Ezinụlọ Buru Ibu Ndị Dị N’otu N’ozi Chineke
“Ihe Nketa Nke Na-esi N’aka Jehova Bịa Ka Ụmụ Bụ,” Ka Ọbụ Abụ Ahụ Dere. “Ụgwọ Ọrụ Ọ Na-akwụ Ka Mkpụrụ Nke Afọ Bụ. Dị Ka Akụ́ N’aka Dike, Otú A Ka Ụmụ A Mụrụ Na Mgbe Okorobịa Dị. Onye Ihe Na-agara Nke Ọma Ka Nwoke Ahụ Bụ Nke Chịrịwooro Akụ́ Ahụ Kpojuo Akpa Akụ́ Ya.”—Abụ Ọma 127:3-5.
EE, ỤMỤ pụrụ ịbụ ngọzi sitere n’aka Jehova. Dịkwa nnọọ ka onye na-agba akụ́ si enwe afọ ojuju n’ịmara ụzọ isi gbapụ akụ́ ndị dị n’akpa akụ́ ya, otú ahụ ka ndị mụrụ ụmụ si achọta obi ụtọ mgbe ha na-eduzi ụmụ ha n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:14.
Ogologo oge gara aga, e nwere ọtụtụ ezinụlọ ndị ji ọtụtụ ụmụ “kpojuo akpa akụ́” ha n’etiti ndị Chineke. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere afọ ndị ahụ e ji ha eji n’Ijipt: “Ụmụ Israel mụrụ ọmụmụ, nupụta, baa ụba, wee nwee ume nke ukwuu nke ukwuu; ala ahụ wee jupụta na ha.” (Ọpụpụ 1:7) Iji ọnụ ọgụgụ ụmụ Israel batara Ijipt tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị si na ya pụọ na-enye echiche na ezinụlọ ndị nwere ụmụ iri dịtụ ọtụtụ!
Mgbe e mesịrị, Jisọs tolitere n’ezinụlọ nke pụrụ iyi ezinụlọ buru ibu nye ụfọdụ ndị taa. Jisọs bụ nwa mbụ, ma Josef na Meri mụtara ụmụ ndị ikom anọ ọzọ na ụfọdụ ụmụ ndị inyom. (Matiu 13:54-56) Na ha mụrụ ọtụtụ ụmụ yikarịrị ka ọ̀ na-akọwa otú Meri na Josef pụrụ isi malite njem isi na Jerusalem lawa n’amaghị na Jisọs esoghị ha.—Luk 2:42-46.
Ezinụlọ Ndị Buru Ibu Taa
Taa, ọtụtụ ndị Kraịst na-ekpebi ịkpara otú ezinụlọ ha ga-aha ókè n’ihi ihe ime mmụọ, ọnọdụ akụ̀ na ụba, mmekọrịta mmadụ na mmadụ, na ihe ndị ọzọ. Otú o sina dị, ezinụlọ ndị buru ibu ka bụ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ obodo. Dị ka The State of the World’s Children 1997 si kwuo, ógbè ebe e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ịmụ ọmụmụ bụ ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara. N’ebe ahụ, nwanyị na-amụkarị ụmụ isii.
Nye ndị Kraịst mụrụ ọtụtụ ụmụ, ịzụlite ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya adịghị mfe, ma ọtụtụ na-eme nke ahụ n’ụzọ gara nke ọma. Ihe ịga nke ọma na-adabere n’ezinụlọ ịbụ ndị dị n’otu n’ofufe dị ọcha. Okwu Pọl onyeozi gwara ọgbakọ dị na Kọrint na-emetụta ezinụlọ ndị Kraịst taa n’otu aka ahụ. O dere, sị: “Ma, ụmụnna m, . . . [ana m arịọ] unu, ka unu nile na-ekwu otu ihe, ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu; kama ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.” (1 Ndị Kọrint 1:10) Olee otú a pụrụ isi nweta ịdị n’otu dị otú ahụ?
Ndị Mụrụ Ụmụ Aghaghị Ịbụ Ndị Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe
Otu ihe bụ́ isi bụ na ndị mụrụ ụmụ aghaghị ịrara onwe ha nye Chineke n’ụzọ zuru ezu. Tụlee ihe Mosis gwara ụmụ Israel: “Nụrụ, Israel; Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu: ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:4-7.
Rịba ama na Mosis kọwapụtara na ọ dị mkpa ka ihe ndị Chineke nyere n’iwu dịrị “n’obi” ndị mụrụ ụmụ. Nanị mgbe ahụ ka ndị mụrụ ụmụ ga-achọ inye ụmụ ha ntụziaka ime mmụọ n’ụzọ chiri anya. N’ezie, mgbe ndị mụrụ ụmụ dị ike n’ụzọ ime mmụọ, ha na-enwe oké mmasị ịkụziri ụmụ ha ihe ime mmụọ.
Iji ghọọ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na iji jiri obi dum hụ Jehova n’anya, ọ dị mkpa ịgụ, ịtụgharị uche, na itinye Okwu Chineke n’ọrụ mgbe nile. Ọbụ abụ ahụ dere na onye ihe ụtọ ya dị n’iwu Jehova na onye na-agụ ya “ehihie na abalị, [ga-adị] ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—Abụ Ọma 1:2, 3.
Dị nnọọ ka osisi si amị ezi mkpụrụ ma ọ bụrụ na a na-agba ya mmiri mgbe mgbe, otú ahụkwa, ezinụlọ ndị na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ na-amị mkpụrụ Chineke, iji nye Jehova otuto. Otu ihe atụ bụ ezinụlọ Uwadiegwu, bụ́ ndị bi n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ọ bụ ezie na Uwadiegwu na nwunye ya mụrụ ụmụ asatọ, ha abụọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ọ na-ekwu, sị: “Ezinụlọ anyị anọgidewo na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya ruo ihe karịrị afọ 20. Anyị akụziworo ụmụ anyị Okwu Chineke site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ, ọ bụghị nanị n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị kamakwa n’ozi nakwa n’oge ndị ọzọ. Ụmụ anyị nile bụcha ndị nkwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ọ bụkwa nanị nke ikpeazụ, bụ́ onye dị afọ isii, ka a na-emebeghị baptism.”
Ịrụkọ Ọrụ Dị ka Otu Ìgwè
“Amamihe ka e ji ewu ụlọ,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 24:3) N’ime ezinụlọ, amamihe dị otú ahụ na-akpata ịrụkọ ọrụ ọnụ. “Onyeisi” nke ìgwè ezinụlọ bụ nna; ọ bụ onye Chineke họpụtara ịbụ onyeisi ezinụlọ. (1 Ndị Kọrint 11:3) Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ mesiri ike ịdị oké mkpa nke ibu ọrụ nke ịbụ isi mgbe o dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha [ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’ụzọ ime mmụọ], ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnahụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.
N’ikwekọ na ndụmọdụ a sitere n’Okwu Chineke, ọ dị ndị Kraịst bụ́ di mkpa ilekọta ọnọdụ ime mmụọ nke nwunye ha. Ọ bụrụ na e jiri ọrụ ụlọ bogbuo ndị bụ́ nwunye, ọnọdụ ime mmụọ ha ga-ahụsi anya. N’otu ala Africa, otu onye Kraịst e mere baptism ọhụrụ kpesaara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ya na nwunye ya yiri onye na-enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ. Ndị okenye ahụ tụrụ aro na enyemaka dị irè dị nwunye ya mkpa. Ya mere di ahụ malitere inyere ya aka n’ọrụ ụlọ. O tinyekwara oge inyere ya aka ime ka ịgụ ihe ya ka mma na ịmụba ihe ọmụma Bible o nwere. O meghachiri omume n’ụzọ dị mma, ugbu a kwa ezinụlọ ahụ nile dị n’otu n’ozi Chineke.
Ọ dịkwa ndị bụ́ nna mkpa inwe nchegbu banyere ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụ ha. Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Mgbe ndị mụrụ ụmụ na-agbaso ndụmọdụ ahụ bụ́ ịghara ịkpasu ụmụ ha iwe, nakwa ntụziaka bụ́ ịzụ ha, ụmụ ha na-enwe mmetụta nke ịbụ akụkụ nke otu ìgwè ezinụlọ. N’ihi ya, o yikarịrị ka ụmụaka ha ga-enye aka ma gbarịta ibe ha ume iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ.
Ịrụkọ ọrụ ọnụ na-agụnye inye ụmụaka ibu ọrụ ime mmụọ mgbe ha ruru inweta ha. Otu nna, bụ́ onye Kraịst bụ́ okenye nke mụrụ ụmụ 11, na-eteta ụra n’isi ụtụtụ ma duziere ụfọdụ n’ime ha ọmụmụ ihe tupu ọ gawa ọrụ. Ndị nke toworo eto, mgbe e mesịrị ha baptism, keere òkè n’inyere ụmụnne ha ndị nwoke na ndị nwanyị ha tọrọ aka, bụ́ nke na-agụnye ikere òkè n’ịkụziri ha Bible. Nna ha na-elekọta ihe ha na-eme, na-aja ha mma ná mgbalị ha. E meela mmadụ isii n’ime ha baptism, ndị ọzọ ka nọkwa na-arụ ọrụ maka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ.
Ezi Nkwurịta Okwu, Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị E Nwekọrọ Ọnụ
Nkwurịta okwu sitere n’ịhụnanya na ihe mgbaru ọsọ ndị e nwekọrọ ọnụ dị oké mkpa iji nwee ezinụlọ ndị dị n’otu. Gordon, bụ́ onye Kraịst bụ́ okenye nke bi na Nigeria, bụ nna nke ụmụ asaa ndị dị malite n’afọ 11 ruo 27. Mmadụ isii n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ, dị ka ndị mụrụ ha. Nke ikpeazụ, bụ́ onye e mere baptism na nso nso a, na-eso ndị òtù ezinụlọ ha na-ekerechi òkè anya n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Ụmụ nwoke abụọ ndị toruworo ogo mmadụ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.
Gordon duziiri nke ọ bụla n’ime ụmụ ya ọmụmụ Bible n’onwe ya. E wezụga nke ahụ, ezinụlọ ahụ nwere usoro ihe omume sara mbara nke ịkụzi Bible. Ha na-agbakọta kwa ụtụtụ iji tụlee otu akụkụ Bible ma kwadebezie maka nzukọ ọgbakọ.
Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị e setịpụụrụ onye ọ bụla so n’ezinụlọ ahụ bụ ịgụ isiokwu nile dị na magazin Ụlọ Nche na Teta! N’oge na-adịbeghị anya, ha gbakwụnyere ọgụgụ Bible kwa ụbọchị n’usoro ihe omume ha. Site n’ikwurịta ihe ndị ha gụtara, ndị òtù ezinụlọ ahụ na-agbarịta ibe ha ume ịnọgide n’àgwà ahụ.
E guzobere nnọọ ọmụmụ Bible ezinụlọ ahụ ha na-enwe kwa izu nke ọma nke na ọ naghị adị mkpa ichetara ya onye ọ bụla—onye ọ bụla na-atụ anya ka o ruo. Eri ọtụtụ afọ, ihe a ga-amụ, ọdịdị, na oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ ga-ewe agbanwewo, na-adabere n’afọ ndụ na mkpa nke ụmụaka ahụ. Ezinụlọ ahụ abịaruwo ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nso, nke a enwewokwa mmetụta bara uru n’ebe ụmụaka ahụ nọ.
Dị ka otu ezinụlọ, ha na-emekọ ihe ọnụ, na-ewepụtakwa oge maka ntụrụndụ. Otu ugbo n’izu, ha na-enwe “uhuruchi ezinụlọ,” bụ́ mgbe ha na-eme a jụọ a zaa, ihe ọchị ndị kwesịrị ekwesị, ịkpọ piano, ịkọ akụkọ, na ntụrụndụ n’ozuzu ya. Mgbe ụfọdụ, ha na-aga n’ụsọ mmiri na ebe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị.
Ịdabere n’Ebe Jehova Nọ
Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị e kwuru n’elu na-ebelata ihe isi ike nke ịzụlite ezinụlọ buru ibu. “Ọ bụ oké ihe ịma aka ịbụụrụ ụmụ asatọ ezigbo nna,” ka otu onye Kraịst kwuru. “Ọ na-achọ ọtụtụ ihe oriri anụ ahụ na nke ime mmụọ iji kwadoo ha; aghaghị m ịrụsi ọrụ ike iji kpata ego zuru ezu iji lekọta ha. Ụmụaka ndị nke mere okenye karị nọ n’afọ iri na ụma ha, ha asatọ na-agacha akwụkwọ. Amaara m na ọzụzụ ime mmụọ dị oké mkpa, ma ụfọdụ n’ime ụmụ m dị isi ike ma na-enupụ isi. Ha na-akpasu m iwe, ma amaara m na m na-eme ihe na-akpasu Jehova iwe mgbe ụfọdụ, ọ na-agbagharakwa m. Ya mere aghaghị m iji ndidi nọgide na-agbazi ụmụ m ruo mgbe ha ga-amara ihe.
“M na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya Jehova n’ihi na ọ na-enwere anyị ndidi n’ihi na ọ chọrọ ka mmadụ nile bịaruo nchegharị. Mụ na ezinụlọ m na-enwe ọmụmụ ihe, ụfọdụ n’ime ụmụ m na-arụkwa ọrụ iru ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị e mere baptism. Adịghị m adabere n’ike nke aka m iji rụpụta ihe; ike m pụrụ ịrụpụta ihe dị nta. Ana m agbalị iji ekpere na-abịarukwu Jehova nso na itinye ilu ahụ n’ọrụ bụ́ nke na-asị: ‘Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.’ Jehova ga-enyere m aka ịzụpụta ụmụ m nke ọma.”—Ilu 3:5, 6.
Adala Mbà Mgbe Ọ Bụla!
Mgbe ụfọdụ ịzụ ụmụaka pụrụ iyi ọrụ a na-agaghị anata ekele na ya, ma adala mbà mgbe ọ bụla! Nọgidesie ike na-eme ya! Ọ bụrụ na ụmụ gị adịghị emeghachi omume n’ụzọ dị mma ma ọ bụ na-enwe ekele ná mgbalị gị ugbu a, ha pụrụ ime otú ahụ n’ọdịnihu. Ọ na-ewe oge tupu nwatakịrị etolite bụrụ onye Kraịst na-amị mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Ndị Galetia 5:22, 23.
Monica, bụ́ onye bi na Kenya, bụ otu n’ime ụmụ iri. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị mụrụ m kụziiri anyị eziokwu Bible site n’oge anyị bụ ụmụ ọhụrụ. Papa m ga-eso anyị mụọ mbipụta dị iche iche nke ndị Kraịst kwa izu. N’ihi ọrụ ya, anyị adịghị enwe ọmụmụ ihe ahụ mgbe nile n’otu ụbọchị ahụ. Mgbe ụfọdụ, ka ọ nọ na-alọta ọrụ, ọ ga-ahụ anyị ebe anyị na-egwuri egwu n’èzí ma gwa anyị ka anyị nile bata n’ụlọ mgbe ọ na-erule minit ise maka ọmụmụ Bible anyị. Mgbe ọmụmụ Bible anyị gasịrị, a na-agba anyị ume ịjụ ajụjụ ma ọ bụ ịkọ nsogbu ọ bụla anyị nwere.
“Ọ hụrụ na anyị so ụmụaka na-atụ egwu Chineke na-akpakọ. Papa m na-eleta ụlọ akwụkwọ anyị mgbe mgbe iji jụọ ndị nkụzi banyere àgwà anyị. N’otu nleta, ọ nụrụ na ụmụnne m ndị nwoke atọ tọrọ m na ụmụ okoro ndị ọzọ lụrụ ọgụ nakwa na ha na-akpa àgwà na-adịghị mma mgbe ụfọdụ. Papa m tara ha ahụhụ maka ịkpa àgwà ọjọọ, ma o wepụtakwara oge iji Akwụkwọ Nsọ kọwaara ha ihe mere o ji dị ha mkpa ịkpa àgwà n’ụzọ nke Chineke.
“Ndị mụrụ anyị gosiri anyị abamuru ndị dị n’ịga nzukọ site n’isoro anyị na-akwadebe ihe omume nzukọ. A zụrụ anyị ịghọ ndị ozi site n’inwe nnọkọ mmụgharị ihe n’ụlọ. Malite n’oge anyị bụ ụmụ ọhụrụ, anyị na-eso ndị mụrụ anyị aga ozi ubi.
“Taa, ụmụnne m ndị nwoke abụọ tọrọ m bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, otu nwanne m nwanyị bụ ọsụ ụzọ oge nile, nwanne m nwanyị ọzọkwa, bụ́ onye lụrụ di ma nwee ezinụlọ, bụ Onyeàmà na-anụ ọkụ n’obi. Ụmụnne m ndị nwanyị abụọ m tọrọ, bụ́ ndị dị afọ 18 na 16, bụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. A ka na-azụ ụmụnne m nwoke abụọ ka na-eto eto. Anọwo m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Kenya ruo afọ atọ. Ahụrụ m ndị mụrụ m n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe n’ihi na ha bụ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe; ha setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya.”
N’agbanyeghị ụmụ ole i nwere, adala mbà mgbe ọ bụla n’inyere ha aka ịga n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ka Jehova na-agọzi mgbalị gị, ị ga-ekwughachi okwu Jọn onyeozi kwuru banyere ụmụ ime mmụọ ya, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.