Site n’Ofufe Eze Ukwu Gaa n’Ezi Ofufe
DỊ KA ISAMU SUGIURA SI KỌỌ
Ọ bụ ezie na o doro anya na 1945 na a gaje imeri Japan n’Agha Ụwa nke Abụọ, anyị nwere obi ike na “kamikaze” (“ifufe Chineke”) ga-efe ma merie ndị iro ahụ. “Kamikaze” na-ezo aka n’oké ifufe ndị ahụ fere na 1274 nakwa na 1281 bụ́ ndị bibiri ihe ka ọtụtụ n’ụgbọ agha mmiri ndị Mongol na-eme mwakpo ugboro abụọ pụọ n’ụsọ oké osimiri ndị Japan, si otu a na-amanye ha ịlaghachi azụ.
YA MERE, mgbe Eze Ukwu Hirohito maara mba ahụ ọkwa n’August 15, 1945, na Japan achịliworo Ndị Agha Jikọrọ Aka, aka elu, olileanya nke otu narị nde mmadụ raara onwe ha nye ya dakpọrọ. Abụ m nwata akwụkwọ mgbe ahụ, olileanya m dakpọkwara. ‘Ọ bụrụ na eze ukwu ahụ abụghị Chineke dị ndụ, ònye bụzi?’ Ka m chere. ‘Ònye ka m kwesịrị ịtụkwasị obi?’
Otú ọ dị, n’ezie, mmeri e meriri Japan n’Agha Ụwa nke Abụọ megheere mụ na ọtụtụ puku ndị Japan ndị ọzọ ụzọ ịmụta banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Tupu m kọọ banyere mgbanwe ndị m na-aghaghị ime, ka m mee ka unu mara banyere nzụlite okpukpe m nwere.
Mmetụta Ndị Mbụ nke Okpukpe
A mụrụ m n’obodo ukwu nke Nagoya na June 16, 1932, nwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ nwoke anọ. Nna m rụrụ ọrụ dị ka onye na-atụ ókè ala nke obodo ukwu ahụ. Nne m bụ ezigbo onye kweere na Tenrikyo, bụ́ otu ịrọ òtù nke Shinto, ọkpara nne m anatawokwa ọzụzụ okpukpe iji bụrụ onye ozizi Tenrikyo. Mụ na nne m nwere mmekọrịta chiri anya karịsịa, ọ kpọkwaara m jee n’ebe ha na-ezukọ maka ofufe.
A kụziiri m ihulata isi m ma kpee ekpere. Okpukpe Tenrikyo kụziri nkwenkwe n’onye okike a kpọrọ Tenri O no Mikoto, nakwa na chi iri ndị dị ala karị. Ndị nọ n’okpukpe a jiri okwukwe gwọọ ọrịa, ha mesikwara ijere ndị ọzọ ozi na ịgbasa nkwenkwe ha ike.
Dị ka nwa okoro, m nwere oké ọchịchọ ịmata ihe. Enwere m ihe ijuanya ịhụ ọnwa na kpakpando ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ n’eluigwe n’anyasị, ana m echekwa ókè mbara igwe gbasaruru gabiga eluigwe. Ahụrụ m ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị ikiri uto nke aṅara na cucumber ndị m kụrụ n’obere ala dị n’azụ ụlọ. Ikiri ihe okike mere ka nkwenye m kwenyere na Chineke sie ike.
Afọ Ndị A Lụrụ Agha
Afọ ndị m nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị malite na 1939 ruo 1945 dabakọrọ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. E mesiri ofufe eze ukwu, bụ́ otu akụkụ dị mkpa nke Shinto, ike n’agụmakwụkwọ anyị. E ziri anyị ihe na shushin, nke gụnyere ọzụzụ banyere omume nke metụtakarịsịrị ịhụ mba n’anya na ibu agha. Ememe iweli ọkọlọtọ elu, ikwe ukwe ito mba, ịmụ iwu agụmakwụkwọ nke eze ukwu, na ịkwanyere foto eze ukwu ùgwù bụcha akụkụ nke usoro ime ihe nke ụlọ akwụkwọ anyị.
Anyị jekwara n’ihu arụsị Shinto dị n’ógbè ahụ ịrịọ Chineke ka usuu ndị agha eze ukwu merie. Ụmụnne m ndị nwoke abụọ bụ ndị agha. N’ihi ịhụ mba n’anya na okpukpe a kụziiri m, aṅụrịrị m ọṅụ ịnụ akụkọ banyere ihe ịga nke ọma ndị usuu ndị agha Japan nwere.
Nagoya bụ ebe bụ́ isi nke ụlọ ọrụ ụgbọelu ndị Japan, ya mere ọ bụ ebe ìgwè Ndị Agha Ụgbọelu nke United States kasị lekwasị anya itisasị. N’oge ehihie, ụgbọelu e ji atụ bọmbụ bụ́ B-29 Superfortress sooro n’ahịrị fegharịa n’obodo ukwu ahụ n’ihe dị ka mita 9,000, na-atụdata ọtụtụ narị bọmbụ n’ógbè ụlọ ọrụ mmepụta ihe ahụ. N’anyasị, e jiri tọọchị na-enwu zaa chọpụta ụgbọelu ndị ahụ e ji atụ bọmbụ n’ebe dị ala ruo ihe dị ka mita 1,300. Mwakpo ụgbọelu ndị e jiri bọmbụ ndị na-amụnye ihe ọkụ mee ugboro ugboro, mere ka ógbè nwere ụlọ obibi gbapịa ọkụ. E mere mwakpo ụgbọelu dị 54 na Nagoya nanị n’ime ọnwa itoolu ndị ikpeazụ nke agha ahụ, na-akpata oké nhụjuanya na ọnwụ nke ihe karịrị mmadụ 7,700.
N’oge a, a malitewo iji ụgbọ agha mmiri atụ obodo ukwu iri ndị dị n’ụsọ oké osimiri bọmbụ, ndị mmadụ nọkwa na-ekwu banyere mfetu pụrụ ikwe mee nke ndị agha United States na nso Tokyo. A zụrụ ụmụ nwanyị na ụmụ okoro na-eto eto iji ube e ji achara mee alụ ọgụ iji chebe mba ahụ. Okwu e ji mara anyị bụ “Ichioku Sougyokusai,” nke pụtara “Otu narị nde mmadụ nwụọ kama anyị ga-achịli aka elu.”
N’August 7, 1945, otu isiakụkọ pụtara n’akwụkwọ akụkọ kọrọ, sị: “A Tụrụ Ụdị Bọmbụ Ọhụrụ na Hiroshima.” Abalị abụọ nke a mesịrị, a tụrụ ọzọ na Nagasaki. Ha bụ bọmbụ atọm, e mesịkwara gwa anyị na ha egbuwo ihe karịrị mmadụ 300,000 ma a gbakọta ha. Mgbe ahụ, ná njedebe nke otu ọzụzụ iji égbè osisi azọ njem n’August 15, anyị nụrụ okwu eze ukwu ebe ọ nọrọ maa ọkwa banyere nchịli aka elu ndị Japan. Obi esiwo anyị ike na anyị ga-emeri, ma ugbu a a kpaghasịwo uche anyị!
Olileanya Ọhụrụ Amalite
Ka mweghara site n’aka usuu ndị agha America malitere, anyị jiri nke nta nke nta nakwere eziokwu ahụ bụ́ na ndị United States emeriwo n’agha ahụ. E webatara ọchịchị onye kwuo uche ya na Japan, nakwa ụkpụrụ iwu ọhụrụ nke nyere nnwere onwe ife ofufe. Ọnọdụ obibi ndụ siri ike, ihe oriri dị ụkọ, na 1946 nna m nwụkwara n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ.
Ka ọ dịgodị mgbe ahụ, a malitere ịkụzi Bekee n’ụlọ akwụkwọ m na-eje, ụlọ ọrụ redio bụ́ NHK malitekwara otu usoro ihe omume e ji Bekee na-akparịta ụka na ya. Ruo afọ ise ana m ejide otu akwụkwọ ọgụgụ n’aka na-aṅa ntị kwa ụbọchị n’usoro ihe omume a na-ewu ewu. Nke a mere ka m nwee ọchịchọ nke ije United States otu ụbọchị. N’ihi enwetaghị ihe m tụrụ anya ya n’okpukpe Shinto na Buddha, amalitere m iche na ikekwe a pụrụ ịchọta eziokwu banyere Chineke n’okpukpe ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ.
Ná mmalite April, 1951, ezutere m Grace Gregory, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke Watch Tower Society. O guzo n’ihu ọdụ ụgbọ okporo ígwè nke Nagoya na-enyefe otu Ụlọ Nche Bekee na akwụkwọ nta e dere n’asụsụ Japanese banyere otu isiokwu Bible. Ịdị umeala n’obi ya n’ịrụ ọrụ dị otú ahụ masịrị m. Anatara m akwụkwọ abụọ ndị ahụ ma nakwere ozugbo ka o duziere m ọmụmụ Bible. Ekwere m ya nkwa ịbịa n’ebe obibi ya maka ọmụmụ Bible ahụ ka ụbọchị ole na ole gasịrị.
Ka m weresịịrị oche n’ụgbọ okporo ígwè ma malite ịgụ Ụlọ Nche ahụ, okwu mbụ dị n’isiokwu mmeghe ya, bụ́ “Jehova,” dọọrọ mmasị m. Ahụtụbeghị m aha ahụ mbụ. Atụghị m anya ịhụ ya n’ime obere akwụkwọ ọkọwa okwu m ji nke na-akọwa okwu site n’asụsụ Bekee gaa n’asụsụ Japanese, ma lee ọ dị ya! “Jehova . . . , Chineke nke Bible.” Ugbu a amalitewala m ịchọpụta ihe banyere Chineke nke Iso Ụzọ Kraịst!
Ná nleta mbụ ahụ m jere n’ebe obibi nke onye ozi ala ọzọ ahụ, anụrụ m banyere okwu Bible nke Nathan H. Knorr, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society mgbe ahụ gaje ikwu n’izu ole na ole dị n’ihu. Ya na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton Henschel na-eleta Japan, ha na-abịakwa Nagoya. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma Bible m nwere dị nta, okwu ahụ tinyekwara mmekọrịta mụ na ndị ọzi ala ọzọ ahụ na ndị ọzọ bịaranụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
N’ihe dị ka ọnwa abụọ, amụtara m eziokwu ndị bụ́ isi banyere Jehova, Jisọs Kraịst, ihe mgbapụta, Setan bụ́ Ekwensu, Amagedọn, na ụwa Paradaịs site n’ọmụmụ ihe mụ na Grace. Ozi ọma nke Alaeze ahụ bụ kpọmkwem ụdị ozi m nọworo na-achọgharị. N’otu oge ahụ m malitere ịmụ ihe ka m malitekwara ije nzukọ ọgbakọ. Ọnọdụ enyi na enyi a na-enwe ná nzukọ ndị a masịrị m, bụ́ ebe ndị ozi ala ọzọ sooro ndị Japan kpakọrịta n’akpaghị ókè ọ bụla, sorokwa anyị nọdụ ala na tatami (ute e ji okporo ọka kpaa).
N’October 1951, a nọrọ n’Ụlọ Ezumezu nke Nakanoshima dị n’obodo ukwu nke Osaka mee mgbakọ sekit mbụ e nwere na Japan. E nwere ihe dị ala karịa Ndịàmà 300 na Japan nile; ma ihe dị ka mmadụ 300 bịara mgbakọ ahụ, gụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ozi ala ọzọ 50. Ọbụna ekeere m òkè dị nta n’usoro ihe omume ahụ. Ihe m hụrụ ma nụ masịrị m nnọọ nke na m kpebiri n’ime obi m ijere Jehova ozi ná ndụ m nile. N’echi ya, e mere m baptism n’ime mmiri dị ṅara ṅara nke otu ụlọ ịsa ahụ ọha na eze dị nso.
Ọṅụ nke Ozi Ọsụ Ụzọ
Achọrọ m ịghọ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ma echekwara m na m nwere ibu ọrụ nke inye aka kwadoo ezinụlọ m. Mgbe m mesiri onwe m obi ike ịgwa ọga m banyere ọchịchọ m, ọ tụrụ m n’anya ịnụ ka o kwuru, sị: “Obi ga-adị m ụtọ ịkwado gị ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-eme gị obi ụtọ.” Enwere m ike ịrụ ọrụ nanị ụbọchị abụọ n’otu izu ma ka nwee ike inyere nne m aka ná mmefu ezinụlọ. Enwere m nnọọ mmetụta yiri nke nnụnụ a tọhapụrụ ná ngịga.
Ka ọnọdụ nọgidere na-adịwanye mma, amalitere m ịsụ ụzọ n’August 1, 1954, n’otu ókèala dị n’azụ ọdụ ụgbọ okporo ígwè nke Nagoya, ebe na-ewe ije ụkwụ minit ole na ole site n’ebe ahụ m zuteworo Grace na mbụ. Mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị, enwetara m ọrụ ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na Beppu, bụ́ otu obodo ukwu dị n’ebe ọdịda anyanwụ àgwàetiti nke Kyushu. E kenyere Tsutomu Miura ịbụ onye mụ na ya ga-arụkọ ọrụ.a N’oge ahụ, e nweghị ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’àgwàetiti ahụ nile, ma ugbu a e nwere ọtụtụ narị, bụ́ ndị e kewara gaa na sekit 22!
Ihe Atụ nke Ụwa Ọhụrụ
Mgbe Nwanna Knorr bịara leta Japan ọzọ n’April 1956, ọ gwara m ka m gụpụta paragraf ole na ole site n’otu Ụlọ Nche Bekee n’olu dara ụda. A gwaghị m ihe mere e ji sị m gụọ ha, ma ka ọnwa ole na ole gasịrị, anatara m akwụkwọ ozi nke kpọrọ m òkù ije klas nke 29 nke ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead. Ya mere na November afọ ahụ, amalitere m njem obi ụtọ ahụ ịga United States nke mezuru ọchịchọ m nweworo ruo ogologo oge. Isoro nnukwu ezinụlọ Betel dị na Brooklyn bikọọ ma rụkọọ ọrụ ruo ọnwa ole na ole mere ka okwukwe m nwere n’ebe nzukọ Jehova a na-ahụ anya dị sie ike.
Na February 1957, Nwanna Knorr kwọọrọ mmadụ atọ n’ime anyị bụ́ ụmụ akwụkwọ n’ụgbọala jee n’ogige Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị na South Lansing, n’ebe ugwu New York. N’ọnwa ise ndị sochirinụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, ka m natara ntụziaka site n’Okwu Jehova ma soro ụmụ akwụkwọ ibe m biri na gburugburu ebe mara mma, ahụrụ m ihe atụ nke ụwa Paradaịs. E kenyere mmadụ 10 n’ime ụmụ akwụkwọ 103 ahụ, nke gụnyere mụ onwe m, ọrụ na Japan.
Inwe Ekele Maka Ọrụ Ndị E Kenyere M
E nwere ihe dị ka Ndịàmà 860 na Japan mgbe m lọtara n’October 1957. E kenyere m ọrụ njegharị dị ka onye nlekọta sekit, ma eburu m ụzọ nata ọzụzụ ụbọchị ole na ole maka ọrụ ahụ site n’aka Adrian Thompson na Nagoya. Sekit m gụnyere otu ógbè sitere na Shimizu, nke dị nso n’Ugwu Fuji, ruo Àgwàetiti Shikoku ma gụnyekọta obodo ukwu ndị dị ka Kyoto, Osaka, Kobe, na Hiroshima.
Na 1961, e kenyere m ọrụ ịbụ onye nlekọta distrikti. Nke a gụnyere ime njem site n’ebe ugwu àgwàetiti nke Hokkaido jupụtara na snow ruo n’àgwàetiti nke Okinawa nke dịdebere ebe okpomọkụ nakwa ọbụna gabiga ruo àgwàetiti ndị dị na Ishigaki bụ́ nke dị nso na Taiwan, ịdị anya nke dị ihe dị ka kilomita 3,000.
Mgbe ahụ, na 1963, a kpọrọ m òkù ije ọzụzụ Ụlọ Akwụkwọ Gilead ga-ewe ọnwa iri na Betel dị na Brooklyn. N’oge ọzụzụ ahụ, Nwanna Knorr mesiri ike mkpa ọ dị inwe omume kwesịrị ekwesị n’ebe ọrụ e kenyere anyị dị. O kwuru na ihicha ọnụ ụlọ ịsa ahụ bụ ọrụ dị nnọọ mkpa dị ka ịrụ ọrụ n’ọfịs. Ọ bụrụ na ọnụ ụlọ ịsa ahụ adịghị ọcha, ka o kwuru, ọ ga-emetụta ndị ezinụlọ Betel nile na ọrụ ha. N’ikpeazụ, otu akụkụ nke ọrụ m na Betel dị na Japan bụ ihicha ụlọ mposi, m chetakwara ndụmọdụ ahụ.
Mgbe m lọtasịrị na Japan, e kenyere m ọrụ njegharị ọzọ. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, na 1966, alụrụ m Junko Iwasaki, bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke na-eje ozi n’obodo ukwu nke Matsue. Lloyd Barry, bụ́ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ nke Japan mgbe ahụ, kwuru okwu agbamakwụkwọ ahụ na-enye obi ụtọ. Mgbe ahụ Junko sonyeere m n’ọrụ njegharị.
Ọrụ anyị gbanwere na 1968 mgbe a kpọbatara m n’alaka ụlọ ọrụ dị na Tokyo ịrụ ọrụ nsụgharị. N’ihi ụkọ ụlọ, ana m eje ma na-alaghachi site na Sumida Ward, Tokyo, Junko jekwara ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ. N’oge a, a chọrọ alaka ụlọ ọrụ bukwuru ibu. Ya mere na 1970 a zụtara ala na Numazu, bụ́ ebe na-adịghị anya site n’Ugwu Fuji. E wuru ụlọ obibi akwụkwọ nwere okpukpu atọ na ụlọ obibi n’ebe ahụ. Tupu a malite ihe owuwu ahụ, e jiri ọtụtụ ụlọ ndị dị n’ala ahụ mee ihe maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, bụ́ nke na-enye ndị nlekọta ọgbakọ ọzụzụ. Enwere m ihe ùgwù nke izi ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ, Junko sikwaara ụmụ akwụkwọ ahụ nri. Ọ na-akpali akpali ihụ ka a na-enye ọtụtụ narị ndị ikom bụ́ ndị Kraịst ọzụzụ pụrụ iche maka ozi ahụ.
N’otu ehihie anatara m otu ozi teligram dị ngwa. E nyewo nne m àkwà n’ụlọ ọgwụ, a tụghịkwa anya na ọ ga-adịgide ndụ. Ejiri m ụgbọ okporo ígwè na-agba oké ọsọ jee Nagoya ma gbaga n’ụlọ ọgwụ ahụ. Ọ maghị onwe ya, ma anọ m n’akụkụ àkwà ya n’abalị ahụ nile. Nne m nwụrụ n’isi ụtụtụ. Ka m na-alaghachi Numazu, apụghị m igbochi anya mmiri mgbe m na-echetaghachi oge ihe isi ike ndị ọ gabigaworo ná ndụ ya na ịhụnanya o nwere n’ebe m nọ. Ọ bụrụ uche Jehova, aga m ahụ ya ọzọ ná mbilite n’ọnwụ.
N’oge na-adịghị anya, ihe owuwu ahụ dị na Numazu adịghịkwa aba anyị. Ya mere a zụtara ala dị hekta asaa n’Ebina City, a malitekwara ihe owuwu nke alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na 1978. Ugbu a, e jiriwo ụlọ obibi akwụkwọ na ụlọ obibi, nakwa Ụlọ Mgbakọ nke na-abata ihe karịrị mmadụ 2,800 rụchie ohere nile e nwere n’ala a. E wusịrị ụlọ ndị kasị ọhụrụ, bụ́ ndị na-agụnye ụlọ obibi abụọ dị okpukpu 13 na ebe ndọba ụgbọala/ụlọ ije ozi dị okpukpu ise ná mmalite afọ a. Ugbu a ezinụlọ Betel anyị dị ihe dị ka mmadụ 530 n’ọnụ ọgụgụ, ma ihe owuwu ndị a e wusawanyere ga-abara anyị ihe dị ka mmadụ 900.
Ọtụtụ Ihe Ndị Mere M Ga-eji Ṅụrịa Ọṅụ
Ọ bụrụwo ihe obi ụtọ ịhụ mmezu nke amụma Bible, ee, ịhụ ka ‘onye dịkarịsịrị nta toro ruo ịghọ mba nwere ume.’ (Aịsaịa 60:22) Ana m echeta mgbe otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke na-ajụ m laa azụ na 1951, sị, “Ndịàmà ole ka e nwere na Japan?”
“Ihe dị ka 260,” ka m zaghachiri.
“Nanị?” ka ọ jụrụ n’ụda olu nlelị.
M na-echeta mgbe m na-eche sị, ‘Oge ga-ekpebi mmadụ ole Jehova ga-ewebata n’ofufe ya ná mba a nke okpukpe Shinto na Buddha jupụtara.’ Jehova azawokwa ajụjụ ahụ! Taa, e nweghịzi ókèala ndị na-enweghị ndị e kenyere ha maka ime nkwusa na Japan, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-efe ezi ofufe arịwokwa elu ruo ihe karịrị mmadụ 222,000 n’ime ọgbakọ 3,800!
Afọ 44 gara aga nke ndụ m n’ije ozi oge nile—nke 32 n’ime ya bụ́ nke mụ na nwụnye m hụrụ n’anya soro jee—abụrụwo nke obi ụtọ karịsịa. Ejewo m ozi ná Ngalaba Nsụgharị dị na Betel ruo afọ 25 nke afọ ndị ahụ. Na September 1979, a kpọkwara m òkù ịbụ onye òtù nke kọmitii alaka nke Ndịàmà Jehova dị na Japan.
Ọ bụworo m ihe ùgwù na ngọzi ikereworị òkè dị nta n’inyere ndị obi ha ziri ezi, ndị hụrụ udo n’anya aka ịbata n’ofufe nke Jehova. Ọtụtụ emewo nnọọ dị ka m mere—gbanwee site n’inye eze ukwu ofufe gaa n’ife nanị otu ezi Chineke, bụ́ Jehova. Ọ bụ ezi ọchịchọ m inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịgafeta n’akụkụ Jehova nke na-enwe mmeri ma nweta ndụ na-enweghị ngwụsị n’ụwa ọhụrụ nke udo.—Mkpughe 22:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nna ya bụ Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi lanarịrị mgbawa nke bọmbụ atọm ahụ a tụrụ na Hiroshima na 1945 mgbe ọ nọ n’otu ụlọ mkpọrọ ndị Japan. Lee Teta! (Bekee) nke October 8, 1994, peji nke 11-15.
[Foto dị na peeji nke 29]
Agụmakwụkwọ nke hiwere isi n’ofufe eze ukwu
[Ebe E Si Nweta Foto]
Akwụkwọ Akụkọ nke Mainichi
[Foto dị na peeji nke 29]
Na New York, Mụ na Nwanna Franz
[Foto dị na peeji nke 29]
Mụ na nwunye m, bụ́ Junko
[Foto dị na peeji nke 31]
N’ọrụ ná Ngalaba Nsụgharị