Ezi Enyemaka Maka Ezinụlọ
“Ọ bụ eziokwu ikwu na e nwere nsogbu ezinụlọ n’America. Ọ dịghị ihe ọzọ a pụrụ ikwubi site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm, ọnụ ọgụgụ nke ịmụ ụmụ n’alụghị di na nwunye, [na] mmetọ ụmụaka na ndị òtù ọlụlụ ndị a na-enwe.”
OKWU ndị a onye United States na-enye nkọwa na telivishọn bụ́ Tom Brokaw kwuru pụrụ imetụta ihe ka n’ọtụtụ mba. Gịnị ka nsogbu a pụtara?
N’ọtụtụ ụzọ, ezinụlọ bụ blọk bụ́ isi e ji ewu ọha mmadụ. Ọ bụrụ na ezinụlọ nọ ná nsogbu, ọha mmadụ nọkwa ná nsogbu. Ọzọkwa, ezinụlọ bụ ebe ụmụaka si enweta nkwado mmetụta uche na nke ego. Ọ bụ ebe ha na-enweta ihe ọmụma mbụ nke ndụ bụ́kwa nke kasị mkpa. Ọ bụrụ na ezinụlọ nọ ná nsogbu, gịnị ka ụmụaka na-amụta? Olee ebe nchebe ha dị? Ụdị ndị dị aṅaa ka ha ga-etolite ịbụ?
È nwere enyemaka ọ bụla dịịrị ezinụlọ n’oge nsogbu a? Ee. Ezinụlọ bụ ndokwa Chineke guzobere n’onwe ya. (Jenesis 1:27, 28) O nyewokwa nduzi ezinụlọ dị oké mkpa n’Okwu ya, bụ́ Bible. (Ndị Kọlọsi 3:18-21) N’eziokwu, anyị apụghị ịgbanwe ọha mmadụ n’ozuzu ya, ma anyị pụrụ itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ n’ezinụlọ anyị. Ọ ga-amasị anyị ịgwa unu banyere ụfọdụ ndị mere nke a nakwa ezi ihe ndị ọ rụpụtaara ha.
Igbochi Ịgba Alụkwaghịm
N’ọtụtụ mba, ihe dị ka pasent 50 nke alụmdi na nwunye nile na-atọsa n’ịgba alụkwaghịm. Nke ahụ bụ ọdịda dị ukwuu ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya! N’eziokwu, ọtụtụ bụ́ ndị ji n’ihi nke a ghọọ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, na-arụ ọrụ dị ukwuu n’ịzụ ụmụ ha. Ma ihe ka ọtụtụ aghaghị ikweta na ọ ka mma mgbe di na nwunye pụrụ idozi nsogbu ha, nọkọọkwa ọnụ.
Alụmdi na nwunye nke otu di na nwunye bi na Solomon Islands nọ na-achọ itisasị. Di ahụ, bụ́ nwa nke otu chiifu, na-eme ihe ike, nweekwa ọtụtụ àgwà ọjọọ. Ndụ siiri nwunye ya ike nke ukwuu nke na ọbụna ọ nwara igbu onwe ya. Mgbe ahụ, di ya kwetara isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọ mụtara na onye ọ bụla nke chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ agaghị amara nanị ihe bụ ihe ọjọọ kamakwa ọ ‘ga-akpọ ihe ọjọọ asị.’ (Abụ Ọma 97:10) Nke ahụ gụnyere ịkpọ ihe ndị dị ka ịgha ụgha, izu ohi, ime ihe ike, na ịṅụbiga mmanya ókè asị. Ọ ṅara ntị na nke a, n’oge na-adịghịkwa anya o meriri àgwà ọjọọ ya na obi ọkụ ya. Mgbanwe ahụ juru nwunye ya anya, alụmdi na nwunye ha kakwara mma nke ukwuu n’ihi mmetụta nke Okwu Chineke.
Na South Africa otu nwanyị bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nụrụ na onye were ya n’ọrụ na di onye were ya n’ọrụ na-eche echiche ịgba alụkwaghịm. Onyeàmà ahụ gwara onyeisi ya banyere otú Chineke si ele alụmdi na nwunye anya ma gosi ya otu akwụkwọ isiokwu ya bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Akwụkwọ a, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara, na-eme ka ụkpụrụ Bible ndị metụtara alụmdi na nwunye pụta ìhè, na-emesi ụzọ Bible si enyere di na nwunye aka idozi nsogbu ike karịsịa. Ma onye were ya n’ọrụ ma di ya gụrụ akwụkwọ ahụ ma jiri ezi obi gbalịa itinye ndụmọdụ Bible ndị o nyere n’ọrụ. N’ihi ya, ha kpebiri ịghara ịgba alụkwaghịm—alụmdi na nwunye ọzọ nke itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ zọpụtara.
Ebe Okpukpe Dịrịtara Iche
Gịnị banyere alụmdi na nwunye ebe di na nwunye ahụ nwere okpukpe dịrịtara iche? Bible dụrụ ndị Kraịst ọdụ n’ụzọ ziri ezi ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, onye òtù ọlụlụ na-agbanwe okpukpe ya. Ọ̀ dị mkpa ka nke ahụ tisaa alụmdi na nwunye ahụ? Ọ dịghị ma ọlị.
Na Botswana, a jụrụ otu nwanyị bụ́ onye ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova na nso nso a banyere otú okpukpe ọhụrụ ya siworo gbanwee ya. Ọ gwara di ya ka ọ zachitere ya, nke a bụkwa ihe o kwuru: “Kemgbe nwunye m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ahụwo m ọtụtụ mgbanwe dị mma n’ebe ọ nọ. O nweziri ume na ịdị nwayọọ sitere n’amamihe nke ọ na-enwebughị. O nwere ikike na nkwenye ịkwụsị ise siga, bụ́ nsogbu nke m na-enwebeghị ike imeri. Nwunye m aghọwo onye na-ahụkwu n’anya na onye nwekwuru mmetụta ịhụnanya n’ebe mụ na ụmụ anyị nọ, nakwa n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ na-anagide ihe karị, karịsịa n’ebe ụmụ anyị nọ. Ana m ahụ ya ka ọ na-etinye oge n’ozi ya, na-agbalị inyere ndị ọzọ aka ime ka ndụ ha ka mma. Ahụwokwa m mgbanwe ndị dị mma n’ime onwe m. Ekwere m na nke a bụ kpam kpam n’ihi ihe nlereanya ya.” Lee mmetụta dị mma ụkpụrụ Bible nweworo n’alụmdi na nwunye a! Ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà ekwuwo ihe ndị yiri nke ahụ banyere ndị òtù ọlụlụ ha bụ́ Ndịàmà.
Mgbe Nna Na-eleghara Ibu Ọrụ Ya Anya
Mmekọrịta dị n’etiti nna na ụmụ ya bụ isi ihe na-eduga n’iwulite ezinụlọ siri ike. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Mgbe ahụ ka a sịkwa ihe mere otu isiokwu dị na magazin bụ́ The Wilson Quarterly ji taa ndị bụ́ nna na-adịghị arụzu ọrụ ha ụta maka ọtụtụ nsogbu e nwere ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Isiokwu ahụ kwuru, sị: “N’agbata 1960 na 1990, pasent nke ụmụaka ndị ha na nna ha na-ebighị rịrị elu karịa okpukpu abụọ . . . Ndalata nke ndị bụ́ nna ịrụ ọrụ ha bụ isi ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu siri ike na-eti ọha ndị America ihe otiti.”
Nke a ọ̀ pụtara na ụmụaka ndị nna ha na-eduzighị ga-abụrịrị ndị na-enweghị ihe ịga nke ọma? Ee e. Ọbụ abụ oge ochie ahụ kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Otu nwa okoro dị afọ itoolu bi na Thailand chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Nne ya nwụnahụrụ ya mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, nna ya kwa, n’achọghị ya, hapụụrụ ya nne nne ya. N’ịbụ onye nwere mmetụta nke ịbụ onye a na-achọghị na onye a na-ahụghị n’anya, nwa okoro ahụ ghọrọ onye na-enupụ isi ma bụrụ onye a maara dị ka ọchọ okwu. Ọbụna o yiri nne nne ya egwu. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova abụọ na-ezisa ozi ọma oge nile, n’ịrịba ama na ọ na-eguzokarị n’ézì nke Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ, kpọrọ ya òkù ka ọ bịa n’ebe obibi ha.
Ha gwara ya banyere Chineke—na dị ka nna, Ọ hụrụ ụmụ ya n’anya. Ha kwukwara banyere Paradaịs elu ala nke Chineke kweworo mmadụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ná nkwa. (Mkpughe 21:3, 4) Ihe a nile masịrị nwa okoro ahụ, ọ bịaghachikwara kwa ụbọchị iji mụtakwuo ihe. Ndịàmà ahụ gwara ya na ọ ghaghị ịkwụsị ịbụ ọchọ okwu ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka Chineke bụrụ Nna ya n’ezie. Nke a kwekọrọ n’okwu Pọl gwara ndị Rom: “Ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ọ ga-adịkwa ya mkpa imeso nne nne ya n’obiọma. (1 Timoti 5:1, 2) N’oge na-adịghị anya, o tinyewara ụkpụrụ Bible n’ọrụ—obi abụọ adịghị ya na ọ na-eme ka ịdị ndụ ezinụlọ ya na nne nne ya kawanye nnọọ mma. (Ndị Galetia 5:22, 23) Mgbanwe ndị ndị agbata obi ha hụrụ n’ebe ọ nọ masịrị ha nke ukwuu nke na ha chọrọ ka ụmụ ha soro Ndịàmà Jehova mụọ Bible!
Mmụọ nke Ime Udo
Pọl onyeozi degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè. Ka udo nke Kraịst na-ekpezikwa okwu n’obi unu.” (Ndị Kọlọsi 3:14, 15) Mmụọ nke ime udo na ịhụnanya si n’obi apụghị ịda n’ijikọta ezinụlọ ọnụ. Ha pụkwara idozi nkewa ezinụlọ ndị dịteworo anya. Rukia, bụ́ onye bi n’Albania, atụpụrụghị nwanne ya nwoke ọnụ ruo ihe karịrị afọ 17 n’ihi esemokwu ezinụlọ. Mgbe o so Ndịàmà Jehova mụọ Bible, ọ mụtara na a na-agba ohu Chineke ọ bụla ume ime ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo. “Ya chọọ udo, gbasookwa ya.”—1 Pita 3:11.
Rukia ghọtara na ọ ghaghị isoro nwanne ya nwoke mee udo. O kpere ekpere abalị nile, n’ụtụtụ echi ya kwa, ka obi ya na-eti eti, ọ gara n’ụlọ nwanne ya nwoke. Nwa nwanne Rukia meghere ụzọ ma jụọ n’ijuanya, sị: “Gịnị ka ị na-eme n’ebe a?” Rukia ji ụzọ dị jụụ rịọ ka ya hụ nwanne ya nwoke, na-akọwa na ya chọrọ ka ya na ya mee udo. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ghọtara ugbu a na nke a bụ uche Chineke. Nwanne ya nwoke meghachiri omume n’ụzọ dị mma, njikọtaghachi ha bụkwa nke e ji ibi ọma na anya mmiri nke ọṅụ kaa akara—ezinụlọ dịghachiri n’otu n’ihi na a gbasoro ụkpụrụ Bible.
Mkpakọrịta Ọjọọ
“Taa, ihe ka n’ọtụtụ ụmụaka na-ekiri telivishọn awa asaa kwa ụbọchị. Ka ha na-agụchala ụlọ akwụkwọ praịmarị, ha ahụwo ihe karịrị puku igbu mmadụ asatọ na otu narị puku ime ihe ike.” Nke ahụ ka akwụkwọ bụ́ The 7 Habits of Highly Effective Families kwuru. Mmetụta dị aṅaa ka mkpughepụ dị otú ahụ na-enwe n’ebe nwata nọ? “Ndị ọkachamara” ekwekọrịtaghị na nke ahụ, ma Bible na-adọsi aka ná ntị ike megide mkpakọrịta ọjọọ. Dị ka ihe atụ ọ na-ekwu, sị: “Enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ọ na-ekwukwa, sị: “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Ndụ ezinụlọ pụrụ ịka mma ma ọ bụrụ na anyị ejiri amamihe lee ụkpụrụ a anya dị ka eziokwu, ma mkparịta ọjọọ ahụ ọ̀ bụ n’elu ahụ ma ọ bụ n’ihe omume telivishọn.
Otu onye bụ́ nne bi na Luxembourg so otu n’ime Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otu ụbọchị ọ gwara Onyeàmà ahụ na n’oge anyasị ụmụ ya nwanyị abụọ ndị dị afọ asaa na asatọ na-ese nnọọ okwu, na-adịkwa obi ọjọọ. Onyeàmà ahụ jụrụ ya ihe ụmụntakịrị ahụ na-eme n’oge anyasị. Nne ha sịrị na ha na-ekiri telivishọn ka ya na-ehicha kichin. Ihe omume ndị dị aṅaa? “Oo, ụfọdụ ihe nkiri na-atọ ọchị,” ka nne ha zaghachiri. Mgbe ọbịa ya kwuru na ihe omume ndị dị otú ahụ na-abụkarị nke ime ihe ike, nne ụmụntakịrị ahụ kwere nkwa inyocha ha.
Kpọmkwem n’echi ya, nne ha kọrọ na ihe nkiri na-atọ ọchị ndị ụmụ ya nọ na-ekiri wụrụ ya akpata oyi. Ha gosiri nnukwu ajọ anụ ndị si na mbara igwe ndị ji arụrụala na-emebisi ihe ndị dị n’ụzọ ha si aga. Ọ kọwaara ụmụ ya na Jehova kpọrọ ime ihe ike asị na ọ dịghị enwe obi ụtọ mgbe anyị na-ekiri obi ọjọọ dị otú ahụ. (Abụ Ọma 11:5) Ụmụntakịrị ahụ, n’ịchọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, kwetara ise ihe osise ụfọdụ kama ikiri telivishọn. N’egbughị oge, àgwà obi ọjọọ ha gbanwere, ọnọdụ dị n’ezinụlọ ahụ kakwara mma.
Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole iji gosi na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na-eme ka ndụ ezinụlọ ka mma. Ndụmọdụ Bible metụtara ụdị ọnọdụ ọ bụla. O ziri ezi, nweekwa mmetụta ọma dị ike. (Ndị Hibru 4:12) Mgbe ndị mmadụ na-amụ Bible, jirikwa obi eziokwu na-agbalị itinye ihe ọ na-ekwu n’ọrụ, a na-eme ka ezinụlọ sikwuo ike, na-eme ka àgwà ndị mmadụ ka mma, na-ezerekwa ihie ụzọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị otu onye òtù nke ezinụlọ na-agbaso ndụmọdụ Chineke, ihe na-aka mma. N’eziokwu, n’akụkụ nile nke ndụ, anyị kwesịrị ile Okwu Chineke anya dị ka ọbụ abụ ahụ mere bụ́ onye dere, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105.
[Foto dị na peeji nke 5]
E doziwo nsogbu ezinụlọ site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ