụ. Mkpebi Murdock ahụ abụrụwo brik siri ike ná mgbidi nchebe ahụ iwu kwadoro.
Okwu ikpe ndị dị otú ahụ arụwo ọrụ dị ukwuu iji chebe nnwere onwe okpukpe maka mmadụ nile. Banyere òkè Ndịàmà keere n’ichebe ihe ndị ruuru nwa amaala na United States, University of Cincinnati Law Review kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova enwewo mmetụta miri emi n’uto nke ụkpụrụ iwu, karịsịa site n’ịgbasapụ ókè nke nchebe maka okwu na okpukpe.”
Iwusi Mgbidi ahụ Ike
Mmeri nke ọ bụla n’okwu ikpe na-eme ka mgbidi ahụ na-esikwu ike. Tụlee ụfọdụ n’ime mkpebi ndị e mere n’afọ ndị 1990 bụ́ ndị bawooro Ndịàmà Jehova, nakwa ndị nile hụrụ nnwere onwe n’anya, n’ụwa nile uru.
Gris. Na May 25, 1993, Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe kwadoro ikike nke otu nwa amaala Gris nwere ịkụziri ndị ọzọ nkwenkwe okpukpe ya. Okwu ikpe ahụ metụtara Minos Kokkinakis, bụ́ onye gbara afọ 84 mgbe ahụ. Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, e jidewo Kokkinakis ihe karịrị ugboro 60 kemgbe 1938, a kpụpụwo ya ihe karịrị ugboro 18 n’ụlọikpe Gris, ọ nọwokwa ihe karịrị afọ isii n’ụlọ mkpọrọ. A mawo ya ikpe karịsịa n’ihi iwu Gris nke afọ ndị 1930 bụ́ nke na-amachibido ime ntọghata—iwu nke kpatara njide nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà Jehova 20,000 site na 1938 ruo 1992. Ụlọikpe Europe ahụ kpebiri na gọọmenti Gris emebiwo nnwere onwe okpukpe nke Kokkinakis ma kwuo ka a kwụọ ya ihe iti aka n’obi n’ọnụ ego dị $14,400. Ná mkpebi ya, Ụlọikpe ahụ kpebiri na Ndịàmà Jehova bụ n’ezie “okpukpe a ma ama.”—Lee Ụlọ Nche nke September 1, 1993, peji nke 27-31.
Mexico. Na July 16, 1992, e weere nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ n’ichebe nnwere onwe okpukpe na Mexico. N’ụbọchị ahụ, e guzobere Iwu nke Òtù Okpukpe na Ofufe Ihu Ọha. Site n’iwu a, òtù okpukpe pụrụ ịnata nkwado iwu dị ka òtù okpukpe site ideba aha otú a chọrọ. Na mbụ, Ndịàmà Jehova, dị ka okpukpe ndị ọzọ ná mba ahụ, dị adị n’ezie ma ha enweghị ọdịdị nke iwu kwadoro. N’April 13, 1993, Ndịàmà tinyere akwụkwọ maka ndebanye aha. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, na May 7, 1993, e debanyere aha ha n’ụzọ iwu kwadoro dị ka La Torre del Vigía, A. R., na Los Testigos de Jehová en México, A. R., ha abụọ bụ òtù okpukpe.—Lee Teta!, October 8, 1994, peji nke 12-14.
Brazil. Na November 1990, Ụlọ Ọrụ Mba Maka Nchebe Ọha na Eze (INSS) nke Brazil mere ka alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society mara na a gaghị elekwa ndị ozi afọ ofufo nọ na Betel (aha alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova) anya ọzọ dị ka ndị ozi okpukpe, n’ihi ya kwa, na ha ga-anọ n’okpuru iwu ọrụ nke Brazil. Ndịàmà tinyere akwụkwọ ka e lebagharịa mkpebi ahụ anya. Na June 7, 1996, Ndị Ndụmọdụ Okwu Ikpe nke Ọfịs nke Ọkaikpe Ukwu na Brasília kwupụtara mkpebi na-akwado ọnọdụ ndị ozi nọ na Betel dị ka ndị òtù nke okpukpe iwu kwadoro, ọ bụghị dị ka ndị na-arụ ọrụ ego.
Japan. Na March 8, 1996, Ụlọikpe Kasị Elu nke Japan kwupụtara mkpebi ya n’okwu ikpe metụtara agụmakwụkwọ na nnwere onwe okpukpe—n’ụzọ baara onye ọ bụla nọ na Japan uru. Ụlọikpe ahụ ji otu olu kpebie na Kobe Municipal Industrial Technical College dara iwu site n’ịchụpụ Kunihito Kobayashi n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ ikere òkè n’ọzụzụ egwuregwu ọgụ aka na ụkwụ. Mkpebi a na-aka akara nke mbụ ya Ụlọikpe ahụ Kasị Elu kwupụtara mkpebi dabeere ná nnwere onwe okpukpe nke Ụkpụrụ Iwu Japan nyere ohere ya. N’ịgbaso akọ na uche ya e ji Bible zụọ, Onyeàmà a na-eto eto chere na ọzụzụ ndị a ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible ndị dị ka nke ahụ a na-achọta n’Aịsaịa 2:4, nke na-asị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” Mkpebi nke Ụlọikpe ahụ guzobere ụkpụrụ maka okwu ikpe ndị a ga-enwe n’ọdịnihu.—Lee Ụlọ Nche, November 1, 1996, peji nke 19-21.
Na February 9, 1998, Ụlọikpe Dị Elu nke Tokyo mere mkpebi ọzọ dị ịrịba ama na-akwado ikike otu Onyeàmà aha ya bụ́ Misae Takeda nwere ịjụ ọgwụgwọ nke na-ekwekọghị n’iwu Bible nke ‘ịhapụ ọbara.’ (Ọrụ 15:28, 29.) E tinyewo akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe a n’Ụlọikpe Kasị Elu, ọ fọdụkwara ka a hụ ma a ga-akwado mkpebi nke Ụlọikpe ahụ Dị Elu.
Philippines. Ná mkpebi e kwupụtara na March 1, 1993, Ụlọikpe Kasị Elu nke Philippines ji otu olu kpelaara Ndịàmà Jehova n’okwu ikpe metụtara ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà a chụpụrụ n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha ji nkwanye ùgwù jụ ikele ọkọlọtọ.
Ikpe ọ bụla ụlọikpe kpelaara ha yiri nkume ma ọ bụ brik ọzọ nke na-ewusi mgbidi ahụ iwu kwadoro ike bụ́ nke na-echebe ikike nke, ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova kama mmadụ nile.
Ichebe Mgbidi Ahụ
E debanyere aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro n’ala 153, ha nweere onwe ha n’ọtụtụ ụzọ n’ụzọ ziri ezi, dị ka okpukpe ndị ọzọ a ma ama nweere. Mgbe ọtụtụ iri afọ nke mkpagbu na mmachibido gasịrị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na ná mba ndị bụbu Soviet Union, a maara Ndịàmà Jehova ugbu a n’ụzọ iwu kwadoro ná mba ndị dị ka Albania, Belarus, Czech Republic, Georgia, Hungary, Kazakstan, Kyrgyzstan, Romania, na Slovakia. Otú ọ dị, n’ala ụfọdụ taa, gụnyere n’ụfọdụ mba ebe Ọdịda Anyanwụ Europe bụ́ ndị nwere usoro ikpe ndị e guzobere mgbe dị anya gara aga, a na-ama ikike Ndịàmà Jehova aka ma ọ bụ na-anapụ ha ya n’ụzọ siri ike. Ndị mmegide na-arụsi ọrụ ike iji ‘ụkpụrụ akpụzi mmegbu’ megide Ndịàmà. (Abụ Ọma 94:20) Olee otú ha si emeghachi omume?c
Ndịàmà Jehova na-achọ ikwenyere gọọmenti dum, ma ha na-achọkwa inweta nnwere onwe iwu kwadoro iji na-efe ofufe ha. Ha kwenyesiri ike na iwu ma ọ bụ mkpebi ụlọikpe ọ bụla nke ga-egbochi ha irubere iwu Chineke isi—gụnyere iwu ikwusa ozi ọma—enweghị isi. (Mak 13:10) Ọ bụrụ na a pụghị inwe nkwekọrịta, Ndịàmà Jehova ga-eji ya gaa n’ụlọikpe, na-achụso ọ̀tụ̀tụ̀ mkpegharị ikpe nile dị mkpa iji nweta nchebe iwu kwadoro maka ikike Chineke nyere ha ife ofufe ha. Ndịàmà Jehova nwere obi ike zuru ezu ná nkwa Chineke bụ́: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma.”—Aịsaịa 54:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle sara mbara nke ihe ndekọ okwu ikpe nke Ndịàmà Jehova, biko lee isiakwụkwọ nke 30 nke akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ná mkpebi Murdock ahụ, Ụlọikpe ahụ Kasị Elu gbanwere ọnọdụ ya n’okwu ikpe Jones megide Obodo Opelika. N’okwu ikpe Jones, na 1942, Ụlọikpe ahụ Kasị Elu akwadowo mkpebi nke ụlọikpe dị ala bụ́ nke mara Rosco Jones, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ikpe ikesa akwụkwọ n’okporo ámá Opelika, Alabama, n’atụghị ụtụ isi nke ịnata ikike.
c Lee isiokwu ndị bụ́ “Ndị A Kpọrọ Asị n’Ihi Okwukwe Ha” na “Ịgọpụrụ Okwukwe Anyị,” na peji nke 8-18.
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ichebe Ikike Ndịàmà Jehova Nwere
Mkpagbu a kpagbuworo Ndịàmà Jehova emewo ka ha bụrụ ndị a kpụpụrụ n’ihu ndị ikpe na ndị ọchịchị n’ụwa nile. (Luk 21:12, 13) Ndịàmà Jehova etinyewo mgbalị nile n’ichebe ihe ndị ruuru ha n’ụzọ iwu. Mmeri ndị e nwere n’ụlọikpe n’ọtụtụ ala enyewo aka ichebe nnwere onwe iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova, gụnyere ikike ha nwere:
◻ ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’enweghị ihe mgbochi ndị a na-atụkwasị n’isi ndị na-azụ ahịa—Murdock megide Commonwealth nke Pennsylvania, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States (1943); Kokkinakis megide Gris, Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe (ECHR) (1993).
◻ izukọ maka ofufe n’enweghị ihe mgbochi—Manoussakis na Ndị Ọzọ megide Gris, ECHR (1996).
◻ ikpebi otú ha pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù n’ụzọ ziri ezi maka ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe nnọchianya nke mba—Bọọdụ Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ na West Virginia State megide Barnette, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States (1943); Ụlọikpe Kasị Elu nke Philippines (1993); Ụlọikpe Kasị Elu nke India (1986).
◻ ịjụ ije ozi agha nke na-emebi akọ na uche ndị Kraịst ha—Georgiadis megide Gris, ECHR (1997).
◻ ịhọrọ ọgwụgwọ na ọgwụ ndị na-adịghị emebi akọ na uche ha—Malette megide Shulman, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Ontario, Canada (1990); Watch Tower megide E.L.A., Ụlọikpe Ka Elu, San Juan, Puerto Rico (1995); Fosmire megide Nicoleau, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke New York, U.S.A. (1990).
◻ ịzụlite ụmụ ha dị ka nkwenkwe ha ndị dabeere na Bible si dị ọbụnadị mgbe a mara nkwenkwe ndị a aka n’esemokwu ịkpọrọ nwa—St-Laurent megide Soucy, Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada (1997); Hoffmann megide Austria, ECHR (1993).
◻ inwe na ilekọta ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro bụ́ ndị a gụpụkwara n’ịtụ ụtụ isi otú e si gụpụ ụlọ ọrụ okpukpe ndị ọzọ a ma ama ji eme ihe—Ndị Mmadụ megide Haring, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe, New York, U.S.A., (1960).
◻ inweta ọnọdụ maka ndị ahụ a họpụtara n’ụdị ụfọdụ nke ozi oge nile pụrụ iche n’ihe metụtara ụtụ isi kpọmkwem otú ndị ọrụ okpukpe oge nile n’okpukpe ndị ọzọ nwetara—Ụlọ Ọrụ Mba Maka Nchebe Ọha na Eze nke Brazil, Brasília, (1996).
[Foto dị na peeji nke 20]
Minos Kokkinakis na nwunye ya
[Foto dị na peeji nke 20]
Kunihito Kobayashi
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]
The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck