“Ọchịchọ Ịmata Ihe Bụ́ nke Na-ere Ka Ọkụ n’Obi na n’Uche”
“Ọnụ apụghị ịkọwa ọṅụ na mkpali ndị m nọgidere na-enwewanye ka m ji oké mmasị na-agụ akwụkwọ ahụ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? Ọ na-eme nnọọ ka mmadụ nwee ọchịchọ—ee e, mkpa—ịmatakwu ihe. Unu emeela maka ịkpali ọchịchọ ịmata ihe bụ́ nke na-ere ka ọkụ n’obi na n’uche m.”
NKE ahụ bụ mmetụta nke otu n’ime Ndịàmà Jehova si North Carolina, U.S.A., nwere banyere akwụkwọ ahụ nke Watch Tower Society wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” n’afọ 1998/1999. Ọ bụrụgodị na i nweghị akwụkwọ ahụ, rịba ama mmeghachi omume ndị ọzọ.
Ụbọchị ụfọdụ mgbe ọ natasịrị otu n’otu mgbakọ e nwere na San Diego, California, U.S.A., otu nwoke dere, sị: “Ana m ahụ akwụkwọ a dị ka nke na-ewusi nnọọ okwukwe ike. Ọ na-eme ka obi m jupụta n’ekele maka ọrụ okike nile nke Jehova. Agụruola m peji nke 98, ọ dịghịkwa m ka ọ gwụchaa agwụcha! Ọ na-enye nnọọ ọṅụ na-akpata afọ ojuju.”
Otu nwanyị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dere, sị: “Ọkà okwu mgbakọ ahụ ji okwu bụ́ ‘akwụkwọ pụrụ iche’ mee ihe, okwu ahụ kwekọkwara nnọọ n’ihe dị n’ime ya. Akụkụ pụtara nnọọ ìhè bụ na akwụkwọ ahụ adịghị amanye onye na-agụ ya ikwere n’ịdị adị nke Chineke, ma ọ na-ewepụta ihe ndị bụ́ eziokwu.”
Eziokwu ndị ahụ gụnyere nchọpụta sayensị ndị na-adọrọ mmasị banyere eluigwe na ala anyị, ndụ, na anyị onwe anyị. Nke a masịrị ọtụtụ ndị. “N’ezie, amaghị m otú m ga-esi kọwaa ụzọ dị ukwuu akwụkwọ nta a siworo metụta m,” ka otu nwanyị si California dere. “Apụghị m idoru akwụkwọ ahụ ala ebe ọ bụ na peji nke ọ bụla na-akọwakwu nchọpụta ndị dokwuru anya banyere eluigwe na ala anyị nakwa ndụ n’onwe ya. N’ezie, amụtara m ihe dị nnọọ ukwuu! Aga m eji akwụkwọ nta a kpọrọ ihe ma soro ọtụtụ ndị dị ka o kwere mee kerịta ya.”
Akụkụ nyere ọtụtụ ndị aṅụrị bụ ụzọ akwụkwọ ahụ si chịkọta Bible n’ụzọ dị nkenke, na-eme ka àgwà Onye Okike pụta ìhè. “Ntụle zuru ezu nke Bible, nke e mere ná ngwụsị nke akwụkwọ ahụ, bụ otu n’ime ndị kasị mma m gụtụrụla,” bụ okwu a na-anụkarị. N’oge na-adịghị anya mgbe e nwesịrị otu n’ime mgbakọ ndị e bu ụzọ nwee na New York, U.S.A., onye ọzọ dere, sị: “Mbipụta ọhụrụ ahụ bụ mbipụta kasị adọrọ mmasị unu bipụtarala. Nnwapụta ndị ahụ dabeere na sayensị nke na-egosi na e nwere Onye Okike riri m ọnụ. Nchịkọta Bible ahụ e gburu nkenke n’onwe ya ezuwo ịkọwa isi ihe a na-ekwu na ịkpali agụụ maka ịgụrụ gaa n’ihu.”
Sayensị A Pụrụ Ịghọta Aghọta
Ihe ọmụma sayensị ndị dị n’isiakwụkwọ ndị mbụ pụrụ iyi ihe siri nnọọ ike nghọta, ma gụọ mmeghachi omume ndị a na-enwekarị.
Otu nwoke bụ́ onye Canada dere, sị: “Lee otú nke a si dị iche n’ebe akwụkwọ nkà na ụzụ dị iche iche dị bụ́ nke ndị dere ha na-anwa iji okpookpo Bekee ha dọta mmasị anyị. Nkà mmụta unu dị ịrịba ama n’ime ka isiokwu ndị metụtara physics, mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe, DNA, chromosome, na ihe ndị ọzọ, doo anyị nnọọ anya. Ọ dị m nnọọ ka ọ bụrụ unu dere akwụkwọ ọgụgụ mahadum ndị m gụrụ ọtụtụ afọ gara aga!”
Otu profesọ mahadum ná mmụta physics dere, sị: “[O] wepụtara nnọọ isiokwu ndị ọ na-atụle n’ụzọ doro anya n’ejighị nkọwa ndị siri ike gbagọọ ya. Akwụkwọ ahụ na-eso onye na-agụ ya na-atụgharị uche ma na-ehota ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama. Nke a bụ ‘akwụkwọ onye ọ bụla nwere mmasị ná mmalite nke eluigwe na ala na ndụ, na-aghaghị ịgụ,’ ma ọ̀ bụ dị ka ọkà mmụta sayensị ma ọ bụ dị ka onye nkịtị.”
Otu nwa agbọghọ na-amụ ọrụ nọọsụ kwuru, sị: “Apụghị m ikweta ihe anya m hụrụ mgbe m meghere isiakwụkwọ nke 4 ma gụọ otu ebe e hotara akwụkwọ anyị na-eji amụ ihe na klas! Enyere m onye prọfesọ anyị akwụkwọ ahụ ma gwa ya na amaara m na ọ ga-ahụ ihe ọmụma ahụ ịbụ nke na-enye ume ọhụrụ. Egosiri m ya peji nke 54 banyere ụbụrụ isi. Ọ gụrụ ya n’ime obi ya ma kwuo, sị, ‘Ọ tọka! Aga m enyocha ya.’”
Otu onye òtù nke nzukọ ndị isi Belgium dere, sị: “Ihe metụrụ m n’ahụ ma dọrọ mmasị m bụ ndepụta sayensị ndị ahụ bụ́ ndị na-emesi ya ike na sayensị nke oge a adịghị emegide echiche Bible bụ́ na e nwere nanị otu ezi Chineke, kama nke ahụ na ọ na-ekwenyere ya. Nke a bụ echiche kwesịrị ịrịba ama.”
Ịmara Onye Okike nke Ọma Karị
Akwụkwọ ahụ nyeere ndị mmadụ aka n’ọtụtụ ala ịmara Chineke nke ọma karị na inwe mmetụta nke ịnọ ya nso karị. Otu onye gụrụ ya na Fukuoka City, Japan, kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na e lekwasịrị Jehova anya na nke mbụ ya. Akwụkwọ ahụ na-eme ka mmadụ kwenye n’ụzọ dị ịtụnanya. Amatara m Jehova otú m na-echetụbeghị n’echiche na mbụ.” Otu onye El Salvador dere, sị: “Unu kọwara nnọọ n’ụzọ doro anya otú Chineke si bụrụ onye obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na onye na-aba ụba n’ezi ịhụnanya. N’ezie, nke a bụ kpọmkwem ihe dị anyị mkpa iji nọrọ ya na Ọkpara ya nso karị. Ọ bụ akwụkwọ mbụ nke na-akọwa mmetụta Jehova na mmetụta nke Ọkpara ya bụ́ Jisọs dị ka mmadụ.” Otu onye gụrụ ya na Zambia kwukwara, sị: “Enweziri m echiche dị nnọọ iche banyere Jehova.”
N’ụzọ a pụrụ ịghọta, Ndịàmà Jehova nwere oké mmasị banyere isoro ndị ọzọ kerịta Is There a Creator Who Cares About You? Otu n’ime ha kwuru, sị: “Mgbe m gụsịrị isiakwụkwọ nke 10 [“Ọ Bụrụ na Onye Okike Na-eche Banyere Anyị, N’ihi Gịnị Ka Oké Nhụjuanya Ji Dịrị?”], etipụrụ m mkpu, sị, ‘Nke a bụ nnọọ akwụkwọ dị anyị mkpa na Japan!’ Aga m achọ icheta ihe dị n’isiakwụkwọ a nke ọma ma were ya mee ihe n’ozi ubi karị.” Nwanyị ọzọ na-amụrụ otu nwa agbọghọ a zụlitere n’ụlọ nsọ bụ́ ebe nna ya bụ ụkọchukwu, Bible. “O siiri ya ike ịnakwere echiche bụ́ na e nwere Onye Okike. Nkọwa nke akwụkwọ a enweghị ihe ọ bụla na-enunye mmadụ enunye ikwere ihe, kama ihe ndị bụ́ eziokwu dị ya n’ime, ya mere echere m na ọbụna ndị Buddha pụrụ ịgụ ya n’egbughị oge. Ọ na-emekwa ka anyị nwee mmetụta nke ịhụnanya Jehova karị.”
Nkọwa nke a sitere n’England: “M ka gụsịrị nnọọ akwụkwọ Creator ahụ, ana m akwadokwa ịmalite ịgụ ya ọzọ. Lee akwụkwọ dị egwu ọ bụ! Ọ dịghị ihe ọzọ mmadụ pụrụ ime mgbe ọ na-agụ ya na-abụghị ịhụ Jehova n’anya. Enyewo m onye agbata obi m otu, bụ́ onye mgbe ọ gụsịrị nanị isiakwụkwọ abụọ kwuru, sị, ‘Apụghị m idoru ya ala, ọ na-akpali nnọọ mmasị.’ Eji m n’aka na nke a ga-enyere ndị mmadụ aka ịmara Onye Okike Ukwu anyị ma hụ ya n’anya.”
Otu nwoke nọ na Maryland, U.S.A., kwuru, sị: “N’ezie ọ bụrụwo nnọọ ihe na-abami n’ọkpụkpụ na ụmị ime mmụọ m! Ana m eme atụmatụ inye ndị nile mụ na ha na-achụkọ nta ego otu otu. Ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ịmalite ịgbara ndị dị otú ahụ ji ọrụ n’aka, bụ́kwa ndị gụrụ akwụkwọ, àmà. N’iji akwụkwọ a eme ihe, aga m achọtazi ụzọ na-adọrọ mmasị, dịkwa irè.”
N’ụzọ doro anya, akwụkwọ ahụ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? ga-enwe mmetụta dị mma n’ebe ndị mmadụ nọ n’ụwa nile.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 25]
Foto dị n’ihu akwụkwọ ahụ dị n’elu, Eagle Nebula: J. Hester na P. Scowen (AZ State Univ.), NASA