Imebisị ihe—Ọ̀ Bụ n’Ihi Gịnị?
“Ọ DỊGHỊ ihe m nwere ikwu.” E ji mkpụrụ akwụkwọ dị okpotokpo dee okwu ndị a n’ahụ ájá e tere ágbá ọhụrụ n’otu ógbè mara mma dị na São Paulo. Ọ bụ omume imebisị ihe, ka ị pụrụ iche. Idekasị ihe n’ahụ ájá bụkwa nanị otu ụdị nke imebisị ihe.
Were ya na ndị na-ejighị ihe akpọrọ ihe emebiela ụgbọala ọhụrụ gị. Ma ọ bụ ị pụrụ ịhụ na ihe onwunwe ọha na eze—nke baara ọtụtụ ndị uru—abụrụwo nke ndị na-emebisị ihe lara n’iyi ma ọ bụ mebie. N’ihi gịnị? Ee, ọ bụ n’ihi gịnị? Ì chetụwo n’echiche ihe mere omume imebisị ihe ji baa ụba? N’ọtụtụ ebe, o yiri ka ọ na-atọ ndị na-emebisị ihe ụtọ itikpọsị ma ọ bụ imebisị ụlọ telifon. Ha na-elekwasịkarị ụgbọ njem ọha, dị ka ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ bọs, anya. O yiri nnọọ ka ndị na-emebisị ihe adịghị echebara ihe ọ bụla echiche. Ma gịnị na-akpata ihe ka ọtụtụ n’ime imebisị ihe ndị anyị na-ahụ ma ọ bụ ndị a na-emebisịrị anyị?
Marco,a bụ́ onye ntorobịa si Rio de Janeiro, nwere mwute mgbe e merisịrị ndị òtù ya n’otu egwuregwu bọl—o nwere mwute nke na ọ malitere ịtụ otu bọs bujuru ndị na-akwado ndị ahụ meriri ha, nkume. Ma ọ bụ tụlee Claus. Mgbe ọ na-emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, oké iwe were ya nke na o ji nkume tụwasịa windo. Otú ọ dị, “mkpori ndụ” ahụ foro ya n’anya mgbe a gwara nna ya ka ọ kwụọ ụgwọ ihe ahụ o mebiri. Onye ntorobịa ọzọ, bụ́ Erwin, na-aga akwụkwọ ma na-arụ ọrụ. A na-ele ya na ndị ọgbọ ya anya dị ka ndị ntorobịa na-akpa ezi àgwà. Ma, ihe ha na-eji egbu oge bụ imebisị ihe dị n’ógbè ha. Nne na nna Erwin amaghị ihe ọ bụla banyere nke ahụ. Valter bụ nwa mgbei nke na-adịghị ihe ọzọ ọ ga-eme karịa iji okporo ámá ndị dị na São Paulo mere ebe obibi ya. Ndị bụ ezigbo enyi ya bụ ndị nọ n’òtù na-emebisị ihe, o sonyekwaara ha ma mụtakwa ịgba karat. Ihe atụ ndị dị otú ahụ na-egosi na e nwere ndị na-akpata imebisị ihe, ihe na-akpalikwa imebisị ihe, ma ọ bụ mmetụta uche ndị na-akpata ya, dịgasị iche.
“Imebisị ihe pụrụ ịbụ omume ịbọ ọ́bọ̀ ma ọ bụ ụzọ isi gosipụta echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ụfọdụ, ma ndị na-eto eto ma ndị meworo okenye na-eme mpụ ahụ nanị maka ‘mkpori ndụ,’” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu. Otú ọ dị, kama ịbụ nanị mkpori ndụ ndị ntorobịa, imebisị ihe pụrụ ibibi ihe n’ụzọ dị ukwuu, ọ pụrụ ọbụna ịkpata ọnwụ. Otu ìgwè ndị ntorobịa chọrọ “ikpori ndụ,” mgbe ha hụkwara otu nwoke na-ehi ụra, ha wụrụ ya otu ihe dị mmiri mmiri nke na-enwu ọkụ ma mụnye ya ọkụ. Nwoke ahụ, bụ́ onye India, mesịrị nwụọ n’ụlọ ọgwụ. Dị ka otu akụkọ si kwuo, “ụmụ okorobịa ahụ kwuru na ha echeghị na ọ dị onye ga-ekwu okwu, ebe ọ bụ na a gbaala ụfọdụ ndị arịrịọ ọkụ n’okporo ámá, ọ dịghịkwa ihe e mere banyere ya.” Ma imebisị ihe ò yiri ihe na-adịghị egbu mmadụ ma ọ bụ na o yighị, a pụghị ịgụkọtali ihe ọ na-efu, ma n’ego ma ná mmetụta uche. Ya mere, gịnị pụrụ ịchịkwa imebisị ihe ma ọ bụ kwụsị ya?
Ònye Pụrụ Ịkwụsị Imebisị Ihe
Ndị uwe ojii na ụlọ akwụkwọ hà pụrụ igbochi imebisị ihe? Otu nsogbu e nwere bụ na ndị ọchịchị pụrụ iji ọrụ n’aka n’ihe banyere mpụ ndị ka njọ, dị ka ịgba mgbere ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ igbu mmadụ, karịa banyere ịda iwu ndị “na-adịghị onye e gburu.” Dị ka otu onye uwe ojii si kwuo, mgbe onye ntorobịa dabara ná nsogbu, ndị mụrụ ya ‘na-atakarị ụmụaka ya na ha na-akpakọ, ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ndị uwe ojii ụta maka ijide ya.’ Agụmakwụkwọ na ịhụ na e debere iwu pụrụ ime ka imebisị ihe belata; ma, gịnị ma ọ bụrụ na àgwà ndị nne na nna agbanweghị? Otu onye ọrụ nnyocha ụmụaka na-ekwu, sị: “Ihe na-akpata nsogbu ahụ bụ enweghị mmasị n’ihe na inwe ohere. [Ụmụaka] alọtaghị ụlọ n’oge, ha enweghịkwa ihe ha na-eme. Ikekwe, a dịghịkwa eleba anya n’ihe ha na-eme—ma ọ́ bụghị ya, ha agaghị apụ.”
Ọ bụ ezie na imebisị ihe bụ oké nsogbu n’ọtụtụ ebe, tụlee otú a pụrụ isi mee ka ihe gbanwee. Ndị ntorobịa ahụ na-emebisị ihe a kpọtụrụ aha ná mmalite gbanwere; ha na-ezerezi kpam kpam akparamàgwà ọha mmadụ kpọrọ asị. Gịnị mere ka ndị a na-enupụbu isi gbanwee ụzọ ndụ ha? Ọzọkwa, ọ̀ ga-eju gị anya ma ọ bụrụ na ọ bụghị nanị na e belatara imebisị ihe kamakwa na e mere ka ọ kwụsị? Anyị na-agba gị ume ịgụ isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ndị ahụ.