Krismas—Ọ̀ Gụpụwo Kraịst?
“Enwebeghị m ike ịnabata ememe ndị a na-eme n’oge Krismas. Ha eyiwo m ka ha ekwekọghị nnọọ ná ndụ na ozizi Jisọs.”—Mohandas K. Gandhi.
ỌTỤTỤ mmadụ ga-agbagha ihe Gandhi kwuru kpam kpam. ‘Gịnị,’ ka ha pụrụ ịjụ, ‘ka onye Hindu ọnụ na-eru n’okwu pụrụ ịma n’ezie banyere ụbọchị ezumike ndị Kraịst?’ Otú ọ dị, a ghaghị ikweta na Krismas agbasawo n’ụwa nile, na-emetụta ọdịbendị dị iche iche. Na December ọ bụla, ụbọchị ezumike ahụ na-eyi ka ọ dị n’ọdịbendị nile.
Dị ka ihe atụ, ihe dị ka nde 145 ndị Esia na-eme ememe Krismas, bụ́ nke ji nde mmadụ 40 karịa ndị mere ya n’iri afọ gara aga. Ọ bụrụkwa na site n’ikwu banyere “ememe” na Gandhi bu n’uche akụkụ na-emetụtaghị okpukpe nke Krismas nke oge a, oké ịzụ ihe ara ara nke anyị nile na-ahụ, o siri ike ịgọpụ na akụkụ a nke ememe a na-ewukarịsị ewu mgbe mgbe. Magazin bụ́ Asiaweek na-arịba ama, sị: “Krismas n’Esia—site n’ọkụ ememe ndị dị na Hong Kong gaa n’osisi Krismas ndị buru ibu dị n’ebe nnabata nke họtel dị na Beijing gaa n’ihe nnọchiteanya nke ihe ngosi ọmụmụ Jisọs dị n’ebe ndịda Singapore—bụ n’ụzọ dị ukwuu ihe omume na-emetụtaghị okpukpe (bụ́ azụmahịa n’ụzọ bụ́ isi).”
Ememe Krismas nke oge a ọ̀ gụpụwo Kraịst? A nọwo na-eme ememe December 25 kemgbe narị afọ nke anọ O.A., mgbe Chọọchị Roman Katọlik wepụtara ụbọchị ahụ maka ememe okpukpe nke ọmụmụ Jisọs. Ma dị ka njụta echiche e mere nso nso a na United States si dị, nanị pasent 33 nke ndị a jụtara echiche ha chere na ọmụmụ Kraịst bụ akụkụ kasị mkpa nke Krismas.
Gịnị ka i chere? Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na n’ime mkpọsa ndị a nọgidesiri ike na-eme, ịzụ onyinye aghara aghara, ịchọ osisi mma, ịhazi na ịga nnọkọ oriri dị iche iche, iziga kaadị dị iche iche—na e legharawo Jisọs anya n’ụzọ ụfọdụ n’ihe omume ahụ?
O yiri ka ọtụtụ mmadụ na-eche na otu ụzọ isi webataghachi Kraịst n’ime Krismas bụ site n’ime Ihe Ngosi Ọmụmụ ya, ma ọ bụ ihe nnọchiteanya nke ihe ngosi ọmụmụ ya. Ma eleghị anya ị hụtụwo ìgwè ihe oyiyi ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị na-egosi nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs ka ọ nọ n’ebe a na-etinye nri anụ ụlọ bụ́ onye Meri, Josef, ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ, “ndị amamihe atọ,” ma ọ bụ “ndị eze atọ,” ụfọdụ anụmanụ ndị a na-akpa akpa, na ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ gbara gburugburu. A na-echekarị na ihe nnọchiteanya nke ihe ngosi ọmụmụ Jisọs ndị a na-echetara ndị mmadụ ihe Krismas pụtara n’ezie. Dị ka U.S. Catholic si kwuo, “ihe nnọchiteanya nke ihe ngosi ọmụmụ na-enye ihe ọmụma dokwuru anya karịa otú otu oziọma pụrụ inye, ọ bụ ezie na ọ na-emekwa ka ọ pụta ìhè na akụkọ ndị a abụghị ihe mere eme.”
Ma, olee otú Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs ga-esi enye echiche na akụkọ ndị dị n’ihe ndekọ Oziọma nke Bible abụghị akụkọ ihe mere eme? A ghaghị ịnakwere na obere ihe oyiyi ndị e ji ágbá nwere ọtụtụ àgwà tee na-eme ka ọmụmụ Kraịst bụrụ akụkọ mgbe ochie ma ọ bụ akụkọ ifo. N’ịbụ nke otu onye mọnk mere ka o wuo ewu na nke mbụ ya na narị afọ nke 13, Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs ahụ bụbu ihe omume dị nta. Taa, dị ka ọtụtụ ihe ndị ọzọ metụtara ụbọchị izu ike a, Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs aghọwo oké azụmahịa. Na Naples, Itali, ọtụtụ ụlọ ahịa na-ere ihe oyiyi maka Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs, ma ọ bụ presepi, n’oge nile n’ime afọ. Ụfọdụ n’ime ihe oyiyi ndị kasị ewu ewu na-anọchite anya, ọ bụghị ndị mmadụ sitere n’ihe ndekọ Oziọma ahụ, kama ndị a ma ama nke oge a, dị ka Princess Diana, Mother Teresa, na onye na-akwa ákwà bụ́ Gianni Versace. N’ebe ndị ọzọ, a na-eji chocolate, pasta, ọbụnakwa ayọrọ eme presepi. Ị pụrụ ịghọta ihe mere o ji sie ike ịhụ akụkọ ihe mere eme n’ihe ngosi ndị dị otú ahụ.
Oleezi otú Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs ndị dị otú ahụ pụrụ isi nye “ihe ọmụma dokwuru anya karịa otú otu oziọma pụrụ inye”? Ọ̀ bụ na ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ abụghị akụkọ ihe mere eme n’ezie? Ọbụna ndị na-arụ ụka kpọrọ ekwo nkụ aghaghị ikweta na Jisọs bụ onye dịrị adị n’ezie n’akụkọ ihe mere eme. Ya mere ọ ghaghị ịbụworị nwa ọhụrụ n’ezie n’otu oge, onye a mụrụ n’ebe dị adị n’ezie. E kwesịrị inwe otu ụzọ ka mma isi nweta ihe ọmụma doro anya banyere ihe omume ndị gbara ọmụmụ ya gburugburu karịa nanị ikiri otu Ihe Ngosi Ọmụmụ!
N’ezie, e nwere. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme abụọ dekọrọ banyere ọmụmụ Jisọs n’iche n’iche. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ụfọdụ ị na-eche na a na-eleghara Kraịst anya nke ukwuu n’oge Krismas, gịnị ma i nyochaa ihe ndekọ ndị a n’onwe gị? N’ime ha, ị ga-ahụ, ọ bụghị akụkọ mgbe ochie ma ọ bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, kama akụkọ na-akpali akpali—akụkọ bụ́ ezie nke ọmụmụ Kraịst.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Ihe ndị a kara n’akụkụ peji nke 3-6, 8, na 9: Fifty Years of Soviet Art