Inwe Ekele Maka “Onyinye n’Ụdị Mmadụ”
“[Matanụ] ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’etiti unu . . . unu werekwa ịhụnanya sọpụrụ ha gabiga ókè nke ukwuu hie nne n’ihi ọrụ ha.”—1 NDỊ TESALỌNAỊKA 5:12, 13.
1. Dị ka Ọrụ 20:35 si kwuo, ikike dị aṅaa ka inye ihe nwere? Nye ihe atụ.
“Ọ DỊ ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ị̀ pụrụ icheta oge ikpeazụ ị hụrụ ịbụ eziokwu nke okwu Jisọs ahụ? Ikekwe ọ bụ onyinye i nyere onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu. I jiriwo nlezianya họrọ ya, n’ihi na ị chọrọ ka ọ bụrụ ihe onye ị hụrụ n’anya ga-eji akpọrọ ihe. Aṅụrị jupụtara n’ihu onye ị hụrụ n’anya—lee ka o si mee ka obi gị ṅụrịa! Inye ihe bụ ngosipụta nke ịhụnanya mgbe ọ bụ nke ezi ebumnobi kpaliri, igosipụta ịhụnanya nwekwara ikike nke iwetara anyị obi ụtọ.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ dịghị onye ka Jehova enwe obi ụtọ, oleekwa otú ndokwa o mere maka “onyinye n’ụdị mmadụ” pụrụ isi mee ka obi ya ṅụrịa? (b) Gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji onyinye sitere n’aka Chineke mee?
2 Oleezinụ onye pụrụ inwe obi ụtọ karịa Jehova, bụ́ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla”? (Jemes 1:17; 1 Timoti 1:11) Ọ bụ Ịhụnanya na-akpali onyinye ọ bụla ọ na-enye. (1 Jọn 4:8) N’ezie, otú ahụ ka ọ dị n’ebe onyinye ahụ Chineke nyeworo ọgbakọ site n’aka Kraịst dị—“onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:8, NW) Ndokwa Chineke mere ka ndị okenye na-elekọta ìgwè atụrụ ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe ndị ya nọ. E ji nlezianya họrọ ndị ikom a—ha aghaghị iru ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Ha maara na ha aghaghị “imere ìgwè atụrụ ebere,” n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka atụrụ ahụ ga-enwe ihe mere ha ga-eji enwe ekele maka ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya dị otú ahụ. (Ọrụ 20:29; Abụ Ọma 100:3) Mgbe Jehova hụrụ na ekele dị otú ahụ jupụtara atụrụ ya n’obi, n’ezie obi ya aghaghị ịṅụrịkwa ọṅụ!—Ilu 27:11
3 N’ezie, anyị ekwesịghị ileda abamuru nke onyinye sitere n’aka Chineke anya; anyị ekwesịghịkwa ịbụ ndị na-enweghị ekele maka onyinye ndị ọ na-enye. N’ihi ya ajụjụ abụọ na-ebilite: Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-ele ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ anya? Oleekwa otú ndị ọzọ so n’ìgwè atụrụ ahụ pụrụ isi na-egosi na ha nwere ekele maka “onyinye n’ụdị mmadụ”?
‘Anyị Bụ Ndị So Unu Na-arụ Ọrụ’
4, 5. (a) Gịnị ka Pọl ji ọgbakọ tụnyere, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe atụ dabara adaba? (b) Gịnị ka ihe atụ Pọl na-egosi banyere ụzọ anyị kwesịrị isi na-ele ibe anyị anya ma na-emeso ha ihe?
4 Jehova ewerewo ikike ụfọdụ nyefee n’aka “onyinye n’ụdị mmadụ” n’ime ọgbakọ. Otú ọ dị, ndị okenye ekwesịghị iji ikike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ha maara na dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ dị nnọọ mfe ime otú ahụ. Oleezi otú ha kwesịrị isi na-ele onwe ha anya n’ebe ndị ọzọ so n’ìgwè atụrụ ahụ nọ? Tụlee ihe atụ Pọl onyeozi ji mee ihe. Mgbe o kwusịrị ihe mere e ji wepụta “onyinye n’ụdị mmadụ,” Pọl dere, sị: “Ka anyị . . . n’ime ịhụnanya, wee too eto ruo n’ime Ya n’ihe nile, Onye bụ isi anyị, bụ́ Kraịst; Onye ahụ nile, ebe a na-ewere nkwonkwo nile ọ bụla nke nnyezu kwụkọọ ya nke ọma jikọọkwa ya, dị ka ịrụsi ọrụ ike nke akụkụ nile ọ bụla n’otu n’otu n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha si dị, ahụ nile ahụ na-esite na Ya na-eme ka ahụ baa ụba iwuli onwe ya elu dị ka ụlọ n’ime ịhụnanya.” (Ndị Efesọs 4:15, 16) Ya mere, Pọl ji ọgbakọ, nke gụnyere ndị okenye na ndị ọzọ so na ya, tụnyere ahụ mmadụ. N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe atụ dabara adaba?
5 Ọtụtụ akụkụ dị iche iche mejupụtara ahụ mmadụ ma o nwere nanị otu isi. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe dị n’ahụ—uru ahụ, akwara ozi, akwara ọbara—nke na-abaghị uru. Akụkụ nke ọ bụla bara uru ma na-atụnye ụtụ n’ahụ ike na ịma mma nke ahụ dum. N’otu aka ahụ, ọtụtụ mmadụ dị iche iche mejupụtara ọgbakọ, ma onye nke ọ bụla—ma ọ̀ bụ onye na-eto eto ma ọ bụ agadi, ma ọ dị ike ma ọ bụ na ọ dịghị—pụrụ ịtụnye ụtụ n’ahụ ike ime mmụọ na ịma mma nke ọgbakọ n’ozuzu ya. (1 Ndị Kọrint 12:14-26) Ọ dịghị onye ọ dị mkpa iche na ya abaghị uru ọ bụla. N’akụkụ nke ọzọ, ọ dịghị onye kwesịrị iche na ya ka ibe ya ukwuu, n’ihi na anyị nile—ma ndị ọzụzụ atụrụ ma atụrụ—bụ akụkụ nke ahụ, e nwekwara nanị otu isi, bụ́ Kraịst. Pọl si otú a gosi ịhụnanya, nchebara echiche, na nkwanye ùgwù anyị kwesịrị inwe n’ebe ibe anyị nọ. Ịghọta nke a na-enyere ndị okenye aka iji obi dị umeala na echiche ziri ezi na-ele ọrụ ha na-arụ n’ime ọgbakọ anya.
6. Ọ bụ ezie na o nwere ikike dị ka onyeozi, olee otú Pọl si gosipụta mmụọ ịdị umeala n’obi?
6 “Onyinye n’ụdị mmadụ” ndị a adịghị achọ ịchịkwa ndụ ma ọ bụ okwukwe nke ndị na-efe ofufe ibe ha. Ọ bụ ezie na Pọl nwere ikike dị ka onyeozi, o ji obi umeala gwa ndị Kọrint, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị sooro unu na-arụta ọṅụ unu: n’ihi na unu ji okwukwe unu guzo.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Pọl achọghị ịchịkwa okwukwe na ụzọ ndụ nke ụmụnna ya. N’ezie, ọ hụrụ na ọ dịghị mkpa ya ime otú ahụ, n’ihi na o kwupụtara obi ike o nwere na ha abụrụlarị ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọ ná nzukọ Jehova n’ihi na ha chọrọ ime ihe ziri ezi. N’ihi ya, n’ikwu banyere onwe ya na onye ya na ya so eme njem bụ́ Timoti, Pọl, dị ka a pụrụ ikwu ya, na-asị: ‘Ọ bụ ọrụ anyị iso unu na-arụkọ ọrụ iji jiri ọnụ na-ejere Chineke ozi.’ (2 Ndị Kọrint 1:1) Lee mmụọ ịdị umeala n’obi nke ahụ bụ!
7. Gịnị ka ndị okenye dị umeala n’obi na-aghọta banyere ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ, obi ike dịkwa aṅaa ka ha nwere n’ebe ndị ha so na-arụ ọrụ nọ?
7 “Onyinye n’ụdị mmadụ” taa nwere otu ụdị ọrụ ahụ. Ha bụ ‘ndị so anyị na-arụta ọṅụ anyị.’ Ndị okenye dị umeala n’obi na-aghọta na ọ bụghị ihe dịịrị ha ikpebi ókè ndị ọzọ pụrụ imeru ihe n’ijere Chineke ozi. Ha maara na ọ bụ ezie na ha nwere ike ịgba ndị ọzọ ume ịmụba ma ọ bụ ime ka ozi ha ka mma, e kwesịrị iji ọchịchọ obi na-ejere Chineke ozi. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 9:7.) Ha nwere obi ike na ọ bụrụ na ndị ha so arụ ọrụ nwere ọṅụ, ha ga-eme ihe nile ha pụrụ ime. N’ihi ya, ọchịchọ ha sitere n’obi bụ inyere ụmụnna ha aka iji “ọṅụ fee Jehova ofufe.”—Abụ Ọma 100:2.
Inyere Mmadụ Nile Aka Iji Ọṅụ Na-eje Ozi
8. Olee ụzọ ụfọdụ nke ndị okenye pụrụ isi nyere ụmụnna ha aka iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi?
8 Ndị okenye, olee otú unu pụrụ isi nyere ụmụnna unu aka iji ọṅụ na-eje ozi? Unu pụrụ ịgba ha ume site n’igosi ha ihe nlereanya. (1 Pita 5:3) Meenụ ka ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ unu nwere n’ozi ahụ pụta ìhè, ọ pụkwara ịgba ndị ọzọ ume iṅomi ihe nlereanya unu. Jaanụ ndị ọzọ mma maka mgbalị ndị ha ji obi ha dum na-eme. (Ndị Efesọs 4:29) Ịja mma na-ekpo ọkụ na nke ziri ezi na-enyere ndị ọzọ aka inwe mmetụta nke ịbụ ndị bara uru na ndị dị mkpa. Ọ na-agba atụrụ ahụ ume ịchọ ime ihe kasị mma ha pụrụ ime iji jeere Chineke ozi. Zere ime ntụnyere ndị na-adịghị mma. (Ndị Galetia 6:4) Ntụnyere ndị dị otú ahụ na-akụda ndị ọzọ aka kama ịkwali ha inwe ọganihu. E wezụga nke ahụ, atụrụ Jehova bụ mmadụ—ndị nwere ọnọdụ na ikike ndị dịgasị iche. Dị ka Pọl, kwupụtanụ obi ike unu nwere n’ebe ụmụnna unu nọ. Ịhụnanya “na-ekwere ihe nile,” ya mere anyị ga-eme nke ọma ikwere na ụmụnna anyị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. (1 Ndị Kọrint 13:7) Mgbe ị ‘na-asọpụrụ ndị ọzọ,’ ị na-adọpụta ihe kasị mma n’ime ha. (Ndị Rom 12:10) Jide n’aka na mgbe a gbara atụrụ ahụ ume ma nye ha ume ọhụrụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-eme ihe nile ha pụrụ ime n’ijere Chineke ozi, ha ga-enwetakwa ọṅụ n’ozi ahụ.—Matiu 11:28-30.
9. Ọ̀ bụ isi aṅaa na-ele ndị okenye ibe ya anya ga-enyere onye okenye nke ọ bụla aka iji ọṅụ na-eje ozi?
9 Iji obi umeala na-ele onwe gị anya dị ka ‘onye so ndị ọzọ na-arụ ọrụ’ ga-enyere gị aka iji ọṅụ na-eje ozi na inwe ekele maka onyinye ndị pụrụ iche nke ndị okenye ibe gị nwere. Onye okenye nke ọ bụla nwere nkà na ikike nke ya bụ́ ndị ọ pụrụ iji mee ihe iji baara ọgbakọ uru. (1 Pita 4:10) Otu pụrụ ịbụ onye nwere onyinye nke izi ihe. Onye ọzọ pụrụ ịbụ onye na-ahazi ihe nke ọma. Onye ọzọ kwa pụrụ ịbụ onye a na-abịaru nso karịsịa n’ihi àgwà ikpo ọkụ na ọmịiko ya. Nke bụ eziokwu bụ na ọ dịghị onye okenye nwere onyinye nile n’ọ̀tụ̀tụ̀ hà nhata. Inwe otu onyinye kpọmkwem—dị ka ihe atụ, onyinye nke izi ihe—ọ̀ na-eme ka otu okenye karịa onye nke ọzọ? Ọ dịghị ma ọlị! (1 Ndị Kọrint 4:7) N’aka nke ọzọ, ọ dịghị gị mkpa inwe anyaụfụ maka onyinye onye nke ọzọ nwere ma ọ bụ inwe mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru mgbe ndị ọzọ jara onye okenye ọzọ mma maka ikike o nwere. Cheta na gị onwe gị nwere onyinye ndị Jehova na-ahụ n’ime gị. Ọ pụkwara inyere gị aka ịzụlite onyinye ndị ahụ ma jiri ha mee ihe maka abamuru nke ụmụnna gị.—Ndị Filipaị 4:13.
‘Na-erubenụ Isi, Na-anọkwanụ n’Okpuru’
10. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na anyị ga-egosipụta ekele maka “onyinye n’ụdị mmadụ”?
10 Mgbe e nyere anyị onyinye, ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị igosipụta ekele. “Bụrụkwanụ ndị na-ekele ekele,” ka Ndị Kọlọsi 3:15 na-ekwu. Gịnịzi banyere “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa nke Jehova nyeworo anyị? N’ezie, ekele anyị bụ́ isi na-agara Jehova, bụ́ Onye Na-enye Onyinye ná mgbasapụ aka. Ma gịnị banyere “onyinye n’ụdị mmadụ” n’onwe ha? Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka ha?
11. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị nwere maka “onyinye n’ụdị mmadụ”? (b) Gịnị ka okwu ndị ahụ bụ́ ‘na-erubenụ isi’ na ‘na-anọnụ n’okpuru’ pụtara?
11 Anyị pụrụ igosipụta ekele anyị nwere maka “onyinye n’ụdị mmadụ” site n’ịdị ngwa n’ịṅa ntị na ndụmọdụ na mkpebi ha ndị dabeere na Bible. Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “[Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, NW]: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ udè: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghị[rị] unu uru.” (Ndị Hibru 13:17) Rịba ama na ọ bụghị nanị na anyị ‘ga-erubere ndị na-edu ndú isi’ kamakwa anyị ‘ga-anọ n’okpuru’ ha. Okwu Grik e ji mee ihe maka ‘na-anọ n’okpuru’ pụtara n’ụzọ nkịtị “na-edo onwe gị n’okpuru.” N’ikwu okwu banyere okwu ndị ahụ bụ́ ‘na-erubenụ isi’ na ‘na-anọnụ n’okpuru,’ ọkà mmụta Bible bụ́ R. C. H. Lenski na-ekwu, sị: “Mmadụ na-erube isi mgbe o kwenyere n’ihe a gwara ya mee, mgbe e mere ka o kwenye banyere izi ezi na ịba uru ya; mmadụ na-ekwenye . . . mgbe o nwere echiche dị iche.” Mgbe anyị ghọtara ma kwenye ná nduzi nke ndị na-edu ndú, anyị pụrụ irube isi ngwa ngwa. Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe kpatara e ji mee otu mkpebi kpọmkwem?
12. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-anọ n’okpuru, ma ọ bụ na-ekwenye, ọbụna mgbe anyị na-aghọtachaghị ihe kpatara e ji mee otu mkpebi kpọmkwem?
12 N’ebe a ka ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịnọ n’okpuru, ma ọ bụ ikwenye. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na, tinyere ihe ndị ọzọ, ọ dị anyị mkpa inwe ntụkwasị obi na ndị ikom a ruru eru n’ụzọ ime mmụọ bu ọdịmma anyị kasị mma n’obi. E kwuwerị, ha maara nke ọma na ha aghaghị ịza Jehova ajụjụ maka atụrụ o nyefere ha n’aka ilekọta. (Jemes 3:1) Tụkwasị na nke a, anyị ga-eme nke ọma icheta na anyị nwere ike ghara ịmacha ihe nzuzo ndị dugara ha n’ime otu mkpebi dabeere n’ezi ihe ọmụma.—Ilu 18:13.
13. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọ n’okpuru mgbe a bịara ná mkpebi ndị okenye mere n’okwu ikpe?
13 Gịnị banyere ịnọ n’okpuru mgbe a bịara ná mkpebi okwu ikpe? N’eziokwu, nke a nwere ike ghara ịdị mfe, karịsịa ma ọ bụrụ na e kpebiri ịchụpụ onye anyị hụrụ n’anya n’ọgbakọ—onye ikwu ma ọ bụ ezi enyi. N’ebe a kwa, ọ kasị mma ikwenyere mkpebi ikpe nke “onyinye n’ụdị mmadụ.” Ha nọ n’ọnọdụ nke echiche onwe onye na-ekwesịghị imetụta ha karịa anyị, ha pụkwara ịma ihe ndị bụ eziokwu karị. Mkpebi ndị dị otú ahụ na-egbukarị ụmụnna a mgbu n’obi; ‘ikpere Jehova ikpe’ bụ ibu ọrụ na-akpali echiche. (2 Ihe E Mere 19:6) Ha na-eme mgbalị nile iji mee ebere, n’ihi na ha maara na Chineke “na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ma ha aghaghịkwa idebe ọgbakọ ọcha, Bible na-ekwukwa ka ha chụpụ ndị mere ihe ọjọọ na-enweghị nchegharị. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) N’ọtụtụ ọnọdụ, onye ahụ mere ihe ọjọọ na-anakwere mkpebi ahụ. Ịdọ aka ná ntị ahụ pụrụ ịbụ nanị ihe dị ya mkpa iji mara onwe ya. Ọ bụrụ na anyị, bụ́ ndị ọ hụrụ n’anya, edoo onwe anyị n’okpuru mgbe a bịara ná mkpebi ahụ, anyị pụrụ isi otú a na-enyere ya aka irite uru site n’ịdọ aka ná ntị ahụ.—Ndị Hibru 12:11.
“Sọpụrụ Ha Gabiga Ókè nke Ukwuu”
14, 15. (a) Dị ka 1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13 si kwuo, n’ihi gịnị ka ndị okenye ji bụrụ ndị kwesịrị ka anyị sọpụrụ ha? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ndị okenye ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’etiti anyị’?
14 Anyị pụkwara igosipụta ekele anyị nwere maka “onyinye n’ụdị mmadụ” site n’ịsọpụrụ ha. N’idegara ọgbakọ dị na Tesalọnaịka akwụkwọ, Pọl dụrụ ndị nọ na ya ọdụ, sị: “[Matanụ] ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’etiti unu, ndị bụkwa [ndị na-eduzi, NW] unu n’ime Onyenwe anyị, ndị na-adụkwa unu ọdụ; ka unu werekwa ịhụnanya sọpụrụ ha gabiga ókè nke ukwuu hie nne n’ihi ọrụ ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13) “Na-adọgbu onwe ha n’ọrụ”—ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị akọwa ndị okenye ahụ raara onwe ha nye bụ́ ndị ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye onwe ha maka anyị? Jiri nwa oge tụlee ibu arọ ezi ụmụnna a na-ebu.
15 Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ikom ji ezinụlọ bụ́ ndị na-aghaghị ịrụ ọrụ ego iji nye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha. (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na onye okenye ahụ nwere ụmụaka, ọ dị ụmụaka ahụ mkpa ịbụ ndị nna ha na-ewepụta oge anọnyere nakwa ndị ọ na-elebara anya. Ọ pụrụ ịdị ya mkpa inyere ha aka n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ha, nakwa idokwara ha oge ụfọdụ maka iji ike ntorobịa ha nwee ntụrụndụ dị mma. (Eklisiastis 3:1, 4) Nke kasị mkpa, ọ na-elekọta mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ya, na-eduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ mgbe nile, soro ha na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi, na-akpọkwa ha aga nzukọ ndị Kraịst. (Deuterọnọmi 6:4-7; Ndị Efesọs 6:4) Ka anyị ghara ichefu na tụkwasị n’ibu ọrụ ndị a nke ọtụtụ n’ime anyị nwere, ndị okenye nwere ọrụ ndị ọzọ: ịkwadebe ihe omume ndị a ga-eme ná nzukọ, ime nleta ọzụzụ atụrụ, ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ nakwa, mgbe ọ dị mkpa, ịhụ maka okwu ikpe. Ụfọdụ na-ebu ibu ọrụ ndị ọzọ n’ihe metụtara mgbakọ sekit, mgbakọ distrikti, iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. N’ezie, ụmụnna a “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ”!
16. Kọwaa ụzọ ndị anyị pụrụ isi sọpụrụ ndị okenye.
16 Ànyị pụrụ isi aṅaa sọpụrụ ha? Otu ilu Bible na-asị: “Okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” (Ilu 15:23; 25:11) Ya mere okwu ekele na agbamume sitere n’ezi obi pụrụ igosi ha na anyị adịghị eleda ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ anya. Ọzọkwa, anyị ekwesịghị ịdị na-atụbiga anya ihe ókè n’aka ha. N’otu akụkụ, anyị kwesịrị ịgakwuru ha maka enyemaka na-enweghị ihe mgbochi. A pụrụ inwe oge mgbe ‘mkpụrụ obi anyị nọ n’oké ihe mgbu,’ anyị achọọkwa agbamume, nduzi, ma ọ bụ ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ site n’aka ndị ahụ “nwere ike izi” Okwu Chineke. (Abụ Ọma 55:4; 1 Timoti 3:2) N’otu oge ahụ, ọ dị anyị mkpa icheta na ọ bụ nanị ruo n’ókè ụfọdụ ka onye okenye pụrụ inyeru anyị oge, n’ihi na ọ pụghị ileghara mkpa nke ezinụlọ ya ma ọ bụ nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anya. N’ịbụ ndị ‘weere obi soro ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike hụkọọ ahụhụ,’ anyị agaghị achọ ihe ndị ezi uche na-adịghị na ha n’aka ha. (1 Pita 3:8) Kama nke ahụ, ka anyị gosi ekele maka oge na nlebara anya ọ bụla ha nwere ike inye anyị.—Ndị Filipaị 4:5.
17, 18. Àjà ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị inyom di ha bụ ndị okenye na-achụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị adịghị eleda ụmụnna nwanyị a na-ekwesị ntụkwasị obi anya?
17 Gịnị banyere nwunye ndị okenye? Ọ̀ bụ na ha ekwesịghịkwa ka anyị sọpụrụ ha? E kwuwerị, ha so ọgbakọ na-ekerịta di ha. Nke a na-achọkarị àjà ụfọdụ n’aka ha. Site n’oge ruo n’oge, ndị okenye aghaghị iji oge uhuruchi na-ahụ maka okwu ọgbakọ bụ́ mgbe ha kwesịrị iso ezinụlọ ha nọkọọ. N’ọtụtụ ọgbakọ, ndị inyom bụ́ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ji ọchịchọ obi ha na-achụ àjà ndị dị otú ahụ ka di ha wee nwee ike ilekọta atụrụ Jehova.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:15.
18 Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị adịghị eleda ụmụnna nwanyị a bụ́ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi anya? N’ezie site n’ịghara ịchọ ihe n’aka di ha n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya. Ma ka anyị gharakwa ichefu ikike nke okwu ekele nkịtị nwere. Ilu 16:24 na-asị: “Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” Tụlee otu ahụmahụ. Mgbe e mechisịrị otu nzukọ ndị Kraịst, otu di na nwunye gakwuuru otu okenye ma rịọ ya ka ha gwa ya okwu banyere nwa ha nwoke nọ n’afọ iri na ụma. Ka onye okenye ahụ na di na nwunye ahụ nọ na-ekwurịta, nwunye ya ji ndidi chere. Mgbe e mesịrị, nne nwa ahụ gakwuuru nwunye onye okenye ahụ ma kwuo, sị: “Ana m ekele gị maka oge di gị wepụtara iji nyere ezinụlọ m aka.” N’ezie, okwu ekele nkịtị ahụ dị ụtọ metụrụ nwunye onye okenye ahụ n’obi.
19. (a) Dị ka otu ìgwè, nzube ndị dị aṅaa ka ndị okenye ji ikwesị ntụkwasị obi na-emezu? (b) Gịnị ka anyị nile kwesịrị ikpebisi ike ime?
19 Ndokwa Jehova mere ka ndị okenye na-elekọta atụrụ ahụ bụ otu n’ime “ezi onyinye” ya. (Jemes 1:17) Ee e, ndị ikom a ezughị okè; dị ka anyị nile, ha na-emehie ihe. (1 Ndị Eze 8:46) Ma, dị ka otu ìgwè, ndị okenye nọ n’ọgbakọ dum dị n’ụwa nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-emezu nzube ndị Jehova bu n’uche maka ha—ya bụ, ịgbazigharị ìgwè atụrụ ahụ, iwuli ha elu, ime ka ha dị n’otu, na ichebe ha. Ka onye okenye ọ bụla kpebie iji ịdị nro nọgide na-elekọta atụrụ Jehova, si otú a na-egosi na ya bụụrụ ụmụnna ya onyinye, ma ọ bụ ngọzi. Ka anyị nile kpebisiekwa ike igosi ekele anyị nwere maka “onyinye n’ụdị mmadụ” site n’irubere ha isi na ịnọ n’okpuru ha nakwa site n’ịsọpụrụ ha maka ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ. Lee ekele anyị pụrụ inwe na Jehova ejiriwo ịhụnanya nye anyị ndị ikom bụ́ ndị, dị ka a pụrụ ikwu ya, na-agwa atụrụ ya, sị: ‘Ọ bụ ọrụ anyị inyere unu aka iji ọṅụ na-ejere Chineke ozi’!
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri ọgbakọ tụnyere ahụ n’ụzọ dabara adaba?
◻ Olee otú ndị okenye pụrụ isi nyere ụmụnna ha aka iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi?
◻ Gịnị mere anyị ekwesịghị ịbụ nanị ndị na-erubere ndị na-edu ndú isi kamakwa ndị na-anọ n’okpuru ha?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi sọpụrụ ndị okenye?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị okenye, jaanụ ndị ọzọ mma maka mgbalị ndị ha ji obi ha dum na-eme
[Foto dị na peeji nke 17]
Site n’ihe nlereanya ha nke ịnụ ọkụ n’obi n’ozi, ndị okenye pụrụ inyere ndị òtù ezinụlọ ha na ndị ọzọ aka iji ọṅụ na-eje ozi
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Anyị nwere ekele maka ndị okenye anyị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ!