Ịgbalịsi Ike Ịbụ “Onye Ọrụ Nke Ihere Na-apụghị Ime”
Dị Ka Anré Soppa Si Kọọ
Agha Ụwa nke Abụọ biiri ọkụ, na-eweta oké mgbupịa na obi nkoropụ a na-apụghị ịkọwa akọwa ozugbo o biri. Dị ka onye na-enye Ndị Agha Mmiri Germany ihe ịrịba ama nke na-anọ na nso Narvik, dị na Norway, enwere m ike ịhụ mmekpọ ọnụ mmadụ na-emekpọ ibe ya n’onwe m. N’abalị, n’osimiri dị n’etiti ugwu abụọ, ịma mma nke ìhè eluigwe ndị si n’ebe ugwu dugara m ịtụgharị uche ná ndụ n’ụzọ miri emi. Eji m n’aka na Chineke nke kere ihe ndị dị otú ahụ apụghị ịkpata ịwị ara nke agha.
A MỤRỤ m na 1923 n’obodo nta nke Lassoth (nke dị ugbu a na Poland), na nso ókèala Czech, etolitekwara m n’ezinụlọ dara ogbenye na-arụ ọrụ ugbo. Ndị mụrụ m na-ekpe Katọlik, okpukpe kekwaara ókè buru nnọọ ibu ná ndụ anyị. Otú ọ dị, ná mmalite, amalitere m inwe obi abụọ banyere okpukpe m. N’obodo nta anyị, e nwere ezinụlọ atọ bụ́ ndị Protestant, ndị Katọlik ahụ chụpụkwara ha. Apụghị m ịghọta ihe mere o kwesịrị iji dị otú a. A kụziiri anyị katkizim n’ụlọ akwụkwọ. Ma otu ụbọchị mgbe m gwara ụkọchukwu ka ọ kọwaa Atọ n’Ime Otu, ihe nile m nwetara dị ka azịza bụ ọnụ ụtarị iri. Otú o sina dị, ọ bụ ihe mere mgbe m dị afọ 17 mesiri enweghị afọ ojuju m nwere n’ebe chọọchị ahụ dị ike. Ndị mụrụ nne m nwụrụ n’ime ọnwa abụọ, nne m enweghịkwa ego zuru ezu iji kwụọ ụgwọ maka ememe olili ozu abụọ nke chọọchị ga-eme. Ya mere ọ jụrụ ụkọchukwu ahụ ma yà pụrụ ịkwụ ya ụgwọ ma e mesịa. “Ndị mụrụ gị nwere ihe ụfọdụ, ọ́ bụghị ya?” bụ nzaghachi ya. “Ree ha, jirikwa ego ha mee ihe maka olili ozu ahụ.”
Afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, mgbe Hitler banyesịrị n’ọchịchị na 1933, e kweghịzi ka anyị sụọ Polish; anyị aghaghị ịsụ German. Ndị jụrụ, ma ọ bụ ndị na-apụghị ịmụta German, ji nwayọọ nwayọọ mie ala—e mesịrị gwa anyị na e zigara ha n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ọbụna a gbanwere aha obodo anyị ịbụ aha German, bụ́ Grünfliess. Akwụsịrị m ịga akwụkwọ mgbe m dị afọ 14, ebe ọ bụkwa na anọghị m n’òtù Ndị Ntorobia Hitler, o siiri m ike ịchọta ọrụ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, e were m n’ọrụ dị ka onye na-amụ ịkpụ ụzụ. Ozugbo agha ahụ malitere, e kpeere Hitler nakwa usuu ndị agha Germany ekpere na chọọchị. Echere m n’uche ma ndị nọ n’akụkụ nke ọzọ hà na-ekpekwa ekpere mmeri yiri nke a.
Ije Ozi n’Òtù Ndị Agha Mmiri Germany
Na December 1941, esonyeere m òtù Ndị Agha Mmiri Germany, ná mmalite afọ 1942 kwa, e zigara m n’ụsọ oké osimiri Norway ije ozi n’ụgbọ mmiri e ji achọpụta ihe ọmụma. E kenyere anyị ọrụ idu ndú n’agbata Trondheim na Oslo, na-edu ụgbọ mmiri ndị na-ebu usuu ndị agha, ngwá agha, ma ọ bụ ngwongwo. Ọ bụ mgbe anyị nọ n’oké osimiri ka m nụpeere ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri abụọ na-ekwu banyere ọgwụgwụ ụwa dị ka e buru ya n’amụma n’ime Bible. Ọ bụ ezie na egwu ji ha ikwusi okwu ike, ha gwara m na ndị mụrụ ha so Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta ma na ha agbasoghị ihe nlereanya ha. Nke a bụ oge mbụ m nụrụ banyere Ndịàmà Jehova.
Mgbe agha biri, ndị Britain jidere anyị dị ka ndị mkpọrọ ma nyefee anyị n’aka ndị America ịkpọghachi anyị na Germany. Ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị ebe obibi ha dị ugbu a n’ógbè Soviet ka e zigara n’ogige ụlọ mkpọrọ dị na Liévin, n’ebe ugwu France, ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal. Nke a bụ n’August 1945. Ana m echeta mgbe m jụrụ otu n’ime ndị France na-eche m nche okpukpe ọ na-ekpe. “Katọlik,” ka ọ zaghachiri. Ebe ọ bụ na mụ onwe m bụkwa onye Katọlik, ajụrụ m ya ihe seere anyị okwu? “Ọ baghị uru ịnwa ịghọta. Nke ahụ bụ nnọọ otú o si dị,” bụ azịza ya. Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya nye m na ndị na-ekpe otu okpukpe ga-alụrịta ọgụ ma gburịta onwe ha.
Otu Ìhè n’Ebe A Na-egwupụta Coal
N’ụbọchị mbụ m sonyeere ndị na-egwupụta coal n’obodo ahụ rụọ ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal, otu onye aha ya bụ́ Evans Emiot sooro m kerịta bredi ya. N’ịbụ onye siteburu n’Ohio, nke dị na United States, o biwo na France ruo ọtụtụ afọ. Ọ gwara m okwu banyere ụwa nke agha na-agaghị adịkwa ọzọ. Omume obiọma ya tụrụ m n’anya. O bughịrị m iro n’obi n’agbanyeghị na m bụ onye Germany, ya onwe ya bụrụkwa onye America. Anyị ezuteghị ọzọ ruo ná mmalite afọ 1948 bụ́ mgbe o nyere m akwụkwọ nta a kpọrọ “The Prince of Peace.” N’ebe a ka m mesịrị mụta banyere Chineke nke ịdị mma bụ́ onye kpọrọ agha asị—ụdị Chineke m cheworo n’echiche mgbe m na-ekiri ìhè eluigwe ndị ahụ si n’ebe ugwu. Ekpebisiri m ike ịchọta okpukpe kụziri nke a. Ma ebe ọ bụ na Evans rụrụ ọrụ n’akụkụ ọzọ nke ebe ahụ a na-egwupụta coal, enweghị m ike ịkpọtụrụ ya. Agagharịrị m n’òtù okpukpe nile dị n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, na-ajụ ma hà maara ihe ọ bụla banyere akwụkwọ nta ahụ, ma o nweghị isi.
N’ikpeazụ, n’April 1948, a tọhapụrụ m n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, aghọkwara m onye ọrụ nweere onwe ya. Kpọmkwem na Sunday sochirinụ, o juru m anya ịnụ obere mgbịrịgba a na-akụ n’okporo ámá. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ Evans! O so ìgwè Ndịàmà Jehova nya bọọdụ n’olu, bụ́ nke na-ama ọkwa banyere isiokwu okwu ihu ọha. Onyeàmà na-akụ mgbịrịgba ahụ bụ́ Marceau Leroy, onye so ugbu na Kọmitii Alaka dị na France. A kpọgaara m otu onye Poland na-asụ German nke aha ya bụ́ Joseph Kulczak, bụ́ onye hụjuworo anya n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche n’ihi okwukwe ya. Ọ kpọrọ m òkù ịbịa nzukọ n’uhuruchi ahụ. Aghọtaghị m ihe dị ukwuu n’ime ihe ndị e kwuru, ma mgbe mmadụ nile bịaranụ weliri aka elu, ajụrụ m onye nọdewere m ihe mere ha ji mee otú ahụ. “Ha bụ ndị pụrụ ịga Dunkerque n’izu ọzọ maka ime nkwusa.” “Àpụrụ m ịbịa?” ka m jụrụ. “Eenụ!” ka ọ zaghachiri. Ya mere na Sunday na-esonụ, anọ m na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụ ezie na ọ bụghị mmadụ nile anyị zutere kwenyere, enwere m obi ụtọ, n’oge na-adịghịkwa anya anọ m na-eme nkwusa mgbe nile.
Ịmụta Ịchịkwa Iwe M
N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, Ndịàmà malitere ime nkwusa n’ogige ndị agha ebe ndị mkpọrọ a tọhapụrụ atọhapụ bụ́ ndị Germany bi. Nke a adịghịrị m mfe, ebe ọ bụ na a maara m nke ọma n’ebe ahụ n’ihi iwe ọkụ m. Mgbe mmadụ kparịrị m, aga m eyi ya egwu, na-asị: “Ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, nsogbu ga-adị.” Otu ugbo mgbe m na-arụ ọrụ n’ebe ahụ a na-egwupụta coal, ọbụnadị akụrụ m otu onye mere Jehova akaje, ọkpọ.
Otú ọ dị, site n’enyemaka Jehova, enwere m ike ime mgbanwe n’ụdị mmadụ m bụ. Otu ụbọchị, mgbe anyị na-eme nkwusa n’ogige ndị agha a, otu ìgwè ndị ikom ṅụbigara ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè nọ na-enye ụfọdụ Ndịàmà nsogbu. N’ịbụ ndị maara banyere iwe ọkụ m, ụmụnna ndị mụ na ha nọ nwara igbochi m ime ihe, ma otu n’ime ndị ikom ahụ ji iyi egwu bịa m nso ma malite iyipụ kotu ya. Arịturu m n’elu ịnyịnya ígwè m, nye ya ya ka o jide, ma manye aka n’akpa m. Nke a juru ya nnọọ anya nke na o gere ntị n’ihe m nwere ikwu. Agwara m ya ka ọ laa n’ebe obibi ya hie ụra ma, e mesịa ya bịa n’okwu ihu ọha. Otú ahụ ka o mere, n’elekere 3:00 nke ehihie, ọ nọ n’ebe ahụ! N’ikpeazụ, ihe dị ka mmadụ 20 bụbu ndị mkpọrọ nabatara ozi ahụ. E mere m baptism na September 1948.
Usoro Ihe Omume Juru Eju ma Na-akwụghachi Ụgwọ
E nyere m ibu ọrụ nke ilekọta ókèala ndị anyị ga-eme nkwusa na ha nakwa ịchọta ebe ndị anyị pụrụ ịnọ kwuo okwu ihu ọha. Iji mezuo nke a, ana m eji obere ọgba tum tum mụ mgbe ụfọdụ gbaa ihe dị ka kilomita 50, tupu m na-arụ ọrụ abalị n’ebe ahụ a na-egwupụta coal. Mgbe ahụ ná ngwụsị izu, anyị na-eji ụgbọala bọs gaa n’ókèala ahụ ma buga ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ anọ tinyere onye ọkà okwu. N’obodo ndị katụ buo ibu, mgbe anyị chọtara ebe kwesịrị ekwesị, anyị tụkọtara igbe anyị iji ya mee ihe dị ka tebụl ọkà okwu. Mgbe mgbe, anyị nyaara bọọdụ n’olu iji kpọsaa isiokwu okwu ihu ọha nke anyị kpọrọ ndị mmadụ òkù ịbịa.
Ọ bụ na 1951 ka m zutere Jeannette Chauffour, bụ́ Onyeàmà si Reims. Anyị hụrụ onwe anyị n’anya ozugbo, otu afọ mgbe e mesịkwara, na May 17, 1952, anyị lụrụ. Anyị kwagara Pecquencourt, bụ́ obodo a na-egwupụta ihe na ya nke dị nso na Douai. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, amalitere m inwe nsogbu ahụ ike. A chọpụtara na m na-arịa ọrịa silicosis, bụ́ ọrịa iku ume nke ihe kpatara ya bụ ịrụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ihe n’ala, ma enwetalighị m ụdị ọrụ ọzọ. Ya mere, na 1955, n’oge mgbakọ mba nile e mere na Nuremberg, Germany, mgbe a gwara anyị ka anyị nyere otu obere ọgbakọ dị na Kehl, bụ́ obere obodo a na-emepụta ihe nke dị na Rhine, aka, anyị nwere onwe anyị ịkwaga ebe ahụ. N’oge ahụ, e nwere nanị ndị nkwusa 45 n’ọgbakọ ahụ. N’ihe karịrị afọ asaa sochirinụ nke anyị so ọgbakọ a rụọ ọrụ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa mụbara ruo 95.
Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ọzọ
N’ịhụ na ọgbakọ ahụ esiela ike, anyị rịọrọ Society ka ha kenye anyị ọrụ na France dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’ịbụrụ anyị oké ihe ijuanya, e kenyere anyị ọrụ na Paris. Ọnwa asatọ anyị nọrọ n’ebe ahụ jupụtara n’oké ọṅụ. Mụ na Jeannette nwere ihe ùgwù nke iduzi ọmụmụ Bible 42. E mere mmadụ ise n’ime ndị anyị mụụrụ ihe baptism mgbe anyị ka nọ ya, mmadụ 11 ndị ọzọ mesịkwara nabata eziokwu ahụ.
Ebe ọ bụ na anyị bi na Latin Quarter, anyị zutere ndị prọfesọ si na Sorbonne mgbe mgbe. Otu prọfesọ nkà ihe ọmụma nke lara ezumike nka bụ́ onye ji okwukwe agwọ ọrịa mụrụ Bible ma mesịa ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otu ụbọchị esooro m otu onye injinịa nke so ndị nkụzi Jesuit kpakọchie anya malite mkparịta ụka Bible. Ọ bịara n’ụlọ anyị n’elekere anya atọ nke ehihie, laakwa n’elekere anya iri n’abalị ahụ. N’ịbụrụ anyị ihe ijuanya, ọ bịaghachiri n’ụlọ anyị otu awa na ọkara mgbe e mesịrị. O sorowo onye Jesuit kwurịta okwu bụ́ onye na-apụghị ịza ajụjụ ya banyere amụma Bible. Ọ lara n’ebe obibi ya n’elekere anya mbụ n’ụtụtụ, ọ bịaghachikwara n’elekere anya asaa. Ka oge na-aga, ọ ghọkwara otu n’ime Ndịàmà Jehova. Akpịrị ịkpọ nkụ dị otú ahụ maka eziokwu bụụrụ mụ na nwunye m ihe agbamume dị ukwuu.
Mgbe anyị jesịrị ozi na Paris, a kpọrọ m òkù ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ọwụwa anyanwụ France. Ọ bụụrụ anyị ezi ọṅụ ileta ọgbakọ ndị na-asụ French na German, na-ewusi ụmụnna ike. Ka anyị na-eleta ọgbakọ Rombas, nke dị na Lorraine, ezutere m Stanislas Ambroszczak. Ọ bụ onye Poland nke jeworo ozi n’ụgbọ agha okpuru mmiri nke Mba Ndị Jikọrọ Aka Ọnụ n’oge agha ahụ, ọ lụwokwa agha ná mmiri Norway. Anyị abụwo ndị iro mgbe anyị ji ụgbọ mmiri na-aga n’otu osimiri ahụ. Ugbu a anyị bụ ụmụnna na-arụkọ ọrụ ọnụ na-ejere Chineke anyị, bụ́ Jehova ozi. N’oge ọzọ ná mgbakọ e mere na Paris, eji m anya gwuru otu onye m matara. Ọ bụ onyeisi nke ogige ahụ m bụbu onye mkpọrọ na ya n’ebe ugwu France. Lee aha obi ụtọ anyị nwere ịrụkọ ọrụ ọnụ n’oge mgbakọ ahụ! Otú ahụ ka ike nke Okwu Chineke dị nke na ọ na-eme ka ndị bụbu ndị iro ghọọ ụmụnna na ezi ndị enyi!
N’ụzọ dị mwute, mgbe m rụsịrị ọrụ njegharị ruo afọ 14, aghaghị m ịkwụsị n’ihi ahụ ike m na-adakpọ adakpọ. Otú ọ dị, mụ na nwunye m kpebisiri ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi ruo ókè ike kwere anyị. Ya mere anyị chọtara ụlọ na ọrụ n’obodo Mulhouse, n’ebe ọwụwa anyanwụ France, ma ghọọ ndị ọsụ ụzọ (ndị na-ezisa ozi ọma oge nile).
Ihe ọzọ na-enye m oké ọṅụ n’ogologo afọ ndị gara aga abụrụwo òkè m keere n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Na 1985, a gwara m ka m hazie otu ìgwè na-ewu ihe owuwu maka ebe ọwụwa anyanwụ France. Site n’iji ndị nwere nkà n’ọrụ aka mee ihe na inye ndị ọrụ afọ ofufe dị njikere ọzụzụ, anyị nwere ike iguzobe otu ìgwè nke kerewooro òkè n’iwu ma ọ bụ n’ịrụzigharị ihe karịrị ụlọ nzukọ 80, na-eme ka ha kwesị ekwesị maka ofufe Jehova. Leekwa obi ụtọ m nwere, na 1993, ịrụ ọrụ n’ihe owuwu nke otu Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ise dị na French Guiana, n’Ebe Ndịda America!
Ịga n’Ihu n’Agbanyeghị Ule
Apụrụ m ikwu n’ezie na n’ime ihe karịrị afọ 50 gara aga nke ịrụ ọrụ ọchịchị Chineke, ndụ m ejupụtawo n’oké ọṅụ na ihe ùgwù ije ozi dị iche iche. N’ụzọ dị mwute, nwunye m hụrụ n’anya, bụ́ onye mụ na ya biworo ruo afọ 43, nwụrụ na December 1995. Ọ bụ ezie na nke a bụ oge oké iru újú—m ka na-erukwa újú ruo taa—Jehova na-enye m ume, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ m enyewo m ịhụnanya na nkwado ndị mere ka ihe mgbu ahụ belatatụ ka oge na-aga.
M ka na-echeta nke ọma okwu otu nwanna nwoke e tere mmanụ kwuru n’otu mgbakọ e mere na Munich, Germany, na 1963. “André,” ka ọ sịrị, “elela anya n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. E lere ụmụnna ndị ahụ nọ n’ogige ịta ahụhụ ule. Ugbu a ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịga n’ihu. Anyị agaghị emere onwe anyị ebere ma ọlị. Ya mere gaa n’ihu!” Eburuwo m nke a n’uche mgbe nile. Ugbu a m na-apụghị ime ihe dị ukwuu n’ihi ọrịa na ịka nka, okwu ndị ahụ a na-achọta ná Ndị Hibru 6:10 nọgidere na-abụ ihe na-akasi m obi: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” Ee, ịrụ ọrụ n’ozi Jehova bụ ihe ùgwù kasị ukwuu onye ọ bụla pụrụ inwe. N’ime afọ 50 gara aga, ihe mgbaru ọsọ m abụwo, ka nọgidekwa na-abụ, ịbụ “onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime.”—2 Timoti 2:15.
[Foto dị na peeji nke 22]
Ụdị ụgbọ mmiri m jere ozi na ya n’osimiri dị n’etiti ugwu abụọ nke Norway
[Foto dị na peeji nke 23]
Iji ịnyịnya ígwè eme nkwusa n’ebe ugwu France
[Foto dị na peeji nke 23]
Igbe ndị a tụkọtara jere ozi dị ka tebụl ọkà okwu maka okwu ihu ọha
[Foto ndị dị na peeji nke 24]
Mụ na nwunye m, bụ́ Jeannette, n’agbamakwụkwọ anyị na 1952