Ihe Mgbapụta Kraịst—Ụzọ Nzọpụta nke Chineke
“Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—JỌN 3:16.
1, 2. Kọwaa ọnọdụ ọjọọ nke biliteworo n’ihe metụtara agbụrụ mmadụ.
WERE ya na ị na-arịa ọrịa ga-egburịrị gị ọ gwụla ma a wara gị ahụ. Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị gaghị akwụli ụgwọ ihe ịwa ahụ ahụ ga-efu? Gịnị ma ọ bụrụ na ọbụna ihe nile ezinụlọ gị na ndị enyi gị nwere apụghị ịkwụ ụgwọ ahụ? Ịbụ onye ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme dị otú ahụ bụ́ nke na-eyi ndụ egwu chere ihu ga-abụ ihe na-ekoropụ obi!
2 Nke a na-egosi ọnọdụ biliteworo n’ihe banyere agbụrụ mmadụ. E kere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ịbụ ndị zuru okè. (Deuterọnọmi 32:4) Ha nwere atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na nke imezu nzube Chineke bụ́: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Otú ọ dị, Adam na Iv nupụụrụ Onye Okike ha isi. (Jenesis 3:1-6) Ọ bụghị nanị Adam na Iv ka nnupụisi ha wetaara mmehie kamakwa ụmụ ha a na-amụpụtabeghị. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job mesịrị kwuo, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ihe ọcha ga-apụta n’ihe rụrụ arụ! ọ dịghị otu ihe ọcha ga-apụta na ya.”—Job 14:4.
3. Olee otú ọnwụ siworo gabiga ruo mmadụ nile?
3 N’ihi ya mmehie yiri ọrịa nke ji onye ọ bụla n’ime anyị, n’ihi na Bible na-ekwu na “mmadụ nile emehiewo.” Ọnọdụ a nwere ihe ndị na-eyi ndụ egwu na-esi na ya apụta. N’ezie, “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 3:23; 6:23, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke pụrụ ịgbanahụ ya. Mmadụ nile na-eme mmehie, n’ihi ya, mmadụ nile na-anwụ. Dị ka ụmụ Adam, a mụnyere anyị n’ime ọnọdụ ọjọọ a. (Abụ Ọma 51:5) “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa,” ka Pọl dere, “dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ma nke a apụtaghị na anyị enweghị olileanya maka nzọpụta.
Iwepụ Mmehie na Ọnwụ
4. N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-apụghị iwepụ ọrịa na ọnwụ n’onwe ha?
4 Gịnị ka ọ ga-ewe iji wepụ mmehie na ihe si na ya pụta, bụ́ ọnwụ? N’ụzọ doro anya, ọ ga-ewe ihe karịrị ihe mmadụ ọ bụla pụrụ inye. Ọbụ abụ ahụ kwara arịrị, sị: “Ụgwọ a ga-akwụ maka ndụ mmadụ hibigara nne ókè. Ihe ọ ga-akwụli adịghị mgbe ọ bụla ọ ga-ezu igbochi ya ịga n’ili, iji mee ka ọ dị ndụ ebighị ebi.” (Abụ Ọma 49:8, 9, Today’s English Version) N’eziokwu, anyị nwere ike iji ihe oriri na-edozi ahụ na nlekọta ahụ ike gbatịa ndụ anyị ruo afọ ole na ole, ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịgwọ ọnọdụ mmehie anyị ketara eketa. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ọjọọ nke usoro ịka nká ma weghachi ahụ anyị n’izu okè ahụ Chineke zubere maka ya ná mmalite. N’ezie, Pọl adịghị ekwubiga okwu ókè mgbe o dere na n’ihi mmehie Adam, “e doro [ihe e kere eke bụ́ mmadụ] n’okpuru ihe efu”—ma ọ bụ dị ka The Jerusalem Bible si sụgharịa ya, “e mere ka ọ ghara inwe ike imezu nzube ya.” (Ndị Rom 8:20) Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Onye Okike agbahapụbeghị anyị. O mewo ndokwa iwepụ mmehie na ọnwụ kpam kpam. N’ụzọ dị aṅaa?
5. Olee otú Iwu ahụ e nyere Israel si egosi ezi nchebara echiche maka ikpe ziri ezi?
5 Jehova bụ “[onye] na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 33:5) Usoro Iwu ahụ o nyere Israel na-egosipụta ezi nchebara echiche maka ikpe ikpe n’adalagaghị n’otu akụkụ na n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, n’ime iwu a, anyị na-agụ na ‘ndụ kwesịrị ịlara ndụ.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na onye Israel egbuo mmadụ, ọ ghaghị iji ndụ nke ya kwụọ ụgwọ nke onye ahụ o gburu. (Ọpụpụ 21:23; Ọnụ Ọgụgụ 35:21) N’ụzọ dị otú a, a ga-emezu ihe ikpe Chineke chọrọ.—Tụlee Ọpụpụ 21:30.
6. (a) N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọ Adam ogbu mmadụ? (b) Olee ụdị ndụ Adam tụfuru, ụdị àjà dịkwa aṅaa ga-adị mkpa iji mezuo ikpe ziri ezi?
6 Mgbe Adam mehiere, ọ ghọrọ ogbu mmadụ. N’echiche dị aṅaa? N’echiche bụ́ na ọ ga-ebufe ọnọdụ mmehie ya—n’ihi ya kwa ọnwụ—nye ụmụ ya nile. Ọ bụ n’ihi nnupụisi Adam ka ahụ anyị ji aka nká ugbu a, na-anwụkwa anwụ. (Abụ Ọma 90:10) Mmehie Adam nwere ọbụna ihe kakwu sie ike ọ gụnyere. Cheta, ihe Adam tụfuuru onwe ya na ụmụ ya abụghị ndụ nkịtị nke ihe dị ka afọ 70 ma ọ bụ 80. Ọ tụfuru ndụ zuru okè—n’ezie, ndụ ebighị ebi. Ya mere ọ bụrụ na ‘ndụ kwesịrị ịlara ndụ,’ ụdị ndụ dị aṅaa ka a na-aghaghị inye iji hụ na e kpere ikpe ziri ezi n’ọnọdụ a? N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ ghaghị ịbụ ndụ mmadụ zuru okè—ndụ nke, dị ka nke Adam, nwere ike ime ka e nwee mmadụ zuru okè. Ọ bụrụ na a chụọ ya dị ka àjà, ọ bụghị nanị na ndụ mmadụ zuru okè ga-emezu ikpe ziri ezi kamakwa ọ ga-eme ka iwepụ mmehie na ihe si na ya apụta, bụ́ ọnwụ kpam kpam, kwe omume.
Ịkwụ Ụgwọ Mmehie
7. Kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” pụtara.
7 Ihe a chọrọ iji gbapụta anyị ná mmehie ka a kpọrọ “ihe mgbapụta” n’ime Bible. (Abụ Ọma 49:7) N’asụsụ Bekee okwu ahụ pụrụ izo aka n’ụgwọ onye ntọrọ mmadụ na-asị ka a kwụọ ya maka onye ọ tọọrọ. N’ezie, ihe mgbapụta ahụ Jehova nyeworo emetụtaghị ntọrọ mmadụ ọ bụla. Ọ ka nwekwara echiche nke ịkwụ ụgwọ. N’ezie, ụdị ngwaa nke okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe mgbapụta” pụtara n’ụzọ nkịtị “ikpuchi.” Iji kpuchie mmehie, ihe mgbapụta ahụ aghaghị ịdaba kpọmkwem n’ihe ahụ e bu n’uche ka o kpuchie—ndụ mmadụ zuru okè nke Adam.
8. (a) Kọwaa ụkpụrụ nzụtaghachi. (b) Olee otú ụkpụrụ nzụtaghachi si emetụta anyị dị ka ndị mmehie?
8 Nke a kwekọrọ n’otu ụkpụrụ dị n’Iwu Mosis—ụkpụrụ nzụtaghachi. Ọ bụrụ na onye Israel a daa ogbenye ma renye onwe ya n’ịgba ohu n’aka onye na-abụghị onye Israel, onye ikwu ya pụrụ ịzụtaghachi (ma ọ bụ, gbapụta) ya site n’ịkwụ ụgwọ e lere anya dị ka ihe ya na ohu ahụ hà nhata. (Levitikọs 25:47-49) Bible na-ekwu na dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị bụ “ohu nke mmehie.” (Ndị Rom 6:6; 7:14, 25) Gịnị ka ọ ga-ewe iji zụtaghachi anyị? Dị ka anyị hụworo, ntụfu nke ndụ mmadụ zuru okè ga-achọ iji ndụ mmadụ zuru okè kwụọ ụgwọ—ọ dịghị ihe ọzọ.
9. Olee otú Jehova siworo mee ndokwa ikpuchi mmehie?
9 N’ezie, a na-amụ anyị bụ́ mmadụ n’ezughị okè. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke ya na Adam hà nhata; ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke pụrụ ịkwụ ihe mgbapụta ahụ nke ikpe ziri ezi chọrọ. Dị ka e hotara ná mmalite, ọ dị ka a ga-asị na anyị na-arịa ọrịa na-eyi ndụ egwu, n’apụghịkwa ịkwụ ụgwọ maka ịwa ahụ nke pụrụ ịgwọ ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ̀ bụ na anyị agaghị enwe ekele ma ọ bụrụ na otu onye akwụchitere anyị ụgwọ ahụ? Nke a bụ kpọmkwem ihe Jehova meworo! O mewo ndokwa ịgbapụta anyị ná mmehie ruo mgbe ebighị ebi. Ee, ọ dị njikere inye anyị ihe ahụ anyị na-apụghị inwetali n’onwe anyị. N’ụzọ dị aṅaa? “Onyinye amara nke Chineke,” ka Pọl dere, “bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Jọn kọwara Jisọs dị ka “Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Ka anyị lee otú Jehova si jiri Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya kwụọ ihe mgbapụta ahụ.
“Ihe Mgbapụta Kwekọrọ Ekwekọ”
10. Olee otú amụma ndị metụtara otu “mkpụrụ” si lekwasị anya n’ebe Josef na Meri nọ?
10 Ngwa ngwa nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị, Jehova kwupụtara nzube ya iweta otu “mkpụrụ,” ma ọ bụ nwa, bụ́ onye ga-agbapụta ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie. (Jenesis 3:15) Site n’ọtụtụ mkpughe O nyere, Jehova mere ka a mata ezinụlọ nke ga-amụpụta mkpụrụ ahụ. Ka oge na-aga, mkpughe ndị a lekwasịrị anya n’ebe Josef na Meri nọ, bụ́ mmadụ abụọ kwere onwe ha nkwa ọlụlụ, bi na Palestine. Ná nrọ, a gwara Josef na Meri dị ime site ná mmụọ nsọ. Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ọ ga-amụpụtakwa Nwa nwoke; ị ga-akpọkwa aha Ya Jisọs; n’ihi na Ya onwe ya ga-azọpụta ndị nke Ya ná mmehie nile ha.”—Matiu 1:20, 21.
11. (a) Olee otú Jehova si mee ndokwa ka a mụọ Ọkpara ya dị ka mmadụ zuru okè? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ike inye “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”?
11 Nke a abụghị ime nkịtị ma ọlị, n’ihi na Jisọs dịbu adị n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ. (Ilu 8:22-31; Ndị Kọlọsi 1:15) E jiriwo ike ọrụ ebube Jehova bufee ndụ ya n’akpa nwa Meri, na-eme ka o kwe omume ịmụpụta Ọkpara Chineke a ọ hụrụ n’anya dị ka mmadụ. (Jọn 1:1-3, 14; Ndị Filipaị 2:6, 7) Jehova duziri ihe nile nke na mmehie Adam emerụghị Jisọs. N’ụzọ dị iche, a mụrụ Jisọs dị ka onye zuru okè. N’ihi ya, o nwere ihe Adam tụfuworo—ndụ mmadụ zuru okè. N’ikpeazụ, mmadụ nke pụrụ ịkwụ ụgwọ mmehie! Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe Jisọs mere na Nisan 14, 33 O.A. N’ụbọchị ahụ mere ihe akụkọ, Jisọs kwere ka ndị na-emegide ya gbuo ya, si otú a na-enye “ihe mgbapụta [kwekọrọ ekwekọ, NW].”—1 Timoti 2:6.
Ọnụ Ahịa nke Ndụ Mmadụ Zuru Okè
12. (a) Kọwaa ọdịiche dị mkpa dị n’ọnwụ Jisọs na nke Adam. (b) Olee otú Jisọs siworo ghọọ “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi” nye ụmụ mmadụ na-erube isi?
12 E nwere ọdịiche n’ọnwụ Jisọs na nke Adam—ọdịiche nke na-eme ka ọnụ ahịa nke ihe mgbapụta ahụ pụta ìhè. Ọnwụ Adam nwụrụ kwesịrị ya, n’ihi na ọ kpachapụrụ anya nupụrụ Onye Okike ya isi. (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị iche, ọnwụ Jisọs nwụrụ ekwesịghị ya ma ọlị, n’ihi na “ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere.” (1 Pita 2:22) Ya mere mgbe Jisọs nwụrụ, o nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke Adam onye mmehie ahụ na-enweghị mgbe ọ nwụrụ—ikike inwe ndụ mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ọnwụ Jisọs bara uru dị ka àjà. Mgbe ọ rịgoro n’eluigwe dị ka onye bụ́ mmụọ, o gosiri Jehova ọnụ ahịa nke àjà ya. (Ndị Hibru 9:24) Site n’ime otú ahụ, Jisọs zụtara ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie ma ghọọ Nna ọhụrụ ha, onye nọchiri anya Adam. (1 Ndị Kọrint 15:45) E nwere ezi ihe mere e ji kpọọ Jisọs “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 9:6) Cheedị banyere ihe nke a pụtara! Adam, bụ́ nna na-emehie emehie, kesara ọnwụ nye ụmụ ya nile. Jisọs, bụ́ Nna zuru okè, jiri ọnụ ahịa nke àjà ya mee ihe iji nye ụmụ mmadụ na-erube isi ndụ ebighị ebi.
13. (a) Nye ihe atụ otú Jisọs si kwụọ ụgwọ ahụ Adam ji. (b) N’ihi gịnị ka àjà Jisọs na-ejighị kpuchie mmehie nke nne na nna anyị mbụ?
13 Otú ọ dị, olee otú ọnwụ nanị otu onye pụrụ isi kpuchie mmehie nke ọtụtụ mmadụ? (Matiu 20:28) N’otu isiokwu e bipụtara afọ ole na ole gara aga, anyị nyere ihe atụ ihe mgbapụta ahụ n’ụzọ dị otú a: “Jiri anya nke uche gị lee otu nnukwute ụlọ ọrụ nke nwere ọtụtụ narị ndị ọrụ. Otu onye nlekọta ụlọ ọrụ nke na-adịghị eme ihe n’eziokwu mere ka ụlọ ọrụ ahụ dakpọọ; ụlọ ọrụ ahụ mechiri. Ọtụtụ narị mmadụ enweghịkwa ọrụ ugbu a, ha enweghịkwa ike ịkwụ ụgwọ ndị ha ji. Di ma ọ bụ nwunye ha, ụmụ ha, na, n’ezie, ndị nile ha ji ụgwọ, na-ata ahụhụ n’ihi àgwà ọjọọ nke otu onye ahụ! Mgbe ahụ otu onye ọgaranya nke bụ omepụrụ onye ọ dịịrị bịara wee kwụọ ụgwọ nile ụlọ ọrụ ahụ ji ma mepeghachi ya. Ịkagbu otu ụgwọ ahụ wetakwaara ọtụtụ ndị ahụ e were n’ọrụ, ezinụlọ ha, na ndị ha ji ụgwọ nnapụta zuru ezu. Ma, onye nlekọta ọrụ mbụ ahụ ọ̀ ga-eketa okè site n’ihe ịga nke ọma ọhụrụ nke a? Ee e, ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, wee sikwa otú a bụrụ onye a chụrụ n’ọrụ kpam kpam! N’otu aka ahụ, nkagbu nke otu ụgwọ ahụ Adam ji na-ewetara ọtụtụ nde ndị sitere n’usoro ọmụmụ ya uru—ma o wetaraghị Adam.”
14, 15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Adam na Iv ndị kpachapụrụ anya mee mmehie, oleekwa otú ọnọdụ anyị si dị iche na nke ha?
14 Nke a ziri ezi. Cheta, Adam na Iv kpachapụrụ anya mee mmehie. Ha họọrọ inupụrụ Chineke isi. N’ụzọ dị iche, a mụnyere anyị n’ime mmehie. Ọ dịghị ihe ọ bụla anyị pụrụ ime. N’agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike, anyị apụghị izere ime mmehie kpam kpam. (1 Jọn 1:8) Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ inwe mmetụta yiri nke Pọl, bụ́ onye dere, sị: “Ihe ọjọọ dị m nso n’ebe aka m ga-eru, mụ, bụ́ onye na-achọ ime ihe ọma. N’ihi na mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ. Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ!”—Ndị Rom 7:21-24.
15 Ma, n’ihi ihe mgbapụta ahụ, anyị nwere olileanya! Jisọs bụ mkpụrụ ahụ “mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha” site na ya, dị ka Chineke kwere ná nkwa. (Jenesis 22:18; Ndị Rom 8:20) Àjà Jisọs na-emeghe ụzọ maka ohere ndị magburu onwe ha nye ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ndị a.
Irite Uru Site n’Ihe Mgbapụta Kraịst
16. N’agbanyeghị ọnọdụ mmehie anyị, uru ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta ugbu a n’ihi ihe mgbapụta Jisọs?
16 Onye so dee Bible bụ́ Jemes na-ekweta na “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe.” (Jemes 3:2) Otú ọ dị, n’ihi ihe mgbapụta Kraịst, a pụrụ ịgbaghara anyị njehie anyị. Jọn na-ede, sị: “[Ọ bụrụ] na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu Onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume: Ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị.” (1 Jọn 2:1, 2) N’ezie, anyị ekwesịghị ile mmehie anya dị ka ntakịrị ihe. (Jud 4; tụlee 1 Ndị Kọrint 9:27.) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị emehie, anyị pụrụ ịwụpụrụ Jehova obi anyị, na-enwe obi ike na ọ “na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5; 130:3, 4; Aịsaịa 1:18; 55:7; Ọrụ 3:19) N’ụzọ dị otú a ihe mgbapụta ahụ na-eme ka anyị nwee ike iji ezi akọ na uche na-ejere Chineke ozi, na-emekwa ka o kwe anyị omume ịgakwuru ya n’ekpere n’aha Jisọs Kraịst.—Jọn 14:13, 14; Ndị Hibru 9:14.
17. N’ihi ihe mgbapụta ahụ, olee ngọzi ndị a pụrụ inweta n’ọdịnihu?
17 Ihe mgbapụta Kraịst na-emeghe ụzọ maka mmezu nke nzube Chineke—ka ụmụ mmadụ na-erube isi dị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Abụ Ọma 37:29) Pọl dere, sị: “Ka ha hà, bụ́ nkwa nke Chineke, ọ bụ n’ime Ya [Jisọs] ka ee dị.” (2 Ndị Kọrint 1:20) N’eziokwu, ọnwụ ‘abụwo eze.’ (Ndị Rom 5:17) Ihe mgbapụta ahụ na-enye ihe ndabere maka Chineke ikpochapụ “onye iro ikpeazụ” a. (1 Ndị Kọrint 15:26; Mkpughe 21:4) Ihe mgbapụta Jisọs pụrụ ọbụna ịbara ndị nwụworo anwụ uru. “Oge awa na-abịa,” ka Jisọs kwuru, “mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya [Jisọs], ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29; 1 Ndị Kọrint 15:20-22.
18. Olee ajọ mmetụta mmehie nweworo n’ahụ ụmụ mmadụ, oleekwa otú a ga-esi gbanwee nke a n’ụwa ọhụrụ Chineke?
18 Cheedị otú ọ ga-esi dị ụtọ ibi ndụ dị ka e zubere ka ọ dị—n’enweghị nchegbu ndị na-anyịgbu anyị taa! Mmehie emewo ka ọ bụghị nanị anyị na Chineke kamakwa uche, obi, na ahụ anyị ghara ịdị n’otu. Otú ọ dị, Bible na-ekwe nkwa na n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Ee, nrịanrịa anụ ahụ na nke mmetụta uche agaghị etikwa ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ọzọ. N’ihi gịnị? Aịsaịa na-aza, sị: “A ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.”—Aịsaịa 33:24.
Ihe Mgbapụta ahụ —Ihe Ngosipụta nke Ịhụnanya
19. Olee otú anyị nile n’otu n’otu kwesịrị isi meghachi omume n’ebe ihe mgbapụta Kraịst dị?
19 Ịhụnanya kpaliri Jehova izite Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Ndị Rom 5:8; 1 Jọn 4:9) N’aka nke ya, ịhụnanya kpaliri Jisọs ‘idetụ ọnwụ ire n’ihi mmadụ nile.’ (Ndị Hibru 2:9; Jọn 15:13) E nwere ezi ihe mere Pọl ji dee, sị: “Ịhụnanya Kraịst [na-arụgide] anyị . . . Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Ọ bụrụ na anyị nwere ekele maka ihe Jisọs meere anyị, anyị ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma. E kwuwerị, ihe mgbapụta ahụ mere ka o kwe omume ịgbapụta anyị pụọ n’ọnwụ! N’ezie anyị agaghị achọ igosi site n’omume anyị na anyị na-ele àjà Jisọs anya dị ka ihe na-adịghị oké ọnụ ahịa.—Ndị Hibru 10:29.
20. Olee ụzọ ụfọdụ ndị anyị si edebe “okwu” Jisọs?
20 Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele sitere n’obi maka ihe mgbapụta ahụ? Ntakịrị oge tupu e jide ya, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m.” (Jọn 14:23) “Okwu” Jisọs na-agụnye iwu ya nke bụ́ ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ịrụzu ọrụ bụ́: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism.” (Matiu 28:19) Irubere Jisọs isi na-achọkwa ka anyị nwee ịhụnanya n’ebe ụmụnna ime mmụọ anyị nọ.—Jọn 13:34, 35.
21. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gaa Ememe Ncheta n’April 1?
21 Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma anyị pụrụ isi gosi obi ekele maka ihe mgbapụta ahụ bụ site n’ịga Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, bụ́ nke a ga-eme n’afọ a n’April 1.a Nke a bụkwa akụkụ nke “okwu” Jisọs, n’ihi na mgbe ọ na-eguzobe ememe a, Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Site na anyị ịga n’ihe omume a kasị mkpa nakwa site na anyị ịṅa ntị nke ọma n’ihe nile Kraịst nyere n’iwu, anyị ga-egosipụta na anyị kwenyesiri ike na ihe mgbapụta Jisọs bụ ụzọ nzọpụta nke Chineke. N’eziokwu, “nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ.”—Ọrụ 4:12.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’afọ a, April 1 kwekọrọ na Nisan 14, 33 C.E., bụ́ ụbọchị Jisọs nwụrụ. Jụọ Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị maka oge na ebe a ga-eme Ememe Ncheta ahụ.
Ị̀ Pụrụ Icheta?
◻ N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-apụghị ikpuchi ọnọdụ mmehie ha?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”?
◻ Olee otú Jisọs si jiri ikike ya ịdị ndụ dị ka mmadụ zuru okè mee ihe maka abamuru anyị?
◻ Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịara ihe a kpọrọ mmadụ n’ihi ihe mgbapụta Kraịst?
[Foto dị na peeji nke 15]
Nanị mmadụ zuru okè—onye ya na Adam hà nhata—pụrụ imezu ikpe ziri ezi
[Foto dị na peeji nke 16]
Ebe Jisọs nwere ikike ịdị ndụ dị ka mmadụ zuru okè, ọnwụ ya bara uru dị ka àjà