Inwe Obi Ụtọ Na Jehova Na-egosi Anyị Ụzọ Ya
“Chineke, ụzọ Ya zuru okè: okwu ọnụ Jehova bụ ihe a nụchara anụcha.”—2 SAMUEL 22:31.
1, 2. (a) Gịnị dị mmadụ nile mkpa n’ụzọ bụ́ isi? (b) Ihe nlereanya ònye ka anyị ga-eme nke ọma iṅomi?
NDUZI dị mmadụ nile mkpa n’ụzọ bụ́ isi. N’ezie, enyemaka dị anyị mkpa iji duzie anyị ná ndụ anyị nile. N’eziokwu, Jehova enyewo anyị ókè ụfọdụ nke ọgụgụ isi na akọ na uche iji nyere anyị aka ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma ọ dị mkpa ka a zụọ akọ na uche anyị azụọ ma ọ bụrụ na ọ ga-abụ ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya. (Ndị Hibru 5:14) Uche anyị chọkwara ihe ọmụma ziri ezi—tinyekwara ọzụzụ iji tụọ ihe ọmụma ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀—ma ọ bụrụ na anyị ga-eme mkpebi ndị dị mma. (Ilu 2:1-5) Ọbụna mgbe ahụ, n’ihi ndụ ịbụ ihe a na-ejighị n’aka, mkpebi ndị anyị mere nwere ike ghara ịrụpụta ihe anyị chọrọ. (Eklisiastis 9:11) N’ime onwe anyị, anyị enweghị ụzọ a pụrụ ịdabere na ya isi mata ihe ga-eme n’ọdịnihu.
2 N’ihi nke a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, onye amụma bụ́ Jeremaịa dere, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Jisọs Kraịst, bụ́ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, naara ntụzi. O kwuru, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla Ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara Ya na-emekwa otú ahụ.” (Jọn 5:19) Lezie ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya iṅomi Jisọs ma legara Jehova anya maka enyemaka n’iduzi nzọụkwụ anyị! Eze Devid bụrụ abụ, sị: “Chineke, ụzọ Ya zuru okè: okwu ọnụ Jehova bụ ihe a nụchara anụcha; ọta ka Ọ bụụrụ ndị nile nke na-agbaba n’ime Ya.” (2 Samuel 22:31) Ọ bụrụ na anyị na-achọ ije ije n’ụzọ Jehova karịa ịgbaso amamihe nke onwe anyị, anyị ga-enwe nduzi zuru okè. Ịjụ ụzọ Chineke na-eduga n’ọdachi.
Jehova Egosi Ụzọ
3. Olee otú Jehova si duzie Adam na Iv, na-enye ha atụmanya ndị dị aṅaa?
3 Tụlee ihe banyere Adam na Iv. Ọ bụ ezie na ha enweghị mmehie, nduzi dị ha mkpa. Jehova ahapụghị Adam ka o meere onwe ya atụmatụ nile n’ogige Iden ahụ mara mma. Kama nke ahụ, Chineke nyere ya ọrụ ọ ga-arụ. Nke mbụ, Adam aghaghị ịgụ ụmụ anụmanụ aha. E mesịa, Jehova nyere Adam na Iv ihe mgbaru ọsọ ndị na-adịte anya. Ha ga-ebuda ụwa n’okpuru onwe ha, mụjupụta ya n’ụmụ, lekọtakwa ụmụ anụmanụ nke ụwa. (Jenesis 1:28) Nke a ga-abụ ọrụ buru ibu, ma ihe ọ ga-arụpụta bụ paradaịs zuru ụwa ọnụ nke agbụrụ mmadụ zuru okè jupụtara bụ́ ndị ha na ụmụ anụmanụ e kere eke na-ebi n’udo. Lee atụmanya dị ebube ọ bụ! Ọzọkwa, ka Adam na Iv ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ije n’ụzọ Jehova, ha ga-eso ya na-ekwurịta okwu. (Tụlee Jenesis 3:8.) Lee ihe ùgwù dị ebube ọ bụ—iso Onye Okike ahụ nọgide na-enwe mmekọrịta!
4. Olee otú Adam na Iv si gosipụta enweghị ntụkwasị obi na eguzosighị ike n’ihe, ihe ndị dị aṅaa na-akpata ọdachi ka ọ rụpụtakwara?
4 Jehova machibidoro di na nwunye mbụ ahụ iri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ nke dị n’Iden, nke a nyekwara ha ohere ozugbo igosipụta nrubeisi ha—ọchịchọ ha ije ije n’ụzọ Jehova. (Jenesis 2:17) Ma, n’oge na-adịghị anya, a nwalere nrubeisi ahụ. Mgbe Setan ji okwu nduhie ya bịa, ọ dị Adam na Iv mkpa igosipụta nguzosi ike n’ihe nye Jehova nakwa inwe ntụkwasị obi ná nkwa Ya nile ma ọ bụrụ na ha ga-anọgide na-erube isi. N’ụzọ dị mwute, iguzosi ike n’ihe na ntụkwasị obi kọrọ ha. Mgbe Setan chere Iv nnwere onwe n’ihu, jirikwa ụgha boo Jehova ebubo na ọ na-agha ụgha, ọ ghọgburu Iv, o wee nupụrụ Chineke isi. Adam so ya mehie. (Jenesis 3:1-6; 1 Timoti 2:14) Ọghọm nke ahụ wetaara ha dị ukwuu. Ije ije n’ụzọ Jehova gaara enyewo ha ọṅụ na-amụbawanye amụbawanye mgbe nile ka ha nọgidere na-emezu uche ya. Kama nke ahụ, ndụ ha jupụtara ná ndakpọ olileanya na ihe mgbu ruo mgbe ọnwụ gburu ha.—Jenesis 3:16-19; 5:1-5.
5. Gịnị bụ nzube Jehova ga-adịte anya, oleekwa otú o si enyere ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ịhụ mmezu ya?
5 Ka o sina dị, Jehova agbanweghị nzube ya bụ́ na otu ụbọchị ụwa ga-abụ ebe obibi paradaịs maka ụmụ mmadụ zuru okè, na-enweghị mmehie. (Abụ Ọma 37:11, 29) Ọ dabeghịkwa mgbe ọ bụla n’inye ndị na-eje ije n’ụzọ ya ma nwee olileanya ịhụ mmezu nke nkwa ahụ nduzi zuru okè. Nye ndị nwere ntị ịnụ ihe n’ime anyị, olu Jehova na-ada n’azụ anyị, na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.”—Aịsaịa 30:21.
Ụfọdụ Jere Ije n’Ụzọ Jehova
6. Olee ndị ikom abụọ nke oge mbụ jere ije n’ụzọ Jehova, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?
6 Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, nanị ọnụ ọgụgụ ka nta nke ụmụ Adam na Iv jere ije n’ụzọ Jehova. Ebel bụ onye mbụ n’ime ha. Ọ bụ ezie na ọ nwụchuru ọnwụ, ọ nwere ihu ọma Jehova ruo ọnwụ, n’ihi ya kwa o nwere atụmanya e ji n’aka nke iso ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume” n’oge Chineke kara aka. (Ọrụ 24:15) Ọ ga-ahụ mmezu ikpeazụ nke nzube ukwu nke Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 11:4) Onye ọzọ jere ije n’ụzọ Jehova bụ Inọk, bụ́ onye e chekwara amụma o buru banyere ọgwụgwụ ikpeazụ nke usoro ihe a n’akwụkwọ Jud. (Jud 14, 15) Inọk anọzughịkwa ndụ afọ ole ọ gaara anọ ma eleghị anya. (Jenesis 5:21-24) Ma, “a gbaworo ya àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 11:5) Mgbe ọ nwụrụ, dị ka Ebel, o nwere atụmanya e ji n’aka nke mbilite n’ọnwụ, ọ ga-esokwa n’ime ndị ga-ahụ mmezu nke nzube Jehova.
7. Olee otú Noa na ezinụlọ si gosipụta iguzosi ike n’ihe nye Jehova ma tụkwasị ya obi?
7 Ka ụwa dị tupu Iju Mmiri ahụ bamikwuru n’ajọ omume, irubere Jehova isi ghọrọ ule nke iguzosi ike n’ihe karị. Mgbe ụwa ahụ na-abịaru ná njedebe, nanị otu ìgwè nta ka a hụrụ na-eje ije n’ụzọ Jehova. Noa na ezinụlọ ya gere Chineke ntị ma tụkwasị ihe o kwuru obi. Ha ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ o nyere ha ma jụ ịbụ ndị a dọkpụnyere n’omume ọjọọ nke ụwa nke oge ahụ. (Jenesis 6:5-7, 13-16; Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5) Anyị pụrụ inwe ekele maka nrubeisi ha ji iguzosi ike n’ihe na ntụkwasị obi rube. N’ihi ya, ha lanarịrị Iju Mmiri ahụ ma ghọọ ndị nna nna anyị.—Jenesis 6:22; 1 Pita 3:20.
8. Nye mba Israel, gịnị ka ije ije n’ụzọ Chineke gụnyere?
8 Ka oge na-aga, Jehova sooro ụmụ Jekọb kwesịrị ntụkwasị obi gbaa ndụ, ha ghọkwara mba ya pụrụ iche. (Ọpụpụ 19:5, 6) Jehova nyere ndị ya o sooro gbaa ndụ nduzi site n’Iwu e dere ede, òtù ndị nchụàjà, na nduzi na-aga n’ihu e nyere n’ụzọ amụma. Ma ọ dịịrị ụmụ Israel ịgbaso nduzi ahụ. Jehova mere ka onye amụma ya gwa ụmụ Israel, sị: “Lee, mụ onwe m na-etinye n’ihu unu taa ngọzi na nkọcha; ngọzi ahụ, ma a sị na unu egee ntị ihe nile Jehova, bụ́ Chineke unu, nyere n’iwu, bụ́ nke mụ onwe m na-enye unu n’iwu taa: ma nkọcha ahụ, ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị ihe nile Jehova, bụ́ Chineke unu, nyere n’iwu, ma unu ewezụga onwe unu n’ụzọ ahụ nke Mụ onwe m na-enye unu n’iwu taa, ka unu wee jesoo chi dị iche iche ọzọ, nke unu na-amaghị.”—Deuterọnọmi 11:26-28.
Ihe Mere Ụfọdụ Ji Gbahapụ Ụzọ Jehova
9, 10. N’ihi ọnọdụ dị aṅaa ka o ji dị ụmụ Israel mkpa ịtụkwasị Jehova obi ma zụlite nguzosi ike n’ihe nye ya?
9 Dị ka ọ dị n’ebe Adam na Iv nọ, ọ dị ụmụ Israel mkpa ịtụkwasị Jehova obi ma na-eguzosi ike n’ihe nye ya ma ọ bụrụ na ha ga-anọgide na-erube isi. Israel bụ mba dị nta nke ndị agbata obi na-ese okwu gbara gburugburu. N’ebe ndịda ọdịda anyanwụ ka Ijipt na Etiopia dị. N’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ ka Siria na Asiria dị. N’ógbè ndị dị ya nso kpọmkwem ka Filistia, Amọn, Moab, na Edọm dị. N’otu oge ma ọ bụ n’ọzọ, ndị a nile bụ ndị iro Israel. Ọzọkwa, ha nile kpere okpukpe ụgha, bụ́ nke e ji ikpere arụsị, ịgụ kpakpando, nakwa n’ọnọdụ ụfọdụ ememe ajọ mmekọahụ na àjà obi ọjọọ e ji ụmụaka na-achụ, mara. Ndị agbata obi Israel legaara chi ha dị iche iche anya inye ha ezinụlọ buru ibu, owuwe ihe ubi bara ụba, nakwa mmeri n’agha.
10 Nanị Israel fere otu Chineke, bụ́ Jehova. O kwere ha nkwa iji ezinụlọ buru ibu, owuwe ihe ubi bara ụba, na nchebe pụọ n’aka ndị iro ha gọzie ha ma ọ bụrụ na ha ga-erube isi n’iwu ya. (Deuterọnọmi 28:1-14) N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị n’Israel emeghị nke a. N’ime ndị jere ije n’ụzọ Jehova, ọtụtụ n’ime ha tara ahụhụ maka iguzosi ike n’ihe ha. Ọbụna ụfọdụ bụ ndị ndị Israel ibe ha mekpọrọ ọnụ, mee akaje, tie ihe, tụọ mkpọrọ, tụọ nkume, ma gbuo. (Ọrụ 7:51, 52; Ndị Hibru 11:35-38) Lee ule nke ahụ na-aghaghị ịbụworo ndị kwesịrị ntụkwasị obi! Ma, gịnị mere ọtụtụ ndị ji si n’ụzọ Jehova kpafuo? Ihe atụ abụọ sitere n’akụkọ ihe mere eme nke Israel na-enyere anyị aka ịhụ echiche ha na-ezighị ezi.
Ihe Nlereanya Ọjọọ nke Ehaz
11, 12. (a) Mgbe Siria majara ya, gịnị ka Ehaz jụrụ ime? (b) N’ebe abụọ dị aṅaa ka Ehaz legara anya maka nchebe?
11 Ehaz chịrị alaeze ebe ndịda nke Juda na narị afọ nke asatọ T.O.A. Udo adịghị n’ọchịchị ya. N’otu oge, Siria na alaeze ebe ugwu nke Israel jikọrọ aka n’agha megide ya, “obi ya na obi ndị ya wee mee mkpọtụ.” (Aịsaịa 7:1, 2) Otú ọ dị, mgbe Jehova kwuru na ya ga-akwado Ehaz ma kpọọ ya òkù ka ọ nwalee ya, Ehaz jụwapụrụ isi! (Aịsaịa 7:10-12) N’ihi ya, e meriri Juda n’agha ahụ, e gbukwara ọtụtụ ndị nke ya.—2 Ihe E Mere 28:1-8.
12 Ọ bụ ezie na Ehaz jụrụ ịnwale Jehova, ọ karịghị ịrịọ eze Asiria maka enyemaka. Ma, Juda nọgidere na-ata ahụhụ n’aka ndị agbata obi ya. Mgbe Asiria megidekwara Ehaz ma “kpagbuo ya,” eze ahụ “chụọrọ chi nile nke Damaskọs àjà, bụ́ ndị tigburu ya: ọ sị, N’ihi na chi nke ndị eze Siria na-enyere ha aka, ndị ahụ ka m ga-achụrụ àjà, ka ha wee nyere m aka.”—2 Ihe E Mere 28:20, 23.
13. Gịnị ka Ehaz gosipụtara site n’ichigharịkwuru chi ndị Siria?
13 Mgbe e mesịrị, Jehova gwara Israel, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” (Aịsaịa 48:17, 18) N’ichigharịkwuru chi ndị Siria, Ehaz gosipụtara otú o si ghara ịbịarutụ nso ‘n’ịzọ ije n’ụzọ ọ ga-ejeso.’ E duhiere ya kpam kpam site n’echiche nke ndị mba ọzọ, na-elegara isi iyi ụgha ndị ha si enweta nchebe anya kama ilegara Jehova anya.
14. N’ihi gịnị ka Ehaz na-ejighị nwee ihe ngọpụ mgbe o chigharịkwuuru chi ụgha dị iche iche?
14 E gosiwo kemgbe na chi ndị mba ọzọ, gụnyere nke ndị Siria, bụ ‘ihe efu.’ (Aịsaịa 2:8) Tupu mgbe ahụ, n’oge ọchịchị nke Eze Devid, a hụrụ nkarị Jehova karịrị chi ndị Siria n’ụzọ doro anya mgbe ndị Siria ghọrọ ndị ohu Devid. (1 Ihe E Mere 18:5, 6) Nanị Jehova, bụ́ “Chineke kachasị chi nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, Chineke ukwu ahụ, bụ́ dike, dịkwa egwu,” pụrụ inye ezi nchebe. (Deuterọnọmi 10:17) Otú ọ dị, Ehaz gbakụtara Jehova azụ ma legara chi ndị mba ọzọ anya maka nchebe. Ọ rụpụtaara Juda ọdachi.—2 Ihe E Mere 28:24, 25.
Ndị Juu Ha na Jeremaịa Nọ n’Ijipt
15. Olee ụzọ ndị Juu nọ n’Ijipt n’oge Jeremaịa si mehie?
15 N’ihi oké eguzosighị ike n’ihe nke ndị ya, na 607 T.O.A., Jehova kwere ka ndị Babilọn bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya. A chụgara ndị ka n’ọnụ ọgụgụ nke mba ahụ na Babilọn. Ma, a hapụrụ ụfọdụ, otu n’ime ha bụ Jeremaịa onye amụma. Mgbe e gburu Gọvanọ Gedalaịa, ìgwè a gbagara Ijipt, ha kpọkwaara Jeremaịa. (2 Ndị Eze 25:22-26; Jeremaịa 43:5-7) N’ebe ahụ, ha malitere ịchụrụ chi ụgha dị iche iche àjà. Jeremaịa so ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi tụgharịta uche, ma ha kpọrọ ekwo nkụ. Ha jụrụ ichigharịkwuru Jehova ma sie ọnwụ na ha ga-anọgide na-esurere “eze nwanyị nke eluigwe” ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na nke a ka ha na ndị nna ha meworo ‘n’obodo nile nke Juda, na n’èzí nile nke Jerusalem: ha wee rijuo nri afọ, ahụ dị ha mma, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ ha hụrụ.’ (Jeremaịa 44:16, 17) Ndị Juu rụkwara ụka, sị: “Site na mgbe anyị hapụrụ isurere eze nwanyị nke eluigwe ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na ịwụsịrị ya àjà ihe ọṅụṅụ, ihe nile akọwo anyị, ọ bụkwa site ná mma agha na site n’oké ụnwụ ka e meworo ka anyị gwụsịa.”—Jeremaịa 44:18.
16. N’ihi gịnị ka ndị Juu nọ n’Ijipt ji bụrụ ndị na-ezighị nnọọ ezi n’echiche ha?
16 Lee nnọọ otú ikike ncheta pụrụ isi na-ahọrọ ihe! Olee ihe ndị bụ́ eziokwu? N’ezie ndị Juu achụworo chi ụgha dị iche iche àjà n’ala Jehova nyeworo ha. Mgbe ụfọdụ, dị ka ọ dị n’oge Ehaz, ha hụjuru anya n’ihi ndapụ n’ezi ofufe ahụ. Otú ọ dị, Jehova ‘eweghị iwe ọsọ ọsọ’ megide ndị o sooro gbaa ndụ. (Ọpụpụ 34:6; Abụ Ọma 86:15) O zigara ndị amụma ya ịgba ha ume ka ha chegharịa. Mgbe ụfọdụ, mgbe eze ha kwesịrị ntụkwasị obi, Jehova gọziri ya, ndị ahụ ritekwara uru site ná ngọzi ahụ, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha ekwesịghị ntụkwasị obi. (2 Ihe E Mere 20:29-33; 27:1-6) Lee otú ndị Juu ahụ nọ n’Ijipt si hie ụzọ n’ịzọrọ na ọganihu ọ bụla ha nwere n’ala a mụrụ ha sitere n’aka chi ụgha ha!
17. N’ihi gịnị ka Juda ji tụfuo ala na ụlọ nsọ ya?
17 Tupu 607 T.O.A., Jehova agbawo ndị Juda ume, sị: “Geenụ ntị olu m, M ga-abụkwara unu Chineke, unu onwe unu ga-abụkwara m otu ndị: jeekwanụ ije n’ụzọ nile nke M na-enye unu n’iwu, ka o wee dịrị unu mma.” (Jeremaịa 7:23) Ndị Juu tụfuru ụlọ nsọ ha na ala ha kpọmkwem n’ihi na ha jụrụ ije ije ‘n’ụzọ nile nke Jehova nyeworo ha n’iwu.’ Ka anyị jide n’aka na anyị zeere mmejọ ahụ na-akpata ọnwụ.
Jehova Na-agọzi Ndị Na-eje Ije n’Ụzọ Ya
18. Gịnị ka ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova na-aghaghị ime?
18 Taa, dịkwa ka ọ dị n’oge gara aga, ije ije n’ụzọ Jehova chọrọ iguzosi ike n’ihe—mkpebisi ike ijere nanị ya ozi. Ọ chọrọ ntụkwasị obi—okwukwe zuru ezu na nkwa nile nke Jehova bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha nakwa na ha ga-emezu. Ije ije n’ụzọ Jehova chọrọ nrubeisi—ịgbasochi iwu ya anya n’ahapụghị ya na idebe ụkpụrụ ya ndị dị elu. “Onye ezi omume ka Jehova bụ; ezi omume ka Ọ hụrụ n’anya.”—Abụ Ọma 11:7.
19. Chi dịgasị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-efe ofufe taa, gịnịkwa na-esi na ya apụta?
19 Ehaz legaara chi ndị Siria anya maka nchebe. Ndị Israel nọ n’Ijipt nwere olileanya na “eze nwanyị nke eluigwe,” bụ́ chi nwanyị e fere ofufe n’ọtụtụ ebe n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa oge ochie, ga-ewetara ha ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe. Taa, ọtụtụ chi abụghị arụsị nkịtị. Jisọs dọrọ aka ná ntị megide ijere “akụ̀” ozi karịa Jehova. (Matiu 6:24) Pọl onyeozi kwuru banyere “anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.” (Ndị Kọlọsi 3:5) O kwukwara banyere ndị “chi ha bụ afọ ha.” (Ndị Filipaị 3:19) Ee, ego na ihe onwunwe so n’ime chi ndị bụ́ isi a na-efe ofufe taa. N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ—gụnyere ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe—‘na-atụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀.’ (1 Timoti 6:17) Ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ijere chi ndị a ozi, ụfọdụ na-enwetakwa ụgwọ ọrụ—na-ebi n’ebe obibi ndị kasị mma, na-enwe ihe ndị dara oké ọnụ, na-erikwa nri mara abụba. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile bara ọgaranya otú ahụ. Ọbụna ndị bara ọgaranya otú ahụ na-emesịkwa hụ na ihe ndị a adịghị enye afọ ojuju n’onwe ha. Ha bụ ihe a na-ejighị n’aka, ndị na-adịru nwa mgbe, ha adịghịkwa egbo mkpa ime mmụọ.—Matiu 5:3.
20. Nguzozi dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-enwe?
20 N’eziokwu, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe ndị bara uru ka anyị na-ebi n’oge ikpeazụ nke usoro ihe a. Ọ dị anyị mkpa ime ihe ndị ezi uche dị na ha iji gbooro ezinụlọ anyị ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ. Ma ọ bụrụ na anyị ejiri ibi ndụ dị elu, nchụso ego, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha kpọrọ ihe karịa ijere Chineke ozi, anyị adabawo n’otu ụdị nke ikpere arụsị, anyị adịghịkwa eje ije n’ụzọ Jehova. (1 Timoti 6:9, 10) Otú ọ dị, gịnị ma anyị zute nsogbu ahụ ike, nsogbu ego, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ? Ka anyị ghara ịdị ka ndị Juu ahụ nọ n’Ijipt bụ́ ndị sịrị na nsogbu ha sitere n’ozi ha na-ejere Chineke. Kama nke ahụ, ka anyị nwalee Jehova bụ́ nke Ehaz na-emeghị. Jiri iguzosi ike n’ihe chigharịkwuru Jehova Chineke maka nduzi. Jiri ntụkwasị obi tinye nduzi ya n’ọrụ, kpeekwa ekpere maka ume na amamihe iji mee ihe maka ọnọdụ ọ bụla. Mgbe ahụ, jiri obi ike chere ngọzi Jehova.
21. Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịara ndị na-eje ije n’ụzọ Jehova?
21 N’akụkọ ihe mere eme nile nke Israel, Jehova gọziri ndị jere ije n’ụzọ ya n’ụba. Eze Devid bụrụ n’abụ, sị: “Jehova, dube m n’ezi omume Gị n’ihi ndị na-eche m anwụ.” (Abụ Ọma 5:8) Jehova nyere ya mmeri agha n’ebe mba ndị ha na ha gbara agbata obi nọ bụ́ ndị mesịrị majaa Ehaz. N’okpuru Solomọn, e ji udo na ọganihu gọzie Israel bụ́ nke ndị Juu nọ n’Ijipt chọsiri ike ka e mesịrị. Ọbụna Jehova mere ka nwa Ehaz, bụ́ Hezekaịa, merie Asiria dị ike. (Aịsaịa 59:1) Ee, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ n’ebe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe nọ, bụ́ ndị na-eguzoghị “n’ụzọ ndị mmehie” kama n’iwu Chineke ka ihe ụtọ ha dị. (Abụ Ọma 1:1, 2) Otú ahụ ka ọ ka dị. Ma, olee otú anyị onwe anyị taa pụrụ isi jide n’aka na anyị na-eje ije n’ụzọ Jehova? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Àgwà ndị dị aṅaa dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eje ije n’ụzọ Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka echiche Ehaz ji ghara izi ezi?
◻ Gịnị bụ ihe na-ezighị ezi n’echiche ndị Juu nọ n’Ijipt?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ka mkpebisi ike anyị ije ije n’ụzọ Jehova sikwuo ike?
[Foto dị na peeji nke 13]
Ehaz legaara chi dị iche iche nke Siria anya kama ilegara Jehova