Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/15 p. 3-6
  • Ị̀ Na-eso Ezinụlọ Gị Anọkọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-eso Ezinụlọ Gị Anọkọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enweghị Nkwurịta Okwu
  • A Chọrọ Mgbalị Siri Ike
  • Enyemaka Sitere n’Okwu Chineke
  • Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nkwurịta Okwu n’Ime Ezinụlọ na n’Ime Ọgbakọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Rụọ Ọrụ Iji Chebe Ezinụlọ Gị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu?​—Nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/15 p. 3-6

Ị̀ Na-eso Ezinụlọ Gị Anọkọ?

“A HỤRỤ Ndị Japan Bụ́ Nna n’Anya—Ọ Bụ Ezie na Ha Bụ Ndị Ji Ọrụ n’Aka na Ndị Na-adịghị Eso Ụmụ Ha Egwurị Egwu.” Isiakụkọ a pụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Shimbun ụfọdụ afọ gara aga. Isiokwu ahụ kọrọ na pasent 87.8 nke ụmụaka bụ́ ndị Japan a jụrụ ajụjụ ná nnyocha gọọmenti mere kwupụtara ọchịchọ ha ilekọta nna ha n’ọdịnihu. Otú ọ dị, ná mbipụta Bekee nke akwụkwọ akụkọ ahụ, otu ihe ahụ pụtara n’isiakụkọ dị iche. Ọ na-agụ, “Ndị Nna na Ụmụ: Ihe Banyere Nleghara Anya.” N’adịghị ka mbipụta ya n’asụsụ Japanese, isiokwu ahụ mesiri ike akụkụ ọzọ nke otu nnyocha ahụ: Kwa ụbọchị ọrụ, ndị Japan bụ́ nna na-eji nanị minit 36 eso ụmụ ha anọkọ. Ná ntụnyere, ndị bụ́ nna na West Germany na-eji minit 44 na-eso ụmụ ha anọkọ n’ụbọchị na-abụghị ngwụsị izu, na United States kwa, ọnụ ọgụgụ ya bụ minit 56.

Ọ bụghị nanị ndị nna na-eji ntakịrị oge eso ụmụ ha anọkọ. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị nne na-arụ ọrụ ego. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nne na-enweghị di aghaghị ịrụ ọrụ ego iji kwado ezinụlọ ha. N’ihi nke a, oge nke ndị mụrụ ụmụ—ma ndị nne ma ndị nna—na-eji eso ụmụ ha na-anọkọ na-adalata.

Nnyocha e mere ihe karịrị ụmụ America 12,000 bụ́ ndị nọ n’afọ iri na ụma na 1997 na-eme ka a chọpụta na ndị ntorobịa ha na nne na nna ha na-enwe mmekọrịta chiri anya yiri ka ha agaghị enwekebe nchekasị, echiche igbu onwe ha, ime ihe ike, ma ọ bụ iji ọgwụ na-eri ahụ eme ihe. Otu onye so mee nnyocha ahụ e mere ọtụtụ ndị kwukwara, sị: “Gị na ụmụaka agaghị enwe mmekọrịta chiri anya ọ gwụlakwa ma ị nọ ha nso.” Isoro ụmụ gị nọkọọ na isoro ha kwurịta okwu dị mkpa.

Enweghị Nkwurịta Okwu

Ndị pụrụ ịnọ na-ekwurịtaghị okwu karịsịa bụ ezinụlọ ndị nne ma ọ bụ nna ha bi n’ebe dị anya site n’ụlọ ha na-arụ ọrụ. N’ezie, ọ bụghị nanị ezinụlọ ndị nne ma ọ bụ nna ha bi ebe dị n’anya site n’ụlọ ha bụ ndị na-adịghị enwe nkwurịta okwu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nne na nna bi n’ụlọ ha, ha na-aga ọrụ tupu ụmụ ha eteta n’ụra ma na-alọghachi mgbe ha lakpuworo ụra. Iji wepụ mmetụta ọjọọ nke enweghị nkwurịta okwu na-esi na ya apụta, ụfọdụ ndị nne na nna na-eso ezinụlọ ha anọkọ ná ngwụsị izu nakwa n’ụbọchị ezumike. Ha na-ekwu banyere iji oge “bara uru” soro ụmụ ha nọkọọ.

N’agbanyeghị nke ahụ, ịba uru nke oge ọ̀ na-akwụ ụgwọ obere oge e ji mee ihe? Onye na-eme nnyocha bụ́ Laurence Steinberg na-aza, sị: “N’ozuzu, ụmụaka ha na ndị mụrụ ha na-eji oge ka ukwuu anọkọ na-eme nke ọma karịa ụmụaka ha na ndị mụrụ ha na-eji oge ka nta anọkọ. O yiri ka o siri nnọọ ike ịkwụ ụgwọ nke enweghị oge ahụ. E kwubigawo okwu ókè banyere oge bara uru.” Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe otu nwanyị si Burma na-eche. Di ya—onye nwere àgwà ndị Japan—na-alọta ọrụ n’elekere mbụ ma ọ bụ abụọ kwa ụtụtụ. Ọ bụ ezie na ọ na-eso ezinụlọ ya anọkọ ná ngwụsi izu, nwunye ya na-asị: “Ịnọ n’ụlọ na Saturday na Sunday apụghị imeju mfu nke anọnyereghị ezinụlọ anyị n’ụbọchị ndị ọzọ nke izu. . . . Ị̀ pụrụ ịhapụ iri nri n’ụbọchị nile n’ime izu ma rie nri dum i kwesịrị iri n’izu ahụ na Saturday na Sunday?”

A Chọrọ Mgbalị Siri Ike

Ịnọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu n’ezinụlọ dị mfe okwukwu karịa omume. Nrụgide nke ịkpata ego na inye ezinụlọ mmadụ ihe dị ha mkpa adịghị eme ka ọ dịrị nna ma ọ bụ nne na-arụ ọrụ mfe isoro ezinụlọ ya nọkọọ. Ọtụtụ bụ́ ndị ọnọdụ ha na-eme ka ha ghara ịnọ n’ụlọ na-enwe nkwurịta okwu mgbe nile site n’ịkpọ na fon ma ọ bụ ide akwụkwọ ozi. Kama ma è so ezinụlọ nọkọọ n’ụlọ ma ọ bụ na e meghị otú ahụ, a chọrọ mgbalị siri ike iji nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu ezinụlọ.

Ndị nne na nna na-eleghara isoro ezinụlọ ha kwurịta okwu anya aghaghị ịkwụ ụgwọ nleghara anya ha. Nna nke jiri ntakịrị oge nọnyere ezinụlọ ya, n’esoghịdị ha eri nri, chere ihe ndị dị oké njọ ọ kpatara ihu. Nwa ya nwoke ghọrọ onye na-eme ihe ike, a nwụdekwara nwa ya nwanyị ka ọ na-atụtụ aka n’ụlọ ahịa. Ka nwoke ahụ na-akwado ịga kụọ bọl golf otu ụtụtụ Sunday, nwa ya nwoke ji oké iwe meghachi omume. “Ọ̀ bụ nanị nne m nọ n’ụlọ a?” ka o ji olu ike kwuo. “Mama m na-ekpebi ihe nile n’ezinụlọ anyị. Papa, o nwetụghị mgbe . . . ,” ka nwa ahụ kwara n’arịrị.

Okwu ndị ahụ mere ka nna ya chee echiche. N’ikpeazụ o kpebiri na, iji malitegodị, o kwesịrị isoro ezinụlọ ya na-eri nri ụtụtụ. Na mbụ, ọ bụ nanị ya na nwunye ya. Ntakịrị ntakịrị, ụmụ ha sonyeweere ha, oge nri ụtụtụ aghọzie mgbe a na-ekwurịta okwu. Nke a dujere n’ezinụlọ ahụ irikọ nri abalị ha ọnụ. N’ụzọ dị otú ahụ, nwoke ahụ mewara mgbalị iji gbochie ezinụlọ ya ịdakpọ.

Enyemaka Sitere n’Okwu Chineke

Bible na-agba ndị nne na nna ume iwepụta oge soro ụmụ ha kwurịta okwu. Site n’ọnụ onye amụma bụ́ Mosis, e nyere ndị Israel ntụziaka, sị: “Nụrụ, Israel; Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu: ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:4-7) Ee, ọ dị mkpa ka ndị nile bụ́ nne na nna n’etiti anyị bute ụzọ n’isoro ezinụlọ anyị nọkọọ ma ọ bụrụ na anyị ga-akụnye okwu Chineke n’uche na n’obi ụmụ anyị.

Ọ dị mma ịmara na nnyocha ahụ e kwuru ná mmalite e mere ihe karịrị ndị ntorobịa America 12,000 na 1997 kpughere na “n’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 88% . . . nke ndị bi n’obodo ahụ kwuru na ha nwere okpukpe ha na-ekpe, ihe e lere anya dị ka ịdị mkpa nke okpukpe na ekpere nyere nchebe.” Ezi ndị Kraịst na-aghọta na ezi nkụzi okpukpe n’ụlọ na-echebe ndị ntorobịa pụọ n’ụdị ihe ndị dị ka iji ihe na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, nchekasị, igbu onwe onye, ime ihe ike, na ihe ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na o siri ike ịchọta oge ha na ezinụlọ ha ga-eji nọkọọ. Nke a dị otú a karịsịa nye ndị nne na-enweghị di, bụ́ ndị ọ ga-amasị nke ukwuu isoro ụmụ ha nọkọọ e wezụga na ha aghaghị ịrụ ọrụ ego. Olee otú ha pụrụ isi zụchapụta oge dị oké ọnụ ahịa iji soro ezinụlọ ha nọkọọ? “Chebe [ezi amamihe, NW] na izuzu,” ka Bible na-agba ume ya. (Ilu 3:21) Ndị nne na nna pụrụ iji “izuzu” mee ihe iji wepụta oge maka ezinụlọ ha. N’ụzọ dị aṅaa?

Ọ bụrụ na ị bụ nne na-arụ ọrụ nke ike na-agwụ mgbe ị rụsịrị ọrụ ụbọchị, olee banyere ịgwa ụmụ gị ka ha soro gị sie nri? Ụdị oge ahụ a nọkọrọ ọnụ ga-enye ohere iji bịakwuo ibe unu nso. Na mbụ, ime ka ụmụ gị tinye aka pụrụ irikwu oge. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ị ga-ahụ na ọ bụ ihe na-enye ọṅụ, ọbụnakwa na-ebelata oge.

I nwere ike ịbụ nna nke nwere ọtụtụ ihe ime ná ngwụsị izu. Gịnị ma i soro ụmụ gị mee ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ? Ị pụrụ isoro ha kwurịta okwu mgbe unu na-arụkọ ọrụ ọnụ, nyekwa ha ọzụzụ bara uru n’otu oge ahụ. Ndụmọdụ Bible bụ́ ịkụnye okwu Chineke n’ime ụmụ gị na-agba gị ume ịgwa ha okwu “mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ”—n’ezie, n’ohere ọ bụla. Ọ bụ ngosipụta nke “ezi amamihe” isoro ụmụ gị kwurịta okwu mgbe gị na ha na-arụkọ ọrụ.

Isoro ezinụlọ gị na-anọkọ na-enye ụgwọ ọrụ na-adịgide adịgide. “N’aka ndị a dụworo ọdụ ka amamihe dị,” ka otu ilu Bible na-ekwu. (Ilu 13:10) Site n’iwepụta oge soro ezinụlọ gị kwurịta okwu, ị ga-anọ n’ọnọdụ dị mma inye ha nduzi amamihe dị na ya ná ndọlị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Nduzi dị otú ahụ e nyere ugbu a pụrụ igbochi ịtụfu oge na inwe obi mgbu n’ọdịnihu. Ọzọkwa, ọ pụrụ ime ka gị na ha nwekwuo obi ụtọ. Iji nye nduzi dị otú ahụ, ọ dị gị mkpa ịmụta ihe site n’amamihe bara ụba dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Jiri ya kụziere ụmụ gị ihe, jirikwa ya duzie nzọụkwụ nke ezinụlọ gị.—Abụ Ọma 119:105.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị ntorobịa ha na nne na nna ha na-enwe mmekọrịta chiri anya yiri ka ha agaghị enwekebe nchekasị

[Foto dị na peeji nke 6]

Mgbe gị na nwa gị na-arụkọ ọrụ, ị pụrụ iso ya kwurịta okwu ma nye ya ọzụzụ bara uru

[Foto dị na peeji nke 5]

Ezi nkwurịta okwu na-enye ụgwọ ọrụ bara ụba ná ndụ ezinụlọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya