Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/15 p. 21-24
  • “Gọzie Jehova, Mkpụrụ Obi M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gọzie Jehova, Mkpụrụ Obi M”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova “Na-agbaghara Gị Ajọ Omume Gị Nile”
  • Ọ “Na-agbapụta Ndụ Gị”
  • Jehova Na-anapụta Ndị Ya
  • “Gọzienụ Jehova, Unu Ọrụ Ya Nile”
  • Jehova Kwesịrị Inweta Otuto Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ebere Jehova Na-azọpụta Anyị Pụọ N’obi Nkoropụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ka Anyị Bulie Aha Jehova Elu n’Otu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/15 p. 21-24

“Gọzie Jehova, Mkpụrụ Obi M”

“N’ỌNWA ndị na-adịbeghị anya, ozi m aghọwo ihe na-agwụ ike na ihe na-adịghị enye ọṅụ,” ka Nancy na-ekwu.a Ruo ihe dị ka afọ iri, o jewo ozi dị ka ọsụ ụzọ, onye na-ekwusa ozi ọma oge nile. Ma, ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe na-eme m na-ewute m. O yiri ka m na-ekwusa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ikwu nanị ihe bụ́ eziokwu karịa ka m na-ekwusa ya site n’obi. Gịnị ka m kwesịrị ime?”

Tụleekwa ọnọdụ Keith, onye bụ okenye n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. O juru ya anya nke ukwuu ịnụ ka nwunye ya sịrị: “Ọ ghaghị inwe ihe ị na-eche. N’ekpere ị ka kpepụrụ, i nyere ekele maka nri, ọ bụ ezie na ugbu a abụghị oge nri!” Keith na-ekweta, sị: “Apụrụ m ịhụ na ekpere m aghọwo ihe na-adịghị esite n’obi.”

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị chọghị ka okwu otuto ị na-agwa Jehova Chineke bụrụ ihe na-esiteghị n’obi na ihe e ji emezu iwu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ị chọrọ ka ha bụrụ ihe sitere n’ala ala obi, na-esi ná mmetụta nke obi ekele. Otú ọ dị, a pụghị iyikwasị ma ọ bụ yipụ mmetụta dị ka uwe. Ọ ghaghị isite n’ime mmadụ. Olee otú mmadụ pụrụ isi nwee ekele n’obi? Abụ Ọma nke 103 na-enye anyị nghọta n’akụkụ a.

Ọ bụ Eze Devid nke Israel oge ochie rọrọ Abụ Ọma nke 103. O ji okwu ndị a malite: “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m; ka ihe nile nke dị n’ime m gọziekwa aha nsọ Ya.” (Abụ Ọma 103:1) “Okwu ahụ bụ́ gọzie, nke e jiri mee ihe n’ebe Chineke nọ,” ka otu akwụkwọ na-ekwu, “pụtara inye otuto, ọ na-enyekarị echiche nke mmetụta siri ike maka ya nakwa obi ekele.” N’ịchọ ito Jehova site n’obi jupụtara n’ịhụnanya na ekele, Devid gwara mkpụrụ obi ya—ya onwe ya—ka ọ “gọzie Jehova.” Ma gịnị na-akpali mmetụta a na-ekpo ọkụ n’obi Devid n’ebe Chineke ọ na-efe nọ?

Devid gara n’ihu, sị: “Echezọkwala mmeso ọma Ya Ọ [Jehova] na-emeso gị.” (Abụ Ọma 103:2) Ihe àmà na-egosi na e jikọrọ inwe obi ekele nye Jehova na iji ekele atụgharị uche ná “mmeso ọma Ya.” Olee kpọmkwem mmeso ọma Jehova ndị Devid bu n’uche? Ileru okike Jehova Chineke anya, dị ka eluigwe jupụtara na kpakpando n’abalị mmiri na-adịghị ezo, pụrụ n’ezie ime ka obi jupụta n’ekele nye Onye Okike. Eluigwe nke jupụtara na kpakpando metụrụ nnọọ Devid n’ahụ. (Abụ Ọma 8:3, 4; 19:1) Otú ọ dị, n’Abụ Ọma nke 103, Devid na-echeta ụdị ọrụ ọzọ nke Jehova.

Jehova “Na-agbaghara Gị Ajọ Omume Gị Nile”

N’abụ ọma a, Devid na-akọ omume obi ebere nke Chineke. Ka ọ na-ezo aka na nke mbụ n’ime ndị a, ọ na-abụ, sị: ‘Jehova na-agbaghara gị ajọ omume gị nile.’ (Abụ Ọma 103:3) Devid maara n’ezie na ya na-eme mmehie. Mgbe Netan onye amụma bịakwutesịrị ya banyere ịkwa iko ya na Bat-sheba, Devid kwetara, sị: “Megide Gị [Jehova], nanị Gị, ka m mehieworo, ọ bụkwa ihe jọrọ njọ n’anya Gị ka m meworo.” (Abụ Ọma 51:4) O ji obi e tiwara etiwa rịọ arịrịọ, sị: “Meere m amara, Chineke, dị ka ebere Gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere Gị nile si dị hichapụ njehie m nile. Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha.” (Abụ Ọma 51:1, 2) Lee obi ekele Devid na-aghaghị inweworị ịbụ onye a gbaghaara! Ebe ọ bụ mmadụ na-ezughị okè, o mere mmehie ndị ọzọ ná ndụ ya, ma ọ dịghị mgbe ọ jụrụ ichegharị, ịnara ịdọ aka ná ntị, na idozi ụzọ ya. Ịtụgharị uche n’omume obi ọma ndị magburu onwe ha Chineke gosiri n’ebe ọ nọ kpaliri Devid ịgọzi Jehova.

Ọ̀ bụ na anyị onwe anyị kwa adịghị eme mmehie? (Ndị Rom 5:12) Ọbụna Pọl onyeozi kwara arịrị, sị: “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ. Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ! ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?” (Ndị Rom 7:22-24) Lee ekele anyị pụrụ inwe na Jehova adịghị agụkọ mmehie anyị! Ọ na-eji obi ụtọ ehichapụ ha mgbe anyị chegharịrị ma chọọ mgbaghara.

Devid na-echetara onwe ya: “[Jehova] na-agwọ ọrịa gị nile.” (Abụ Ọma 103:3) Ebe ịgwọ ọrịa bụ ihe omume mweghachi, ọ pụtara ihe karịrị ịgbaghara mmehie. Ọ na-agụnye iwepụ “ọrịa”—ihe ọjọọ nile nke njehie anyị kpatara. N’ụwa ọhụrụ ọ na-akwadebe, Jehova n’ezie ga-ekpochapụ nsogbu elu ahụ nke mmehie na-akpata, dị ka ọrịa na ọnwụ. (Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:1-4) Otú ọ dị, ọbụna taa, Chineke na-agwọ anyị ọrịa ime mmụọ anyị. Nye ụfọdụ ndị, ọrịa ndị a na-agụnye akọ na uche na-adịghị mma na mmekọrịta dị njọ e nwere n’ebe ọ nọ. “Echezọkwala” ihe Jehova mewoororịị onye ọ bụla n’ime anyị n’akụkụ a.

Ọ “Na-agbapụta Ndụ Gị”

“[Jehova] na-agbapụta ndụ gị n’aka [olulu, NW],” ka Devid na-abụ. (Abụ Ọma 103:4) “Olulu” bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ—Sheol, ma ọ bụ Hedis. Ọbụna tupu ọ ghọọ eze Israel, Devid hụrụ onwe ya n’ọnụ ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl nke Israel nwere ịkpọasị na-akpata igbu mmadụ n’ebe Devid nọ ma nwaa igbu ya ọtụtụ mgbe. (1 Samuel 18:9-29; 19:10; 23:6-29) Ndị Filistia chọkwara ka Devid nwụọ. (1 Samuel 21:10-15) Ma n’oge nke ọ bụla, Jehova napụtara ya n’aka “olulu.” Lee ekele Devid na-aghaghị inweworị mgbe ọ na-echeta mmeso ndị a Jehova mesoro ya!

Gị kwanụ? Jehova ọ̀ kwagidewo gị n’oge ị dara mbà n’obi ma ọ bụ mgbe ihe funahụrụ gị? Ka ị marawo oge ndị ọ gbapụtaworo ndụ Ndịàmà ya na-ekwesị ntụkwasị obi site n’olulu nke Sheol n’oge anyị? Eleghị anya ịgụ akụkọ nke ọrụ mgbapụta ya na magazin a emetụwo gị n’ahụ. Gịnị ma i wepụta oge jiri ekele tụgharịa uche ná mmeso ndị a nke ezi Chineke ahụ? Otú ọ dị, anyị nile nwekwara ihe mere anyị ga-eji nwee obi ekele nye Jehova maka olileanya mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

Jehova na-enye anyị ma ndụ ma ihe na-eme ka ọ dị ụtọ obibi. Ọbụ abụ ahụ na-ekwupụta na Chineke “na-ekpube gị okpueze, bụ́ ebere na obi ebere dị iche iche.” (Abụ Ọma 103:4) N’oge anyị nọ ná mkpa, Jehova adịghị agbahapụ anyị kama ọ na-enyere anyị aka site ná nzukọ ya a na-ahụ anya na ndị okenye, ma ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ a họpụtara ahọpụta, n’ime ọgbakọ. Enyemaka dị otú ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịnagide ọnọdụ ọjọọ na-ele anyị ule n’etufughị ùgwù onwe onye anyị. Ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-eche nnọọ banyere atụrụ ahụ. Ha na-agba ndị na-arịa ọrịa na ndị dara mbà n’obi ume, ha na-emekwa ike ha nile iji weghachi ndị daworo ada. (Aịsaịa 32:1, 2; 1 Pita 5:2, 3; Jud 22, 23) Mmụọ Jehova na-akwali ndị ọzụzụ atụrụ a inwe ọmịiko na ịhụnanya n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ. N’ezie, “ebere na obi ebere” ya dị ka okpueze nke na-achọ anyị mma ma na-enye anyị ùgwù! N’echezọghị mmeso ọma ya mgbe ọ bụla, ka anyị gọzie Jehova na aha nsọ ya.

N’ịga n’ihu na ndụmọdụ ọ na-enye onwe ya, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “[Jehova] na-ewere ezi ihe mee ka afọ ju ọnụ gị; ịdị na nwata gị ewee mee onwe ya ka ọ dị ọhụrụ dị ka ugo.” (Abụ Ọma 103:5) Ndụ nke Jehova na-enye bụ nke na-eju afọ na nke na-enye ọṅụ. Leenụ, ihe ọmụma nke eziokwu n’onwe ya bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa na-enweghị atụ na isi iyi nke ọṅụ dị ukwuu! Tụleekwa otú ọrụ Jehova nyeworo anyị si na-eju afọ nke ukwuu, bụ́ ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịchọta onye nwere mmasị ịmụ banyere ezi Chineke ahụ nakwa inyere onye ahụ aka ịmara Jehova, gọziekwa ya! Otú ọ dị, ma è nwere onye gere ntị n’ókèala anyị ma ọ bụ na e nweghị, ọ bụ oké ihe ùgwù ikere òkè n’ọrụ e jikọrọ ya na ido aha Jehova nsọ na iwepụ ọbụbụeze ya n’ụta.

Ònye ka ike na-adịghị agwụ mgbe ọ nọgidere na-arụ ọrụ ịkpọsa Alaeze Chineke? Ma Jehova nọgidere na-eme ka ume ndị ohu ya dị ọhụrụ, na-eme ka ha “dị ka ugo” nke nwere nku dị ike ma na-efeli oké elu. Lee ekele anyị pụrụ inwe na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-enye “ike” dị otú ahụ ka anyị wee nwee ike ijezu ozi anyị kwa ụbọchị n’ikwesị ntụkwasị obi!—Aịsaịa 40:29-31.

Iji maa atụ: Clara na-arụ ọrụ ego oge nile, ma na-etinyekwa awa 50 n’ọnwa ọ bụla n’ozi ubi. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ ike na-agwụ m, m na-amanyekwa onwe m ịga ozi ubi nanị n’ihi na mụ na mmadụ emewo ndokwa ịrụkọ. Ma ozugbo m pụrụ, m na-enwe ume ọhụrụ.” Ọ pụkwara ịbụ na gị onwe gị enwetawo ike na-abịa site ná nkwado Chineke n’ozi ndị Kraịst. Ka a kpalie gị ikwu, dị ka Devid kwuru n’okwu mmalite nke abụ ọma a: “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m; ka ihe nile nke dị n’ime m gọziekwa aha nsọ Ya.”

Jehova Na-anapụta Ndị Ya

Ọbụ abụ ahụ na-abụkwa, sị: “Jehova na-emere ndị nile a na-emegbu ezi omume nile na ihe nile O kpere n’ikpe. Ọ na-eme ka Mosis mara ụzọ Ya nile, Ọ na-emekwa ka ụmụ Israel mara omume Ya nile.” (Abụ Ọma 103:6, 7) O yiri ka Devid ọ̀ na-eche banyere ‘mmegbu’ ndị mmegbu nke Ijipt megburu ụmụ Israel n’oge Mosis. Ịtụgharị uche n’otú Jehova si gosi Mosis ụzọ mgbapụta ya aghaghị ịkpasuworị ekele n’obi Devid.

A pụrụ ịkpali anyị inwe ụdị ekele ahụ site n’ịtụgharị uche ná mmeso Chineke mesoro ụmụ Israel. Ma anyị ekwesịghị ịhapụ ichemi echiche n’ahụmahụ nke ndị ohu Jehova nke oge a, dị ka ndị a kọrọ banyere ha n’isi nke 29 na 30 nke akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Akụkọ ndị a kọrọ n’ime ya nakwa n’ime mbipụta ndị ọzọ nke Watch Tower Society na-enyere anyị aka ịhụ otú Jehova siworo nyere ndị ya aka n’oge a idi ịga mkpọrọ, mwakpo nke ìgwè na-eme ihe ike, mmachibido iwu, ogige ịta ahụhụ, na ogige ebe ndị ohu na-arụ ọrụ. E nwewo ule n’ala ndị agha tisasịrị, dị ka Burundi, Liberia, Rwanda, na ebe bụbu Yugoslavia. Mgbe ọ bụla e nwere mkpagbu, aka Jehova akwagidewo ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile. Ịtụgharị uche ná mmeso ndị a nke Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova, pụrụ imere anyị ihe ichemi echiche n’akụkọ nke mgbapụta site n’Ijipt meere Devid.

Tụleekwa otú Jehova na-esi eji ụzọ dị nro agbapụta anyị pụọ n’ibu arọ nke mmehie. O nyewo “ọbara Kraịst” iji ‘mee akọ na uche anyị ka ọ dị ọcha nke ukwuu pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ.’ (Ndị Hibru 9:14) Mgbe anyị chegharịrị ná mmehie anyị ma chọọ mgbaghara ná ndabere nke ọbara Kraịst wụsịrị, Chineke na-ewepụ mmehie anyị ebe dị nnọọ anya—“dị ka Ihu anyanwụ si dị anya n’Ọdịda anyanwụ”—ma na-eweghachi anyị n’ihu ọma ya. Cheekwa banyere ndokwa ndị Jehova mere n’ụdị nke nzukọ ndị Kraịst, mkpakọrịta na-ewuli elu, ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọgbakọ, na mbipụta ndị dabeere na Bible anyị na-enweta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Ọ̀ bụ na mmeso ndị a nile Jehova na-emeso anyị adịghị enyere anyị aka iwusi mmekọrịta anyị na ya ike? Devid na-akpọsa, sị: “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. . . . Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị.” (Abụ Ọma 103:8-14) Ịtụgharị uche ná nlekọta ịhụnanya nke Jehova pụrụ n’ezie ịkwali anyị ito ya na ibuli aha nsọ ya elu.

“Gọzienụ Jehova, Unu Ọrụ Ya Nile”

“Ụbọchị” nke “mmadụ” dị mkpụmkpụ n’ezie—“dị ka ahịhịa”—ma e jiri ya tụnyere anwụghị anwụ nke Jehova, bụ́ “Chineke Ebighị ebi.” Ma Devid ji obi ekele na-atụgharị uche, sị: “Ebere nke Jehova na-esi na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya, ezi omume Ya dịkwaara ụmụ ụmụ; ọ dịịrị ndị na-edebe ọgbụgba ndụ Ya, dịkwara ndị na-echeta ụkpụrụ Ya ime ha.” (Jenesis 21:33; Abụ Ọma 103:15-18) Jehova adịghị echezọ ndị na-atụ egwu ya. N’oge ọ kara aka, ọ ga-enye ha ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; 17:3.

N’ikwupụta ekele o nwere maka ọbụbụeze Jehova, Devid na-asị: “Jehova emewo ka ocheeze Ya guzosie ike n’eluigwe; alaeze Ya na-achịkwa ihe nile.” (Abụ Ọma 103:19) Ọ bụ ezie na e gosipụtara ọbụbụeze Jehova n’ụzọ a na-ahụ anya ruo oge ụfọdụ site n’alaeze Israel, n’ezie, ocheeze ya dị n’eluigwe. N’ihi na ọ bụ Onye Okike, Jehova bụ Eze Na-achị eluigwe na ala ma na-eme uche ya n’eluigwe na n’elu ụwa dị ka nzube ya si dị.

Ọbụna Devid na-agba ndị mmụọ ozi e kere eke nke eluigwe ume. Ọ na-abụ, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi Ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu Ya, n’ige ntị olu nke okwu Ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha Ya nile; unu ndị na-ejere Ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ. Gọzienụ Jehova, unu ọrụ Ya nile, n’ebe nile Ọ na-achị: gọzie Jehova, mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 103:20-22) Ọ̀ bụ na uche anyị tụgharịrị n’ọrụ ebere Jehova na-arụ n’ebe anyị nọ ekwesịghị ịkpali anyị ịgozikwa ya? O kwesịrị nnọọ! Anyị pụkwara ijide n’aka na a ga-anụ ụda olu anyị mgbe anyị na-enye Chineke otuto n’onwe anyị n’etiti nnukwu ndị ukwe na-enye ya otuto nke na-agụnye ọbụna ndị mmụọ ozi ezi omume. Ka anyị jiri obi anyị nile na-eto Nna anyị nke eluigwe, na-aja ya mma mgbe nile. N’ezie, ka anyị buru okwu Devid n’obi, “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo ụfọdụ aha.

[Foto dị na peeji nke 23]

Devid tụgharịrị uche n’ọrụ ebere nke Jehova. Ị̀ na-eme otú ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya