Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/15 p. 4-9
  • Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga-ekwe Omume n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga-ekwe Omume n’Ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Mere Anyị Ịdị Ndụ Ebighị Ebi
  • Ọchịchọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Obi?
  • Ọ̀ Bụ Nzube Chineke n’Ezie?
  • Nzube Chineke Agbanweghị
  • Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Mmadụ Ịdị Ndụ Ọzọ Mgbe Ọ Nwụsịrị—Ọ Ga-ekwe Omume!
    Teta!—2008
  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/15 p. 4-9

Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga-ekwe Omume n’Ezie?

“Onye ozizi, ọ̀ bụ ezi ihe gịnị ka m ga-eme, ka m wee nwee ndụ ebighị ebi?”—MATIU 19:16.

1. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere oge ndụ anyị?

EZE Xerxes nke Mbụ nke Peasia, onye a maara na Bible dị ka Ahasuerọs, nọ na-eleru usuu ndị agha ya anya tupu otu agha a lụrụ n’afọ 480 T.O.A. (Esta 1:1, 2) Dị ka onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus si kwuo, eze ahụ bere ákwá mgbe o lere ndị agha ya anya. N’ihi gịnị? “Ọ na-ewute m,” ka Xerxes kwuru, “mgbe m tụgharịrị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ. N’ihi na n’ime ndị ikom a nile, ọ dịghị nke ga-anọ ndụ otu narị afọ site n’ugbu a.” Ma eleghị anya gị onwe gị ahụwokwa na ndụ dị mkpụmkpụ n’ụzọ dị mwute na ọ dịghịkwa onye chọrọ ịka nká, ịrịa ọrịa, na ịnwụ. Ewo, a sị nnọọ na anyị pụrụ ịdị ndụ n’ahụ nke oge ntorobịa na n’obi ụtọ!—Job 14:1, 2.

2. Olileanya dị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-enwe, n’ihi gịnịkwa?

2 N’ụzọ dị ịrịba ama, The New York Times Magazine nke September 28, 1997, bu isiokwu bụ́ “Ha Chọrọ Ịdị Ndụ.” O hotara okwu nke otu onye na-eme nchọpụta bụ́ onye tiri mkpu, sị: “Ekwenyere m n’ezie na anyị pụrụ ịbụ ọgbọ mbụ ga-adị ndụ ebighị ebi”! Ikekwe gị onwe gị kwa kwetara na ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume. Ị pụrụ iche otú ahụ n’ihi na Bible na-ekwe nkwa na anyị pụrụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala ebe a. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4) Ma, ụfọdụ ndị kwetara na ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume n’ihi ihe ndị ọzọ ma e wezụga ihe ndị e dere na Bible. Ịtụle ole na ole n’ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịmata na ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume n’ezie.

E Mere Anyị Ịdị Ndụ Ebighị Ebi

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ekweta na anyị kwesịrị inwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? (b) Gịnị ka Devid kwuru banyere otú e si mee ya?

3 Otu ihe mere ọtụtụ ndị ji kwere na ụmụ mmadụ kwesịrị inwe ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi bụ n’ihi ụzọ dị ebube e si mee anyị. Dị ka ihe atụ, otú e si mee anyị n’ime akpa nwa nne anyị bụ ọrụ ebube n’ezie. Otu onye a ma ama bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịka nká dere, sị: “Mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube ndị na-akpọrọ anyị site n’oge a tụrụ ime anyị gaa n’ọmụmụ, ruokwa ná ntozu okè n’ụzọ mmekọahụ na itoru ogo mmadụ, ike na-eke ihe họọrọ ịghara imepụta usoro yiri ka ọ dị mfe karị, nke ga-akwụsị ịka nká ma mee ka ọrụ ebube ndị ahụ dịruo ebighị ebi.” Ee, n’iburu n’uche otú e si mee anyị n’ụzọ ọrụ ebube, ajụjụ ka bụ, Gịnị mere anyị ga-eji na-anwụ anwụ?

4 Ọtụtụ narị afọ iri gara aga onye ahụ so dee Bible, bụ́ Devid, tụgharịrị uche n’ọrụ ebube ndị ahụ n’ezie, ọ bụ ezie na ọ pụghị ịhụ ime akpa nwa kpọmkwem otú ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ ime taa. Devid tụgharịrị uche n’otú e si mee ya onwe ya mgbe, dị ka o si dee, ‘a kpara ya n’afọ nne ya dị ka e si akpa ákwà.’ N’oge ahụ, ka ọ sịrị, ‘e wepụtara akụrụ ya abụọ.’ O kwukwara banyere omume e mere “ọkpụkpụ” ya mgbe, dị ka o si kwuo, “e mere m na nzuzo.” Devid kwuziri banyere “ahụ m mgbe ọ ka-ezughị okè” ma kwuo banyere ahụ ya ahụ nọ n’ime akpa nwa nne ya, sị: “N’akwụkwọ Gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ.”—Abụ Ọma 139:13-16.

5. Olee ọrụ ebube ndị dị n’otú e si mee anyị n’ime akpa nwa?

5 N’ụzọ doro anya, ọ dịghị ụkpụrụ nkịtị e dere ede a gbasoro iji kpụọ Devid n’ime akpa nwa nne ya. Ma mgbe Devid na-atụgharị uche n’otú e si mee “akụrụ” ya, “ọkpụkpụ” ya, na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, ọ dị ya ka e mere ihe ndị a n’ụzọ kwekọrọ n’otu ụkpụrụ—na e deturu ihe nile, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, “n’akwụkwọ.” Ọ dị ka a ga-asị na mkpụrụ ndụ ahụ dị n’ime ahụ nne ya nke ghọrọ nwa ò nwere nnukwute ọnụ ụlọ nke jupụtara n’akwụkwọ ndị e deturu ntụziaka sara mbara banyere otú e si eme nwa n’ime ha nakwa na e bufere ntụziaka ndị a dị mgbagwoju anya ná mkpụrụ ndụ ọhụrụ ọ bụla. N’ihi ya, magazin bụ́ Science World ji okwu na-egosi na ihe bụ ihe ọzọ mee ihe n’ikwu na ‘mkpụrụ ndụ ọ bụla dị n’ime nwa a ka bu n’afọ nwere ebe ndebe ihe nke jupụtara n’ụkpụrụ zuru ezu.’

6. Olee ihe àmà na-egosi na, dị ka Devid dere, “e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee” anyị?

6 Ì chetụwo echiche banyere otú ahụ anyị si arụ ọrụ n’ụzọ ọrụ ebube? Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Jared Diamond kwuru, sị: “Anyị na-edochi mkpụrụ ndụ ngịrị afọ anyị otu ugboro n’ime ụbọchị ole na ole, ndị dị n’akpa mamịrị otu ugboro n’ime ọnwa abụọ ọ bụla, mkpụrụ ndụ ọbara uhie otu ugboro n’ime ọnwa anọ ọ bụla.” O kwubiri, sị: “Okike na-atụkasị anyị ma na-akwụkọta anyị kwa ụbọchị.” Gịnị ka nke ahụ pụtara n’ezie? Ọ pụtara na n’agbanyeghị afọ ole anyị pụrụ ịdịru—ma ọ bụ 8, 80, ma ọ bụ ọbụna 800—ahụ anyị na-anọgide na-adị ọhụrụ. Otu onye ọkà mmụta sayensị mere atụmatụ n’otu oge, sị: “N’ime otu afọ a ga-eji ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ anyị na-enweta site n’ikuku, n’ihe oriri, na n’ihe ọṅụṅụ ndị anyị na-eweba n’ime ahụ anyị dochie ihe e mere atụmatụ ya ịbụ pasent 98 nke ụmụ irighiri ihe ndị dị anyị n’ahụ ugbu a.” N’ezie, dị ka Devid kwuru n’otuto ya, “e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka [anyị] bụrụ oké ọrụ.”—Abụ Ọma 139:14.

7. Dabere n’ọdịdị nke ahụ anyị, gịnị ka ụfọdụ ndị kwubiworo?

7 Dabere n’otú e si mee ahụ anyị, otu onye ọkachamara n’ihe banyere ịka nká kwuru, sị: “O doghị anya ihe mere ịka nká ji kwesị iwere ọnọdụ.” O yiri n’ezie ka anyị kwesịrị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụkwa ya mere ndị mmadụ ji na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ a site na nkà na ụzụ ha. N’oge na-adịbeghị oké anya, Dr. Alvin Silverstein ji obi ike dee n’akwụkwọ ya bụ́ Conquest of Death, sị: “Anyị ga-ekpughepụ ihe ndụ pụtara. Anyị ga-aghọta . . . otú mmadụ si aka nká.” Gịnị ka ọ ga-arụpụta? O buru amụma, sị: “A gaghị enwekwa ndị ‘kara nká,’ n’ihi na ihe ọmụma nke ga-eme ka e merie ọnwụ ga-emekwa ka a nọgide na-abụ ndị ntorobịa mgbe nile.” N’iburu n’uche nnyocha nke nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ na-eme banyere ọdịdị mmadụ, echiche nke ịdị ndụ ebighị ebi ọ̀ na-ada gị nnọọ ka ihe na-agaghị ekwe omume? E nwere ọbụna ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ karị mere a ga-eji kwere na ịdị ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume.

Ọchịchọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

8, 9. Olee ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị mmadụ nweworo kemgbe ụwa?

8 Ị̀ chọpụtatụwo na ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi bụ ọchịchọ mmadụ bu pụta ụwa? Otu dọkịta dere n’otu akwụkwọ akụkọ Germany, sị: “Ma eleghị anya nrọ nke ndụ ebighị ebi malitere kemgbe e kere ihe a kpọrọ mmadụ.” N’ịkọwa nkwenkwe nke ụfọdụ ndị Europe oge ochie, The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ndị selitere isi ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụlọ nzukọ na-egbuke egbuke nke e ji ọlaedo kpuchie elu ya.” Ewo, leekwa ebe ndị mmadụ garuworo ná mgbalị imeju ọchịchọ ahụ bụ́ isi nke ịdị ndụ ebighị ebi!

9 Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu na n’ihe karịrị afọ 2,000 gara aga na China, “ndị ọchịchị alaeze ukwu na [ndị nkịtị] n’otu aka ahụ, n’okpuru idu ndú nke ndị nchụàjà nke okpukpe Tao, mere mgbalị nile iji chọọ mmiri ọgwụ nke ndụ”—ihe a sị na-akpata ịnọgide na-abụ onye ntorobịa. N’ezie, n’akụkọ ihe mere eme nile, ndị mmadụ ekwenyewo na site n’ịṅụ ngwakọta nke ihe dị iche iche ma ọ bụ ọbụna site n’ịṅụ mmiri ụfọdụ, na ha pụrụ ịnọgide na-abụ ndị ntorobịa.

10. Mgbalị dị aṅaa ka e meworo n’oge a iji mee ka e nwee ike ịgbatịkwu ndụ?

10 Mgbalị ndị a na-eme n’oge a iji mejuo ọchịchọ ebumpụta ụwa nke mmadụ maka ndụ ebighị ebi dịkwa ịrịba ama. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ iji oyi gbasie onye nwụrụ n’ihi ọrịa. E mewo nke a n’olileanya nke ime ka ọ dịghachi ndụ n’ọdịnihu mgbe a chọpụtaworo ngwọta ọrịa ahụ. Otu onye na-akwalite omume a, a na-akpọ cryonics, dere, sị: “Ọ bụrụ na nchekwube anyị zie ezie, a mụtakwa ụzọ isi gwọọ ma ọ bụ dozie mbibi nile—gụnyere nkwarụ nile nke ịka nká—mgbe ahụ, n’ọdịnihu, ndị ‘na-anwụ’ ugbu a ga-enwe ndụ a gbatịrị ruo ebighị ebi.”

11. Gịnị mere ndị mmadụ ji achọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

11 N’ihi gịnị, ka ị pụrụ ịjụ, ka ọchịchọ a nke ịdị ndụ ebighị ebi ji dị otú a n’uche anyị? Ọ̀ bụ n’ihi na “[Chineke etinyewo] mgbe ebighị ebi n’ime uche mmadụ”? (Eklisiastis 3:11, Revised Standard Version) Nke a bụ okwu a ga-echebasiri echiche ike! Cheedị nnọọ echiche: Gịnị mere anyị ga-eji nwee ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ịdị ndụ n’anwụghị anwụ—ruo mgbe ebighị ebi—ma ọ bụrụ na ọ bụghị nzube Onye Okike anyị ka e mejuo ọchịchọ a? Ọ̀ ga-abụkwa ịhụnanya, ya ike anyị inwe ọchịchọ maka ndụ ebighị ebi ma mezie ka obi koropụ anyị site n’ịghara ikwe mgbe ọ bụla ka anyị nweta ọchịchọ ahụ?—Abụ Ọma 145:16.

Ònye Ka Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Obi?

12. Obi ike dị aṅaa ka ụfọdụ ndị na-enwe, ma ì kwere na o nwere ezi ihe kpatara ya?

12 Ebee, ma ọ bụ na gịnị, ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi maka inweta ndụ ebighị ebi? Ọ̀ bụ na nkà na ụzụ nke narị afọ nke 20 ma ọ bụ nke 21? Isiokwu dị na The New York Times Magazine bụ́ “Ha Chọrọ Ịdị Ndụ” kwuru banyere “chi: nkà na ụzụ” na “oké mmasị banyere ikike nke nkà na ụzụ.” E kwuru na ọbụna otu onye nchọpụta nwere “oké obi ike . . . na a ga-enwe usoro nkwalite mkpụrụ ndụ ihe nketa n’oge iji zọpụta [anyị] site n’ịkwụsị ịka nká, ikekwe gbanwee ya.” Otú ọ dị, n’ezie, mgbalị ụmụ mmadụ n’ịkwụsị ịka nká ma ọ bụ n’imeri ọnwụ akụwo afọ n’ala kpam kpam.

13. Olee otú ọdịdị ụbụrụ anyị si egosi na e zubere ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

13 Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ụzọ a ga-esi nweta ndụ ebighị ebi? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dị ụzọ dịnụ! Ọdịdị nke ụbụrụ anyị dị ebube, ya na ikike ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-akparaghị ókè maka ịmụta ihe, kwesịrị ime ka anyị kweta nke a. Ọkà mmụta ihe mejupụtara ihe ndị dị ndụ bụ́ James Watson kpọrọ ụbụrụ anyị “ihe kasị dị mgbagwoju anya anyị chọpụtatụworo n’eluigwe na ala anyị.” Ọkà n’ọrịa akwara ahụ bụ́ Richard Restak kwukwara, sị: “Ọ dịghị ebe e nwere ihe ọ bụla yitetụrụ ya n’eluigwe na ala a maara.” Gịnị mere anyị ga-eji nwee ụbụrụ nke nwere ikike ịkwakọba na ịnabata ihe ọmụma fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-akparaghị ókè na ahụ nke e mere ịrụ ọrụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na e zubeghị ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi?

14. (a) Nkwubi okwu dị aṅaa banyere ndụ mmadụ ka ndị so dee Bible na-ezo aka na ya? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụkwasị Chineke obi, ọ bụghịkwa mmadụ?

14 Mgbe ahụzi, gịnị bụ nanị nkwubi okwu ezi uche dị na ya, nke ziri ezi, anyị na-aghaghị iru? Ọ́ bụghị na ọ bụ Onye nwere ọgụgụ isi, nke kasị ike, mere ma kee anyị ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? (Job 10:8; Abụ Ọma 36:9; 100:3; Malakaị 2:10; Ọrụ 17:24, 25) Ya mere, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji amamihe ṅaa ntị n’iwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke onye ọbụ abụ so dee Bible nyere: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere”? Gịnị mere na anyị agaghị atụkwasị mmadụ obi? N’ihi na, dị ka ọbụ abụ ahụ dere, sị, “mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” N’ezie, n’agbanyeghị ikike ha nwere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ụmụ mmadụ apụghị ime ihe ọ bụla mgbe ọnwụ bịara. Ọbụ abụ ahụ kwubiri, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ . . . nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya.”—Abụ Ọma 146:3-5.

Ọ̀ Bụ Nzube Chineke n’Ezie?

15. Gịnị na-egosi na ọ bụ nzube Chineke ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

15 Ma ị pụrụ ịjụ, Ọ̀ bụ nzube Jehova n’ezie ka anyị nwee ndụ ebighị ebi? Ee, ọ bụ! Okwu ya kwere nkwa ya ugboro ugboro. “Onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi,” ka Bible na-emesi anyị obi ike. Ohu Chineke bụ́ Jọn dere, sị: “Nke a bụkwa nkwa ahụ nke [Chineke] onwe ya kwere anyị, bụ́ ndụ ahụ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi.” Ka a sịkwa ihe mere otu nwa okorobịa ji jụọ Jisọs, sị: “Onye ozizi, ọ̀ bụ ezi ihe gịnị ka m ga-eme, ka m wee nwee ndụ ebighị ebi?” (Ndị Rom 6:23; 1 Jọn 2:25; Matiu 19:16) N’ezie, Pọl onyeozi dere banyere ‘olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke Chineke, Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha, kwere nkwa ya tutu mgbe ebighị ebi eruo.’—Taịtọs 1:2.

16. N’echiche dị aṅaa ka Chineke pụrụ isiworị kwee nkwa ndụ ebighị ebi “tutu mgbe ebighị ebi eruo”?

16 Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na Chineke kwere nkwa ndụ ebighị ebi “tutu mgbe ebighị ebi eruo”? Ụfọdụ na-eche na Pọl onyeozi bu n’obi na tupu e kee mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, na Chineke zubere na ụmụ mmadụ kwesịrị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na Pọl na-ezo aka n’otu oge mgbe e kesịrị mmadụ, mgbe Jehova kwupụtakwara nzube ya, ọ ka doro anya na uche Chineke gụnyere ndụ ebighị ebi maka ụmụ mmadụ.

17. Gịnị mere e ji chụpụ Adam na Iv n’ogige Iden, n’ihi gịnịkwa ka e ji tinye cherubim n’ọnụ ụzọ mbata?

17 Bible na-ekwu na n’ogige Iden na ‘Jehova, bụ́ Chineke, mere ka osisi . . . si n’ala puo, osisi nke ndụ kwa.’ Ihe e kwuru mere e ji chụpụ Adam n’ogige ahụ bụ ka o wee “ghara isetị aka ya, were mkpụrụ sitere n’osisi ahụ nke ndụ, rie, dị ndụ”—ee, ruo mgbe ebighị ebi! Mgbe a chụpụsịrị Adam na Iv n’ogige Iden, Jehova tinyere “Cherubim . . . ha na ire ọkụ nke mma agha nke na-echigharị onwe ya, idebe ụzọ osisi ahụ nke ndụ.”—Jenesis 2:9; 3:22-24.

18. (a) Gịnị ka iri mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ gaara apụtaworo Adam na Iv? (b) Gịnị ka iri mkpụrụ osisi ahụ na-anọchite anya ya?

18 A sị na e kwere ka Adam na Iv rie mkpụrụ nke osisi nke ndụ ahụ, gịnị ka ọ gaara apụtaworo ha? Ọ bụnụ ihe ùgwù nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs! Otu ọkà mmụta Bible chere, sị: “Osisi nke ndụ ahụ aghaghị inweworị ihe ọma ụfọdụ dị n’ime ya nke ga-eme ka ọdịdị mmadụ ghara ịdakpọ n’ihi ịka nká, ma ọ bụ ire ure nke na-ejedebe n’ọnwụ.” O kwuru ọbụna na “e nwere mkpá akwụkwọ ọma dị na paradaịs bụ́ nke pụrụ imeghasị mmetụta nile” nke ịka nká. Otú ọ dị, Bible ekwughị na osisi nke ndụ ahụ nwere n’ime onwe ya ihe ndị na-enye ndụ. Kama nke ahụ, osisi ahụ bụ nanị ihe nnọchiteanya nke mmesi obi ike Chineke banyere ndụ ebighị ebi nye onye a ga-ekwe ka o rie mkpụrụ ya.—Mkpughe 2:7.

Nzube Chineke Agbanweghị

19. N’ihi gịnị ka Adam ji nwụọ, n’ihi gịnịkwa ka anyị, bụ́ ụmụ ya, ji na-anwụkwa?

19 Mgbe Adam mehiere, ọ tụfuuru onwe ya nakwa ụmụ ya nile a na-amụbeghị ikike nke ịdị ndụ ebighị ebi. (Jenesis 2:17) Mgbe ọ ghọrọ onye mmehie n’ihi nnupụisi ya, ọ ghọrọ onye nwere ntụpọ, onye na-ezughị okè. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ahụ Adam ghọrọ, n’ezie, nke e mere ịnwụ anwụ. Dị ka Bible na-ekwu, “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ọzọkwa, ụmụ Adam bụ́ ndị na-ezughị okè ghọkwara ndị e mere ịnwụ anwụ, ọ bụghị ịdị ndụ ebighị ebi. Bible na-akọwa, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.

20. Gịnị na-egosi na e mere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala?

20 Ma gịnị ma a sị na Adam emehieghị? Gịnị ma a sị na o nupụghịrị Chineke isi, e nyekwa ya ikike iri mkpụrụ sitere n’osisi nke ndụ ahụ? Olee ebe ọ gaara anọ nụ ụtọ onyinye Chineke bụ́ ndụ ebighị ebi? Ọ̀ bụ n’eluigwe? Ee e! Chineke ekwughị ihe ọ bụla banyere ịkpọga Adam n’eluigwe. Ọrụ e nyere ya bụ n’ụwa ebe a. Bible na-akọwa na “Jehova, bụ́ Chineke, wee mee ka osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri,” ọ na-ekwukwa, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were mmadụ ahụ mee ka ọ nọdụ n’ubi Iden a gbara ogige ịrụ ọrụ ya na idebe ya.” (Jenesis 2:9, 15) Mgbe e kesịrị Iv dị ka nwunye Adam, e nyere ha abụọ ọrụ ọzọkwa n’elu ala ebe a. Chineke gwara ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:28.

21. Olileanya ndị dị aṅaa magburu onwe ha ka mmadụ abụọ mbụ ahụ nwere?

21 Cheedị echiche banyere olileanya elu ala magburu onwe ya ntụziaka ndị ahụ sitere n’aka Chineke nyere Adam na Iv! Ha gaje ịzụ ụmụaka ndị nwoke na ndị nwanyị nwere ahụ ike zuru okè na Paradaịs elu ala ahụ. Ka ụmụ ha ha hụrụ n’anya na-eto, ndị a ga-esoro ha kere òkè n’ịmụ ọmụmụ na n’ịrụ ọrụ ubi na-enye obi ụtọ iji lekọta Paradaịs ahụ. N’ịbụ ndị anụmanụ ahụ nile nọ n’okpuru ha, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe nnọọ afọ ojuju. Cheedị ọṅụ ọ bụ ịgbasapụ ókèala nke ogige Iden ahụ ka ụwa nile wee ghọọ paradaịs n’ikpeazụ! Ị̀ ga-enwe mmasị ibi ndụ n’ụdị ebe obibi dị otú ahụ mara mma n’elu ala na-enwe ụmụaka zuru okè, n’enweghị nchegbu ọ bụla banyere ịka nká na ịnwụ anwụ? Ka ọchịchọ ebumpụta ụwa dị gị n’obi zaa ajụjụ ahụ.

22. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Chineke agbanweghị nzube ya maka ụwa?

22 Ya bụrụ otú ahụ, mgbe Adam na Iv nupụrụ isi, a chụpụkwa ha n’ogige Iden, Chineke ọ̀ gbanwere nzube ya maka ụmụ mmadụ ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala? Ọ dịghị ma ọlị! Chineke ime otú ahụ gaara abụ ikweta na ya apụghị imezu nzube ya mbụ. Anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke na-emezu ihe o kwere ná nkwa, dị ka ya onwe ya na-ekwupụta: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.

23. (a) Gịnị na-akwadoghachi na ọ bụ nzube Chineke ka ndị ezi omume dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala? (b) Gịnị bụ ihe ọzọ anyị ga-atụle?

23 Na nzube Chineke banyere ụwa agbanwebeghị bụ nke e mere ka o doo anya n’ime Bible, bụ́ ebe Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ọbụna Jisọs Kraịst kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya na ndị dị nwayọọ n’obi ga-eketa ụwa. (Abụ Ọma 37:29; Matiu 5:5) Ma, olee otú anyị pụrụ isi nweta ndụ ebighị ebi, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji nụ ụtọ ụdị ndụ ahụ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji ekweta na ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume?

◻ Gịnị ga-eme ka anyị kweta na e mere anyị ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

◻ Gịnị bụ nzube mbụ nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Chineke ga-emezu nzube ya mbụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya